Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Emeela Ka ‘Ụzọ M Kwụrụ Ọtọ’

Jehova Emeela Ka ‘Ụzọ M Kwụrụ Ọtọ’

E NWERE mgbe otu nwa okorobịa jụrụ m, sị: “Olee amaokwu Baịbụl kacha amasị gị?” N’egbughị oge, m zara ya, sị: “Ọ bụ Ilu isi atọ amaokwu nke ise na nke isii, ebe sịrị: ‘Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.’” N’eziokwu, Jehova mere ka ụzọ m kwụrụ ọtọ. Olee otú o si mee ya?

NNE NA NNA M MERE KA M MALITE IJE IJE N’ỤZỌ KWỤ ỌTỌ

Mgbe afọ 1920 gachara, nne na nna m mụtara gbasara Jehova mgbe ha na-alụbeghị. A mụrụ m ná mmalite afọ 1939. Mgbe m ka dị obere anyị bi n’Ịngland, m na-eso ndị mụrụ m aga ọmụmụ ihe. Mgbe e mechakwara, m malitere ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ruokwa taa, m ka na-echeta ihe omume mbụ m mere. M rigooro n’elu igbe ka m nwee ike ịna-ahụ ndị m nọ n’ikpo okwu na-agwa okwu. M dị afọ isii n’oge ahụ. Ụjọ jidere m mgbe m lepụrụ anya hụ ndị toro eto na-ege m ntị.

Ebe mụ na nne na nna m na-ezi ozi ọma n’okporo ámá

Papa m na-edere m obere ihe n’akwụkwọ ka m jiri ya zie ozi ọma. Adị m afọ asatọ mgbe mbụ naanị m gara n’ụlọ mmadụ zie ya ozi ọma. Obi tọgburu m atọgbu mgbe onye nwe ụlọ gụrụ ihe dị n’akwụkwọ m ji ma nara m akwụkwọ aha ya bụ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu.” M ji ọsọ gbakwuru papa m gaa gwa ya ihe merenụ. Ịga ozi ọma na ọmụmụ ihe na-atọ m ụtọ. O mere ka m nwee mmasị iji oge m niile jeere Jehova ozi.

Eziokwu Baịbụl malitere irukwu m n’obi mgbe papa m tụụrụ m ọda Ụlọ Nche. M na-agụ nke ọ bụla n’ime ha ozugbo ọ bịara. M malitere ịtụkwasịkwu Jehova obi, ya emee ka m nyefee ya onwe m.

Ezinụlọ anyị so gaa mgbakọ e mere n’afọ 1950 na Niu Yọk isiokwu ya bụ Ịba Ụba Ọchịchị Chineke. Isiokwu nke Tọzdee, abalị atọ n’ọnwa Ọgọst, bụ “Ụbọchị Onye Ozi Ala Ọzọ.” N’ụbọchị ahụ, ọ bụ Nwanna Carey Barber, onye mechara soro n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu baptizim. Mgbe ọ jụchara ndị a ga-eme baptizim ajụjụ abụọ ná ngwụcha okwu ya, m biliri ọtọ ma zaa, “Ee.” Adị m afọ iri na otu mgbe ahụ. Mana, ama m na ihe m chọrọ ime abụghị ihe egwuregwu. Ma, ụjọ dị m ịbanye n’ime mmiri n’ihi na amụtabeghị m igwu mmiri. Nwanne papa m duuru m banye n’ime mmiri ahụ ma gwa m na o nweghị ihe ga-eme m. Ihe niile mere n’egbughị oge. Ụkwụ m emetụdịghị n’ala mmiri ahụ. Otu nwanna kuuru m mee m baptizim, kunyezie m nwanna ọzọ kupụtara m ná mmiri ahụ. Kemgbe ụbọchị ahụ dị ezigbo mkpa ná ndụ m, Jehova anọgidela na-eme ka ụzọ m kwụrụ ọtọ.

