Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ebe M Na-adịghị Ike Emeela Ka A Hụkwuo Ike Chineke

Ebe M Na-adịghị Ike Emeela Ka A Hụkwuo Ike Chineke

MGBE mụ na nwunye m rutere Kolombia n’afọ 1985, a na-eme ezigbo tigbuo zọgbuo n’ebe ahụ. Ndị ọchịchị na-alụso ndị na-ere ọgwụ ike nọ n’obodo ndị mepere emepe na ndị agha ọlụọ ọgbalaga nọ n’ugwu ọgụ. N’ebe a na-akpọ Medelin, bụ́ ebe anyị mechara jee ozi, e nwere òtù ụmụ okorobịa na-ebu égbè agagharị ebe niile. Ha na-ere ọgwụ ike, na-ana ndị mmadụ ego iji chebe ha. Ọ bụkwa ha ka ndị chọrọ igbu mmadụ na-ego. E nweghị otu onye n’ime ha nọrọ ogologo ndụ. Ọ dị anyị ka ànyị nọ n’ụwa ọzọ.

Mụ na nwunye m bụ ndị nkịtị. Obodo anyị bụ́ Finland bụkwa otu n’ime obodo ndị kacha dịrị n’ebe ugwu n’ụwa. Oleezi otú anyị si bịa na Kọntinent Saụt Amerịka? Oleekwa ihe ndị m mụtara kemgbe ọtụtụ afọ?

MGBE M NA-ETO ETO NA FINLAND

A mụrụ m n’afọ 1955. Ọ bụ m bụ nwa ikpeazụ n’ime ụmụ nwoke atọ nne na nna m mụrụ. M toro n’ebe dị nso n’akụkụ osimiri dị n’ebe ndịda Finland. Ihe a na-akpọzi ebe ahụ bụ Vantaa.

Mama m mere baptizim ghọọ Onyeàmà Jehova afọ ole na ole tupu a mụọ m. Ma, papa m na-emegide ya, o kweghịkwa ka mama m na-amụrụ anyị bụ́ ụmụ ya ihe ma ọ bụkwanụ na-akpọ anyị aga ọmụmụ ihe. N’ihi ya, mama anyị na-akụziri anyị eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi mgbe papa anyị na-anọghị ya.

Ekweghị m enupụrụ Jehova isi mgbe m dị afọ asaa

Malite mgbe m bụ nwata, anaghị m ekwe enupụrụ Jehova isi. Dị ka ihe atụ, mgbe m dị afọ asaa, onye nkụzi anyị wesara m iwe n’ihi na ekweghị m ata keeki ndị Finland na-eji ọbara eme. Onye nkụzi ahụ gbalịrị ịmanye m ịta ya. O ji otu aka ya na-emepe ọnụ m, jiri fọk n’aka nke ọzọ na-etinye m keeki ahụ n’ọnụ. M jisiri ike kụchapụ ya fọk ahụ n’aka.

Mgbe m dị afọ iri na abụọ, papa m nwụrụ. Mgbe ọ nwụchara, m maliteziri ịga ọmụmụ ihe. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ gosiri m obiọma. Ihe a mekwara ka mụ na Jehova na-adịkwu ná mma. M malitere ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-amụsikwa akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl ike. Otú m si na-amụ ihe mere ka m mee baptizim mgbe m dị afọ iri na anọ, ya bụ, n’abalị asatọ n’ọnwa Ọgọst afọ 1969.

Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ, ọ dịghị anya, mụ amalite ịsụ ụzọ oge niile. N’ime izu ole na ole, m kwagara ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma na Pielavesi, nke dị nso n’etiti Finland.

Na Pielavesi, m hụrụ nwa agbọghọ mechara bụrụ nwunye ọma m. Aha ya bụ Sirkka. Ihe masịrị m n’ebe ọ nọ bụ otú o si dịrị umeala n’obi nakwa otú o si jiri ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ihe ka ya mkpa abụghị akụnụba ma ọ bụ ịbụ onye a ma ama. Anyị abụọ chọsiri ike ife Jehova otú ọ bụla anyị nwere ike. Anyị dịkwa njikere ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere anyị. Anyị lụrụ n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Mach afọ 1974. Kama ịgawa ezumike otú ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ na-eme, anyị kwafere na Katula, bụ́ ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma.

