Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọ Na-eme Ka Onye Ike Gwụrụ Nwee Ike”

“Ọ Na-eme Ka Onye Ike Gwụrụ Nwee Ike”

Isiokwu Afọ 2018: “Ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike.”—AỊZA. 40:31.

ABỤ: 3, 47

1. Olee ụfọdụ nsogbu ndị anyị na ha na-alụ taa? Gịnị mere obi ji na-atọ Jehova ụtọ maka ndị ohu ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

NDỊ MMADỤ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ n’ụwa taa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime unu na ọrịa na-alụ kwa ụbọchị. Ụfọdụ n’ime unu ndị metụrụla okenye ka na-elekọta ndị ikwu unu merela agadi. E nwekwara ndị nke na-atagbu onwe ha n’ahụhụ tupu ha enwee ike ịkpa afọ ezinụlọ ha. Anyị makwa na ọtụtụ n’ime unu na ọtụtụ nsogbu ndị a na-alụ. Nsogbu ndị a na-ewe nnukwu oge, na-emekwa ka ike ụwa gwụ mmadụ, e kwubedịghị nnukwu ego ha na-efu. Ma, obi siri unu ike na Jehova ga-enyere unu aka. Unu kwetasiri ike na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu n’ihi na ọ bụ ihe o kwere ná nkwa. Okwukwe unu na-eme Jehova obi ụtọ.

2. Olee otú Aịzaya 40:29 si agba anyị ume? Ma, olee ihe jọgburu onwe ya anyị nwere ike ime?

2 Ọ̀ na-adị gị mgbe ụfọdụ ka ị gaghị edili nsogbu ndị gị na ha na-alụ? Ọ bụrụ otú ahụ, e nweela ndị ọ dị otú ọ dị gị. Baịbụl kwuru na e nwere ndị ohu Chineke n’oge ochie chere na ha enweghịzi ike idi nsogbu ha. (1 Eze 19:4; Job 7:7) Gịnị nyeere ha aka idi ha? Ha tụkwasịrị Jehova obi ka o nye ha ike. Chineke anyị emechughịkwa ha ihu n’ihi na ọ “na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike.” (Aịza. 40:29) Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị Chineke n’oge anyị a chere na otú kacha mma ha ga-esi edi nsogbu ha bụ ‘ịhapụtụ ọgbakọ.’ N’ihi na ha chere na ife Jehova bụụrụ ha ibu arọ kama ịbụ ihe ọma Chineke meere ha. N’ihi ya, ha na-akwụsị ịgụ Okwu Chineke, ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma, bụ́kwanụ ihe Setan tụrụ anya na ha ga-eme.

3. (a) Olee ihe anyị ga-eme ka Setan ghara ime ka anyị kwụsị ife Jehova? (b) Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Ekwensu ma na ọ bụrụ na anyị ejiri ihe ndị gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe, okwukwe anyị ga-esikwu ike. Ma ọ chọghị ka okwukwe anyị sie ike. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ike gwụrụ gị, ya adị gị ka olileanya adịghịzi, ahapụkwala Jehova. Gbalịa ka gị na ya dịkwuo ná mma n’ihi na ‘ọ ga-eme ka i guzosie ike, ọ ga-eme ka i sie ike.’ (1 Pita 5:10; Jems 4:8) N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe abụọ nwere ike ime ka anyị ghara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Anyị ga-atụlekwa otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi enyere anyị aka. Ma, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe Aịzaya 40:26-31 kwuru gosiri na Jehova nwere ike ime ka anyị dị ike.

NDỊ NWERE OLILEANYA N’EBE JEHOVA NỌ GA-ENWETAGHACHI IKE

4. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’Aịzaya 40:26?