M HỌỌRỌ ỊTỤKWASỊ JEHOVA OBI

Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndịrị, m chọrọ ịmalite ịsụ ụzọ. Mana, ndị nkụzi m gbara m ume ka m gaa mahadum. M kwetara ihe ha kwuru ma gaa mahadum. Ma, m mechara chọpụta na ụkwụ agaghị esi m ike n’ọgbakọ, mụ ana-emekwa nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. N’ihi ya, m kpebiri ịhapụ mahadum. M kọọrọ Jehova gbasara ya, deekwa akwụkwọ na mụ agụjuola. M hapụkwara mahadum ná ngwụcha afọ mbụ m banyere. Otú m si tụkwasị Jehova obi mere ka m malite ịsụ ụzọ ozugbo.

M malitere ozi oge niile n’ọnwa Julaị afọ 1957 n’otu obodo a na-akpọ Welinboro. M gwara ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ Lọndọn ka ha tụọrọ m aro nwanna nwoke bụ́ ọsụ ụzọ ma nke a na-akọ mụ na ya ga-eso eje ozi. Ha gwara m ka mụ na Nwanna Bert Vaisey soro na-eje ozi. Ọ kụziiri m ọtụtụ ihe. O ji ozi ọma kpọrọ ihe. O nyekwaara m aka ime otú ahụ. Ndị nọ n’ọgbakọ anyị bụ mụnwa, ụmụnna nwaanyị isii merela agadi, na Nwanna Vaisey. Ịkwadebe ọmụmụ ihe niile, ịza ajụjụ, na ime ihe omume n’ọmụmụ ihe niile mere ka m tụkwasịkwuo Jehova obi, meekwa ka m na-ekwupụta ihe m kweere.

A tụrụ m mkpọrọ n’ihi na ekweghị m abanye amị. Obere oge m pụtara, m matara Nwanna Nwaanyị Barbara bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mụ na ya lụrụ n’afọ 1959. Anyị dịkwa njikere ịga ebe ọ bụla e zigara anyị. Ebe mbụ e zigara anyị bụ Lankashịa nke dị n’agbata ebe ugwu na ebe ọdịda anyanwụ Ịngland. N’ọnwa Jenụwarị afọ 1961, a kpọrọ m ka m gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze nke ga-ewe otu ọnwa na Betel dị na Lọndọn. O juru m anya na ná ngwụcha ụlọ akwụkwọ ahụ, a gwara m na m ga-abụzi onye nlekọta sekit. Otu onye nlekọta sekit ma nke a na-akọ ji izu abụọ zụọ m n’ọrụ nlekọta sekit n’obodo Beminham. E kwere ka nwunye m soro m. E zigaziri anyị ka anyị gaa letawa ọgbakọ ndị dị na Lankashịa na Cheshịa.

ỊTỤKWASỊ JEHOVA OBI NA-ABA URU MGBE NIILE

Mgbe anyị gara ezumike n’ọnwa Ọgọst afọ 1962, anyị nwetara akwụkwọ ozi si n’aka alaka ụlọ ọrụ. Ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ bụ fọm maka ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe mụ na nwunye m kpechara ekpere banyere ya, anyị dejupụtara fọm ahụ ma zighachiri ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo otú ha gwara anyị mee. Mgbe ọnwa ise gachara, anyị gara klas nke iri atọ na asatọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied na Bruklin dị na Niu Yọk. Anyị ji ọnwa iri mụọ Baịbụl n’ụlọ akwụkwọ ahụ.

Ihe anyị mụtara n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied nyeere anyị aka ịmatakwu Okwu Chineke na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile nke ọma. Anyị dị ihe dị ka afọ iri abụọ na ise n’oge ahụ, anyị mụtakwara nnukwu ihe n’aka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nọ na klas anyị. Obi dị m ụtọ iso Nwanna Fred Rusk bụ́ otu n’ime ndị nkụzi anyị na-arụ ọrụ kwa ụbọchị. Otu n’ime ihe ndị o kwusiri okwu ya ike bụ na anyị kwesịrị ịna-enye ndụmọdụ n’ezi omume, ya bụ, na anyị ga-agbalị hụ na ndụmọdụ ọ bụla anyị na-enye mmadụ si na Baịbụl. Ndị so ná ndị gwara anyị okwu n’oge anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ bụ Nwanna Nathan Knorr, Nwanna Frederick Franz, na Nwanna Karl Klein. Anyị mụtakwara ọtụtụ ihe n’aka Nwanna A. H. Macmillan. Ihe ọ kụziiri anyị mere ka m ghọtakwuo otú Jehova si duzie ndị ya mgbe e lere ha ule malite n’afọ 1914 ruo ná mbido afọ 1919.

