Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Jehova Bu n’Obi Ga-emezu

Ihe Jehova Bu n’Obi Ga-emezu

“Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo. Akpụwo m ya, m ga-emekwa ya.”AỊZA. 46:11.

ABỤ: 147, 149

1, 2. (a) Gịnị ka Jehova gwara anyị? (b) Olee ihe e kwuru n’Aịzaya 46:10, 11 na 55:11 nke mere ka obi sie anyị ike?

IHE mbụ Baịbụl kwuru bụ: “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jen. 1:1) Ihe a dị mfe nghọta. Ma, ọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe Chineke kere anyị na-aghọtachaghị, dị ka mbara igwe, ìhè, na ihe mere ihe a tụliri elu ji ada n’ala. Ọ bụkwa naanị obere ihe dị n’eluigwe na ụwa ka anyị hụrụla. (Ekli. 3:11) Ma, Jehova gwara anyị ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. O kere ụwa ka ọ bụrụ ebe ụmụ mmadụ o kere n’oyiyi ya ga-ebi. (Jen. 1:26) Ha ga-abụ ụmụ ya, ya abụrụ Nna ha.

2 Dị ka Jenesis isi atọ kwuru, ihe mere n’ogige Iden mere ka ihe Jehova bu n’obi ghara imezu ozugbo. (Jen. 3:1-7) Ma, ọ gaghị eme ka ihe o bu n’obi ghara imezu. O nweghị onye ga-egbochili ya ime ihe ọ chọrọ ime. (Aịza. 46:10, 11; 55:11) N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ihe Jehova bu n’obi kee ụwa ga-emezurịrị mgbe oge ya ruru.

3. (a) Olee eziokwu ndị dị ezigbo mkpa ga-eme ka anyị ghọta ihe Baịbụl kwuru? (b) Gịnị mere anyị ji atụle eziokwu ndị a ugbu a? (ch) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 O doro anya na anyị ma eziokwu Baịbụl kwuru gbasara ihe Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ nakwa ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ iji mezuo ihe Chineke bu n’obi. Ihe ndị a dị ezigbo mkpa. Ha nwere ike iso n’ihe ndị mbụ anyị mụtara mgbe anyị malitere ịmụ Baịbụl. Anyị chọkwara ịna-enyere ndị chọrọ ife Chineke aka ka ha mara eziokwu ndị a Baịbụl na-akụzi. Ka anyị na-amụ isiokwu a n’ọgbakọ, anyị na-agba mbọ ịkpọ ọtụtụ ndị ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Kraịst. (Luk 22:19, 20) Ndị bịaranụ ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ. N’ihi ya, n’ụbọchị ole na ole a fọrọnụ tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs eruo, ọ ga-adị mma ka anyị chee gbasara ajụjụ ndị anyị nwere ike iji mee ka ndị anyị na-amụrụ ihe nakwa ndị ọzọ chọrọ ife Chineke nwee mmasị ịbịa ihe a dị mkpa. Ajụjụ atọ anyị ga-aza bụ: Gịnị ka Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ? Olee ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ? Gịnị mere àjà Jizọs chụrụ ji bụrụ ihe ga-eme ka ihe Chineke bu n’obi mezuo?

GỊNỊ KA CHINEKE BU N’OBI KEE ỤWA NA ỤMỤ MMADỤ?

4. Olee otú ihe ndị Jehova kere si egosi na ọ dị ebube?

4 Jehova, bụ́ Onye kere anyị, dị egwu. Ihe niile o kere dị mma otú ọ chọrọ. (Jen. 1:31; Jere. 10:12) Olee ihe anyị ga-amụta n’otú ihe ndị e kere eke si maa mma, dịkwa n’usoro? Anyị lewe ihe ndị Jehova kere, obi na-adị anyị ụtọ maka otú ha niile si arụ ihe bara uru, ma nke ukwu ma nke nta. È nwere onye ọ na-anaghị eju anya ịhụ otú mkpụrụ ndụ si dị mgbagwoju anya, na ọmarịcha nwa ọhụrụ, nakwa otú anyanwụ si ama mma ma ọ dawa? Ihe ndị a Chineke kere na-eme anyị obi ụtọ n’ihi na o kere anyị ka anyị nwee ike ịna-amata ihe mara mma.—Gụọ Abụ Ọma 19:1; 104:24.

