Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ṅomie Okwukwe Noa, Daniel, Job, nakwa Otú Ha Si Rube Isi

Ṅomie Okwukwe Noa, Daniel, Job, nakwa Otú Ha Si Rube Isi

“Noa, Daniel na Job, . . . ga-anapụta mkpụrụ obi nke ha n’ihi ezi omume ha..”​—EZIK. 14:14.

ABỤ: 89, 119

1, 2. (a) Gịnị mere ịtụle gbasara Noa, Daniel, na Job ga-eji agba anyị ume? (b) Olee ihe ndị mere mgbe Ezikiel dere Ezikiel 14:14?

Ò NWERE nsogbu gị na ya na-alụ, dị ka ọrịa, ụkọ ego, ma ọ bụ mkpagbu? Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ịna-enwe obi ụtọ n’ozi ị na-ejere Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, nwee obi ike. Ịmụ banyere Noa, Daniel, na Job ga-agba gị ume. Ha ezughị okè. Ọtụtụ nsogbu ndị na-abịara anyị bịakwaara ha, ma ndị nke gaara ata isi ha. Ma, ha akwụsịghị irubere Chineke isi. Chineke lekwara ha anya ka ndị anyị kwesịrị iṅomi okwukwe ha, nakwa otú ha si rube isi.—Gụọ Ezikiel 14:12-14.

2 Ọ bụ mgbe Ezikiel nọ na Babịlọn n’afọ 612 Tupu Oge Ndị Kraịst, ka o dere amaokwu e si nweta isiokwu a. * (Ezik. 1:1; 8:1) O dere ya afọ ole na ole tupu e bibie Jeruselem n’afọ 607 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka a zọpụtara n’ihi na ha ṅomiri Noa, Daniel, na Job. (Ezik. 9:1-5) Ụfọdụ n’ime ha bụ Jeremaya, Barọk, Ibed-melek, na ndị Rikab.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọ bụ naanị ndị Jehova weere ka ndị ezi omume, ya bụ, ndị mere ka Noa, Daniel, na Job, ka a ga-azọpụta mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a. (Mkpu. 7:9, 14) N’ihi ya, ka anyị tụlee ihe mere Jehova ji were ha ka ndị ezi omume anyị kwesịrị iṅomi. Ka anyị na-atụle gbasara onye nke ọ bụla, anyị ga-elekwasị anya (1) ná nsogbu ndị bịaara ya na (2) otú anyị nwere ike isi ṅomie okwukwe ya na otú o si rube isi.

NOA NWERE OKWUKWE MA RUBE ISI IHE KARỊRỊ NARỊ AFỌ ITOOLU

4, 5. Olee nsogbu ndị bịaara Noa? Olee ihe dị ịtụnanya gbasara Noa?

4 Nsogbu ndị bịaara Noa. N’oge nna nna ochie Noa bụ́ Inọk dịrị ndụ, ndị mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ hie nne. Ha na-ekwudị ihe “na-awụ akpata oyi” gbasara Jehova. (Jud 14, 15) Ime ihe ike nọ na-arị ibe ya elu. Ma, mgbe o ruru n’oge Noa, ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike.’ Ụfọdụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa, dịrị n’ụdị mmadụ ma lụrụ ụmụ nwaanyị. Ha mụtara ụmụ obi fere azụ ma na-eme ihe ike. (Jen. 6:2-4, 11, 12) Ma, Noa dị iche. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe Noa masịrị Jehova. . . . Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ n’etiti ndị ya na ha dịkọrọ ndụ. Noa so ezi Chineke jee ije.”—Jen. 6:8, 9.

5 Chegodị ihe ihe a Baịbụl kwuru na-akụziri anyị banyere nwoke ezi omume a. Nke mbụ, Noa so Chineke jee ije n’ụwa ọjọọ ahụ tupu iju mmiri. Ọ bụghị naanị afọ iri asaa ma ọ bụ afọ iri asatọ ka o biri n’ụwa ahụ, kama, o biri ihe fọrọ obere ka o ruo narị afọ isii. (Jen. 7:11) Nke abụọ bụ na Noa enweghị ọgbakọ ga-enyere ya aka ma ọ bụ gbaa ya ume otú anyị nwere n’oge a. Ọ ga-abụkwa na o nweghị ụmụnne ya nyeere ya aka. *

