ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 15
ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya
Tụkwasịkwuo Nzukọ Jehova Obi
“Na-echetanụ ndị na-eduzi unu, bụ́ ndị gwara unu okwu Chineke.”—HIB. 13:7.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịtụkwasịkwu nzukọ Jehova obi ma na-akwanyekwuru ya ùgwù.
1. Olee otú e si hazie ndị Jehova n’oge ndịozi Jizọs?
MGBE ọ bụla Jehova nyere ndị ya ọrụ, ọ na-atụ anya ka ha rụọ ya n’ụzọ a haziri ahazi. (1 Kọr. 14:33) Dị ka ihe atụ, ọ bụ uche Chineke ka e kwusaa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa. (Mat. 24:14) Jehova mere Jizọs onyeisi ọrụ ahụ. Jizọs na-ahụkwa na a na-arụ ya n’ụzọ a haziri ahazi. N’oge ndịozi, mgbe e hiwere ọgbakọ n’ọtụtụ ebe, a họpụtara ndị okenye ka ha na-enye ọgbakọ ndị ahụ ntụziaka, na-eduzikwa ha. (Ọrụ 14:23) Na Jeruselem, e nwere ndị okenye na ndịozi na-eme mkpebi ndị a chọrọ ka ọgbakọ niile rube isi na ha. (Ọrụ 15:2; 16:4) Mgbe ụmụnna rubere isi ná ntụziaka ahụ e nyere ha, ‘okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche siri ike, ha ana-ehikwu nne.’—Ọrụ 16:5.
2. Kemgbe afọ 1919, olee otú Jehova si na-eduzi ndị ya ma jiri Okwu ya na-enyeju ha afọ?
2 Jehova ka na-ahazikwa ndị ya taa. Kemgbe afọ 1919, Jizọs ji ndị e tere mmanụ ole na ole na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma, na-enyekwa ndị na-eso ụzọ ya nri n’oge kwesịrị ekwesị. a (Luk 12:42) O doro anya na Jehova na-agọzi ọrụ ha.—Aịza. 60:22; 65:13, 14.
3-4. (a) Mee ihe atụ uru anyị na-erite n’otú e si hazie anyị. (b) Gịnị ka anyị ga-ekwu banyere ya n’isiokwu a?
3 Ọ bụrụ na a hazighị anyị ahazi, anyị agaghị arụli ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị. (Mat. 28:19, 20) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na a naghị ekenye ọgbakọ ebe ha ga na-ekwusa ozi ọma. Onye ọ bụla nwere ike ikwusa ozi ọma ebe ọ bụla ọ chọrọ. Ihe a nwere ike ime ka a na-arụgbu ebe ụfọdụ arụgbu, e nweekwa ebe ndị a na-anaghị arụ chaa chaa. Ì nwere ike icheta uru ndị ọzọ anyị na-erite n’ihi na a haziri anyị ahazi?
4 Otú ahụ Jizọs haziri ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ nọ n’ụwa ka ọ na-ahazikwa ndị Chineke taa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Jizọs mere nakwa n’otú nzukọ Jehova si eme ka ya. Anyị ga-ekwukwa otú anyị ga-esi egosi na anyị tụkwasịrị nzukọ Jehova obi.
NZUKỌ JEHOVA NA-EME KA JIZỌS
5. Olee otú anyị si eme ihe Jizọs mere? (Jọn 8:28)
5 Jizọs si n’aka Nna ya nke eluigwe mụta ihe ọ ga-eme na ihe ọ ga-ekwu. Ọgbakọ Jehova na-eme ka Jizọs. Ọ na-esi n’Okwu Chineke akụziri anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ, na-agwakwa anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. (Gụọ Jọn 8:28; 2 Tim. 3:16, 17) Ọ na-agwakwa anyị mgbe niile ka anyị na-agụ Okwu Chineke ma na-eme ihe anyị mụtara. Olee uru ime ihe a na-abara anyị?
6. Olee otu ụzọ dị mkpa anyị si erite uru n’ịmụ Baịbụl?
6 Anyị jiri akwụkwọ nzukọ Jehova bipụtara na-amụ Baịbụl, ọ na-abara anyị ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, ọ na-enyere anyị aka ịchọpụta ma ntụziaka nzukọ Jehova na-enye anyị ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru. Anyị chọpụta na ntụziaka e nyere anyị si na Baịbụl, ọ na-eme ka anyị tụkwasịkwuo nzukọ Jehova obi.—Rom 12:2.