Ụlọ anyị bi na Katula dị na Finland

JEHOVA LEKỌTARA ANYỊ

Ụgbọala ahụ nwanne m nyere anyị

Malite mgbe anyị lụrụ, Jehova egosila anyị na ọ ga na-egboro anyị mkpa anyị ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ya. (Mat. 6:33) Dị ka ihe atụ, na Katula, anyị enweghị ụgbọala. Ná mmalite, ihe anyị ji eme njem bụ ígwè. Ma n’oge oyi, ụdị oyi na-atụ ebe ahụ na-eme ka mmiri kpụkọọ. Ụgbọala dị anyị mkpa ka anyị nwee ike na-ekwusa ozi ọma n’obodo ahụ buru ibu. Ma, anyị enweghị ego anyị ga-eji azụ ụgbọala.

Deede m bịara leta anyị mgbe anyị na-atụghị anya ya. O nyere anyị ụgbọala ya. Ọ kwụọla ụgwọ ịnshọransị ya. Naanị ihe anyị ga-eme bụ ịgbanye ya mmanụ ụgbọala. Ọ bụ otú anyị si nweta ụgbọala dị anyị mkpa.

Jehova gosiri anyị na ya dị njikere ịrụ ọrụ ya, nke bụ́ ilekọta anyị na igboro anyị mkpa anyị. Ọrụ anyị bụ ibu ụzọ na-achọ Alaeze ya.

ỤLỌ AKWỤKWỌ GILIED

Mgbe anyị gara Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ n’afọ 1978

Mgbe anyị nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Ọsụ Ụzọ n’afọ 1978, Nwanna Raimo Kuokkanen, a bụ́ otu n’ime ndị nkụzi anyị, gbara anyị ume ka anyị tinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’ihi ya, anyị malitere ịmụ asụsụ Bekee ka anyị nwee ike iru eru ịga ya. Ma, n’afọ 1980, tupu anyị etinye akwụkwọ ịga ụlọ akwụkwọ ahụ, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Finland. N’oge ahụ, ndị na-eje ozi na Betel anaghị etinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ma, anyị chọrọ ijere Jehova ozi n’ebe ọ bụla o chere kacha mma, ọ bụghị n’ebe anyị chere kacha mma. N’ihi ya, anyị kwetara gawa Betel. Ma, anyị ka nọkwa na-amụ asụsụ Bekee ka ọ ga-abụ, ohere dapụta itinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied, anyị etinye akwụkwọ.

Mgbe afọ ole na ole gachara, Òtù Na-achị Isi kwuru na ndị na-eje ozi na Betel nwere ike itinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Anyị dejupụtara akwụkwọ ozugbo. Ma, ọ bụghị n’ihi na ozi Betel adịghị anyị ụtọ. Betel na-atọgbu anyị atọgbu. Ọ bụ naanị na anyị chọrọ iwepụta onwe anyị ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa ma ọ bụrụ na anyị ruru eru ije ya. A kpọrọ anyị, anyị agaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Anyị gụchakwara na klas nke iri asaa na itoolu n’ọnwa Septemba afọ 1985. Ebe e zigara anyị bụ Kolombia.

EBE MBỤ ANYỊ JERE OZI ALA ỌZỌ

Na Kolombia, e bu ụzọ ziga anyị ka anyị jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ. M gbalịrị ike m niile n’ọrụ e nyere m. Ma, mgbe m nọchara otu afọ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, m chere na e kwesịrị ịgbanwere anyị ọrụ. M kwuru ka a gbanweere anyị ọrụ. Nke ahụ bụ nke mbụ na nke ikpeazụ m mere ya. E zigaziri anyị ka anyị jewe ozi ala ọzọ n’obodo Neva, n’ebe a na-akpọ Huila.

