Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 14

ABỤ NKE 56 Ka Eziokwu Bamie Gị n’Obi

‘Jisie Ike Na-eme Nke Ọma Ruo Mgbe I Tozuru Etozu’

‘Jisie Ike Na-eme Nke Ọma Ruo Mgbe I Tozuru Etozu’

“Ka anyị jisie ike na-eme nke ọma ruo mgbe anyị tozuru etozu.”​—HIB. 6:1.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ otú Onye Kraịst tozuru etozu si eche echiche otú dị Jehova mma, na-emekwa ihe Jehova chọrọ ma na-eme mkpebi ndị dị mma.

1. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị mee?

 OTU n’ime oge ndị kacha eme di na nwunye obi ụtọ bụ mgbe ha mụrụ nwa ọhụrụ. N’agbanyeghị na nne na nna hụrụ nwa ọhụrụ ha n’anya, ha anaghị achọ ka ọ bụrụ nwa ọhụrụ na-aga. N’eziokwu, obi agatụdịghị adị ha mma ma ọ bụrụ na ọ naghị eto eto. Otú ahụ ka ọ dị Jehova. Obi na-adị ya ụtọ ma anyị ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma ọ chọghị ka anyị kwụsị ebe ahụ. (1 Kọr. 3:1) Kama, ọ gwara anyị ka anyị ghọọ “dimkpa” ma ọ bụ Ndị Kraịst tozuru etozu.​—1 Kọr. 14:20.

2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 Gịnị ka ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu pụtara? Olee otú anyị ga-esi bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu? Olee uru nri siri ike dị n’Okwu Chineke ga-abara anyị? Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na anyị amarachaala ihe niile? N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a.

GỊNỊ KA ỊBỤ ONYE KRAỊST TOZURU ETOZU PỤTARA?

3. Olee ihe ịbụ Onye Kraịst bụ́ dimkpa pụtara?

3 Na Baịbụl, okwu Grik a sụgharịrị “dimkpa” nwekwara ike ịpụta onye tozuru etozu, onye zuru okè, ma ọ bụ ‘onye siri ike n’okwukwe.’ a (1 Kọr. 2:6) N’ihi ya, dị ka nwatakịrị si eto ruo mgbe ọ ghọrọ dimkpa, anyịnwa kwesịkwara ịna-eto eto n’adịm ná mma anyị na Jehova. Anyị ga-esi otú ahụ bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu. N’eziokwu, ọ bụrụgodị na anyị etozuola, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịna-eme nke ọma. (1 Tim. 4:15) Anyị niile nwere ike ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu ọ bụrụgodị na anyị ka bụ ndị na-eto eto. Ma, gịnị na-egosi na Onye Kraịst aghọọla onye tozuru etozu?

4. Olee ihe e ji ama Onye Kraịst tozuru etozu?

4 Onye Kraịst tozuru etozu bụ onye na-eme ihe niile Jehova chọrọ ka o mee. Ọ naghị ahọrọ ndị nke ọ ga-eme na ndị nke ọ na-agaghị eme. Ọ ga na-emehie ihe ụfọdụ n’ihi na ọ bụ onye na-ezughị okè. Ma kwa ụbọchị, ọ ga na-agbasi mbọ ike ịna-eche echiche ma na-eme ihe otú Jehova chọrọ. Ọ na-eyiri àgwà ọhụrụ, na-agbalịkwa mgbe niile ịna-echekwu echiche otú Jehova si eche. (Efe. 4:22-24) Ọ mụtala iji iwu Jehova na ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru na-eme mkpebi ndị ziri ezi. N’ihi ya, ọ naghị echere ka e nye iwu maka ihe niile ọ na-eme. O kpebie ihe ọ ga-eme, ọ na-agbalịsi ike ime ya.​—1 Kọr. 9:26, 27.

5. Gịnị nwere ike ime Onye Kraịst na-etozubeghị etozu? (Ndị Efesọs 4:14, 15)

5 Ma, ọ bụrụ na Onye Kraịst etozubeghị etozu, o nwere ike ịdị mfe iji “ihe na-abụghị eziokwu ndị aghụghọ na-akụzi” duhie ya. O nwere ike ikweta ihe ndị na-agbasa akụkọ ụgha n’Ịntanet ma ọ bụ n’ebe ọzọ a na-agbasa ozi na-ekwu, ma ọ bụkwanụ na-ekweta ihe ndị si n’ọgbakọ pụọ na-ekwu. b (Gụọ Ndị Efesọs 4:14, 15.) O nwere ike ịna-emere ndị ọzọ anyaụfụ, na-esesa ndị ọzọ okwu, na-ewe iwe ọsọ ọsọ, ma ọ bụkwanụ na-eme ihe na-adịghị mma mgbe a nwara ya ọnwụnwa.​—1 Kọr. 3:3.

6. Olee ihe atụ e nwere ike iji kọwaa otú mmadụ si aghọ Onye Kraịst tozuru etozu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Dị ka anyị kwuburu, Baịbụl ji Onye Kraịst itozu etozu tụnyere mmadụ ito ghọọ dimkpa. E nwere ọtụtụ ihe nwatakịrị na-amaghị. N’ihi ya, onye toro eto kwesịrị ịna-echebe ya ma na-eduzi ya. Iji maa atụ, nne nwere ike ịgwa nwa ya nwaanyị ka o jide ya aka ma ọ gafewe okporo ụzọ. Ka nwa ahụ na-eto, nne ya nwere ike ịhapụ ya ka ọ na-agafe okporo ụzọ n’onwe ya, ma ọ ka ga-echetara ya ka ọ hụ na e nweghị ụgbọala na-abịa tupu ọ gafee okporo ụzọ. Nwa ahụ ghọọ dimkpa, ọ gaghịzi adị mkpa ka e nyere ya aka n’ihi na ọ matala ihe ọ ga-eme. Otú ahụ ọ na-adị mkpa ka ndị toro eto nyere ụmụaka aka izere ihe ọ bụla nwere ike imerụ ha ahụ́, ọ na-adịkarị mkpa ka Ndị Kraịst tozuru etozu nyere Ndị Kraịst na-etozubeghị etozu aka izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma nakwa ime mkpebi ndị dị mma. Ma, Ndị Kraịst tozuru etozu adịghị otú ahụ. Tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme, ha na-ebu ụzọ chebara ihe Baịbụl kwuru echiche ka ha mata ihe Jehova chere, na-emekwa ihe ahụ dị mma ha mụtara.

Ndị Kraịst na-etozubeghị etozu kwesịrị ịmụta otú ha ga-esi jiri ihe Baịbụl kwuru na-eme mkpebi ndị dị mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)


7. È nwere mgbe Ndị Kraịst tozuru etozu na-achọ enyemaka ndị ọzọ?

7 Ọ̀ pụtara na e nweghị mgbe Onye Kraịst tozuru etozu na-achọ enyemaka onye ọ bụla? Mba. Ndị tozuru etozu kwesịkwara ịchọ enyemaka mgbe ụfọdụ. Ma Onye Kraịst na-etozubeghị etozu nwere ike ịchọ ka ndị ọzọ gwa ya ihe ọ ga-eme ma ọ bụ meere ya mkpebi o kwesịrị ime. Ihe dị iche bụ na Onye Kraịst tozuru etozu gwa ndị ka ya nwee amamihe na nghọta ka ha tụọrọ ya aro, ọ ma na ọ bụ yanwa ga-ekpebi ihe ọ ga-eme nakwa na ọ “ga-ebu ibu nke ya.”​—Gal. 6:5.

8. Olee otú Ndị Kraịst tozuru etozu si dịrị iche n’ibe ha?

8 Otú ahụ ọdịdị ndị niile toro eto na-abụghị otu ka àgwà Ndị Kraịst niile tozuru etozu na-abụghị otu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ nwere ike ịka ndị ọzọ nwee amamihe ma ọ bụ obi ike, na-emesapụ aka ma ọ bụ na-emetere ndị ọzọ ebere. E nwee otu ihe Ndị Kraịst abụọ tozuru etozu kwesịrị ikpebi, ihe ha kpebiri ime nwere ike ịdị iche. Ma ọ ga-adaba n’ihe Baịbụl kwuru. Ihe a na-emekarị n’ihe Onye Kraịst ga-eji akọnuche ya kpebie. N’ihi ya, ha anaghị ekpe ndị ọzọ ikpe ma ihe ha kpebiri dịrị iche na nke ha. Kama, ihe na-abụ mkpa ha bụ ka ha dịrị n’otu.​—Rom 14:10; 1 Kọr. 1:10.

GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME KA ANYỊ BỤRỤ NDỊ KRAỊST TOZURU ETOZU?

9. Ànyị ga-abụli Ndị Kraịst tozuru etozu n’agbaghị mbọ ọ bụla? Kọwaa.

9 Nwatakịrị ga-emecha too ka oge na-aga. Ma, Onye Kraịst na Jehova agaghị adị ná mma ma ọ bụrụ na ọ gbaghị mbọ. Dị ka ihe atụ, ụmụnna nọ na Kọrịnt nabatara ozi ọma, e mee ha baptizim, ha anata mmụọ nsọ, mụtakwa ọtụtụ ihe n’ihe Pọl onyeozi kụziiri ha. (Ọrụ 18:8-11) Ma, mgbe e mechara ha baptizim, afọ ụfọdụ agaa, ọtụtụ n’ime ha ka bụ ndị na-etozughị etozu. (1 Kọr. 3:2) Gịnị ka anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị?

10. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu? (Jud 20)

10 Ka anyị nwee ike ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu, anyị ga-ebugodị ụzọ chọọ itozu etozu. “Ndị na-amaghị ihe,” ya bụ, ndị họọrọ ịbụ Ndị Kraịst bụ́ nwa ọhụrụ na-aga, agaghị emecha tozuo etozuo. (Ilu 1:22) Anyị achọghị ịna-eme ka onye toro eto na-akpa àgwà ka ụmụaka, nke na-achọ ka ọ bụrụ ndị mụrụ ya na-ekpebiri ya ihe o kwesịrị ikpebiri onwe ya. Kama, anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu, ndị na-emere onwe ha mkpebi, ndị ha na Jehova na-adị ná mma. (Gụọ Jud 20.) Ọ bụrụ na ị ka na-agbalị ka i tozuo etozuo, na-arịọ Jehova ka ‘ọ na-eme ka i nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa gị ike i ji eme ya.’​—Fil. 2:13.

11. Olee ihe Jehova nyere anyị ga-enyere anyị aka ịbụ ndị tozuru etozu? (Ndị Efesọs 4:11-13)

11 Jehova ebughị n’obi ka anyị tozuo etozuo n’enweghị onye nyeere anyị aka. O nyere anyị ndị ọzụzụ atụrụ na ndị nkụzi n’ọgbakọ, ndị ga-enyere anyị aka ka anyị bụrụ ndị tozuru etozu, “ruokwa mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru.” (Gụọ Ndị Efesọs 4:11-13.) Jehova nyekwara anyị mmụọ nsọ ya ka o nyere anyị aka inwe “uche Kraịst.” (1 Kọr. 2:14-16) Ihe ọzọ bụ na Jehova mere ka e were mmụọ nsọ ya dee Ozi Ọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn iji gosi anyị otú Jizọs si eche echiche, ihe ndị o kwuru, na ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ bụrụ na ị mụta otú Jizọs si eche echiche na otú o si akpa àgwà, ị ga-enwe ike ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu otú i bu n’obi.

URU NRI SIRI IKE DỊ NA BAỊBỤL NA-ABA

12. Gịnị bụ “ihe ndị mbụ a kụziiri anyị banyere Kraịst”?

12 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraịst tozuru etozu, ihe anyị ga-amụta abụghị naanị “ihe ndị mbụ a kụziiri anyị banyere Kraịst.” Ụfọdụ n’ime ha bụ nchegharị, okwukwe, baptizim, na mbilite n’ọnwụ. (Hib. 6:1, 2) Ihe ndị a so n’ihe ndị bụ́ isi Ndị Kraịst niile kwetara. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji kwuo banyere ha mgbe ọ na-ezi ìgwè mmadụ ozi ọma n’ụbọchị Pentikọst. (Ọrụ 2:32-35, 38) Anyị ga-ekwetarịrị eziokwu ndị a tupu anyị aghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na onye ọ bụla na-ekwetaghị ná mbilite n’ọnwụ agaghị ekwuli na ya bụ ezigbo Onye Kraịst. (1 Kọr. 15:12-14) Ma, ihe anyị kwesịrị ime abụghị naanị ịmụta eziokwu ndị mbụ a kụziiri anyị.

13. Gịnị ka anyị ga-eme ka nri siri ike e kwuru ná Ndị Hibru 5:14 baara anyị uru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Nri siri ike dị na Baịbụl adịghị ka ihe ndị mbụ a kụziiri anyị. Kama, ihe ndị so na ha bụ iwu Jehova na ihe ndị ọzọ dị n’Okwu ya, ndị na-enyere anyị aka ịghọta otú o si eche echiche. Anyị chọọ ka nri ndị ahụ siri ike baara anyị uru, anyị kwesịrị ịna-amụ Okwu Chineke, na-atụgharị uche n’ihe ndị anyị na-amụ, ma gbalịsie ike ịna-eme ihe ndị anyị mụtara. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú a, anyị na-azụ onwe anyị ime mkpebi ndị ga-adị Jehova ezigbo mma. c​—Gụọ Ndị Hibru 5:14.

Nri siri ike dị n’Okwu Chineke na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme mkpebi ga-adị Jehova mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) d


14. Olee otú Pọl si nyere ndị Kọrịnt aka ịbụ ndị tozuru etozu?

14 Ọ na-esikarịrị Ndị Kraịst na-etozubeghị etozu ike ime mkpebi ndị dị mma ma ọ bụrụ na Baịbụl enyeghị iwu ndị a kapịrị ọnụ. Ọ bụrụ na e nweghị iwu Baịbụl nyere, ụfọdụ ndị nwere ike iche na ha nwere ike ime ihe ọ bụla masịrị ha. Ụfọdụ ndị nwekwara ike ịchọ ka a na-enye ha iwu mgbe a na-ekwesịghị inye ha iwu. Dị ka ihe atụ, ọ ga-abụ na Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt gwara Pọl ka o nye ha iwu gbasara iri ihe e ji chụọrọ arụsị àjà. Pọl agwaghị ha ihe ha ga-eme. Kama, ọ kọwaara ha uru akọnuche ha ga-abara ha nakwa na onye ọ bụla nwere ‘ikike ime ihe ọ chọrọ.’ Ọ gwara ha ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nwere ike inyere ha aka ime mkpebi na-agaghị eme ka akọnuche ha maa ha ikpe ma ọ bụ mee ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ. (1 Kọr. 8:4, 7-9) Pọl si otú ahụ na-enyere Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt aka ka ha bụrụ ndị tozuru etozu, ka ha nwee ike ịna-echebara ihe echiche nke ọma kama ịna-achọ onye ga-agwa ha ihe ha ga-eme ma ọ bụ na-achọ ka e nye ha iwu.

15. Olee otú Pọl si nyere Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ?

15 Anyị na-amụta ihe ọzọ dị mkpa n’akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru. Ụfọdụ n’ime ha kwụsịrị ito eto n’ọgbakọ. ‘Ọ bụzi mmiri ara ka a ga-enye ha, ọ bụghị nri siri ike.’ (Hib. 5:12) Ha anabataghịkwa ihe ọhụrụ Jehova ji nwayọọ nwayọọ si n’ọgbakọ ya na-akụziri ha. (Ilu 4:18) Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst nọ na-akwado Iwu Mosis n’agbanyeghị na ihe dị ka iri afọ atọ agaala kemgbe a kagburu Iwu ahụ n’ihi àjà Jizọs chụrụ. (Rom 10:4; Taị. 1:10) O doro anya na afọ iri atọ ndị ahụ ekwesịla izuru Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ịghọta na ha ekwesịghịzi ịna-edebe Iwu Mosis. Onye ọ bụla nke gụrụ ihe Pọl si n’ike mmụọ nsọ degara ndị Hibru ga-ekweta na ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ bụ nri siri ike. Akwụkwọ ozi ahụ Pọl dere nyeere ha aka ịghọta na ụzọ ọhụrụ ahụ Jehova mere ka e si n’aka Jizọs na-efe ya ka nnọọ mma. O mekwara ka ha jiri obi ike na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị otú ndị Juu si na-emegide ha.​—Hib. 10:19-23.

ECHELA NA Ị MARACHAALA IHE NIILE

16. E wezụga ịgba mbọ ka anyị bụrụ ndị tozuru etozu, gịnị ọzọ ka anyị kwesịrị ime?

16 Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ọ bụghị naanị ka anyị tozuo etozuo, kamakwa ka anyị bụrụ ndị tozuru etozu na-aga. Ọ pụtara na anyị ekwesịghị iche na anyị amarachaala ihe niile. (1 Kọr. 10:12) Anyị kwesịrị ‘ịna-enyocha’ onwe anyị ka anyị jide n’aka na anyị na-emekwu nke ọma.​—2 Kọr. 13:5.

