Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 8

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

Na-eso Nduzi Jehova

Na-eso Nduzi Jehova

‘Mụnwa, bụ́ Jehova, na-ezi gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso.’​—AỊZA. 48:17.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịhụ otú Jehova si edu ndị ya taa nakwa uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-eso nduzi ya.

1. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka Jehova na-eduzi anyị? Nye ihe atụ.

 WEREGODỊ ya na i furu efu n’oké ọhịa. Ebe ahụ adịtụdịghị mma ịnọ. E nwere ụmụ anụ ọhịa, ahụhụ ndị nwere ike ịtanye gị ọrịa, na osisi ndị nwere ike imerụ gị ahụ́. Okwute ndị nwere ike ịkpọbi gị ụkwụ jukwara n’ebe ahụ. Ma, obi ga-atọgbu gị atọgbu ma ọ bụrụ na e nwere onye maara ebe ihe ndị ahụ nwere ike imerụ gị ahụ́ dị ma nyere gị aka izere ha. Ụwa a anyị nọ n’ime ya yiri ọhịa ahụ. Ihe ndị nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma jukwara na ya. Mana, anyị nwere Onye Ndú zuru okè, bụ́ Jehova. Ọ na-edu anyị ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu. Ọ ga-edurukwa anyị ebe anyị na-aga, ya bụ, n’ụwa ọhụrụ, ebe anyị ga-adị ndụ ebighị ebi.

2. Olee otú Jehova si eduzi anyị?

2 Olee otú Jehova si eduzi anyị? Ụzọ bụ́ isi o si eduzi anyị bụ Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ma, ọ na-ejikwa ụmụ mmadụ na-eduzi anyị. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” enye anyị nri na-eme ka anyị na-eme mkpebi dị mma. (Mat. 24:45) Jehova na-ejikwa ụmụ nwoke ndị ọzọ tozuru etozu eduzi anyị. Dị ka ihe atụ, ndị nlekọta sekit na ndị okenye ọgbakọ na-agba anyị ume, na-enyekwa anyị ntụziaka na-enyere anyị aka n’oge ihe siri ike. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-edu anyị nke ọma n’oge a siri ezigbo ike tupu ọgwụgwụ abịa. Otú a o si eduzi anyị na-eme ka anyị na ya dịrị ná mma, nyekwara anyị aka ịnọgide na-eje ije n’ụzọ nke ndụ.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Ma, e nwere mgbe ụfọdụ o nwere ike isiri anyị ike iso nduzi Jehova, karịchaa, ma ọ bụrụ na o si n’aka ndị mmadụ na-ezughị okè. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha nwere ike ịgwa anyị ihe na-adịghị anyị mma. Anyị nwekwara ike iche na ihe ha gwara anyị esighị n’aka Jehova n’ihi na n’anya anyị, ọ dabaghị adaba. N’oge ndị ahụ, ọ dị ezigbo mkpa ka obi sie anyị ike na ọ bụ Jehova na-edu ndị ya, nakwa na iso nduzi ya na-abara anyị uru mgbe niile. Iji mee ka obi sikwuo anyị ike, n’isiokwu a, anyị ga-atụle (1) otú Jehova si duzie ndị ya n’oge e dere Baịbụl, (2) otú o si edu anyị taa, nakwa (3) otú iso nduzi ya si abara anyị uru.

Malite n’oge ochie ruo taa, Jehova ejirila ụmụ mmadụ na-eduzi ndị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


OTÚ JEHOVA SI DUO NDỊ IZREL

4-5. Olee otú Jehova si gosi na o ji Mosis na-eduzi ndị Izrel? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