A GBANWEERE ANYỊ ỌRỤ

Mgbe anyị na-agụcha akwụkwọ, Nwanna Knorr gwara mụ na nwunye m na a ga-eziga anyị Burundi dị n’Afrịka. Anyị gbagara ozugbo n’ọba akwụkwọ dị na Betel ka anyị lee anya n’Akwụkwọ Mgbaafọ anyị ka anyị mata ndị nkwusa ole e nwere n’obodo ahụ. Ma, o juru anyị anya na e nweghị ebe e dere ndị nkwusa ole e nwere na Burundi. E kwusatụbeghị ozi ọma n’obodo a anyị na-aga. E nwekwaghị oké ihe anyị ma gbasara Afrịka. Obi nọ na-akụ anyị kpum kpum. Ma, ekpere anyị si n’obi anyị kpee mere ka obi ruo anyị ala.

Otú ihe niile si dịrị n’ebe a e zigara anyị dị nnọọ iche n’otú ọ dị n’obodo anyị, ma okpomọkụ dị ebe ahụ, ma omenala ha, ma asụsụ ha. Anyị kwesịkwara ịmụta asụsụ French. Inweta ebe anyị ga-ebi sikwaara anyị ike. Abalị abụọ anyị rutere, otu n’ime ndị anyị na ha so gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied bụ́ Nwanna Harry Arnott bịara leta anyị mgbe ọ na-alaghachi ebe ọ na-eje ozi na Zambia. O nyeere anyị aka ịchọta ebe anyị ga-ebi. Ebe ahụ ghọrọ ụlọ ndị ozi ala ọzọ mbụ anyị. N’oge na-adịghị anya, ndị ọchịchị na-amaghị ihe ọ bụla gbasara Ndịàmà Jehova malitere imegide anyị. Obere oge ozi anyị na-eje ebe ahụ bidoro ịtọ anyị ụtọ, ndị ọchịchị gwara anyị na ha agaghị ekwe ka anyị nọrọ n’obodo ha ma ọ bụrụ na anyị enwetaghị akwụkwọ ikike e ji arụ ọrụ n’obodo ahụ. O wutere anyị na anyị ga-ahapụ obodo a gaa obodo ọzọ. E zigaziri anyị Yuganda.

Ụjọ na-atụ anyị ịga Yuganda n’ihi na anyị enweghị akwụkwọ ikike ibi ebe ahụ. Ma, anyị tụkwasịrị Jehova obi. Otu nwanna onye Kanada na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma na Yuganda kọọrọ otu onye ọrụ gọọmenti na-ahụ maka inye ndị mmadụ akwụkwọ ikike ibi n’obodo ahụ otú ihe si dịrị anyị, ya enye anyị ikike ibi ebe ahụ ọnwa ole na ole ruo mgbe anyị ga-enweta akwụkwọ ikike ibi n’obodo ahụ. Ihe ahụ merenụ gosiri na Jehova na-enyere anyị aka.

Otú ihe si dịrị ebe a dị iche n’otú o si dịrị na Burundi. A malitela ikwusa ozi ọma n’obodo a, ọ bụ eziokwu na ọ bụ naanị ndị nkwusa iri abụọ na asatọ ka e nwere n’obodo a niile. Ọtụtụ ndị na-asụ Bekee n’obodo a. Ma n’oge na-adịghị anya, anyị ghọtara na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enyere ndị nwere mmasị aka ịna-emekwu nke ọma, ọ dị mkpa ka anyị mụọ ọ dịkarịa ala otu n’ime asụsụ ndị a na-asụ n’obodo ahụ. Anyị malitere izi ozi ọma na Kampala nakwa n’obodo ndị dị ya nso. Asụsụ a na-asụkarị ebe ahụ bụ Luganda. N’ihi ya, anyị kpebiri ịmụ asụsụ ahụ. O were anyị afọ ole na ole tupu asụsụ ahụ agawa anyị were were n’ọnụ. Mana, o mere ka ozi anyị kakwuo mma. Anyị ghọtakwuru ihe anyị kwesịrị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, ya emeekwa ka ha na-agwa anyị otú obi dị ha maka ihe ndị ha na-amụta.

