Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ofufe Chineke Kpọrọkwuo Ihe

Jiri Ofufe Chineke Kpọrọkwuo Ihe

“Nọgidenụ na-eje ije site na mmụọ nsọ.”​—GAL. 5:16.

ABỤ: 22, 75

1, 2. Olee ihe otu nwanna ghọtara banyere onwe ya? Olee ihe o mere maka ya?

E MERE Robert baptizim mgbe ọ na-eto eto, ma o jichaghị ọgbakọ kpọrọ ihe. O kwuru, sị: “E nwetụghị ihe ọjọọ a ga-asị na m mere. Onye lee m anya, ya echee na m ji ọgbakọ kpọrọ ihe n’ihi na m na-agachi ọmụmụ ihe anya, na-asụ ụzọ inyeaka ọnwa ole na ole n’afọ. Ma, ọ na-adị m ka è nwere ihe na-efu ná ndụ m.”

2 Ma, Robert aghọtaghị ihe ọ bụ ruo mgbe ọ lụrụ nwaanyị. Mgbe ha na-ezuru ike, ya na nwunye ya na-ajụ ibe ha ajụjụ Baịbụl zara. Nwunye ya ma Baịbụl nke ọma, ma na-aza ajụjụ ọ bụla di ya jụrụ ya. Ma ọtụtụ mgbe, Robert azataghị ajụjụ ndị nwunye ya na-ajụ ya, ya emee ka ihere na-eme ya. Robert kwuru, sị: “Ọ dị m ka e nweghị ihe m ma. M gwara onwe m, sị, ‘Ọ bụrụ na m ga-akụziri nwunye m Okwu Chineke ka onyeisi ezinụlọ, m ga-eme ihe.’” Robert mekwaranụ ihe. Ọ sịrị: “M mụrụ Baịbụl, mụọ ya, mụọ ya, ma matawa ihe a na-akọ na Baịbụl. M mechara mara Baịbụl, nke ka nke bụ na mụ na Jehova bịara dịkwuo ná mma.”

3. (a) Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe mere Robert? (b) Olee ihe ndị dị mkpa anyị ga-atụle ugbu a?

3 E nwere ihe ndị dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Robert. Anyị nwere ike mara Baịbụl nke ọma, na-agachi ọmụmụ ihe anya, ma ihe ndị a agaghị emecha ka anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Ma ọ bụkwanụ na anyị agbaala mbọ jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, ma mgbe anyị leruru onwe anyị anya, anyị achọpụta na e nwere ebe ndị ọzọ anyị ga-emekwu ihe. (Fil. 3:16) Ka anyị nwee ike ịna-eji ofufe Chineke kpọrọ ihe, anyị ga-aza ajụjụ atọ dị mkpa n’isiokwu a: (1) Gịnị ga-enyere anyị aka ịchọpụta n’eziokwu ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe? (2) Olee otú anyị ga-esi mụta iji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ma nọgide na-eme otú ahụ? (3) Olee otú anyị iji ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe ga-esi enyere anyị aka n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?

OTÚ ANYỊ GA-ESI AMATA MA ÀNYỊ JI OFUFE CHINEKE KPỌRỌ IHE

4. Ole ndị ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 4:23, 24 gbasara?

4 Mgbe anyị malitere ife Chineke, anyị gbanwere ụzọ niile anyị si ebi ndụ. Ma, mgbanwe a akwụsịghị mgbe e mechara anyị baptizim. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘na-eme ka ike nke na-eduzi uche anyị dị ọhụrụ.’ (Efe. 4:23, 24) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị kwesịrị ịnọgide na-agbanwe otú anyị si ebi ndụ. Ọ bụrụgodị na anyị efeela Jehova ọtụtụ afọ, anyị kwesịkwara ime ka adịm ná mma anyị na ya na-esikwu ike.—Fil. 3:12, 13.

5. Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịmata ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

5 Ka anyị nwee ike jiri ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe, anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma. Ma ànyị bụ onye na-eto eto ma ànyị bụ dimkpa, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ chọpụtala na m jirikwuola ofufe Chineke kpọrọ ihe? Àgwà ndị m na-akpa, hà na-egosi na m na-eṅomi Kraịst? Otú m si akpa àgwà n’ọmụmụ ihe, ọ̀ na-egosi na m ji ofufe Chineke kpọrọ ihe? Olee ihe mkparịta ụka m na-egosi banyere ihe ndị m chọrọ ná ndụ? Gịnị ka otú m si amụ ihe, eji ejiji, na otú m si anabata ndụmọdụ e nyere m na-ekwu banyere m? Olee ihe m na-eme ma ọnwụnwa bịara m? M̀ bụ Onye Kraịst tozuru okè?’ (Efe. 4:13) Ichebara ajụjụ ndị a echiche ga-enyere anyị aka ịma ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe.

6. Olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime iji chọpụta ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

6 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike jụọ ndị ọzọ ka anyị nwee ike ịchọpụta ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Pọl onyeozi kwuru na onye anụ ahụ́ na-achị enweghị ike ịghọta na ihe ndị ọ na-eme adịghị Chineke mma. Ma, onye mmụọ nsọ Chineke na-achị na-aghọta otú Chineke si ele ihe anya. Ọ makwa na ihe onye anụ ahụ́ na-achị na-eme adịghị Chineke mma. (1 Kọr. 2:14-16; 3:1-3) Ebe ọ bụ na ndị okenye nwere uche nke Kraịst, ha na-achọpụtakarị ihe ndị na-egosi na mmadụ echewele echiche ka onye anụ ahụ́ na-achị. Ọ bụrụ na ha agwa anyị ya, ànyị na-ekweta ma mee ihe ndị ha gwara anyị? Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị chọrọ iji ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe.—Ekli. 7:5, 9.

IHE Ị GA-EME KA I JIRI OFUFE CHINEKE KPỌRỌKWUO IHE

7. Gịnị mere ịma Baịbụl nke ọma abụghị naanị ya ga-eme ka mmadụ jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe?

7 Cheta na ịma Baịbụl nke ọma abụghị naani ihe ga-eme ka mmadụ jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. Eze Sọlọmọn oge ochie ma Jehova nke ọma. E mechara dee ihe ndị o kwuru na Baịbụl. Ma, o mechara o jighịzi obi ya niile na-efe Chineke. (1 Eze 4:29, 30; 11:4-6) Ma, e wezụga ịma Baịbụl nke ọma, olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime? Anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. (Kọl. 2:6, 7) Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya?

8, 9. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka ime ka okwukwe anyị sikwuo ike? (b) Olee ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị mgbe anyị na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Pọl gwara Ndị Kraịst oge ochie ka ha “jisie ike ruo ntozu okè.” (Hib. 6:1) Ka anyị nwee ike ime ihe a Pọl kwuru, olee ihe anyị ga-eme? Otu ihe dị mkpa anyị ga-eme bụ ịmụ akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Ịmụcha akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmata otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru ná ndụ gị. Ọ bụrụ na ị mụchaala akwụkwọ a, ì nwere ike ịmụ akwụkwọ anyị ndị ọzọ ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike? (Kọl. 1:23) Ị̀ na-echebara ihe ndị ị na-agụ echiche ma na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịmata otú ị ga-esi eme ha eme?

9 Cheta na mgbe anyị na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche, mkpa anyị kwesịrị ịbụ ka anyị jiri obi anyị niile na-eme uche Chineke. (Ọma 40:8; 119:97) Anyị na-amụtakwa otú anyị ga-esi agbara ihe ọ bụla nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike, ọsọ.—Taị. 2:11, 12.

10. Olee ihe ndị na-eto eto ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike?

10 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ì nwere ihe ndị i bu n’obi ime n’ozi Chineke? Ihe otu nwanna na-eje ozi na Betel na-emekarị ma ọ gaa mgbakọ sekit bụ ịga ebe ndị a na-aga ime baptizim nọ jụọ ha ajụjụ, tupu ihe omume amalite. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto. Nwanna ahụ na-ajụ ha ihe ha bu n’obi ime n’ozi Jehova. Ihe ọtụtụ n’ime ha na-aza gosiri na e nwere ihe ha bu n’obi ime. O nwere ike bụrụ ịbanye n’ozi oge niile ma ọ bụ ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze. Ma, ụfọdụ n’ime ha amaghị ihe ha ga-aza. Nke a ọ̀ pụtara na ha enweghị ihe ha bu n’obi ime n’ozi Jehova? Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ so na-eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ naanị na ndị mụrụ m chọrọ ka m na-eme otú ahụ? Mụ na Chineke, ànyị bụ ezigbo enyi, si otú ahụ na-abịaru ya nso?’ Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị niile kwesịrị inwe ihe anyị bu n’obi ime n’ozi Jehova ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị torola eto. Ime otú ahụ ga-enyere anyị niile aka ime ka okwukwe anyị sikwuo ike.—Ekli. 12:1, 13.

11. (a) Ka anyị nwee ike imekwu nke ọma n’ofufe Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ime? (b) Olee onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl anyị nwere ike iṅomi?