Ịga ozi ọma na-atọgbu m atọgbu kemgbe ụwa. Mgbe m na-asụ ụzọ na Finland tupu mụ alụọ nwaanyị, m na-ekwusa ozi ọma mgbe ụfọdụ si n’ụtụtụ ruo mgbe chi jiri. Mgbe mụ na nwunye m lụrụ ọhụrụ, anyị na-anọ ogologo oge n’ozi ọma. Anyị kwusawa ozi ọma n’ebe dị anya n’ebe anyị bi, anyị na-ehi n’ụgbọala anyị mgbe ụfọdụ. Ihe a na-eme ka anyị ghara ịlọta ụlọ, gbarakwa gawa n’ebe anyị ga-ezi ozi ọma n’echi ya. Ọ na-emekwa ka anyị bido ozi ọma ọsọ ọsọ n’ụbọchị na-eso ya.

Ozi ala ọzọ anyị na-eje mere ka anyị nụwakwa ọkụ n’obi n’ozi ọma otú anyị na-anụbu mgbe anyị na-asụ ụzọ. Ndị ọhụrụ malitere ịbata n’ọgbakọ anyị. Ụmụnna ndị Kolombia na-asọpụrụ mmadụ, na-ahụ mmadụ n’anya, na-ejikwa ihe ọma e meere ha kpọrọ ihe.

IKE EKPERE NA-AKPA

Na Neva, bụ́ ebe e kenyere anyị ikwusa ozi ọma, e nwere obodo ndị dị nso a na-enweghị Ndịàmà Jehova. M nọ na-echegbu onwe m gbasara otú ozi ọma ga-esi ruo ebe ndị ahụ. Ma, n’ihi ndị agha ọlụọ ọgbalaga, ndị na-abụghị ụmụ amaala anaghị aga ebe ndị ahụ ka a ghara igbu ha. N’ihi ya, m kpere ekpere ka e nwee onye si n’otu n’ime obodo ndị ahụ ga-aghọ Onyeàmà Jehova. M chere na onye ahụ ga-ebirịrị na Neva ka o nwee ike ịmụta eziokwu Baịbụl. N’ihi ya, m kpekwara ekpere ka ụkwụ sie onye ahụ ike n’ọgbakọ ma o mechaa baptizim tupu ya alaghachi n’obodo ya kwusawa ozi ọma. Amaghị m na Jehova nwere ihe o bu n’obi ka nke m mma.

N’oge na-adịghị anya, m malitere ịmụrụ otu nwa okorobịa Baịbụl. Aha ya bụ Fernando González. O bi n’Algesiras, bụ́ otu n’ime obodo ndị ahụ a na-enweghị Ndịàmà Jehova na ha. Fernando na-agba ihe karịrị kilomita iri ise ịga Neva arụ ọrụ. Ọ na-akwado ihe ọ bụla mụ na ya ga-amụ nke ọma, bidokwa ozugbo bịawa ọmụmụ ihe niile. Malite n’izu mbụ a mụwaara ya Baịbụl, ọ na-akpọkọta ndị ọzọ n’obodo ha ma na-akụziri ha ihe ọ mụtara na Baịbụl.

Anyị na Fernando n’afọ 1993

Fernando mere baptizim n’ọnwa Jenụwarị afọ 1990, mgbe ọnwa isii gara ọ malitere ịmụ ihe. Mgbe o mechara baptizim, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile. Ebe ọ bụ na e nweela onye Algesiras bụ́ Onyeàmà Jehova, ọ bụzi mgbe ahụ ka alaka ụlọ ọrụ zigara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ahụ n’atụghị ụjọ na ihe ọ bụla ga-eme ha. N’ọnwa Febụwarị afọ 1992, e hiwere ọgbakọ n’obodo ahụ.

Nwanna Fernando ò kwusara ozi ọma naanị n’obodo ha? Mba. Mgbe ọ lụchara nwaanyị, ya na nwunye ya kwagara San Visenti del Kagụan, bụ́ obodo ọzọ a na-enweghị Ndịàmà Jehova. Ha nyere aka hiwe ọgbakọ n’ebe ahụ. N’afọ 2002, a họpụtara Nwanna Fernando ka ọ bụrụ onye nlekọta sekit. Ya na nwunye ya Olga ka nọkwa n’ọrụ ilekọta sekit ruo taa.

Akụkọ a kụziiri m na ọ dị mkpa ka anyị kpọọ okwu aha mgbe anyị na-ekpe ekpere gbasara ọrụ e nyere anyị ná nzukọ Jehova. Jehova na-eme ihe anyị na-agaghị emeli. A sị ka e kwuwe, ọ bụ ya nwe owuwe ihe ubi a, ọ bụghị anyị.​—Mat. 9:38.