5. Olee otú Jehova si eme ka ihe niile o kere na-arụkọ ọrụ?

5 Ihe ndị e kere eke gosiri na Jehova nyere iwu dị iche iche. O nyere ụmụ mmadụ na ihe ndị ọzọ o kere eke iwu ha ga na-erubere isi ka ihe niile nwee ike ịna-aga siriri werere. (Ọma 19:7-9) N’ihi ya, ihe ọ bụla dị n’eluigwe na n’ụwa nwere ebe ọ na-adị, na-arụkwa ọrụ Chineke chọrọ ka ọ rụọ. Jehova haziri otú ihe ndị o kere eke ga-esi na-arụkọ ọrụ. N’ihi ya, ọ bụ iwu Jehova nyere mere ka ikuku dịrị n’ụwa, kpaara oké osimiri ókè, meekwa ka ihe ndị dị ndụ n’ụwa ghara ịnwụ. Ma ụmụ mmadụ ma ihe ndị ọzọ Chineke kere na-erubere iwu ndị a o nyere isi. O doro anya na otú ihe ndị Chineke kere si aga siriri werere na-egosi na e nwere ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. Anyị gaa ozi ọma, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-agwa ndị mmadụ banyere Onye mere ka ihe ndị a niile na-aga n’usoro?—Mkpu. 4:11.

6, 7. Olee onyinye ụfọdụ Jehova nyere Adam na Iv?

6 Ihe Jehova bu n’obi kee ụmụ mmadụ bụ ka ha biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Jen. 1:28; Ọma 37:29) O nyere Adam na Iv ọtụtụ onyinye bara uru ga-eme ka ndụ na-atọ ha ụtọ. (Gụọ Jems 1:17.) Jehova hapụrụ ha ka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme, ka ha nwee ọgụgụ isi, nwee ike ịhụ ndị ọzọ n’anya, nweekwa ndị enyi. Chineke gwara Adam otú ọ ga-esi na-erubere ya isi. Adam matakwara otú ọ ga-esi na-egbo mkpa ya, na-elekọtakwa ụmụ anụmanụ na ala. (Jen. 2:15-17, 19, 20) Jehova kekwara Adam na Iv ka ha nwee ike ịnụ ụtọ ihe, imetụ ihe aka mara otú ọ dị, ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, na ịnụ ísì. N’ihi ya, ọmarịcha Paradaịs Chineke nyere ha na ihe ọma juru na ya ga na-atọ ha ụtọ. Ọrụ obi ụtọ Adam na Iv ga na-arụ na ihe ndị ha ga na-achọpụta juru eju bara abara.

7 Olee ihe ọzọ Chineke bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ? Jehova kere Adam na Iv ka ha nwee ike ịmụta ụmụ zuru okè. O bu n’obi ka ụmụ ha mụta ụmụ, ruo mgbe ụmụ mmadụ ga-eju n’ụwa. Ọ chọrọ ka Adam na Iv na ndị ọzọ ga-amụta ụmụ hụ ụmụ ha n’anya otú Jehova si hụ Adam na Iv n’anya. Ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, na-erikwa ihe ndị dị na ya.—Ọma 115:16.

OLEE EBE MMIRI SI BAA N’OPI ỤGBỌGỤRỤ?

8. Gịnị ka iwu Chineke nyere Adam na Iv na Jenesis 2:16, 17 mere ka a mata?

8 Ihe ahụ Chineke bu n’obi emezughị ozugbo. Maka gịnị? Jehova nyere Adam na Iv iwu dị mfe, nke ga-eme ka a mata ma hà ga-erubere ya isi n’agbanyeghị na ọ hapụrụ ha ka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Ọ sịrị Adam: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jen. 2:16, 17) O siirighị Adam na Iv ike ịghọta iwu a. Irubere ya isi agaghịkwa eme ka ihe siere ha ike. A sị ka e kwuwe, ha agaghị erichali nri dị iche iche Chineke nyere ha.

9, 10. (a) Olee ebubo Setan boro Jehova? (b) Gịnị ka Adam na Iv kpebiri ime? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ ghọgbuo Iv ka o nupụrụ Nna ya, bụ́ Jehova, isi. (Gụọ Jenesis 3:1-5; Mkpu. 12:9) Setan mere ka o yie ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ na Chineke gwara Adam na Iv ka ha ghara iri ‘mkpụrụ osisi niile dị n’ubi ahụ.’ Ọ dị ka à ga-asị na Setan na-ekwu, sị: ‘Ọ̀ pụtara na unu agaghị emeli ihe unu chọrọ ime?’ Ọ ghara ụgha chara acha, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” Ọ gbalịrị ka Iv kweta na o kwesịghị ige Chineke ntị. Ọ sịrị ya: “Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe.” Setan kwuru na ihe mere Jehova ji sị ha erila mkpụrụ osisi ahụ bụ na ọ chọghị ka ha hụ ụzọ. Setan kwekwara Iv nkwa na-abụghị eziokwu, sị: “Unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.”

