Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 16

ABỤ NKE 64 Anyị Ji Ọṅụ Soro Na-ewe Ihe Ubi

Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ọṅụ n’Ozi Gị

Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ọṅụ n’Ozi Gị

“Jirinụ ọṅụ na-efe Jehova.”​—ỌMA 100:2.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a kwuru ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enwekwu ọṅụ n’ozi anyị.

1. Olee otú ọ na-adị ụfọdụ ndị ma ha chọwa izi mmadụ ozi ọma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

 EBE anyị bụ ndị Jehova, anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma n’ihi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya, chọọkwa inyere ndị mmadụ aka ịmata ya. Ikwusa ozi ọma na-atọ ọtụtụ ndị nkwusa ụtọ. Ma, e nwere ndị ọ na-esiri ike inwe ọṅụ n’ozi ha. Maka gịnị? O nwere ike ịbụ n’ihi na ụfọdụ bụ ndị ihere, obi anaghịkwa aka ha izi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ naghị adịrị ụfọdụ ndị mfe ịga n’ụlọ ndị mmadụ ma ọ bụrụ na a kpọghị ha. Ụjọ na-atụ ụfọdụ ndị na a gaghị ege ha ntị. E nwekwara ndị a kụziiri ka ha ghara ịna-akpasu ndị mmadụ iwe. N’agbanyeghị na ụmụnna ndị a hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu, ọ na-esiri ha ike ịgakwuru ndị ha na-amaghị zie ha ozi ọma. Ma, ha na-echeta na ọrụ a dị ezigbo mkpa. Ha na-esokwa arụ ya mgbe niile. Ihe a na-atọ Jehova ezigbo ụtọ.

Ikwusa ozi ọma ọ̀ na-atọ gị ụtọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)


2. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike inwe obi ụtọ n’ozi gị, gịnị mere na i kwesịghị ịda mbà?

2 Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ inwe ọṅụ n’ozi gị n’ihi ihe ndị a anyị kwuru? Ọ bụrụ otú ahụ, adala mbà. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịkata obi, o nwere ike ịpụta na ị dị umeala n’obi, na ị chọghị ka a hụchatawa gị, nakwa na ị chọghị ime ihe ga-eme ka gị na ndị mmadụ sewe okwu. E nweghịkwanụ onye na-achọ ịkpasu ndị ọzọ iwe, karịchaa mgbe ọ na-achọ imere ha ihe ọma. Nna gị nke eluigwe ma otú obi dị gị. Ọ chọkwara inyere gị aka. (Aịza. 41:13) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’aro ise ga-enyere anyị aka ná nsogbu ndị a nakwa n’otú anyị ga-esi na-enwe ọṅụ n’ozi anyị.

KWE KA OKWU CHINEKE MEE KA Ị DỊ IKE

3. Gịnị nyeere Jeremaya onye amụma aka izi ndị ọzọ ozi Chineke ziri ya?

3 Kemgbe ụwa, ozi si n’aka Chineke na-eme ka ndị ohu ya dị ike mgbe e nyere ha ọrụ siri ike. Dị ka ihe atụ, ka anyị kwuo gbasara Jeremaya onye amụma. Mgbe Jehova nyere ya ọrụ ikwusara ndị mmadụ ozi ya, obi esighị ya ike na ọ ga-arụli ya. Ọ sịrị: “Amaghị m okwu ekwu, n’ihi na abụ m nwata.” (Jere. 1:6) Gịnị nyeere ya aka inwe obi ike ikwusa ozi Chineke? Okwu Chineke gwara ya mere ka ọ dị ike. Jeremaya sịrị: “Ọ dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m. Enweghịzi m ike ịgbachi nkịtị.” (Jere. 20:8, 9) Ọ bụ eziokwu na ndị a gwara Jeremaya ka ọ gaa zie ozi bụ ndị isi ike, ihe a gwara ya ka o kwusaa mere ka o nwee ike o ji rụọ ọrụ ahụ.

4. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-agụ Okwu Chineke, na-atụgharịkwa uche na ya? (Ndị Kọlọsi 1:9, 10)

4 Ihe dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl na-eme ka Ndị Kraịst dị ike. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi, ọ sịrị na ịmụtakwu gbasara uche Jehova ga-enyere ha aka ‘ịna-eme ihe ọ bụla dị mma,’ sikwa otú ahụ “na-eme ihe otú ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 1:9, 10.) Ihe so n’ihe ahụ dị mma bụ ikwusa ozi ọma. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị gụrụ Okwu Chineke ma tụgharịa uche na ya, okwukwe anyị nwere na Jehova na-esikwu ike. Ọ na-emekwa ka anyị ghọtakwuo na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

5. Gịnị ka anyị ga-eme ka ịgụ Baịbụl na ịmụ ya baara anyị ezigbo uru?

5 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke bakwuoro anyị uru, anyị gụwa ya, mụwa ya, ma na-atụgharị uche na ya, anyị ekwesịghị ime ya ọkụ ọkụ. Wepụtara ya ezigbo oge. Ọ bụrụ na ị gụta ebe siiri gị ike nghọta na Baịbụl, ahapụkwala ya gawa n’ọzọ, kama jiri Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ ma ọ bụ akwụkwọ anyị ọzọ mata otú e si kọwaa amaokwu ahụ. Ọ bụrụ na i wepụta ezigbo oge mụọ ihe, ọ ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Okwu Chineke bụ eziokwu. (1 Tesa. 5:21) Ọ bụrụ na obi esie gị ezigbo ike, ọ ga-eme ka obi na-atọkwu gị ụtọ ịgwa ndị ọzọ ihe ị mụtara.

KWADEBE NKE ỌMA MAKA OZI ỌMA

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-akwadebe nke ọma maka ozi ọma?

6 Ọ bụrụ na ị kwadebe nke ọma maka ozi ọma, o nwere ike ime ka ụjọ ghara ịna-atụ gị ma ị gwawa ndị ọzọ okwu. Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịkwadebe tupu ya ezipụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma. (Luk 10:1-11) Ebe ọ bụ na ha mere ihe Jizọs kụziiri ha, o mere ka ha rụọ ọtụtụ ọrụ ọma, obi atọọkwa ha ezigbo ụtọ.​—Luk 10:17.

7. Olee otú anyị nwere ike isi kwadebe maka ozi ọma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Olee otú anyị nwere ike isi kwadebe maka ozi ọma? Anyị kwesịrị ichebara ihe anyị ga-ezi mmadụ echiche ma kwuo ya otú anyị si ekwu okwu nakwa n’okwu nke aka anyị. Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka bụ iche gbasara ụzọ ihe abụọ ma ọ bụ atọ ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere ike ikwu ma anyị chọọ izi ha ozi ọma, anyị akwadebekwa ihe anyị ga-ekwu na nke ọ bụla n’ime ha. Anyị gwawazie ndị mmadụ okwu, anyị kwesịrị ịgbalị ka ahụ́ ruo anyị ala, anyị amụmụọrọ ha ọnụ ọchị, gwakwa ha okwu ka enyi.

Na-akwadebe nke ọma maka ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)


8. Olee otú Ndị Kraịst si dị ka ite ájá Pọl onyeozi ji mee ihe atụ?

8 Pọl onyeozi ji ihe atụ kọwaa ọrụ anyị na-arụ n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma. Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na anyị dị ka ite ájá, anyị nwere akụ̀.” (2 Kọr. 4:7) Gịnị bụ akụ̀ a? Ọ bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na-azọ ndụ. (2 Kọr. 4:1) Gịnịkwanụ bụ ite ájá ahụ? Ọ na-anọchi anya ndị ohu Chineke ndị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’oge Pọl, ndị ahịa na-eji ite ájá ebu ihe ndị dị mkpa, dị ka nri, mmanya, na ego. Otú ahụ ka Jehova nyere anyị ọrụ dị mkpa, nke bụ́ izi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ ga-eme ka anyị nweta ike anyị ga-eji na-ekwusa ya.

KPEE EKPERE KA Ị KATA OBI

9. Olee otú anyị nwere ike isi kwụsị ịtụ ụjọ na ndị mmadụ agaghị ege anyị ntị ma ọ bụ ịtụ ụjọ mmadụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịtụ ụjọ na ndị mmadụ agaghị ege anyị ntị ma ọ bụ tụọ ụjọ mmadụ. Olee otú anyị ga-esi emeri nsogbu a? Ka anyị tụlee ekpere ndịozi Jizọs kpere mgbe e nyere ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Kama ịtụrụ ụjọ kwụsị ikwusa ozi ọma, ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka ‘ịna-ekwu okwu ya n’atụghị egwu.’ Jehova zara ekpere ha ozugbo. (Ọrụ 4:18, 29, 31) Ọ bụrụ na ụjọ mmadụ atụọ anyị mgbe ụfọdụ, anyị kwesịrị ikpe ekpere ka Jehova nyere anyị aka. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka otú i si hụ ndị mmadụ n’anya mee ka ị kwụsị ịtụ ụjọ mmadụ.