4 Gụọ Aịzaya 40:26. E nwebeghị onye nwere ike ịgụta kpakpando niile dị na mbara igwe ọnụ. Ndị sayensị kwuru na naanị n’ụyọkọ kpakpando nke a na-akpọ Milky Way, e nwere ike inwe ihe ruru narị ijeri kpakpando anọ na ya. Ma, Jehova ma aha nke ọ bụla n’ime ha. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na Jehova si otú a nwee mmasị na kpakpando nkịtị, chezie otú ọ hụruru gịnwa na-efe ya n’anya. Ị naghị efe ya n’ihi na a manyere gị amanye, kama, n’ihi na ị hụrụ ya n’anya n’eziokwu. (Ọma 19:1, 3, 14) Nna anyị hụrụ anyị n’anya maruru gị ala. Ọ ‘gụwo ntutu niile dị n’isi gị ọnụ.’ (Mat. 10:30) Otu ọbụ abụ mesiri anyị obi ike, sị: “Jehova maara ụbọchị niile nke ndị na-enweghị ntụpọ.” (Ọma 37:18) N’eziokwu, Jehova ma ihe gị na ya na-alụ, o nwere ike inye gị ike idi ha niile.

5. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova ga-enyeli anyị ike idi nsogbu anyị?

5 Gụọ Aịzaya 40:28. Ọ bụ Jehova nwe ike niile. Chegodị gbasara ụdị ike ọ na-enye anyanwụ. Otu onye sayensị aha ya bụ David Bodanis nke na-ede akwụkwọ, kwuru, sị: “Ike anyanwụ na-emepụta n’otu nkeji ọ bụla hà ka ebe ọtụtụ ijeri bọmbụ atọm gbawara.” Onye sayensị ọzọ chọpụtara na ike anyanwụ “na-emepụta n’otu tịnkọm ga-ezuru ụmụ mmadụ ruo narị puku afọ abụọ.” Ò nwere onye ga-ekwu na Onye ahụ “na-enye” anyanwụ ike enweghị ike inye anyị ike anyị ga-eji edi nsogbu ọ bụla anyị nwere?

6. Olee otú o si bụrụ na yok Jizọs anaghị egbu mgbu? Oleekwa uru ịmara ya na-abara anyị?

6 Gụọ Aịzaya 40:29. Ife Jehova na-eme anyị ezigbo obi ụtọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nyaranụ yok m.” Ma, o kwukwara, sị: “Mkpụrụ obi unu ga-enweta ume. N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu. O nwere mgbe ụfọdụ ike ga-agwụcha anyị tupu anyị agawa ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. Ma, olee otú ahụ́ na-adị anyị ma anyị lọta? Anyị na-enwetaghachi ume, nweekwa ike anyị ga-eji na-edi nsogbu anyị. N’eziokwu, yok Jizọs anaghị egbu mgbu.

7. Kọọ ihe gosiri na ihe e kwuru na Matiu 11:28-30 bụ eziokwu.

7 Otu nwanna nwaanyị anyị ga-akpọ Kayla na-arịa ọrịa na-akpatara ya oké ike ọgwụgwụ na oké isi ọwụwa. Ọ na-adakarịkwa mbà n’obi. N’ihi ya, ọ na-esiri ya ike ịga ọmụmụ ihe mgbe ụfọdụ. Ma, otu ụbọchị ọ gbalịrị gaa ọmụmụ ihe, o kwuru, sị: “Okwu ihu ọha ụbọchị ahụ bụ gbasara ịda mbà n’obi. Otú e si kwuo ya metụrụ m n’ahụ́ nke na m bewere ákwá. O mere ka m cheta na m kwesịrị ịna-agbalị abịa ọmụmụ ihe.” Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ na ọ gbalịrị gaa ọmụmụ ihe.

8, 9. Mgbe Pọl kwuru, sị: “Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike,” gịnị ka ọ pụtara?

8 Gụọ Aịzaya 40:30. N’agbanyeghị na anyị nwere ike ịma otú e si eme ọtụtụ ihe, o nwere ihe ụfọdụ anyị na-agaghị emeli n’ike anyị. Ọ bụ ihe anyị niile kwesịrị ịghọta. Ọ bụ eziokwu na Pọl onyeozi nwere ike ime ọtụtụ ihe, ma o melighị ihe niile ọ chọrọ ime. Mgbe ọ gwara Chineke otú ọ dị ya, Chineke gwara ya, sị: “A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” Pọl ghọtara ihe a Chineke gwara ya. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “Mgbe m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka m na-adị ike.” (2 Kọr. 12:7-10) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

9 Pọl ghọtara na ọ bụ naanị ihe ole na ole ka o nwere ike imeli n’ike nke aka ya. Ọ chọrọ enyemaka nke onye ka ya ike. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inye Pọl ike ọ chọrọ. O nwekwara ike ime ka ọ rụọ ọrụ ndị ọ na-enweghị ike ịrụli n’ike nke aka ya. Mmụọ nsọ Chineke nwekwara ike imere anyị otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na Jehova enye anyị ike, anyị ga-adị ike.

