Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 7

Ikike Ndị Okenye Nwere n’Ọgbakọ

Ikike Ndị Okenye Nwere n’Ọgbakọ

“Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ, ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a.”—EFE. 5:23.

ABỤ NKE 137 Ụmụ Nwaanyị Ndị Nwere Okwukwe

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otu n’ime ihe ndị mere ndị nọ n’ezinụlọ Jehova ji dịrị n’otu?

OBI dị anyị ụtọ na anyị so n’ezinụlọ Jehova. Gịnị mere anyị ji dịrị n’udo ma dịrị n’otu? Otu ihe kpatara ya bụ na anyị niile na-agba mbọ erubere ndị Jehova mere ndị isi isi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ghọta ihe mere Jehova ji hazie ka e nwee ndị isi, ọ ga-eme ka anyị dịrịkwuo n’otu.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ndị Jehova nyere ikike n’ọgbakọ. Anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Olee ọrụ Jehova nyere ụmụnna nwaanyị n’ọgbakọ? Ọ̀ bụ eziokwu na nwanna nwoke ọ bụla bụ isi nke nwanna nwaanyị ọ bụla? Ikike ndị okenye nwere n’ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị nọ, ọ̀ bụ otu ụdị ikike ahụ onyeisi ezinụlọ nwere n’ebe nwunye ya na ụmụ ya nọ? Ka anyị buru ụzọ leba anya n’otú anyị kwesịrị isi na-ele ụmụnna nwaanyị anya.

OLEE OTÚ ANYỊ KWESỊRỊ ISI NA-ELE ỤMỤNNA NWAANYỊ ANYA?

3. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike iji ọrụ ụmụnna nwaanyị na-arụ kpọrọkwuo ihe?

3 Anyị ji ụmụnna nwaanyị ndị na-agbasi mbọ ike ilekọta ndị ezinụlọ ha, ikwusa ozi ọma, na ịkwado ọgbakọ kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị atụlee otú Jehova na Jizọs si ele ha anya, anyị ga-eji ha kpọrọkwuo ihe. Anyị ga-amụtakwa ihe n’otú Pọl onyeozi si meso ụmụ nwaanyị ihe.

4. Olee otú Baịbụl si gosi na Jehova ji ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe?

4 Baịbụl gosiri na Jehova ji ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwaanyị kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi, Jehova nyere ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị mmụọ nsọ ya, nyekwa ha ikike ịrụ ọrụ ebube, dị ka ịsụ asụsụ dị iche iche. (Ọrụ 2:1-4, 15-18) Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị so ná ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka ha soro Kraịst chịa. (Gal. 3:26-29) Ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. (Mkpu. 7:9, 10, 13-15) E nyekwara ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ọrụ ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ ihe. (Mat. 28:19, 20) Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Prisila. Ya na di ya aha ya bụ Akwịla kọwaara Apọlọs, bụ́ nwoke gụrụ ezigbo akwụkwọ, eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke nke ọma.—Ọrụ 18:24-26.

5. Olee otú ihe e dere na Luk 10:38, 39, 42 si gosi otú Jizọs si ele ụmụ nwaanyị anya?

5 Jizọs kwanyeere ụmụ nwaanyị ùgwù. O meghị ka ndị Farisii, bụ́ ndị na-eleda ụmụ nwaanyị anya. Ha anaghịdị agwa ụmụ nwaanyị okwu n’ihu ọha, ma ya fọdụzie ha na ha ikwu gbasara Akwụkwọ Nsọ. Kama, ụmụ nwaanyị so ná ndị Jizọs kọwaara ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ ihe. * (Gụọ Luk 10:38, 39, 42.) O kwekwara ka ụmụ nwaanyị soro ya gaa ikwusa ozi ọma. (Luk 8:1-3) Ọ bụkwa ha ka Jizọs mere ka ha gwa ndịozi ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ.—Jọn 20:16-18.

6. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na ọ na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù?