11 Anyị chọpụtachaa ihe ndị anyị ga-emekwu nke ọma na ha n’ofufe Chineke, anyị kwesịrị ịmalite ime ha eme. Mmadụ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe dị ezigbo mkpa, n’ihi na ọ bụ ihe gbasara ọnwụ na ndụ. (Rom 8:6-8) Ma, ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè apụtaghị na anyị ga-ezu okè. Mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka imekwu nke ọma. Ma, anyị ka kwesịkwara ịgbasi mbọ ike. Nwanna John Barr, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru ọtụtụ afọ gara aga banyere Luk 13:24, sị: “Ụfọdụ ndị enweghị ike isi n’ọnụ ụzọ dị warara banye n’ihi na ha anaghị agbasi mbọ ike ịbụ Ndị Kraịst tozuru okè.” Anyị kwesịrị ịdị ka Jekọb, bụ́ onye na-ahapụghị mmụọ ozi ya na ya na-agba mgba ka ọ laa ruo mgbe ọ gọziri ya. (Jen. 32:26-28) Ọ bụ eziokwu na ịgụ Baịbụl na-atọ ụtọ, anyị ekwesịghị ịtụwa anya ka ọ tọọ anyị ụtọ otú ahụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị si atọ ma anyị gụwa ya. Anyị kwesịrị ịgbalị chọpụta eziokwu ndị magburu onwe ha ga-enyere anyị aka.

12, 13. (a) Olee ihe ga-enyere anyị aka ime ihe e kwuru ná Ndị Rom 15:5? (b) Olee otú ihe Pita onyeozi mere na ihe o kwuru ga-esi enyere anyị aka? (ch) Gịnị ka i nwere ike ime ka i jiri ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Ị Ga-eme Ka I Jiri Ofufe Chineke Kpọrọkwuo Ihe.”)

12 Ọ bụrụ na anyị agbalịa jiri ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe, mmụọ nsọ ga-enyere anyị aka ịgbanwe otú anyị si eche echiche. Ọ ga-eme ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ mụta iche echiche ka Kraịst. (Rom 15:5) Ọ ga-enyekwara anyị aka iwepụ ihe ọjọọ anyị na-eche, meekwa ka anyị na-akpa àgwà ndị dị Chineke mma. (Gal. 5:16, 22, 23) Ọ bụrụ na anyị achọpụta na obi anyị dịzi n’ịchụ akụnụba ma ọ bụ n’ihe ndị na-agụ anụ ahụ́ agụụ, anyị ekwesịghị ịda mbà. Na-arịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya nke ga-enyere gị aka ka uche gị dịrị n’ihe kwesịrị ekwesị. (Luk 11:13) Cheta Pita onyeozi. Ọ bụghị mgbe niile ka o chere echiche ka Kraịst. (Mat. 16:22, 23; Luk 22:34, 54-62; Gal. 2:11-14) Ma, ọ daghị mbà n’obi. Jehova nyeere ya aka, ya ejiri nwayọọ nwayọọ mụta iche echiche ka Kraịst. Anyị nwekwara ike ime ka ya.

13 Pita mechara kwuo àgwà ndị ga-enyere anyị aka. (Gụọ 2 Pita 1:5-8.) Ọ bụrụ na anyị ‘etinye oké mgbalị’ inwe àgwà ndị dị ka njide onwe onye, ntachi obi, na ịhụnanya ụmụnna, ọ ga-enyere anyị aka ịnọgide na-eji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Kwa ụbọchị, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee àgwà m ga-agbalị inwe taa nke ga-enyere m aka iji ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe?’

IME IHE BAỊBỤL KWURU NÁ NDỤ ANYỊ KWA ỤBỌCHỊ

14. Olee otú iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-esi enyere anyị aka?

14 Ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche ka Kraịst, ọ ga-enyere anyị aka n’otú anyị si ekwu okwu, n’otú anyị si akpa àgwà n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’otú anyị si ekpebi ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime ga-egosi na anyị na-agbalị ime ka Kraịst. Ebe anyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, anyị achọghị ka ihe ọ bụla mebie adịm ná mma anyị na Jehova. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, ịkpa àgwà ka Kraịst ga-enyere anyị aka ịgbara ọnwụnwa ahụ ọsọ. Tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme, anyị kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Olee ihe Baịbụl kwuru nke ga-enyere m aka? Olee ihe Kraịst ga-eme n’ụdị ihe a? Olee ihe ga-atọ Jehova ụtọ?’ Iji na-eche echiche otú a, ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ. N’ihe atụ nke ọ bụla, anyị ga-eleba anya n’ihe Baịbụl kwuru nke ga-enyere anyị aka ime mkpebi dị mma.

15, 16. Nye ihe atụ otú iche echiche ka Kraịst ga-esi enyere anyị aka mgbe anyị na-ahọrọ (a) onye anyị ga-alụ. (b) ndị enyi.