6. Olee otú Noa si gosi na o nwere ezigbo obi ike?

6 Noa echeghị na ebe ọ bụ na ya bụ onye ezi omume na okwu agwụla. O jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị ọzọ banyere okwukwe o nwere n’ebe Jehova nọ. Baịbụl kpọrọ ya “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Pọl onyeozi kwuru, sị: “O sitekwara n’okwukwe a maa ụwa ikpe.” (Hib. 11:7) O doro anya na ndị mmadụ mere ya akaje, ikekwe yie ya egwu imesi ya ike. Ma, ‘ọ tụghị mmadụ egwu.’ (Ilu 29:25) Kama, Jehova mere ka obi sie ya ike otú o si eme ndị ohu ya.

7. Mgbe Noa na-ewu ụgbọ ahụ, olee nsogbu ndị bịaara ya?

7 Mgbe Noa fere Chineke ruo ihe karịrị narị afọ ise, Jehova gwara ya ka o wuo ụgbọ a ga-eji azọpụta ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ. (Jen. 5:32; 6:14) Ọ ga-abụ na iwu nnukwu ụgbọ ahụ adịghịrị Noa mfe. Ọ ma na ọ ga-emekwu ka ndị mmadụ na-akwa ya emo ma na-enyekwu ya nsogbu. Ma, o nwere okwukwe na Jehova ma rubere ya isi. Baịbụl sịrị na “o mere nnọọ otú ahụ.”—Jen. 6:22.

8. Olee otú Noa si tụkwasị Jehova obi na ọ ga-egboro ya na ezinụlọ ya mkpa ha?

8 Nsogbu ọzọ bịaara Noa bụ otú ọ ga-esi akpa afọ ezinụlọ ya. Tupu Iju Mmiri ahụ, ndị mmadụ na-arụgbu onwe ha n’ọrụ ịkọ nri. Noa mekwara otú ahụ. (Jen. 5:28, 29) N’agbanyeghị ya, o kweghị ka ịkpa afọ ezinụlọ ya na-echu ya ụra. Ijere Chineke ozi bụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Ma, mgbe ọ na-ewu ụgbọ ahụ, bụ́ nke were ya afọ iri anọ ma ọ bụ iri ise, o lekwasịrị Jehova anya. Ọ kwụsịghị ime otú ahụ ruo narị afọ atọ na iri ise ọzọ mgbe Iju Mmiri ahụ gachara. (Jen. 9:28) Noa nwere okwukwe ma rube isi. Anyị kwesịkwara iṅomi ya.

9, 10. (a) Olee otú anyị ga-esi ṅomie okwukwe Noa ma na-erube isi ka ya? (b) Ọ bụrụ na i kpebisie ike irubere Chineke isi, olee ihe obi kwesịrị isi gị ike na ya?

9 Otú anyị ga-esi eṅomi okwukwe Noa na otú o si rube isi. Otú anyị ga-esi eme ya bụ irubere Chineke isi, ịghara ịbụ nke ụwa Setan, nakwa ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33; Jọn 15:19) Ọ bụ n’ihi ihe ndị a mere ụwa ejighị anya ahụ anyị. Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na anyị kpebisiri ike ịna-erubere Chineke isi ma a bịa n’ihe gbasara inwe mmekọahụ na alụmdi na nwunye, ndị mmadụ nwere ike iji ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emebi aha anyị. (Gụọ Malakaị 3:17, 18.) Dị ka Noa, anyị na-atụ egwu Jehova, ọ bụghị ndị mmadụ. Anyị ma na ọ bụ naanị ya ga-enye anyị ndụ ebighị ebi.—Luk 12:4, 5.

10 Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ ga na-eme ihe ziri ezi n’anya Chineke ma mgbe ndị ọzọ na-akwa m emo ma ọ bụ na-akatọ m? M̀ tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-egboro m mkpa ezinụlọ m, ma mgbe ịkpa afọ ezinụlọ na-esi ezigbo ike? Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi ma na-erubere ya isi ka Noa, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga na-elekọta gị.—Fil. 4:6, 7.