6 Pọl onyeozi chetaara Timoti ka ọ na-akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù. Pọl gwara ya ka ọ na-emeso “ụmụ nwaanyị mere okenye ihe dị ka ndị nne,” na-emesokwa ‘ụmụ agbọghọ dị ka umunne ya ndị nwaanyị.’ (1 Tim. 5:1, 2) Pọl gbara ezigbo mbọ iji nyere Timoti aka ịghọ Onye Kraịst tozuru okè. Ma, o kwetara na ọ bụ nne Timoti na nne nne ya bu ụzọ kụziere ya “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” (2 Tim. 1:5; 3:14, 15) Pọl kpọrọ ụfọdụ ụmụnna nwaanyị aha ma kelee ha n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom. Ọ bụghị naanị na Pọl hụrụ ọrụ ọma ụmụnna nwaanyị ndị a rụsiri ike n’ime Onyenwe anyị, ọ jakwara ha mma maka ya.—Rom 16:1-4, 6, 12; Fil. 4:3.

7. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

7 Dị ka anyị hụrụ na paragraf ndị bu nke a ụzọ, o nweghị ebe Baịbụl kwuru ihe gosiri na ụmụnna nwoke bara uru karịa ụmụnna nwaanyị. Ụmụnna nwaanyị ndị a bara ezigbo uru n’ọgbakọ n’ihi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya ma na-emesapụ aka. Obi dịkwa ndị okenye ụtọ na ha na-enye aka eme ka ọgbakọ dịrị n’otu ma dịrị n’udo. Ma, e nwere ụfọdụ ajụjụ ndị e kwesịri ịza. Dị ka ihe atụ: Gịnị mere Jehova ji chọọ ka ụmụnna nwaanyị na-ekpuchi isi ha mgbe ụfọdụ? Ebe ọ bụ naanị ụmụnna nwoke ka a na-ahọpụta ịbụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, ọ̀ pụtara na nwanna nwoke ọ bụla bụ isi nwanna nwaanyị ọ bụla nọ n’ọgbakọ?

NWANNA NWOKE Ọ BỤLA Ọ̀ BỤ ISI NKE NWANNA NWAANYỊ Ọ BỤLA?

8. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 5:23, nwanna nwoke ọ bụla ọ̀ bụ isi nke nwanna nwaanyị ọ bụla? Kọwaa.

8 Azịza ya bụ mba. Nwanna nwoke abụghị isi nke ụmụnna nwaanyị niile nọ n’ọgbakọ. Ọ bụ Kraịst bụ isi ha. (Gụọ Ndị Efesọs 5:23.) N’ezinụlọ, di bụ isi nke nwunye ya. Nwanna nwoke mere baptizim abụghị isi nke nne ya. (Efe. 6:1, 2) N’ọgbakọ, ọ bụghị n’ihe niile ka ndị okenye nwere ikike n’ebe ụmụnna nọ. (1 Tesa. 5:12; Hib. 13:17) Ụmụnna nwaanyị ha na nne na nna ha na-ebighịzi ka kwesịrị ịna-akwanyere nne na nna ha na ndị okenye ùgwù. Ma, ọ bụ naanị Jizọs bụ isi nke ma ha ma ụmụnna nwoke nọ n’ọgbakọ.

Ọ bụ Jizọs bụ isi nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ha na nne na nna ha na-ebighịzi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

9. Gịnị mere ụmụnna nwaanyị kwesịrị iji na-ekpuchi isi ha mgbe ụfọdụ?

9 Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova họpụtara ụmụ nwoke ka ha na-ebute ụzọ n’ịkụzi ihe n’ọgbakọ nakwa n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke. O nyeghị ụmụ nwaanyị ụdị ikike ahụ. (1 Tim. 2:12) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi otu ihe ahụ mere o ji họpụta Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ isi nke nwoke, ya bụ, iji mee ka ọgbakọ ya bụrụ nke a haziri ahazi. Ọ bụrụ na e nwee ihe mere ka ọ dị mkpa ka nwanna nwaanyị mee ihe nwanna nwoke kwesịrị ime, Jehova chọrọ ka o kpuchie isi ya ma o mewe ihe ahụ. * (1 Kọr. 11:4-7) Ihe mere Jehova ji chọọ ka nwanna nwaanyị kpuchie isi ya abụghị iji wetuo ya ala, kama, ọ bụ ka o si otú ahụ gosi na ọ na-erubere ndị Jehova mere ka ha bụrụ ndị isi isi. Ka anyị zaa ajụjụ bụ́: Olee ụdị ikike ndị isi ezinụlọ na ndị okenye nwere?

IKIKE NDỊ ISI EZINỤLỌ NA NDỊ OKENYE NWERE

10. Olee ihe nwere ike ime ka okenye chọọ imere ndị nọ n’ọgbakọ iwu?

10 Ndị okenye hụrụ Kraịst n’anya, hụkwa “atụrụ” Jehova na Jizọs nyere ha ka ha na-elekọta n’anya. (Jọn 21:15-17) Ebe ọ bụ na ọrụ okenye bụ ilekọta ọgbakọ, o nwere ike iwere onwe ya ka nna ndị nọ n’ọgbakọ. O nwere ike ịna-eche na ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ nwere ikike inye ndị ezinụlọ ya iwu iji chebe ha, okenye nwekwara ikike inye atụrụ Jehova iwu o chere ga-echebe ha. Ụfọdụ ụmụnna nwekwara ike ịna-agwa ndị okenye ka ha na-emere ha mkpebi ụfọdụ. Ma, ikike ndị okenye nọ n’ọgbakọ nwere na nke ndị isi ezinụlọ nwere hà bụ otu?

Ndị okenye na-enyere ndị nọ n’ọgbakọ aka ka ha na Jehova dịrị ná mma, na-emekwa ka ha mara na a hụrụ ha n’anya. Jehova nyekwara ha ikike ịchụpụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

11. Olee otú ikike ndị isi ezinụlọ na nke ndị okenye si yie?

11 Ihe Pọl kwuru gosiri na e nwere otú ikike onyeisi ezinụlọ na nke okenye si yie. (1 Tim. 3:4, 5) Dị ka ihe atụ, Jehova chọrọ ka ndị nọ n’ezinụlọ na-erubere onyeisi ezinụlọ ha isi. (Kọl. 3:20) Ọ chọrọ ka ndị nọ n’ọgbakọ na-erubere ndị okenye isi, chọọkwa ka ndị isi ezinụlọ na ndị okenye na-akụziri ndị ha na-elekọta ihe ga-eme ka ha na ya dịrị ná mma. Ha kwesịkwara ime ka ndị ha na-elekọta mara na a hụrụ ha n’anya. Ndị okenye kwesịrị ịhụ na ha na-enyere ndị ha na-elekọta aka ma ha nwee nsogbu, otú ahụ ezigbo ndị isi ezinụlọ na-eme. (Jems 2:15-17) Ihe ọzọ Jehova chọkwara ka ndị okenye na ndị isi ezinụlọ na-eme bụ inyere ndị ọzọ aka ka ha na-edebe iwu ya. Ọ chọghị ka ha “gabiga ihe e dere ede” na Baịbụl.—1 Kọr. 4:6.

Jehova nyere ndị isi ezinụlọ ikike ịbụ ndị isi n’ezinụlọ ha. Tupu onyeisi ezinụlọ hụrụ nwunye ya n’anya emewe mkpebi, ọ na-agwa ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

12-13. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 7:2, olee otú ikike ndị isi ezinụlọ nwere si dị iche na nke ndị okenye?

12 Ma, e nwekwara ihe ụfọdụ dị iche n’ikike ndị okenye nwere na ikike ndị isi ezinụlọ nwere. Dị ka ihe atụ, Jehova nyere ndị okenye ikike ikpe ikpe, nyekwa ha ikike ịchụpụ ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ọgbakọ.—1 Kọr. 5:11-13.

13 Ma, e nwere ikike Jehova nyere ndị isi ezinụlọ ọ na-enyeghị ndị okenye. Dị ka ihe atụ, o nyere onyeisi ezinụlọ ikike inye ndị ezinụlọ ya iwu na ịhụ na ha debere ya. (Gụọ Ndị Rom 7:2.) Onyeisi ezinụlọ nwere ike ikpebi oge ụmụ ya ga-eji na-alọta n’ụlọ n’abalị. O nwekwara ikike inye ha ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe o kwuru. (Efe. 6:1) Ma, onyeisi ezinụlọ hụrụ nwunye ya n’anya na-ajụ nwunye ya ihe o chere tupu ya enye iwu n’ezinụlọ ya. A sị ka e kwuwe, ha abụọ “bụ otu.” *Mat. 19:6.

KWANYERE KRAỊST BỤ́ ONYEISI ỌGBAKỌ ÙGWÙ

Jehova si n’aka Jizọs na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. (a) N’ihi ihe e kwuru na Mak 10:45, gịnị mere o ji daba adaba na Jehova họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ isi nke ọgbakọ ya? (b) Gịnị bụ ọrụ Òtù Na-achị Isi? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ọrụ Òtù Na-achị Isi.”)

14 Jehova ji ihe mgbapụta ahụ zụta ndụ nke ndị niile nọ n’ọgbakọ nakwa ndụ ụmụ mmadụ niile nwere okwukwe na Jizọs. (Gụọ Mak 10:45; Ọrụ 20:28; 1 Kọr. 15:21, 22) N’ihi ya, ọ dabara adaba na ọ họpụtara Jizọs, bụ́ onye nyere ndụ ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta, ka ọ bụrụ isi nke ọgbakọ ya. Ebe Jizọs bụ onyeisi anyị, o nwere ikike inye iwu onye ọ bụla n’ime anyị, ezinụlọ ọ bụla, nakwa ọgbakọ niile ga-edebe. O nwekwara ikike ịhụ na e debere iwu ahụ. (Gal. 6:2) Ihe Jizọs na-eme abụghị naanị inye anyị iwu. Ọ hụrụ anyị n’anya, na-elekọtakwa anyị nke ọma.—Efe. 5:29.

15-16. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Marley na Nwanna Benjamin kwuru?

15 Ụmụnna nwaanyị na-erubere ndị Jizọs họpụtara ilekọta ha isi iji gosi na ha na-akwanyere Jizọs ùgwù. Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Marley kwuru otú ọ na-adị ọtụtụ ụmụnna nwaanyị n’obi. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ na m bụ nwunye, bụrụkwa nwanna nwaanyị n’ọgbakọ. M na-agbalị na-echetara onwe m mgbe niile ịna-erubere ndị Jehova họpụtara ka ha bụrụ ndị isi isi. Ma, di m na ụmụnna nwoke ndị ọzọ na-eme ka ọ na-adịrị m mfe irubere ha isi n’ihi na ha na-akwanyere m ùgwù, na-ajakwa m mma maka ọrụ ndị m na-arụ.”

16 Ụmụnna nwoke na-akwanyekwara ụmụnna nwaanyị ùgwù iji gosi na ha ji ndokwa Jehova mere ka e nwee ndị isi kpọrọ ihe. Otu nwanna nwoke bi n’Ịngland aha ya bụ Benjamin sịrị: “M na-amụta ọtụtụ ihe n’ajụjụ ụmụnna nwaanyị na-aza n’ọmụmụ ihe nakwa n’ihe ndị ha na-ekwu na-enye aka n’ịmụ ihe na ime nke ọma n’ozi ọma. Ama m na ọrụ ha na-arụ bara ezigbo uru.”

17. Gịnị mere anyị kwesịrị iji jiri ndokwa Jehova mere ka e nwee ndị isi kpọrọ ihe?

17 Ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ, ma ụmụ nwoke, ma ụmụ nwaanyị, ma ndị isi ezinụlọ, ma ndị okenye aghọta ihe mere Jehova ji hazie ka e nwee ndị isi ma na-erubere ndị isi isi, ọgbakọ niile ga-adị n’udo. Nke kachanụ bụ na ọ ga-eme ka e too Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya bụ́ Jehova.—Ọma 150:6.

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

^ par. 5 Olee ọrụ Jehova nyere ụmụnna nwaanyị n’ọgbakọ? Ụmụnna nwoke niile hà bụ ndị isi nke ụmụnna nwaanyị niile? Ọ̀ bụ otu ụdị ikike ka ndị okenye na ndị isi ezinụlọ nwere? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú Okwu Chineke ga-esi nyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a.

^ par. 5 Gụọ paragraf nke isii n’isiokwu bụ́ “Na-akwado Ụmụnna Nwaanyị.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Septemba 2020.

^ par. 13 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma onye ga-ekpebi ọgbakọ ezinụlọ ga-anọ na ya, gụọ paragraf nke 17 ruo na nke 19 n’isiokwu bụ́ “Na-akwanyere Ndị Ọzọ n’Ọgbakọ Jehova Ùgwù.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 2020.

^ par. 59 Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ gbasara isiokwu a, gụọ akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” peeji nke 209-212.

^ par. 64 Iji matakwuo ọrụ dị iche iche Òtù Na-achị Isi na-arụ, gụọ Ụlọ Nche Julaị 15, 2013, peeji nke 20 ruo na nke 25.