Na-ekpe ekpere ka ị kata obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)


10. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ịbụ Ndịàmà ya? (Aịzaya 43:10-12)

10 Jehova họpụtara anyị ka anyị bụrụ Ndịàmà ya. O kwekwara nkwa inyere anyị aka inwe obi ike. (Gụọ Aịzaya 43:10-12.) Ka anyị kwuo banyere naanị ụzọ anọ o si emezu nkwa ahụ. Nke mbụ, Jizọs nọnyeere anyị mgbe ọ bụla anyị na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 28:18-20) Nke abụọ, Jehova họpụtara ndị mmụọ ozi ga na-enyere anyị aka. (Mkpu. 14:6) Nke atọ, Jehova enyela anyị mmụọ nsọ ya ka ọ na-enyere anyị aka icheta ihe ndị anyị mụrụ. (Jọn 14:25, 26) Nke anọ, Jehova nyere anyị ụmụnna anyị, ndị anyị na ha ga na-eso aga ozi ọma. Ebe ọ bụ na Jehova na-enyere anyị aka, ụmụnna anyị hụrụ anyị n’anya ana-akwadokwa anyị, anyị nwere ihe niile kwesịrị ime ka anyị na-enwe obi ike ma na-ekwusa ozi ọma.

NA-AGBANWE IHE ỤFỌDỤ N’OZI GỊ, NA-ELEKWA IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ

11. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwetakwuo ndị mmadụ n’ozi ọma? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ike ọ̀ na-agwụ gị ma ọ bụrụ na ị naghị enweta ọtụtụ ndị n’ụlọ? Ọ ga-adị mma ka ị jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ebe ndị bi n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma nọ ugbu a?’ (Ọrụ 16:13) ‘Hà gara ọrụ, ka hà gara ahịa?’ Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ị ga-aka enweta ndị mmadụ ma ị gaa kwusawa ozi ọma n’okporo ámá. Otu nwanna aha ya bụ Joshua sịrị, “M nwetara ọtụtụ ndị m ziri ozi ọma mgbe m na-aga n’ebe a na-ere ahịa nakwa n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị.” Ya na nwunye ya bụ́ Bridget na-ahụkwa ọtụtụ ndị n’ụlọ ma ọ bụrụ na ha agaa n’ụlọ ndị mmadụ ná mgbede nakwa n’ehihie Sọnde.​—Efe. 5:15, 16.

Na-agbanwe ihe ụfọdụ n’ozi gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12. Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ihe ndị mmadụ kweere ma ọ bụ ihe na-echegbu ha?

12 Ọ bụrụ na ndị mmadụ anaghị enwecha mmasị n’ozi anyị, gbalịa chọpụta ihe ha kweere ma ọ bụ ihe na-echegbu ha. Nwanna Joshua na Bridget nwunye ya na-eji ajụjụ dị n’ihu traktị amalite izi ndị mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha ji traktị isiokwu ya bụ Olee Ihe I Chere na Baịbụl Bụ? ha na-asị mmadụ: “Ụfọdụ ndị kweere na Baịbụl bụ akwụkwọ si n’aka Chineke, ma ụfọdụ ndị ekweghị. Gịnị ka i chere?” Ọtụtụ mgbe, ọ na-eme ka ha na mmadụ kparịta ụka.

13. Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ egeghị anyị ntị, olee otú o si bụrụ na mbọ anyị efughị ọhịa? (Ilu 27:11)

13 Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ ekweghị ege anyị ntị n’ozi ọma, mbọ anyị efughị ọhịa. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị emeela ihe Jehova na Ọkpara ya chọrọ ka anyị mee, ya bụ, izi ndị mmadụ ozi ọma. (Ọrụ 10:42) Ọ bụrụgodị na anyị enwetaghị onye anyị ga-ezi ozi ọma ma ọ bụ na ndị mmadụ ekweghị ege ntị, anyị ka nwere ike ịna-enwe obi ụtọ n’ihi na anyị na-eme ihe na-amasị Nna anyị nke eluigwe.​—Gụọ Ilu 27:11.

14. Gịnị mere anyị nwere ike iji na-enwe obi ụtọ ma onye nkwusa ọzọ nweta onye nwere mmasị?

14 Anyị nwekwara ike ịṅụrị ọṅụ ma ọ bụrụ na onye nkwusa ọzọ enweta onye gere ya ntị n’ozi ọma. E nwere mgbe Ụlọ Nche ji ọrụ ikwusa ozi ọma tụnyere ịchọ nwatakịrị furu efu. Ọtụtụ ndị na-eso gaa ebe dị iche iche ịchọ ya. Ọ bụrụ na a chọta ya, mmadụ niile na-enwe aṅụrị, ọ bụghị naanị onye ahụ chọtara ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ozi ọma anyị na-ekwusa. Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ na-enye aka eme ka mmadụ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs. Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nye aka ka mmadụ niile nọ n’ebe anyị na-ekwusa ozi ọma nụ ozi ọma. Anyị niile na-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na otu onye ọhụrụ abịawa ọmụmụ ihe.

LEKWASỊ ANYA N’OTÚ I SI HỤ JEHOVA NA NDỊ AGBATA OBI GỊ N’ANYA

15. Olee otú ime ihe e kwuru na Matiu 22:37-39 nwere ike isi nyere anyị aka ịna-enwekwu obi ụtọ n’ozi ọma? (Kọwaakwa foto .)

15 Anyị ga-eme ka ozi ọma na-atọkwu anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’otú anyị si hụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya. (Gụọ Matiu 22:37-39.) Chegodị ụdị obi ụtọ Jehova na-enwe ma ọ hụ ka anyị na-arụ ọrụ a nakwa ụdị obi ụtọ ndị mmadụ ga-enwe ma ha mụwa Baịbụl. Chetakwa na ndị gere ntị n’ozi ọma ma kpebie ife Jehova nwere ike inweta ndụ ebighị ebi.​—Jọn 6:40; 1 Tim. 4:16.

Ilekwasị anya n’otú anyị si hụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya ga-eme ka anyị na-enwekwu ọṅụ n’ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka ikwusa ozi ọma na-atọ anyị ụtọ mgbe anyị na-agaghị apụli èzí? Nye ihe atụ.

16 È nweela ihe mere ka ị ghara ịna-apụ èzí? Ọ bụrụ na e nwere, lekwasị anya n’ihe i nwere ike ime iji gosi na ị hụrụ Jehova na ndị agbata obi gị n’anya. N’oge ọrịa koronavaịrọs, Nwanna Samuel na Dania nwunye ya anaghị apụ n’ụlọ ha. N’oge niile ahụ ihe siri ezigbo ike, ha ji ekwentị ha na-ekwusa ozi ọma. Ha na-ede akwụkwọ ozi, sikwa na Zoom na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Samuel ziri ndị ọ hụrụ n’ụlọ ọgwụ ebe a na-agwọ ya ọrịa kansa ozi ọma. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị, ike agwụkwa anyị. O nwekwara ike isiri anyị ike ime ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịna-enwe ọṅụ n’ozi Jehova.” N’oge ahụ, Dania dara ada, nke mere ka ọ ghara ịpụ èzí ruo ọnwa atọ. O jikwa ígwè ndị ngwọrọ na-agagharị ruo ọnwa isii. Ọ sịrị: “M gbalịrị ime ihe niile m ga-emeli. M ziri otu nọọsụ bịara ileta m ozi ọma. Mụ na ndị na-ebute ihe n’ebe ahụ na-ekwurịta okwu. Mụ na otu onye na-anọchite anya ụlọ ọrụ na-ere ọgwụ na ihe ndị ọzọ e ji agwọ ọrịa sikwa n’ekwentị kwuo okwu.” Otú ihe si dịrị Nwanna Samuel na nwunye ya mere ka ha ghara inwe ike ime ọtụtụ ihe ha na-emebu, ma ha mere ihe ndị ha ga-emeli, obi atọọkwa ha ụtọ maka ya.

17. Gịnị ka anyị ga-eme ka aro ndị a tụrụ n’isiokwu a baara anyị ezigbo uru?

17 Ihe ndị a tụrụ aro ha n’isiokwu a na-akacha aba uru ma e mee ha niile. Aro nke ọ bụla dị ka ihe so ná ngwá nri a chọrọ iji esi nri. Ọ bụrụ na e jiri ngwá nri ahụ niile sie nri, nri ahụ ga-abụ e rie, a mịchaa aka. Ọ bụrụ na anyị emee ihe niile a tụrụ n’aro ebe a, ọ ga-eme ka anyị jikere nke ọma maka ihe ndị nwere ike ime ka obi daa anyị mbà. Anyị ga-enwekwu obi ụtọ n’ozi anyị.

OLEE OTÚ IME IHE NDỊ A GA-ESI MEE KA Ị NA-ENWEKWU ỌṄỤ N’OZI GỊ?

  • Iwepụta oge kwadebe nke ọma

  • Ikpe ekpere ka ị kata obi

  • Ilekwasị anya n’otú i si hụ Jehova na ndị agbata obi gị n’anya

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’