DANIEL NWERE OKWUKWE MA RUBE ISI N’AGBANYEGHỊ NA O BI N’OBODO ỌJỌỌ

11. Olee nnukwu nsogbu bịaara Daniel na ndị enyi ya atọ mgbe ha nọ na Babịlọn? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Nsogbu ndị bịaara Daniel. A dọọrọ Daniel n’agha gaa Babịlọn, bụ́ obodo ọtụtụ ndị bi na ya na-ekpere arụsị, na-emekwa mgbaasị. Ndị Babịlọn na-eleda ndị Juu anya, na-akwakwa ha na Chineke ha bụ́ Jehova, emo. (Ọma 137:1, 3) Ọ ga-abụ na nke a wutere Daniel na ndị Juu ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya. Anya ndị mmadụ dị n’ahụ́ Daniel na ndị enyi ya atọ aha ha bụ Hananaya, Mishel, na Azaraya n’ihi na a chọrọ ka a zụọ ha ijere eze Babịlọn ozi. A chọkwara ka ha na-eri nri eze na-eri. Ụfọdụ n’ime nri ndị ahụ bụ nri Jehova gwara ndị Izrel erila. Ma, Daniel achọghị ‘iji nri pụrụ iche nke eze na mmanya ya merụọ onwe ya.’—Dan. 1:5-8, 14-17.

12. (a) Olee àgwà ọma Daniel nwere? (b) Olee otú Jehova si lee Daniel anya?

12 E nwekwara nsogbu ọzọ bịaara Daniel. O yiri ihe na-ataghị akpụ ná mmalite. Daniel nwere amamihe pụrụ iche, ọ bụ ya mere eze ji bulie ya n’ọkwá. (Dan. 1:19, 20) Ma, kama ịdị mpako ma ọ bụ bụrụ eze onye agwala m, ọ dị umeala n’obi. Ọ na-ekwukwa mgbe niile na ọ bụ Jehova nyere ya amamihe. (Dan. 2:30) Jehova gụnyere Daniel, Noa, na Job ná ndị ezi omume anyị kwesịrị iṅomi. N’oge ahụ, Noa na Job efechaala Jehova nwụọ, ma Daniel ka bụ nwa okorobịa. Obi Jehova tụkwasịrị Daniel ò furu ọhịa? Mbanụ. Daniel akwụsịghị inwe okwukwe na Jehova na irubere ya isi ruo ọnwụ. Ọ fọrọ obere ka o ruo otu narị afọ mgbe mmụọ ozi Chineke gwara ya, sị: “Daniel, nwoke a hụrụ n’anya nke ukwuu.”—Dan. 10:11.

13. Olee otu ihe mere Jehova ji bulie Daniel n’ọkwá?

13 Jehova mere ka e bulie Daniel n’ọkwá mgbe ndị Babịlọn na-achị nakwa mgbe ndị Midia na Peshia na-achị. (Dan. 1:21; 6:1, 2) Ọ ga-abụ na ihe mere Jehova ji mee otú ahụ bụ ka Daniel nwee ike inyere ndị ya aka otú ahụ Josef mere n’Ijipt, nakwa otú ahụ Esta na Mọdekaị mere na Peshia. * (Dan. 2:48) Chegodị otú obi dị Ezikiel na ndị Juu ndị ọzọ a dọọrọ n’agha gaa Babịlọn ịhụ otú Jehova si jiri Daniel nyere ha aka.

Jehova hụrụ ndị nọgidere na-efe ya n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 na nke 15)

14, 15. (a) Olee otú ọnọdụ anyị si yie nke Daniel? (b) Olee ihe ndị nne na nna ga-amụta n’aka ndị mụrụ Daniel?

14 Otú anyị ga-esi ṅomie okwukwe Daniel nakwa otú o si rube isi. Omume rụrụ arụ na okpukpe ụgha juru ebe niile taa. Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa emegharịala ụmụ mmadụ anya. Baịbụl kpọrọ ya “ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (Mkpu. 18:2) Ma anyị dị ka ndị mbịarambịa. N’ihi ya, ndị mmadụ na-ahụ na anyị dị iche, ha nwekwara ike ịna-akwa anyị emo. (Mak 13:13) Ka anyị gbalịa bịarukwuo Jehova, bụ́ Chineke anyị nso otú ahụ Daniel mere. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, tụkwasị Jehova obi, ma na-erubere ya isi, Jehova ga-ahụkwa anyị n’anya.—Hag. 2:7.