4 Jehova họpụtara Mosis ka o duru ndị Izrel pụọ n’Ijipt. O nyekwara ụmụ Izrel ihe ha na-ahụ anya na-egosi na ọ bụ ya si n’aka Mosis na-eduzi ha. Dị ka ihe atụ, o nyere ha ogidi ígwé ojii n’ehihie na ogidi ọkụ n’abalị. (Ọpụ. 13:21) Mosis sooro ogidi ahụ, ya eduru ya na ndị Izrel gawa n’Oké Osimiri Uhie. Ma ndị Ijipt nọ na-achụ ndị Izrel. N’ihi ya, ụjọ tụrụ ndị Izrel n’ihi na ha chere na ndị Ijipt ga-egbu ha. Ha chere na Mosis ekwesịghị ịkpọ ha aga n’Oké Osimiri Uhie. Mana, ihe a Mosis mere abụghị imehie ihe. Jehova ma ụma si n’aka Mosis duru ndị ya gaa n’ebe ahụ. (Ọpụ. 14:2) Jehova napụtaziri ndị ya n’ụzọ dị ịtụnanya.​—Ọpụ. 14:26-28.

Mosis ji ogidi ígwé ojii duo ndị Chineke n’oge niile ha nọ n’ala ịkpa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5)


5 Mgbe ihe a mechara, Mosis ka tụkwasịkwara Jehova obi na o ji ogidi ígwé ojii na-edu ndị Chineke n’ọzara ruo afọ iri anọ. a E nwere oge o ruru, Jehova emee ka ogidi ahụ pụta n’elu ụlọikwuu Mosis, ebe ụmụ Izrel niile nwere ike ịhụ ya. (Ọpụ. 33:7, 9, 10) Jehova si n’ogidi ahụ gwa Mosis okwu, ya agwazie ndị Izrel ihe Jehova kwuru. (Ọma 99:7) Ndị Izrel ji anya ha na-ahụ na Jehova ji Mosis na-eduzi ha.

Mosis na Joshụa bụ́ onye nọchiri ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 7)


6. Gịnị ka ụmụ Izrel mere mgbe Jehova na-eduzi ha? (Ọnụ Ọgụgụ 14:2, 10, 11)

6 Ma, ọ dị mwute na ọtụtụ ndị Izrel ekwetaghị ihe doro anya gosiri na Jehova ji Mosis na-edu ha. (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 14:2, 10, 11.) Ọtụtụ ugboro, ha ekwetaghị na ọ bụ Jehova ji Mosis na-edu ha. Ihe a mere ka Jehova ghara ikwe ka ha banye n’Ala Nkwa ahụ.​—Ọnụ Ọgụ. 14:30.

7. Nye ihe atụ gosiri ụfọdụ ndị sooro nduzi Jehova. (Ọnụ Ọgụgụ 14:24) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

7 Ma, e nwere ndị Izrel sooro nduzi Jehova. Dị ka ihe atụ, Jehova sịrị: ‘Keleb ji obi ya niile na-eso m.’ (Gụọ Ọnụ Ọgụgụ 14:24.) Jehova kwụrụ Keleb ụgwọ. O nyedịrị ya ala ọ chọrọ n’ala Kenan. (Josh. 14:12-14) Ụmụ Izrel ndị banyere n’Ala Nkwa ahụ sokwaara nduzi Jehova nke ọma. Mgbe Joshụa nọchiri Mosis duwezie ndị Izrel, “ha na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù n’oge niile ọ dị ndụ.” (Josh. 4:14) Ihe a mere ka Jehova gọzie ha, kpọbata ha n’ala o kwere ha nkwa ya.​—Josh. 21:43, 44.

8. Kọwaa otú Jehova si duo ndị ya n’oge ndị eze. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

8 Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova họpụtara ndị ikpe ka ha na-eduzi ndị ya. Mgbe e mechakwara, n’oge ndị eze, Jehova họpụtara ndị amụma ga na-eduzi ndị ya. Ndị eze rubeere Jehova isi gere ndị amụma ntị. Dị ka ihe atụ, Eze Devid wedara onwe ya ala ma nabata aka ná ntị Netan dọrọ ya. (2 Sam. 12:7, 13; 1 Ihe 17:3, 4) Eze Jehoshafat kwere ka onye amụma bụ́ Jahazayel duzie ya ma gbaa ndị Juda ume ka ha tụkwasị “ndị amụma [Chineke] obi.” (2 Ihe 20:14, 15, 20) N’oge Eze Hezekaya nọ ná nsogbu, ọ gwara Aịzaya onye amụma ka o nyere ya aka. (Aịza. 37:1-6) Mgbe ọ bụla ndị eze sooro nduzi Jehova, Jehova na-agọzi ha, chebekwa ndị ya. (2 Ihe 20:29, 30; 32:22) O kwesịrị ido mmadụ niile anya na Jehova na-eji ndị amụma ya na-eduzi ndị ya. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ ndị eze na ndị Izrel ekweghị ege ndị amụma Jehova ntị.​—Jere. 35:12-15.