JEHOVA NA-EME KA ANYỊ ‘NWEE MMASỊ IME IHE, NA-ENYEKWA ANYỊ IKE ANYỊ JI EME YA’

N’afọ 1990, e zigara anyị ka anyị gaa letawa sekit. Sekit mbụ anyị letara dị na Bogota, bụ́ isi obodo Kolombia. Ọ dị anyị ka anyị agaghị arụli ọrụ ahụ. Mụ na nwunye m bụ ndị nkịtị. Anyị enweghị nkà pụrụ iche. Ibi n’obodo mepere emepe na-ekwo ekwo amaghịkwa anyị ahụ́. Ma, Jehova mezuru nkwa o kwere ná Ndị Filipaị 2:13, ebe sịrị: “Ọ bụ Chineke na-enye unu ume maka na ọ dị ya ezigbo mma ime otú ahụ. Ọ na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya.”

E mechara ziga anyị n’otu sekit dị na Medelin, bụ́ obodo ahụ m kwuru okwu ya ná mmalite. Tigbuo zọgbuo a na-eme n’obodo ahụ amarala ndị bi na ya ahụ́. Ọ naghịzi atụ ha ụjọ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu oge m nọ na-amụrụ mmadụ Baịbụl, a malite ịgba égbè n’èzí. Ezigbo ụjọ jidere m, ya afọ obere ka m makpuru ala. Ma, onye m na-amụrụ Baịbụl ka nọkwa na-agụ paragraf ọ na-agụ. Ụjọ atụghị ya. Mgbe ọ gụchara, ọ sịrị anyị ka ya bịa, ya apụọ èzí. Mgbe obere oge gachara, ọ kpọ ụmụaka abụọ bata ma wetuo obi sị anyị, “Unu ewela iwe. M gara kpọta ụmụ m.”

E nwere oge ndị ọzọ ọ fọrọ obere ka ihe mee anyị. Otu oge anyị nọ na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ, nwunye m gbakwutere m. Ihu ya adịchaghị mma. Ọ sịrị na e nwere onye gbajọrọ ya égbè. M kụjara. Ma, anyị mechara chọpụta na ọ bụghị nwunye m ka ọ chọrọ ịgba ya. Onye ọ chọrọ ịgba ya bụ otu nwoke nọ na-agafe n’akụkụ nwunye m.

Ka oge na-aga, tigbuo zọgbuo a na-eme n’ebe ahụ anaghịzi amapụ anyị obi. Ihe gbara anyị ume bụ otú ụmụnna ndị obodo ahụ si nwee obi ike n’agbanyeghị na ụdị ihe ndị a nakwa ndị ka ha njọ na-eme ha. Anyị kwuru na ebe ọ bụ na Jehova na-enyere ha aka, ọ ga-enyekwara anyị aka. Anyị na-ege ndị okenye obodo ahụ ntị mgbe niile, na-akpachapụ anya, hapụziere Jehova nke fọrọ afọ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe ụfọdụ, ihe anyị chọpụtara merenụ adịghị njọ ka ihe anyị tụrụ ụjọ ya. E nwere otu oge m nọ n’otu ụlọ m gara, na-anụ ihe yiri olu ụmụ nwaanyị abụọ na-akọ ibe ha ọnụ n’èzí. Ike ile ndị na-ese okwu adịghị m. Ma, onye nwe ụlọ gwara m ka m pụtagodị na varanda ya. Mgbe m rutere, m hụrụ na ọ bụghị mmadụ abụọ na-ese okwu. O mechara bụrụ nnụnụ abụọ a na-akpọ icheoku ma ọ bụ okooko na-ejije ndị agbata obi ha.

ỌRỤ NDỊ ỌZỌ E NYERE ANYỊ NAKWA IHE NDỊ SIIRI ANYỊ IKE

N’afọ 1997, a họpụtara m ka m bụrụ onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. b Ịga ụlọ akwụkwọ nzukọ Jehova haziri na-atọgbu m atọgbu. Ma, e nweghị mgbe ọ bụla m chetụrụ n’echiche na m ga-abụ onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ nke ọ bụla.

