Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Gịnị mere o ji dị mma na e nwere ike iji nduru ma ọ bụ kpalakwukwu chụọrọ Jehova àjà n’Izrel oge ochie?

IWU Mosis kwuru na e nwere ike iji nduru ma ọ bụ kpalakwukwu chụọrọ Jehova àjà. N’iwu e nyere ụmụ Izrel gbasara ịchụ àjà, mgbe ọ bụla e kwuru gbasara nduru, a na-ekwukwa gbasara kpalakwukwu. Ọ bụrụ na i jighị nke a chụọ àjà, i nwekwara ike iji nwanne ya. (Lev. 1:14; 12:8; 14:30) Gịnị mere o ji dị mma? Otu ihe kpatara ya bụ na ọ bụghị mgbe niile ka nduru na-adị n’Izrel. N’ihi gịnị?

Nduru

Nduru na-adị n’Izrel niile n’oge okpomọkụ. N’ọnwa Ọktoba ọ bụla, ha na-efega n’obodo ndị na-ekpo ọkụ ma lọghachi n’Izrel n’ihe dị ka n’ọnwa Eprel. (Abụ Solo. 2:​11, 12; Jere. 8:7) Ihe ọ putara bụ na ọ ga-esiri ndị Izrel ike inweta nduru ha ga-eji chụọ àjà n’oge oyi.

Kpalakwukwu

Ma, kpalakwukwu anaghị aga ebe ọ bụla. Ọ na-adị n’Izrel mgbe ọ bụla n’afọ. Ihe ọzọkwa bụ na ndị Izrel na-akpa kpalakwukwu. (Tụlee Jọn 2:​14, 16. *) Akwụkwọ aha ya bụ Bible Plants and Animals kwuru, sị: “A na-akpa kpalakwukwu n’obodo niile dị na Palestaịn. Onye ọ bụla nwe ụlọ na-arụnye akwụ́, ma ọ bụ oghere, n’ahụ́ ụlọ ya ebe nduru ga-ebi.”​—Tụlee Aịzaya 60:8.

Kpalakwukwu nọ n’akwụ́ ya

Otú a Jehova si kwe ka ndị Izrel jiri nnụnụ ndị ha ga-enwetali mgbe ọ bụla n’afọ na-achụrụ ya àjà gosiri na ọ hụrụ ha n’anya, na-echebakwara ha echiche.

^ par. 5 “Nduru” e kwuru maka ya na Jọn 2:​14, 16 nwekwara ike ịbụ “kpalakwukwu.”