15 Ndị nne na nna nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị mụrụ Daniel. Olee otú ha ga-esi eme ya? N’agbanyeghị ihe ọjọọ juru na Judia mgbe Daniel bụ nwata, o toro ma hụ Jehova n’anya. O meghị ná ndaba. Ọ ga-abụrịrị na ndị mụrụ ya kụziiri ya banyere Jehova. (Ilu 22:6) Aha Daniel nke pụtara “Chineke Bụ Onyeikpe M,” na-egosi na ndị mụrụ ya hụrụ Jehova n’anya. (Dan. 1:6) N’ihi ya, ndị nne na nna, na-enwerenụ ụmụ unu ndidi mgbe unu na-akụziri ha banyere Jehova. (Efe. 6:4) Na-ekpere ha ekpere, unu na ha na-ekpekọkwa ekpere ọnụ. Ọ bụrụ na unu agbalịa kụziere ha eziokwu Baịbụl, Jehova ga-agọzi unu nke ukwuu.—Ọma 37:5.

JOB NWERE OKWUKWE MA RUBE ISI MA MGBE Ọ BỤ ỌGARANYA MA MGBE Ọ BỤ OGBENYE

16, 17. Olee ihe ndị gbanwere ná ndụ Job?

16 Nsogbu ndị bịaara Job. E nwere ọtụtụ ihe gbanwere ná ndụ Job. Tupu nsogbu abịara ya, ọ bụ “onye kasị baa ọgaranya ná ndị Ọwụwa Anyanwụ niile.” (Job 1:3) Ọ bụ aka ji akụ̀, onye a ma ama, na onye a na-akwanyere ezigbo ùgwù. (Job 29:7-16) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, o cheghị na ọ ka ndị ọzọ mma, ma ọ bụkwanụ chee na o nweghị uru Chineke baara ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova kpọrọ ya, “ohu m.” O kwukwara na ọ bụ ‘onye ezi omume, na ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ.’—Job 1:8.

17 Ihe gbanwere ná ndụ Job n’otu ntabi anya. Ihe niile o nwere lara n’iyi, ya adaa mbà n’obi nke na ọ chọrọ ịnwụ. Anyị ma na onye kpatara nsogbu ya bụ onye nkwutọ, bụ́ Setan. O kwuru na Job na-efe Jehova naanị n’ihi ihe Jehova na-emere ya. (Gụọ Job 1:9, 10.) Jehova agbachighị nkịtị n’ebubo a. Kama, o nyere Job ohere ka o gosi na ọ tụkwasịrị ya obi, nakwa na ọ na-efe ya n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya.

18. (a) Olee ihe masịrị gị n’otú Job si fee Chineke? (b) Gịnị ka anyị na-amụta banyere Jehova n’otú o si mesoo Job ihe?

18 Setan mere ka nsogbu zuo Job ahụ́. Ọ kpachaara anya mee ya ka obi gbawaa Job, nakwa ka o chewe na ọ bụ Chineke kpataara ya nsogbu ndị ahụ. (Job 1:13-21) Mmadụ atọ sịrị na ha bịara ịkasi ya obi ji okwu ọjọọ saa ya ahụ́. Ha gwara ya na Jehova na-ata ya ahụhụ maka ihe ọjọọ ndị o mere. (Job 2:11; 22:1, 5-10) Ma, Job akwụsịghị ife Chineke. Ọ bụ eziokwu na o nwere mgbe o kwuru okwu n’echeghị echiche, ma Jehova ghọtara otú obi dị ya. (Job 6:1-3) Jehova ma na Job ahapụghị ya, ọ bụ eziokwu na Ekwensu mesiri Job ike, ma bo ya ebubo ọtụtụ ugboro. Mgbe nsogbu ndị ahụ kwụsịrị, Jehova nyeghachiri Job ihe ndị ahụ o nweburu okpukpu abụọ, meekwa ka ọ dịkwuo ndụ otu narị afọ na iri anọ. (Jems 5:11) N’oge ahụ niile, ọ kwụsịghị iji obi ya niile na-efe Jehova. Olee otú anyị si mara? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ narị afọ agaala Job nwụrụ tupu Ezikiel edee amaokwu e si nweta isiokwu a.

19, 20. (a) Olee otú anyị ga-esi eṅomi okwukwe Job na otú o si rube isi? (b) Olee otú anyị ga-esi eṅomi obi ebere Chineke mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe?

19 Otú anyị ga-esi eṅomi okwukwe Job na otú o si rube isi. N’agbanyeghị otú ihe nwere ike isi dịrị anyị, ka anyị bute Jehova ụzọ n’ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ, tụkwasị ya obi, ma jiri obi anyị niile na-erubere ya isi. N’eziokwu, anyị nwedịrị ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi ma rubere ya isi karịa Job. Dị ka ihe atụ, anyị ma ọtụtụ ihe banyere Setan na aghụghọ ya niile. (2 Kọr. 2:11) Anyị makwa ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị n’ihi na anyị nwere Baịbụl, nke ka nke, akwụkwọ Job. Amụma Daniel mere ka anyị ghọta na Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-achị ụwa nke Jizọs ga-abụ eze ya. (Dan. 7:13, 14) Anyị makwa na n’oge na-adịghị anya, Alaeze a ga-eme ka ahụhụ niile kwụsị.

20 Ihe mere Job na-akụzikwara anyị ka anyị na-emere ụmụnna anyị ebere mgbe ha na-ata ahụhụ. Ụfọdụ n’ime ha nwedịrị ike ikwu okwu n’echeghị echiche mgbe ụfọdụ otú ahụ Job mere. (Ekli. 7:7) Ma, kama iwere ha ka ndị ọjọọ, ka anyị gbalịa ghọta ha ma meere ha ebere. Anyị mee otú ahụ, anyị na-eṅomi Nna anyị Jehova, onye hụrụ anyị n’anya ma na-emere anyị ebere.—Ọma 103:8.

JEHOVA “GA-EME KA UNU GUZOSIE IKE”

21. Olee otú 1 Pita 5:10 si chetara anyị ihe mere Noa, Daniel, na Job?

21 Ọ bụ eziokwu na Noa, Daniel, na Job biri n’oge dị iche iche, otú ihe si dịrị ha adịrịkwa iche iche, ha diri nsogbu ndị bịaara ha. Ihe ndị mere ha na-echetara anyị ihe Pita onyeozi kwuru. O kwuru, sị: “Mgbe unu tasịrị ahụhụ nwa oge, Chineke nke obiọma niile na-erughịrị mmadụ . . . ga-enyesị unu ọzụzụ unu n’onwe ya, ọ ga-eme ka unu guzosie ike, ọ ga-eme ka unu sie ike.”—1 Pita 5:10.

22. Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu ọzọ?

22 Jehova si n’ihe Pita kwuru mee ka obi sie anyị ike na ọ ga-eme ka ndị ohu ya guzosie ike ma sie ike. Ihe ndị ahụ o kwuru gbasakwara ndị Chineke taa. Anyị niile chọrọ ka Jehova mee ka anyị guzosie ike, ma nọgide na-efe ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị iṅomi okwukwe Noa, Daniel, na Job, nakwa otú ha si rube isi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-amụta na ihe mere na ha akwụsịghị ife Jehova bụ n’ihi na ha ma ya nke ọma. Ha ‘ghọtara ihe niile’ ọ chọrọ ka ha mee. (Ilu 28:5) Anyị nwekwara ike ime otú ahụ.

^ para. 2 A dọọrọ Ezikiel n’agha gaa Babịlọn n’afọ 617 Tupu Oge Ndị Kraịst. O dere Ezikiel 8:1–19:14 “n’afọ nke isii” mgbe a dọọrọ ya n’agha ma ọ bụ n’afọ 612 Tupu Oge Ndị Kraịst.

^ para. 5 Nna Noa bụ́ Lemek fere Chineke. Ọ nwụrụ ihe dị ka afọ ise tupu Iju Mmiri ahụ. Ọ bụrụ na nne Noa na ụmụnne ya dị ndụ mgbe Iju Mmiri ahụ malitere, a zọpụtaghị ha.

^ para. 13 Ọ ga-abụkwa na Jehova mere ka e bulie Hananaya, Mishel, na Azaraya n’ọkwá ka ha nwee ike inyere ndị Juu aka.—Dan. 2:49.