Eze Hezekaya na Aịzaya onye amụma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


OTÚ JEHOVA SI DUZIE NDỊ KRAỊST OGE MBỤ

9. Olee ndị Jehova ji duzie Ndị Kraịst n’oge ndịozi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 N’oge ndịozi, Jehova hiwere ọgbakọ Ndị Kraịst. Olee otú o si duzie ha? Ọ họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ onyeisi ọgbakọ ya. (Efe. 5:23) Mana, Jizọs agwaghị onye na-eso ụzọ ya nke ọ bụla ihe ọ ga-eme. O ji ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem duzie ndị ya. (Ọrụ 15:1, 2) A họpụtakwara ndị okenye ka ha na-eduzi ọgbakọ dị iche iche.​—1 Tesa. 5:12; Taị. 1:5.

Ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)


10. (a) Olee ihe ọtụtụ Ndị Kraịst mere n’oge ndịozi mgbe e nyere ha ntụziaka? (Ọrụ Ndịozi 15:30, 31) (b) Olee ihe mere ụfọdụ ndị n’oge e dere Baịbụl anabataghị ndị Jehova ji na-eduzi ha? (Kwuo ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ekwetaghị na Jehova Na-eji Ụmụ Mmadụ Eduzi Ndị Ya.”)

10 Olee ihe Ndị Kraịst nọ n’oge ahụ mere? Obi dị ọtụtụ n’ime ha ụtọ iso ntụziaka ndị e nyere ha. N’eziokwu, “ha ṅụrịrị ọṅụ” n’ihi otú e si gbaa ha ume. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:30, 31.) Ma, olee otú Jehova si na-eduzi ndị ya n’oge anyị a?

OTÚ JEHOVA SI EDUZI ANYỊ TAA

11. Nye ihe atụ gosiri otú Jehova si na-eduzi ndị ọ họpụtara iduzi ndị ya n’oge anyị a.

11 Jehova ka na-eduzi ndị ya taa. Ọ na-eji Ọkpara ya, bụ́ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst, na Okwu ya bụ́ Baịbụl eduzi ndị ya. Ànyị na-ahụ ihe ndị gosiri na Jehova ka ji ụmụ mmadụ na-eduzi ndị ya taa? Ee. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe ụfọdụ mere mgbe afọ 1870 gachara. Charles Taze Russell na ndị enyi ya malitere ịghọta na afọ 1914 bụ afọ dị ezigbo mkpa n’ihe gbasara Alaeze Chineke. (Dan. 4:25, 26) Otú ha si chọpụta ya bụ na ha mere nchọnchọ n’ihe Baịbụl kwuru, tụkwasịkwa obi na amụma dị na Baịbụl ga-emezu. Jehova ò duziri ha na nchọnchọ ahụ ha mere? Ee. O duziri ha. Ihe ndị mere n’afọ 1914 mere ka o doo anya na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ ahụ. A lụrụ Agha Ụwa nke Mbụ, e nweekwa ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na ụkọ nri. (Luk 21:10, 11) N’eziokwu, Jehova ji ụmụ nwoke ndị a ji ezi obi mụọ Baịbụl nyere ndị ya aka.

12-13. Olee ihe ụmụnna ndị Jehova ji eduzi ndị ya mere n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ iji mee ka a na-ekwusakwu ozi ọma?

12 Ka anyị leekwa ihe mere n’oge a lụrụ Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe ụmụnna na-elekọta nzukọ Jehova nọ n’isi ụlọ ọrụ anyị mụchara Mkpughe 17:8, ha ghọtara na ọ bụghị agha ahụ ga-akpata agha Amagedọn, kama a ga-emecha nwee oge a ga-enwe udo nke ga-eme ka e nwee ohere buru ibu ikwusa ozi ọma. N’ihi ya, ha malitere Ụlọ Akwụkwọ Gilied ka e jiri ya zụọ ndị ozi ala ọzọ ndị ga na-ekwusa ozi ọma ma na-akụzi ihe gburugburu ụwa n’agbanyeghị na o yiri ihe na-adabachaghị adaba n’oge ahụ. E zipụdịrị ndị ozi ala ọzọ n’oge a na-alụ agha ahụ. Ihe ọzọ bụ na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi haziri ka a malite Ọzụzụ n’Ije Ozi Ọchịchị Chineke b ka e jiri ya zụọ ndị niile nọ n’ọgbakọ ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma na ịna-akụzi ihe nke ọma. Ihe ndị a mere ka a kwadebe ndị Chineke maka ọrụ ha ga-arụ n’ọdịnihu.

13 Taa, anyị chọpụtara na ọ bụ Jehova duru ndị ya n’oge ahụ ihe siri ike. Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ala ajụọla oyi n’ọtụtụ obodo, ụmụnna anyị nwezikwara ike izi ozi ọma n’ọtụtụ obodo n’enweghị ndị na-enye ha nsogbu. N’eziokwu, ọtụtụ ndị amatala Jehova. Ndị ohu Jehova na-ekwusakwa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa.

14. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-ege nzukọ Jehova na ndị okenye ntị? (Mkpughe 2:1) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

14 Taa, Òtù Na-achị Isi ka na-elekwa Jizọs anya ka ọ na-eduzi ha. Ha chọrọ ka ntụziaka ha ga-enye ụmụnna ha bụrụ otú Jehova na Jizọs si ele ihe anya. Ha na-ejizi ndị nlekọta sekit na ndị okenye ọgbakọ enye ụmụnna ntụziaka ndị ahụ. c Ndị okenye e tere mmanụ nọ “n’aka nri” Kraịst. (Gụọ Mkpughe 2:1.) N’eziokwu, ndị okenye ndị a ezughị okè, ha nwekwara ike imejọ ihe. Mosis na Joshụa mejọrọ ihe mgbe ụfọdụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndịozi. (Ọnụ Ọgụ. 20:12; Josh. 9:14, 15; Rom 3:23) N’agbanyeghị ya, anyị na-achọpụta na Jizọs ji ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nakwa ndị okenye na-eduzi ndị ya nakwa na ọ ga-emegide ya “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 28:20) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ntụziaka Kraịst si n’aka ndị a ọ họpụtara na-enye anyị obi.

Òtù Na-achị Isi taa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)


ISO NDUZI JEHOVA NA-ABARA ANYỊ URU

15-16. Gịnị ka ị mụtara n’aka ndị sooro ntụziaka Jehova?

15 Ọ bụrụ na anyị esoro nduzi Jehova, ọ na-abara anyị uru ugbu a. Dị ka ihe atụ, Nwanna Andy na nwunye ya Robyn mere ihe Òtù Na-achị Isi kwuru ma selata aka n’otú ha si emefu ego. (Mat. 6:22) Ihe a mere ka ha wepụta onwe ha iso na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. Nwanna nwaanyị Robyn sịrị: “Anyị ebiela n’ebe ndị dị ezigbo obere. Ọtụtụ mgbe, a naghị enwe usekwu na ha. M rekwara ihe ndị m na-eji ese foto, nke bụ́kwanụ ihe na-amasị m. Ihe a mere ka anya mmiri gbaa m. Ma dịkwa ka Sera nwunye Ebreham, m kpebisiri ike ilegide anya n’ihu, ọ bụghị ile anya n’azụ.” (Hib. 11:15) Olee uru mkpebi a Nwanna Andy na nwunye ya mere bara? Nwanna Nwaanyị Robyn sịrị: “Obi na-atọgbu anyị atọgbu n’ihi na anyị ma na anyị na-enye Jehova ihe niile anyị nwere. Anyị soro na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, anyị na-ahụperetụ otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ.” Nwanna Andy kwetara ihe a nwunye ya kwuru. Ọ sịrị: “Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị ji ihe niile anyị nwere na-akwado Alaeze Chineke.”