15 Mmadụ ịhọrọ onye ọ ga-alụ. Baịbụl kwuru gbasara ya ná 2 Ndị Kọrịnt 6:14, 15. (Gụọ ya.) Pọl mere ka o doo anya na onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe dị iche n’onye anụ ahụ́ na-achị. Ha na-ele ihe anya iche iche. Olee otú ihe a Baịbụl kwuru ga-esi enyere gị aka ma ị chọwa onye ị ga-alụ?

16 Ịhọrọ ndị enyi. Baịbụl kwuru ihe ga-enyere gị aka ná 1 Ndị Kọrịnt 15:33. (Gụọ ya.) Onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe agaghị achọ ka ya na ndị ga-eme ka okwukwe ya nyụọ ka ọkụ na-akpa. Olee ajụjụ ndị nwere ike inyere gị aka ime ihe a Baịbụl kwuru? Dị ka ihe atụ, olee otú ihe a si gbasa ịkparịta ụka n’Ịntanet? Ma ọ bụ, gịnị ka i kwesịrị ime ma onye ị na-amaghị chọọ ka gị na ya gwuo egwuregwu n’Ịntanet?

Mkpebi ndị m na-eme, hà na-enyere m aka ime ka m jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17-19. Olee otú iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-esi enyere gị aka (a) ịgbara ọrụ ndị na-abaghị uru ọsọ? (b) ikpebi ihe ndị ị ga-eme n’ofufe Chineke? (ch) idozi esemokwu?

17 Ọrụ ndị nwere ike ime ka anyị ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Pọl dọrọ Ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ná Ndị Hibru 6:1. (Gụọ ya.) Gịnị na gịnị bụ ‘ọrụ nwụrụ anwụ’ anyị kwesịrị ịgbara ọsọ? Ha bụ ọrụ ndị na-abaghị uru, bụ́ ndị ga-eme ka okwukwe anyị ghara isi ike. Ihe a Pọl kwuru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị dị ka: ‘Ọrụ a, ò so n’ọrụ nke anụ ahụ́? M̀ kwesịrị itinye aka n’achụmnta ego a m chọrọ ịbanye na ya? Gịnị mere na ekwesịghị m iso ná ndị na-achọ ịgbanwe ihe ndị na-eme n’ụwa?’

Mkpebi ndị m na-eme, hà na-enyere m aka ime ka m na-ekpebi ihe ndị m ga-eme n’ofufe Chineke? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18 Ihe ndị i kpebiri ime n’ofufe Chineke. Ihe Jizọs kwuru n’Ozizi Elu Ugwu mere ka anyị mata otú anyị nwere ike isi kpebie ihe ndị anyị chọrọ ime n’ofufe Chineke. (Mat. 6:33) Onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na-ebu ụzọ achọ Alaeze Chineke. Iburu ihe ndị a n’uche ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị dị ka: ‘M̀ kwesịrị ịga mahadum ma m gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị? M̀ kwesịrị ịrụ ọrụ ụfọdụ e nyere m?’

Mkpebi ndị m na-eme, hà na-enyere m aka ime ka mụ na mmadụ niile “dịrị n’udo”? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19 Esemokwu. Olee otú ihe Pọl gwara ọgbakọ dị na Rom ga-esi enyere anyị aka ma anyị na ndị ọzọ see okwu? (Rom 12:18) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị na-agbalị ka anyị na “mmadụ niile dịrị n’udo.” Anyị na ndị ọzọ see okwu, olee ihe anyị na-eme? Ọ̀ na-esiri anyị ike ikweta ihe onye ọzọ kwuru? Ndị mmadụ hà ma anyị ka “ndị na-eme udo”?—Jems 3:18.

20. Gịnị mere i ji chọọ ịna-eji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

20 Ihe atụ ndị a na-egosi na ime ihe Baịbụl kwuru nwere ike nyere anyị aka ime mkpebi ndị na-egosi na mmụọ nsọ na-eduzi anyị. Ọ bụrụ na anyị ejiri ofufe Chineke kpọrọ ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ, ndụ anyị ga-enwekwa isi. Nwanna Robert anyị kwuburu okwu ya ná mmalite isiokwu a kwuru, sị: “Mgbe mụ na Jehova malitere ịdị ná mma, m bịara ghọọ ezigbo di na ezigbo nna. Obi bịara tọwa m ezigbo ụtọ.” Ọ bụrụ na anyị ejiri ofufe Chineke na-akpọrọ ihe, anyị ga-erite ọtụtụ uru. Ebe anyị bụ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ ugbu a, nwetakwa “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” n’ọdịnihu.—1 Tim. 6:19.