Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Pọl onyeozi kwuru na Jehova ‘agaghị ekwe ka a nwaa anyị gabiga ihe anyị pụrụ idi.’ (1 Kọr. 10:13) Ọ̀ pụtara na Jehova na-ebu ụzọ elebara ọnwụnwa ndị anyị ga-edili anya, jirizie ya kpebie nke ga-abịara anyị?

Chegodị otú ọ ga-adị ma ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu. Otu nwanna nwa ya nwoke gburu onwe ya jụrụ, sị: ‘Jehova ò bu ụzọ lechaa ihe ga-eme, kpebie na mụ na nwunye m ga-edili ihe a nwa anyị nwoke mere?’ Ànyị kwesịrị iche na Jehova na-esi otú ahụ ahazi ihe ọ bụla na-eme ná ndụ anyị?

Anyị lebakwuo anya n’ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 10:13, anyị ga-aghọta na e nweghị ihe Baịbụl kwuru kwesịrị ime ka anyị chee na Jehova na-ebu ụzọ elebara ọnwụnwa anyị ga-edili anya, jirizie ya kpebie nke ga-abịara anyị. Ka anyị tụlee ihe anọ mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ.

Nke mbụ bụ na Jehova hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Ọ chọrọ ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe ndị anyị na-eme. (Diut. 30:19, 20; Jọsh. 24:15) Anyị kpebie ime ihe dị mma, anyị nwere ike ịtụkwasị Jehova obi ka o duzie anyị. (Ilu 16:9) Ma, anyị kpebie ime ihe na-adịghị mma, anyị ga-eji isi anyị buru ihe anyị metere. (Gal. 6:7) A sị na Jehova na-ahọrọ ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị, ọ̀ bụ na ọ gaghị apụta na ọ hapụghịzi anyị ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?

Nke abụọ bụ na Jehova anaghị eme ka “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya” ghara ịbịara anyị. (Ekli. 9:11) Anyị nwere ike nwee ihe mberede ga-eme ka anyị taa ahụhụ n’ihi na anyị nọ n’ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị. Jizọs kwuru banyere otu ihe mberede mere ka mmadụ iri na asatọ nwụọ mgbe ụlọ elu dagidere ha. O kwuru ihe gosiri na ihe mberede ahụ abụghị uche Chineke. (Luk 13:1-5) Ànyị kwesịrị iche na tupu ọdachi emee, Chineke na-ebu ụzọ kpebie onye ga-anwụ na onye na-agaghị anwụ?

Nke atọ bụ na onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iji obi ya niile na-efe Jehova. Cheta na Setan sịrị na ndị niile na-efe Jehova ejighị obi ha na-efe ya. O kwuru na anyị agaghị erubere Jehova isi ma ọnwụnwa bịara anyị. (Job 1:9-11; 2:4; Mkpu. 12:10) A sị na Jehova na-eme ka ọnwụnwa ụfọdụ ghara ịbịara anyị n’ihi na ọ hụrụ na anyị agaghị edili ha, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka ihe Setan kwuru yie eziokwu, ya bụ na anyị na-efe Chineke n’ihi ihe anyị na-enweta n’aka ya?

Nke anọ bụ na Jehova anaghị achọ ịmata ihe niile ga-eme anyị n’ọdịnihu. Ichewe na Chineke na-ahọrọ ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị na-egosi na ọ ma ihe niile gbasara ọdịnihu anyị. Ma, iche otú ahụ adabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. Chineke nwere ike ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Aịza. 46:10) Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na Jehova na-ahọrọ ihe ndị ọ chọrọ ịma ga-eme n’ọdịnihu. (Jen. 18:20, 21; 22:12) N’ihi ya, ọ naghị eji ikike o nwere ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu egbochi anyị iji aka anyị kpebie ihe anyị ga-eme. Ọ́ bụghị ihe anyị kwesịrị ịtụ anya ka Chineke mee, ebe ọ bụ na ọ na-eme ihe ziri ezi mgbe niile, hapụkwa anyị ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme?—Diut. 32:4; 2 Kọr. 3:17.