17. Olee otú akwụkwọ ozi Pọl deere ndị Kọlọsi si gosi na anyị ekwesịghị ịkwụsị ịbụ ndị tozuru etozu?

17 N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kọlọsi, o kwukwara na ha ekwesịghị ịkwụsị ịbụ ndị tozuru etozu. N’agbanyeghị na ha bụ Ndị Kraịst tozuru etozu, Pọl dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ikwe ka e jiri echiche ụwa duhie ha. (Kọl. 2:6-10) Ọ ga-abụ na Epafras ma ndị nọ n’ọgbakọ Kọlọsi nke ọma. N’ihi ya, o kpere ekpere mgbe niile ka ha “kwụrụ chịm n’ikpeazụ ka ndị tozuru etozu.” (Kọl. 4:12) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ihe anyị na-amụta bụ na Pọl na Epafras ghọtara na ọ bụrụ na anyị achọghị ịkwụsị ịbụ ndị tozuru etozu, anyị ga-achọ ka Chineke nyere anyị aka, anyị ana-agbalịsikwa ike ka anyị na ya na-adịkwu ná mma. Ha chọrọ ka ụmụnna nọ na Kọlọsi bụrụ ndị tozuru etozu mgbe niile, ya bụ, Ndị Kraịst bụ́ dimkpa n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha.

18. Olee ihe nwere ike ime Onye Kraịst tozuru etozu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

18 Pọl dọrọ Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru aka ná ntị na ọ bụrụ na Onye Kraịst tozuru etozu akpacharaghị anya, o nwere ike ime ka Jehova jụ ya ruo mgbe ebighị ebi. Mmehie nwere ike ime ka obi Onye Kraịst kpọchie nke na ọ gaghịzi achọ ichegharị ka Chineke gbaghara ya. Obi dị anyị ụtọ na Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru emeghị otú ahụ. (Hib. 6:4-9) Ọ bụrụkwanụ na mmadụ akwụsị ịga ozi ọma ma ọ bụ na a chụrụ ya n’ọgbakọ, ya emechaa chegharịa? O chegharịa, ọ na-egosi na ọ dịghị ka ndị ahụ Pọl dere banyere ha, bụ́ ndị Jehova nwere ike ịjụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ọ bụrụ na ọ laghachikwute Jehova, e kwesịrị inyere ya aka otú Jehova chọrọ. (Ezik. 34:15, 16) Ndị okenye nwere ike ịhazi ka Onye Kraịst ma nke a na-akọ n’ọgbakọ nyere ya aka ka ya na Jehova dịwakwa ná mma.

Jehova na-enyere ndị chọrọ ka ha na ya dịghachi ná mma aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)


19. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

19 Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu, ị ga-emeli ya. Akwụsịla ịna-eri nri siri ike dị n’Okwu Chineke. Na-agbakwa mbọ ka ị na-eche echiche otú Jehova si eche. Ọ bụrụkwa na ị bụ Onye Kraịst tozuru etozu, nọsie ike ka ị ghara ịkwụsị ịbụ Onye Kraịst bụ́ dimkpa.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ịbụ Onye Kraịst tozuru etozu pụtara?

  • Olee otú anyị ga-esi bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu?

  • Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na anyị amarachaala ihe niile?

ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu

a Ọ bụ eziokwu na Akwụkwọ Nsọ Hibru ekwughị okwu ahụ bụ́ “tozuru etozu” ma ọ bụ “na-etozughị etozu,” ma ihe ndị o kwuru kọwara okwu abụọ ahụ. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Ilu kwuru ihe dị iche na nwa okorobịa na-amaghị ihe na nke ma ihe ma nwee nghọta.​—Ilu 1:4, 5.

b Gụọ isiokwu bụ́ “Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị” nke dị n’ebe a kpọrọ “Isiokwu Ndị Ọzọ” n’isiokwu dị iche iche na-agba na jw.org nakwa na JW Library.®

c Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe I Nwere Ike Ịmụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche a.

d NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna ji ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl na-ekpebi ihe ndị ọ ga-ele na tiivi.