EBE NDỊ ANYỊ GARA

Mgbe anyị gara Yuganda

Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị nyeere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl. Obi tọkwukwara anyị ụtọ mgbe a gwara anyị ka anyị na-eleta ọgbakọ ndị dị n’obodo ahụ niile. Alaka ụlọ ọrụ dị na Kenya gwara anyị ka anyị gaa ebe dị iche iche chọta ebe ndị e nwere ike iziga ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọtụtụ mgbe, ndị anyị gara n’obodo ha na-ahụtụbeghị Ndịàmà Jehova mbụ nabatara anyị nke ọma. Ha na-eme ka obi ruo anyị ala. Ha na-esidịrị anyị nri.

E nwere ụdị njem ọzọ m mere. M si Kampala gbaa ụgbọ okporo ígwè mee njem were abalị abụọ gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri Kenya dị na Mombasa, sizie ebe ahụ banye ụgbọ mmiri gaa Seshel bụ́ agwaetiti dị n’Oké Osimiri India. Malite n’afọ 1965 ruo n’afọ 1972, nwunye m na-eso m aga Seshel. Ná mmalite, e nwere naanị ndị nkwusa abụọ n’ebe ahụ. Ma ka oge na-aga, ha ghọrọ ìgwè, mechaakwa ghọọ ọgbakọ na-eme nke ọma. Anyị gakwara leta ụmụnna ndị nọ n’Eritria, Itiopia na Sudan.

Ihe gbanwere na Yuganda mgbe ndị amị weghaara ọchịchị. Ihe siri ezigbo ike n’afọ ndị na-esonụ. O mekwara ka m mata na ọ dị mma ime ihe Baịbụl kwuru nke bụ́ ‘kwụọ Siza ihe Siza.’ (Mak 12:17) E nwere mgbe o ruru, a gwa ndị niile bụ́ ndị mbịarambịa na Yuganda ka ha gaa deba aha ha n’akwụkwọ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii nọ ha nso. Anyị rubere isi ozugbo. Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, mgbe anyị si Kampala na-agbafe, ndị uwe ojii nzuzo kwụsịrị mụ na otu nwanna onye ozi ala ọzọ. Obi nọ na-akụ anyị kpum kpum. Ha boro anyị ebubo na anyị bụ ndị nledo ma buru anyị gaa n’isi ụlọ ọrụ ha. Anyị kọwaara ha na anyị bụ ndị ozi ala ọzọ nakwa na anyị anaghị eme aghara. Anyị gwakwara ha na anyị edebabuola aha anyị n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, ma ha ekweghị ege anyị ntị. Ndị uwe ojii bu égbè buuru anyị gawa n’ụlọ ọrụ ha kacha nọrọ ụlọ ndị ozi ala ọzọ nso. Obi ruru anyị ala mgbe onye uwe ojii nọ ebe ahụ maara na anyị edebala aha anyị hụrụ anyị ma nye iwu ka a tọhapụ anyị.

N’oge ndị ahụ, e nwere ọtụtụ oge obi na-amapụ anyị ma ndị amị kwụsị anyị n’ụzọ, karịchaa ma ọ bụrụ na ndị amị ahụ ṅụrọrọ anya. Mgbe ọ bụla ụdị ihe a mere, anyị na-ekpe ekpere. Obi na-erukwa anyị ala ma ha hapụ anyị ka anyị gawa ebe anyị na-aga n’udo. Ọ dị mwute na n’afọ 1973, a gwara ndị ozi ala ọzọ niile na-abụghị ndị Yuganda ka ha si na Yuganda pụọ.