M mechara bụrụ onye nlekọta distrikti. Mgbe e mechara kwụsị ọrụ ndị nlekọta distrikti, m rụwakwara ọrụ nlekọta sekit. N’ihi ya, kemgbe ihe karịrị afọ iri atọ, m na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ nzukọ Jehova haziri, bụrụkwa onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ọrụ ndị a m rụrụ emeela ka m nweta ọtụtụ ngọzi. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ihe gaara m siriri werere. Ka m kọwakwuo.

Obi siri m ike, abụghịkwa m onye ụjọ. Ihe a nyeere m aka n’oge ihe siri ezigbo ike. Ma, mgbe ụfọdụ, m na-anụfe ọkụ n’obi ókè mgbe m na-achọ ịgbazi ihe ụfọdụ na-eme n’ọgbakọ. E nwere otu oge m ji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ụfọdụ ndị ka ha na-ahụ ibe ha n’anya ma na-echebara ibe ha echiche. Mana nke bụ́ eziokwu bụ na n’oge ndị ahụ, mụnwa anaghị akpa àgwà ndị ahụ.​—Rom 7:21-23.

N’ihi ihe ndị m na-anaghị emeta, e nweela oge ndị m dara mbà. (Rom 7:24) E nwere otu oge m gwara Jehova n’ekpere na ọ ga-akara m mma ịhapụ ozi ala ọzọ m na-eje ma laghachi Finland. Ná mgbede ahụ, m gara ọmụmụ ihe. Okwu m nụrụ n’ọmụmụ ihe ahụ mere ka obi sie m ike na m kwesịrị ịnọ ebe ahụ na-arụ ọrụ m, na-agbasikwa mbọ ike n’ihe ndị m na-anaghị emeta. Ruokwa taa, obi na-atọ m ezigbo ụtọ n’otú doro anya Jehova si za ekpere ahụ m kpere. Ihe ọzọ bụ na obi dị m ezigbo ụtọ na o nyerela m aka imezi ihe ndị m na-anaghị emeta.

IJI OBI IKE NA-ELE ANYA IHE NDỊ GA-EME N’ỌDỊNIHU

Mụ na nwunye m Sirkka ji obi anyị niile na-ekele Jehova maka na o mere ka anyị jiri oge buru ibu ná ndụ anyị jeere ya ozi oge niile. M na-ekelekwa Jehova nke ukwuu na o nyere m nwaanyị nwere ịhụnanya ma kwesị ntụkwasị obi mụ na ya so na-eje ozi n’afọ ndị a niile.

N’oge na-adịghị anya, m ga-agba afọ iri asaa, kwụsị ịbụ onye nlekọta sekit na onye nkụzi n’ụlọ akwụkwọ nzukọ Jehova nwe. Ma, ọ naghị ewute m. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi siri m ike na ihe kacha eto Jehova bụ na anyị weturu onwe anyị ala na-efe ya, nakwa na anyị si n’obi anyị na-eto ya n’ihi otú anyị si hụ ya n’anya nakwa otú obi si dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị. (Maị. 6:8; Mak 12:32-34) Ihe ga-eme ka anyị too Jehova abụghị na anyị bụ ndị a ma ama.

Ọ na-abụ m cheta ọrụ ndị m rụrụla ná nzukọ Jehova, m na-aghọta na ihe mere e ji nye m ọrụ ndị ahụ abụghị maka na m ka ndị ọzọ mma ma ọ bụkwanụ na m nwere nkà pụrụ iche karịa ndị ọzọ. Ọ bụtụghị ya ma otu. Kama, ihe mere Jehova ji nye m ọrụ ndị ahụ bụ maka amara ya. O nyere m ọrụ ndị a n’agbanyeghị ebe ndị m na-adịghị ike. Ama m na naanị ihe mere m ji rụlie ọrụ ndị a bụ enyemaka Jehova. Ihe a emeela ka e si n’ebe ndị m na-adịghị ike mee ka a hụkwuo ike Jehova.​—2 Kọr. 12:9

a Akụkọ ndụ Nwanna Raimo Kuokkanen isiokwu ya bụ “Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi” gbara n’Ụlọ Nche Eprel 1, 2006.

b E jizi Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze dochie ya.