10 Adam na Iv ga-ejizi aka ha kpebie ihe ha ga-eme. Hà ga-erubere Jehova isi, ka hà ga-ege agwọ ahụ ntị? Ha kpebiri inupụrụ Chineke isi, si otú ahụ soro Setan nupụrụ Chineke isi. Ihe a ha mere gosiri na ha achọghịzi ka Jehova bụrụ Nna ha ma ọ bụ na-achị ha.—Jen. 3:6-13.

11. Gịnị mere Jehova elegharaghị isi Adam na Iv nupụụrụ ya anya?

11 Isi ahụ Adam na Iv nupụụrụ Jehova mere ka ha bụrụzie ndị na-ezughị okè. O mekwara ka ha na Jehova ghara ịdị ná mma n’ihi na ‘anya ya dị nsọ nke ukwuu nke na ọ dịghị ele ihe ọjọọ.’ N’ihi ya, ọ gaghị ‘elegide nsogbu anya,’ ya bụ, leghara ihe ọjọọ anya. (Hab. 1:13) A sị na o leghaara ihe ọjọọ anya, ihe niile o kere ma n’eluigwe ma n’ụwa agaaraghị enwe olileanya. Nke ka nke bụ na a sị na Chineke emeghị ihe ọ bụla gbasara mmehie ahụ e mere n’ogige Iden, a gaaraghị atụkwasị ya obi. Ma, Jehova anaghị ahapụ iwu ya. Ọ naghị emebi ya. (Ọma 119:142) N’ihi ya, otú ahụ Chineke hapụrụ Adam na Iv ka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme apụtaghị na ha kwesịrị ileghara iwu ya anya. Isi ahụ ha nupụụrụ Jehova mere ka ha nwụọ, laghachi n’ájá e ji kee ha.—Jen. 3:19.

12. Gịnị mere ụmụ Adam?

12 Mgbe Adam na Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, ọ pụtara na ha esoghịzi n’ezinụlọ Chineke n’eluigwe na n’ụwa. Chineke chụpụrụ ha n’ogige Iden. Ha enweghịzi olileanya ịlaghachi ebe ahụ. (Jen. 3:23, 24) Ihe ahụ Jehova mere gosiri na o kpere ikpe ziri ezi, ha ejiri isi ha buru ihe ha metara. (Gụọ Diuterọnọmi 32:4, 5.) Ebe mmadụ na-ezukwaghị okè, o nweghịzi ike iṅomi àgwà Chineke n’emehieghị. Ọ bụghị naanị na Adam tụfuru ihe magburu onwe ya ọ gaara enweta n’ọdịnihu, kama o bufeere ụmụ ya ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. (Rom 5:12) O mere ka ụmụ ya ghara inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na Adam na Iv enweghịzi ike ịmụta nwa zuru okè. E nweghịkwa nwa ha ga-amụtali nwa zuru okè. Kemgbe Setan bụ́ Ekwensu mechara ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi, ọ ka na-eduhie ụmụ mmadụ ruo n’oge anyị a.—Jọn 8:44.

ÀJÀ JIZỌS CHỤRỤ MERE KA ANYỊ NA JEHOVA DỊRỊ NÁ MMA

13. Gịnị ka Jehova chọrọ imere ụmụ mmadụ?

13 Ma, Chineke ka hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. N’agbanyeghị na Adam na Iv nupụụrụ ya isi, ọ chọrọ ka ya na ụmụ mmadụ dịrị ná mma. Ọ chọghị ka onye ọ bụla nwụọ. (2 Pita 3:9) N’ihi ya, ozugbo Adam na Iv nupụchaara ya isi, o mere ndokwa ka ya na ụmụ mmadụ nwee ike ịdịkwa ná mma n’emebighị iwu ya ziri ezi. Olee otú Jehova si mee ya?

14. (a) Gịnị ka Jọn 3:16 kwuru Chineke mere ka ya na ụmụ mmadụ nwee ike ịdịkwa ná mma? (b) Olee ajụjụ anyị na ndị nwere mmasị nwere ike ịtụle?

14 Gụọ Jọn 3:16. Ọtụtụ ndị anyị ga-akpọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs bu amaokwu Baịbụl a n’isi. Ma ajụjụ bụ, Olee otú àjà Jizọs chụrụ ga-esi mee ka ụmụ mmadụ dị ndụ ebighị ebi? Ma òkù ahụ anyị na-akpọ ha ma Ncheta Ọnwụ Jizọs ma nletaghachi anyị ga-agara ndị bịaranụ ga-eme ka anyị nwee ike inyere ndị ji obi ha niile na-achọ ife Chineke aka ịghọta azịza ajụjụ a dị mkpa. Obi nwere ike ịdị ha ụtọ ma ha ghọtawa otú ihe mgbapụta ahụ si gosi na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ma ihe. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịkọwara ha gbasara ihe mgbapụta ahụ?