7. Gịnị bụ ozi Jizọs kwusara, oleekwa otú nzukọ Jehova si eme ka ya?
7 Jizọs kwusara “ozi ọma Alaeze Chineke.” (Luk 4:43, 44) Ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa gbasara Alaeze ahụ. (Luk 9:1, 2; 10:8, 9) Taa, ndị niile nọ n’ọgbakọ Jehova na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’agbanyeghị ebe ha bi ma ọ bụ ọrụ ndị ha na-arụ ná nzukọ Jehova.
8. Olee ihe ọma Chineke meere anyị?
8 Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere anyị na anyị so na-akọrọ ndị ọzọ eziokwu banyere Alaeze Chineke. Ọ bụghị mmadụ niile nọ n’ụwa ka e meere ihe ọma a. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kweghị ka ndị mmụọ ọjọọ gbaa àmà banyere ya. (Luk 4:41) Taa, tupu mmadụ esoro ndị Jehova na-ekwusa ozi ọma, ọ ga-ebugodị ụzọ ruo eruo. Otú anyị si egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma Chineke meere anyị ịna-ekwusa ozi ọma bụ iso na-ekwusa ya n’ebe ọ bụla nakwa mgbe ọ bụla anyị nwere ike ime ya. Dị ka Jizọs, ihe anyị bu n’obi bụ ịkụ mkpụrụ eziokwu Alaeze n’obi ndị mmadụ ma na-agba ya mmiri.—Mat. 13:3, 23; 1 Kọr. 3:6.
9. Olee otú nzukọ Jehova si eme ka a mara aha Chineke?
9 Jizọs mere ka a mara aha Chineke. N’ekpere Jizọs kpere, ọ gwara Nna ya nke eluigwe, sị: “Emeela m ka ha mara aha gị.” (Jọn 17:26) Nzukọ Jehova na-eme ihe a Jizọs mere. Otú ha si eme ya bụ ịna-eme ike ha niile inyere ndị mmadụ aka ịmata aha Chineke. Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ so n’ihe ndị nzukọ Jehova ji na-eme ya. E dere aha Chineke na Baịbụl a n’ebe niile ọ dịbu n’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl. Baịbụl a dị ugbu a n’ihe karịrị asụsụ narị abụọ na iri asaa (270), ma ndị nke bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik ma ndị nke bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik. N’Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara—Nke A4 na A5 na Baịbụl a, ị ga-ahụ ihe ndị a kọwara gbasara ide aha Chineke n’ebe ndị ha dịbu na Baịbụl. Isiokwu bụ́ “Aha ahụ ” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2008 kwuru ọtụtụ ihe gosiri na aha Chineke kwesịrị ịdị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ugboro narị abụọ na iri atọ na asaa (237). Bụ́ Jehova Ò Kwesịrị Ịdị n’Agba Ọhụrụ?
10. Gịnị ka ị mụtara n’ihe otu nwaanyị bi na Mianmaa kwuru?
10 Dị ka Jizọs, anyị chọrọ inyere ọtụtụ mmadụ aka ịmata aha Chineke. E nwere otu nwaanyị dị afọ iri isii na asaa bi na Mianmaa. Mgbe ọ matara na Chineke nwere aha, o bere ákwá ma sị: “Nke a bụ nke mbụ ná ndụ m niile m na-anụ na aha Chineke bụ Jehova. . . . Ị kụzierela m ihe kacha mkpa m mụtatụrụla.” Dị ka akụkọ a na-egosi, ọ bụrụ na mmadụ amata aha Chineke, o nwere ike ịgbanwe ndụ ya.
NA-EGOSI MGBE NIILE NA Ị TỤKWASỊRỊ NZUKỌ JEHOVA OBI
11. Olee otú ndị okenye ga-esi gosi na ha tụkwasịrị nzukọ Jehova obi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
11 Olee otu ụzọ ndị okenye nwere ike isi gosi na ha tụkwasịrị nzukọ Jehova obi? Ọ bụrụ na nzukọ Jehova enye ndị okenye ntụziaka, ha kwesịrị ịgụ ya nke ọma ma gbalịsie ike ime ya. Dị ka ihe atụ, ha na-enweta ndụmọdụ, ọ bụghị naanị gbasara otú e si eme ihe omume nakwa otú e si ekpe ekpere n’ọgbakọ, kamakwa gbasara otú e si elekọta atụrụ Jizọs. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme ihe niile nzukọ Jehova gwara ha mee, obi ga-esi ụmụnna ike na Jehova hụrụ ha n’anya nakwa na ọ na-elekọta ha.
12. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-erubere ndị Jehova ji eduzi nzukọ ya isi? (Ndị Hibru 13:7, 17) (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji lekwasị anya n’ebe ndị na-eduzi ọgbakọ Jehova na-eme nke ọma?
12 Ọ bụrụ na ndị okenye agwa anyị ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị iji obi anyị niile mee ya. Anyị mee otú ahụ, anyị na-eme ka ọ dịkwuoro ndị na-eduzi ọgbakọ mfe ịrụ ọrụ ha. Baịbụl gwara anyị ka anyị na-erubere ndị na-eduzi anyị isi, na-edokwa onwe anyị n’okpuru ha. (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.) O nwere ike isiri anyị ike mgbe ụfọdụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ụmụnna ndị a ezughị okè. Ma, ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ihe ndị ha na-anaghị emeta kama ilekwasị anya n’ihe ndị ha na-emeta, ọ pụtara na anyị na-enyere ndị iro anyị aka. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghara ịtụkwasị nzukọ Jehova obi, nke bụ́ ihe ndị iro Jehova na-agbalịsi ike ime. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị mata ụgha ndị ahụ ndị iro anyị na-agha ma jụ ha?
EKWELA KA NDỊ ỌZỌ MEE KA Ị KWỤSỊ ỊTỤKWASỊ NZUKỌ JEHOVA OBI
13. Olee otú ndị iro Chineke sirila gbalịa ịkatọ nzukọ Jehova?
13 Ndị iro Chineke na-agbalị ime ka ihe ọma nzukọ Jehova na-eme yie ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, anyị amụtala na Baịbụl na Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na-adị ọcha ma n’ahụ́ ha ma n’omume ha ma n’ofufe ha. O nyere iwu ka a chụọ onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ ma jụ ichegharị n’ọgbakọ. (1 Kọr. 5:11-13; 6:9, 10) Anyị na-erubere iwu a Baịbụl nyere isi. Ma, ndị iro anyị na-agbalị iji ya na-ebo anyị ebubo na anyị ahụghị ndị ọzọ n’anya, na anyị na-ama ndị ọzọ ikpe, nakwa na anyị anaghị anabata onye nwere echiche dị iche.
14. Ònye ka akụkọ ndị na-abụghị eziokwu gbasara nzukọ Jehova na-esi n’aka?
14 Ghọta onye na-alụso nzukọ Jehova ọgụ. Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-eme ka a na-akọ ihe na-abụghị eziokwu banyere nzukọ Jehova. Ọ bụ “nna ụgha.” (Jọn 8:44; Jen. 3:1-5) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụ anya na Setan ga-eji ndị òtù ya na-akọsa ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere nzukọ Jehova. Ọ bụ ihe mere ma n’oge Jizọs ma n’oge ndịozi ya.
15. Gịnị ka ndị isi okpukpe mere Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya?
15 N’oge Jizọs, Setan ji ndị òtù ya na-agha ụgha dị iche iche banyere Ọkpara Chineke bụ́ onye zuru okè ma na-arụ ọrụ ebube. Dị ka ihe atụ, ndị isi okpukpe gwara ndị mmadụ na ọ bụ “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ” nyere Jizọs ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Mak 3:22) Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe, ndị isi okpukpe boro ya ebubo na ọ na-ekwulu Chineke, meekwa ka ìgwè mmadụ kwuo ka e gbuo ya. (Mat. 27:20) Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs mechara kwusawa ozi ọma, ndị iro ha “mere ka ndị mba ọzọ megidewe” ha. (Ọrụ 14:2, 19) Ụlọ Nche December 1, 1998, kwuru banyere Ọrụ Ndịozi 14:2. Ọ sịrị na ndị na-akwado Setan jụrụ ozi ahụ Ndị Kraịst kwusara, na-ekwukwa ihe ndị jọgburu onwe ha banyere ha ka ndị mmadụ kpọọ ha asị ma ghara ige ha ntị.
16. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma anyị nụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu?
16 Ekwensu akwụsịbeghị ịgha ụgha kemgbe oge ndịozi. Ọ ka “na-eduhie ụwa niile.” (Mkpu. 12:9) Ọ bụrụ na ị nụ akụkọ na-adịghị mma banyere nzukọ Jehova ma ọ bụ ụmụnna Jehova ji na-eduzi ọgbakọ ya, cheta otú ndị iro Chineke si meso Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya. Taa, a na-emegide ndị Jehova, na-ekwukwa ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere ha otú ahụ Baịbụl buru n’amụma. (Mat. 5:11, 12) A gaghị ejili akụkọ ndị na-abụghị eziokwu duhie anyị ma ọ bụrụ na anyị aghọta onye na-akwado ha, meekwa ihe anyị kwesịrị ime ozugbo. Gịnị ka anyị kwesịrị ime?
17. Gịnị ka anyị ga-eme ka a ghara iji akụkọ na-abụghị eziokwu duhie anyị? (2 Timoti 1:13) (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Anyị Ga-eme ma Anyị Nụ Akụkọ Ndị Na-abụghị Eziokwu.”)
17 Jụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu. Pọl onyeozi nyere anyị ndụmọdụ doro anya gbasara ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị anụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu. Ọ gwara Timoti ka ọ “gwasie ụfọdụ ndị ike ka ha ghara . . . ịṅa ntị n’akụkọ ụgha,” nakwa ka ha ghara ‘ige akụkọ ụgha na-enweghị isi.’ (1 Tim. 1:3, 4; 4:7) Ọ bụ eziokwu na nwatakịrị na-egbe igbe nwere ike ịhụ ihe ruru unyí n’ala tụtụrụ ya tinye n’ọnụ, ma onye toro eto agaghị eme otú ahụ maka na ọ ghọtara nsogbu ọ ga-akpatara ya. Anyị na-ajụ akụkọ ụgha n’ihi na anyị ghọtara ebe o si. Anyị na-ejidesi “eziokwu” ike.—Gụọ 2 Timoti 1:13.
18. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị nzukọ Jehova obi?
18 Ihe ndị anyị lebarala anya na ha bụ naanị atọ n’ime ọtụtụ ụzọ ndị nzukọ Jehova si na-eme ka Jizọs. Ka ị na-amụ Baịbụl, chọpụta ụzọ ndị ọzọ nzukọ Jehova si na-eso ụzọ Jizọs. Na-enyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka ịtụkwasịkwu nzukọ Jehova obi. Na-egosikwa na ị tụkwasịrị nzukọ Jehova obi. Otú ị ga-esi eme ya bụ iji obi gị niile soro nzukọ Jehova na-aga ije ụkwụ na ụkwụ n’ihi na ọ bụ nzukọ a ka Jehova ji na-emezu uche ya. (Ọma 37:28) Ka anyị na-egosi mgbe niile na obi dị anyị ụtọ na anyị so ná ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-erubere ya isi.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
-
Olee ụzọ dị iche iche ndị Chineke si na-eme ka Jizọs?
-
Olee otú anyị nwere ike isi na-egosi na anyị tụkwasịrị nzukọ Jehova obi?
-
Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị anụ akụkọ ndị na-abụghị eziokwu?
ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị
a Gụọ igbe isiokwu ya bụ ““Ihe Mere n’Afọ 1919” n’akwụkwọ A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe, peeji nke 102 na nke 103.
b NKỌWA FOTO: Mgbe ndị okenye kwurịtachara nhazi e mere maka ikwusa ozi ọma n’ebe ọhaneze na-anọkarị, onye nlekọta ìgwè ana-agwa ndị nkwusa na ndị okenye sịrị ha guzoro n’ebe ha ga-agbakụta ahụ́ ụlọ azụ iji gbaara nsogbu ọsọ.