16 Olee otú ọzọ iso nduzi Jehova si abara anyị uru? Mgbe Nwanna Nwaanyị Marcia pụtara n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, o kpebiri ime ihe a gbara ya ume ka o mee nke bụ́ ịmalite ịsụ ụzọ oge niile. (Mat. 6:33; Rom 12:11) Ọ sịrị: “E nyere m ohere ịgụ akwụkwọ n’efu afọ anọ n’otu mahadum. Mana, m chọrọ ijekwuru Jehova ozi. N’ihi ya, m kpebiri ịga ụlọ akwụkwọ ebe a na-amụ aka ọrụ, mụọ ọrụ ga-enyere m aka ịna-eje ozi m. Ihe ahụ bụ otu n’ime mkpebi ndị kacha mma m metụrụla. Ugbu a, m bụ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ na-atọkwa m ụtọ. Ebe ọ bụ m na-eji aka m ekpebi mgbe m ga-arụ ọrụ, m na-ewepụta ụbọchị ụfọdụ enye aka na Betel, na-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ magburu onwe ha n’ozi Jehova.”

17. Olee uru ndị ọzọ ọ na-abara anyị ma anyị soro nduzi Jehova? (Aịzaya 48:17, 18)

17 Mgbe ụfọdụ, nzukọ Jehova na-enye anyị ntụziaka ndị na-echebe anyị. Dị ka ihe atụ, a na-adọ anyị aka ná ntị gbasara ịhụ ego n’anya nakwa gbasara ime ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị mebie iwu Chineke. Jehova na-agọzikwa anyị ma anyị soro ntụziaka o nyere anyị n’ihe ndị a. Akọnuche anyị na-adị ọcha, anyị anakwaghị akpatara onwe anyị nsogbu ndị na-enweghị isi. (1 Tim. 6:9, 10) Ihe a na-eme ka anyị jiri obi anyị niile na-efe Jehova, nke na-eme ka obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala.​—Gụọ Aịzaya 48:17, 18.

18. Gịnị mere i ji kpebisie ike ịna-eso nduzi Jehova?

18 O doro anya na Jehova ka ga-eji ụmụ mmadụ na-eduzi ndị ya n’oge oké mkpagbu nakwa n’ime otu puku afọ Kraịst ga-achị. (Ọma 45:16) Ànyị ga-eso nduzi Jehova ma mgbe a chọrọ ka anyị mee ihe ụfọdụ na-anaghị amasị anyị? Ihe ga-ekpebi ihe anyị ga-eme n’oge ahụ bụ otú anyị si eso nduzi Jehova na-enye anyị taa. N’ihi ya, ka anyị na-eso nduzi Jehova mgbe niile, ma nke o si n’aka ụmụ nwoke ọ họpụtara ilekọta anyị na-enye anyị. (Aịza. 32:1, 2; Hib. 13:17) Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Onye Ndú anyị bụ́ Jehova obi na ọ ga-edu anyị ka ihe ọ bụla ghara ime adịm ná mma anyị na ya, duruokwa anyị ebe anyị na-aga, ya bụ, n’ụwa ọhụrụ, ebe anyị ga-adị ndụ ebighị ebi.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú Jehova si duzie ụmụ Izrel?

  • Olee otú Jehova si duzie Ndị Kraịst n’oge ndịozi?

  • Olee otú iso nduzi Jehova si abara anyị uru taa?

ABỤ NKE 48 Soro Jehova Na-eje Ije Kwa Ụbọchị

a Jehova họpụtakwara mmụọ ozi, “onye na-ebutere ndị Izrel ụzọ,” ya eduru ndị ya banye n’Ala Nkwa ahụ. O doro anya na mmụọ ozi ahụ bụ Maịkel. Maịkel bụ aha Jizọs bụ́ onyeisi ndị mmụọ ozi.​—Ọpụ. 14:19; 32:34.

b E mechara kpọwa ya Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Taa, o so n’ihe a na-eme n’ọmụmụ ihe etiti izu anyị.

c Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ọrụ Òtù Na-achị Isi.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Febụwarị 2021, peeji nke 18.