15. Olee otú Jizọs si dị iche n’Adam?

15 Jehova zitere otu nwoke zuru okè ka ọ bịa gbapụta ụmụ mmadụ. Nwoke ahụ zuru okè kwesịrị irubere Jehova isi, dịkwa njikere iji ndụ ya chụọ àjà ka ọ gbapụta ụmụ mmadụ. (Rom 5:17-19) Jehova si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri, a mụọ ya n’ụwa. (Jọn 1:14) N’ihi ya, Jizọs ghọrọ mmadụ zuru okè otú ahụ Adam zuru. Ma Jizọs emeghị ka Adam. O mere ihe Jehova chọrọ ka onye zuru okè mee. N’agbanyeghị ọnwụnwa tara akpụ bịaara ya, o mehieghị ma ọ bụ daa iwu Chineke.

16. Gịnị mere ihe mgbapụta ahụ ji bụrụ onyinye bara ezigbo uru?

16 Ebe Jizọs bụ nwoke zuru okè, o nwere ike ịnwụ n’ihi ụmụ mmadụ iji zọpụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. Ọ bụ mmadụ zuru okè, onye ji obi ya niile rubere Chineke isi otú ahụ Adam kwesịrị ime. (1 Tim. 2:6) Jizọs chụrụ àjà ga-eme ka “ọtụtụ mmadụ” nweta ndụ ebighị ebi, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụaka. (Mat. 20:28) N’eziokwu, ọ bụ ihe mgbapụta ahụ ga-eme ka ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ mezuo. (2 Kọr. 1:19, 20) Ọ ga-emekwa ka mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.

JEHOVA MERE KA ANYỊ NA YA NWEE IKE ỊDỊKWA NÁ MMA

17. Olee uru anyị ga-erite n’ihe mgbapụta ahụ?

17 Ihe mgbapụta ahụ Jehova nyere anyị furu ya oké ihe. (1 Pita 1:19) Otú o si hụ ụmụ mmadụ n’anya mere ka o kwe ka Ọkpara ọ mụrụ naanị ya nwụọ n’ihi anyị. (1 Jọn 4:9, 10) Jizọs meere anyị ihe nna mbụ anyị bụ́ Adam gaara emere anyị. (1 Kọr. 15:45) Ọ bụghị naanị na ihe ahụ Jizọs mere ga-eme ka anyị dị ndụ, kama ọ ga-emecha mee ka anyị sorokwa n’ezinụlọ Chineke. N’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ, Jehova nwere ike ịnabataghachi ụmụ mmadụ n’ezinụlọ ya n’emebighị iwu ya ziri ezi. Ọ̀ bụ na obi anaghị adị gị ụtọ ma i cheta mgbe a ga-eme ka mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi zuo okè? Ndị niile so n’ezinụlọ Chineke ma n’eluigwe ma n’ụwa ga-abụzi otu. Ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-asị na anyị niile bụ ụmụ Chineke.—Rom 8:21.

18. Olee mgbe Jehova ga-abụ “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ”?

18 Isi ahụ Setan nupụrụ emeghị ka Jehova ghara ịhụ ụmụ mmadụ n’anya, ọ gaghịkwa eme ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè ghara irubere Jehova isi. Jehova ga-esi n’ihe mgbapụta ahụ nyere ụmụ ya niile aka ka ha bụrụ ndị ezi omume na-anaghị emehie emehie. Chegodị otú ndụ ga-adị mgbe onye ọ bụla nke ghọtara “Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya” ga-adị ndụ ebighị ebi. (Jọn 6:40) Jehova ga-eji ezigbo ịhụnanya ya na amamihe ya mee ka ụmụ mmadụ zuo okè otú ahụ o bu n’obi ná mmalite. Jehova, bụ́ Nna anyị, ga-abụzi “ihe niile n’ebe onye ọ bụla nọ.”—1 Kọr. 15:28.

19. (a) Olee ihe anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Ka Anyị Na-achọpụta Ndị Kwesịrị Ekwesị.”) (b) Olee ihe anyị ga-atụle gbasara ihe mgbapụta ahụ n’isiokwu na-esonụ?

19 Obi ụtọ anyị nwere maka ihe mgbapụta ahụ kwesịrị ime ka anyị na-agbalịsi ike ịgwa ndị ọzọ banyere uru ha ga-erite n’onyinye ahụ na-enweghị atụ. Ndị mmadụ kwesịrị ịmata na ihe mgbapụta ahụ bụ otú Jehova si eme ka ụmụ mmadụ nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, e nwere uru ọzọ ihe mgbapụta ahụ bara. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-eleba anya n’otú àjà Jizọs chụrụ si mee ka o doo anya na ihe ahụ Setan kwuru n’ogige Iden bụ okpookpo ụgha.