Ibipụtaghachi Ozi Alaeze Anyị n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Abdjan dị na Kot Devụa

Ozi anyị na-eje gbanwere ọzọ. E zigaziri anyị Kot Devụa bụ́ mba dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Ihe a abụghị obere mgbanwe. Anyị bidoro ịmụ omenala ọhụrụ. Anyị bidoro ịsụ French ọzọ, na-amụkwa otú anyị na ndị ozi ala ọzọ si ebe dị iche iche ga-esi na-ebi. Anyị hụrụ na ọ bụ Jehova na-eduzi ọrụ anyị na-arụ n’ihi na ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma na-ege anyị ntị. Mụ na nwunye m chọpụtara na ịtụkwasị Jehova obi mere ka ụzọ anyị kwụrụ ọtọ.

Na mberede, a chọpụtara na nwunye m na-arịa kansa. N’agbanyeghị na anyị laghachiri n’obodo anyị ọtụtụ ugboro ka a gwọọ ya, n’afọ 1983, ọ bịara doo anyị anya na anyị agaghị enwe ike ịnọgide n’ozi anyị n’Afrịka. Ihe a gbawara anyị obi.

OTÚ IHE SI GBANWEE

Ọrịa kansa nwunye m kakwuru njọ mgbe anyị laghachiri jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ dị na Lọndọn. O mechakwara nwụọ. Ezinụlọ Betel nyeere m ezigbo aka. Otu di na nwunye nyeere m aka idi ọnwụ ya na ịnọgide na-atụkwasị Jehova obi. Ka oge na-aga, m hụrụ otu nwanna nwaanyị na-abịa enye aka na Betel. Ọ bụbu ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ hụrụ Jehova n’anya. Mụ na ya lụrụ n’afọ 1989. Kemgbe ahụ, anyị nọ na Betel dị na Lọndọn na-eje ozi.

Ebe mụ na nwunye m Ann guzo n’ihu Betel a rụrụ ọhụrụ na Briten

Malite n’afọ 1995 ruo n’afọ 2018, m bụ onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị (nke a na-akpọbu onye nlekọta zoonu). Anyị letara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ mba iri isii. N’ebe nke ọ bụla anyị gara, m na-achọpụta na Jehova na-agọzi ndị ya n’agbanyeghị otú ọ bụla ihe si dịrị ha.

N’afọ 2017, anyị gaghachiri ileta ndị Afrịka. Obi dị m ụtọ igosi ụmụnna anyị ndị Burundi Ann bụ́ nwunye ọhụrụ m. Mmụba e nwere n’obodo ahụ tụkwara anyị abụọ n’anya. Ihe dịzi n’otu ebe m ziri ozi ọma n’afọ 1964 bụ ọmarịcha Betel. A nọ ebe ahụ na-elekọta ndị nkwusa karịrị puku iri na ise na narị ise.

Obi tọgburu m atọgbu n’afọ 2018 mgbe e nyere m akwụkwọ e depụtara obodo ndị m ga-aga leta. Otu n’ime ha bụ Kot Devụa. Mgbe anyị rutere Abijan, bụ́ isi obodo ahụ, ọ dị m ka m̀ lọtara ụlọ. Mgbe m nọ na-ele akwụkwọ e depụtara nọmba telefon ndị mmadụ, m chọpụtara na aha onye nọ n’ụlọ nọ ụlọ m nso bụ Sossou bụ́ aha m maara nke ọma. M chetara na ọ bụbu nwanna na-elekọta obodo mgbe m nọ n’Abijan. Ma, m dara ya. Sossou nke a dị iche. Ọ bụ nwa ya nwoke.

Jehova emezuola ihe o kwere ná nkwa. Ihe ndị siiri m ike ná ndụ mere ka m mata na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-eme ka ụzọ anyị kwụrụ ọtọ. Ugbu a, anyị ekpebiela ịnọgide na-efe Jehova ruo mgbe ọ ga-eduru anyị banye n’ụwa ọhụrụ ya.—Ilu 4:18.