Ma, gịnịzi ka anyị kwesịrị ịghọta n’ihe ahụ Pọl kwuru, nke bụ́ na ‘Chineke agaghị ekwe ka a nwaa anyị gabiga ihe anyị pụrụ idi’? Pọl na-akọwa ihe Jehova na-eme mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, ọ bụghị tupu ọnwụnwa abịara anyị. Ihe ahụ o kwuru na-emesi anyị obi ike na Jehova ga-enyere anyị aka ma anyị tụkwasị ya obi n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. (Ọma 55:22) Ka anyị tụlee ihe abụọ mere Pọl ji kwuo otú ahụ.

Nke mbụ bụ na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị bụ ndị “na-abịara ụmụ mmadụ.” N’ihi ya, ọnwụnwa ndị na-abịara anyị abụghị ihe ọhụrụ. Ma, ọnwụnwa ndị ahụ abụghị ndị anyị na-agaghị edili ma ọ bụrụhaala na anyị atụkwasị Chineke obi. (1 Pita 5:8, 9) N’amaokwu ndị bu 1 Ndị Kọrịnt 10:13 ụzọ, Pọl kwuru banyere ọnwụnwa ndị bịaara ndị Izrel n’ala ịkpa. (1 Kọr. 10:6-11) O nweghị nke bụ́ ihe mmadụ na-ahụtụbeghị ma ọ bụ nke ndị Izrel kwesịrị ntụkwasị obi na-agaghị edili. Pọl kwuru ugboro anọ na “ụfọdụ n’ime ha” nupụụrụ Jehova isi. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị Izrel mere ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ n’ihi na ha atụkwasịghị Chineke obi.

Nke abụọ bụ na “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.” Ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke si mesoo ndị ya gosiri na ọ bụ “ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe ihe o nyere n’iwu” ka ọ na-enyere aka. (Diut. 7:9) O gosikwara na Chineke na-emezu nkwa ọ bụla o kwere. (Jọsh. 23:14) Otú o si mezuo ihe ndị o kwuru n’oge gara aga kwesịrị ime ka obi sie ndị hụrụ ya n’anya ma na-erubere ya isi ike na ọ ga-emezu nkwa abụọ a o kwere gbasara ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara ha: Nke mbụ, ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla bịaara ha sie ike nke na ha agaghị edili ya. Nke abụọ, ‘ọ ga-emere ha ụzọ mgbapụ.’

Jehova “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile”

Olee otú Jehova si emere ndị tụkwasịrị ya obi ụzọ mgbapụ mgbe ọnwụnwa bịaara ha? N’eziokwu, ọ bụrụ na ọ bụ uche ya, o nwere ike iwepụrụ ha ọnwụnwa ahụ. Ma, cheta na Pọl kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.” Ma, ọtụtụ mgbe, otú o si emere anyị “ụzọ mgbapụ” bụ inye anyị ihe ga-eme ka anyị nwee ike idi ọnwụnwa bịaara anyị. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Jehova nwere ike isi meere anyị ụzọ mgbapụ:

  • Ọ “na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Kọr. 1:3, 4) Jehova nwere ike iji Okwu ya, mmụọ nsọ ya, na ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ewepụtara anyị mee ka obi ruo anyị ala.—Mat. 24:45; Jọn 14:16; Rom 15:4.

  • O nwere ike iji mmụọ nsọ ya duzie anyị. (Jọn 14:26) Mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, mmụọ nsọ nwere ike nyere anyị aka icheta ihe e kwuru na Baịbụl na akụkọ ndị a kọrọ na ya ga-eme ka anyị mata ihe anyị kwesịrị ime.

  • O nwere ike iji ndị mmụọ ozi ya nyere anyị aka.—Hib. 1:14.

  • O nwere ike iji okwu ụmụnna anyị gwara anyị na ihe ndị ha meere anyị mee ka anyị “dị ike.”—Kọl. 4:11.

N’ihi ya, gịnị ka anyị mụtara n’ihe Pọl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 10:13? Anyị amụtala na Jehova anaghị ahọrọ ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị. Ma mgbe ọnwụnwa bịaara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị tụkwasị Jehova obi anyị niile, ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa ahụ karịa anyị. Ọ ga-emere anyị ụzọ mgbapụ ka anyị nwee ike idi ya. Ihe ndị a na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike.