Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Ndị Chọrọ Ime Jehova Obi Ụtọ Na-eme Mkpebi Ndị Dị Mma

Ndị Chọrọ Ime Jehova Obi Ụtọ Na-eme Mkpebi Ndị Dị Mma

Gụọ Jenesis 25:29-34 ka ị mata ma Ịsọ na Jekọb hà mere ezigbo mkpebi.

Matakwuo ihe ndị mere n’akụkọ ahụ. Gịnị mere tupu mgbe ahụ? (Jen. 25:20-28) Gịnị mechara mee?​—Jen. 27:1-46.

Mee nchọnchọ gbasara ihe ndị a kọrọ. N’oge ahụ, olee ihe ọkpara kwesịrị inweta na ọrụ ndị o kwesịrị ịrụ?​—Jen. 18:18, 19; w10 5/1 13.

  • Mmadụ ọ̀ ga-abụrịrị ọkpara tupu ya abụrụ onye a ga-esi n’ezinụlọ ya mụta Mezaya? (w17.12 14-15)

Chee gbasara ihe ndị ị mụtara, meekwa ha. Gịnị mere Jekọb ji jiri ihe ọkpara kwesịrị inweta kpọrọ ihe karịa Ịsọ? (Hib. 12:16, 17; w03 10/15 28-29) Olee otú obi dị Jehova n’ebe ụmụnne abụọ ahụ nọ, maka gịnị? (Mal. 1:2, 3) Gịnị ka Ịsọ gaara eme ka o nwee ike ime ezigbo mkpebi?

  • Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m ga-esi egosi na ihe gbasara ofufe Jehova dị m ezigbo mkpa mgbe m na-ekpebi ihe ndị m ga-eji oge m eme n’izu, jidekwa n’aka na m nwere oge maka ofufe ezinụlọ?’