10. Olee otú Jehova si nyere Devid aka imeri nsogbu ndị bịaara ya?

10 E nwere ọtụtụ oge Devid ji anya ya hụ otú Chineke si jiri mmụọ nsọ ya mee ka ọ dị ike. Ọ bụrụ abụ, sị: “Site n’enyemaka gị, m pụrụ ịchụ ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ọsọ; site n’enyemaka Chineke m, m pụrụ ịrịgo mgbidi.” (Ọma 18:29) Anyị nwere ike inwe nsogbu ndị dị ka mgbidi ndị anyị na-agaghị ‘arịgoli’ ma ọ bụ merie n’ike nke aka anyị. Anyị ga-achọ ka Jehova nyere anyị aka.

11. Kọwaa otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka idi nsogbu anyị.

11 Gụọ Aịzaya 40:31. Ugo anaghị eji naanị ike ya efego elu elu ma fere gaa ebe dị anya. Ikuku ọkụ na-ala elu na-enyere ugo aka ifego elu, na-emekwa ka ike ghara ịgwụ ya. N’ihi ya, nsogbu tara akpụ bịara gị, cheta ugo. Rịọ Jehova ka o jiri “ihe inyeaka ahụ, bụ́ mmụọ nsọ” ya bulie gị elu ma ọ bụ nyere gị aka. (Jọn 14:26) Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ịrịọ Jehova mgbe ọ bụla ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Anyị kwesịkwara ịrịọ ya ka o nyere anyị aka karịchaa mgbe anyị na nwanna nwere nghọtahie. Ma, gịnị mere nwanna na nwanna ji enwe nghọtahie?

12, 13. (a) Gịnị na-eme ka nwanna na nwanna na-enwe nghọtahie? (b) Gịnị ka ihe mere Josef na-akụziri anyị gbasara Jehova?

12 Ihe mere mmadụ na ibe ya ji enwe nghọtahie bụ n’ihi na anyị niile ezughị okè. O nwere mgbe ụfọdụ ihe nwanna kwuru ma ọ bụ mee nwere ike ịkpasu anyị iwe. Anyị nwekwara ike ikwu ma ọ bụ mee ihe ga-akpasu nwanna iwe. Ihe a nwere ike ịghọrọ anyị ọnwụnwa. Jehova chọrọ ka anyị jiri ohere ahụ gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya otú ahụ anyị na-eme ma ọnwụnwa bịara anyị. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịmụta iso ụmụnna anyị Jehova hụrụ n’anya n’agbanyeghị na ha ezughị okè, na-emekọ ihe ọnụ n’udo.

Jehova echefughị Josef, ọ gaghịkwa echefu gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13 Jehova anaghị egbochi ọnwụnwa ịbịara ndị ohu ya. Ihe mere Josef gosiri na ọ bụ eziokwu. Mgbe ọ bụ nwa okorobịa, ụmụnne ya nweere ya anyaụfụ ma resị ya ndị Ijipt ka ọ gaa gbawa ohu ebe ahụ. (Jen. 37:28) Jehova hụrụ ihe ahụ ha mere. O dokwara anya na o wutere ya mgbe ọ hụrụ otú e si na-emekpọ Josef enyi ya ọnụ. Ma o nweghị ihe Jehova mere. Mgbe nwunye Pọtịfa boro Josef ebubo na ọ chọrọ idina ya n’ike, a tụba Josef n’ụlọ mkpọrọ, o nweghịkwa ihe Jehova mere. Ọ̀ pụtara na Jehova chefuziri ya? Mbanụ. Baịbụl kwuru na “Jehova na-emekwa ka ihe [Josef] na-eme na-aga nke ọma.”—Jen. 39:21-23.

14. Olee uru ndị ọ ga-abara anyị ma anyị “hapụ” ịna-ewe iwe?

14 Ihe atụ ọzọ bụ banyere Devid. Ọ bụ mmadụ ole na ole ka e merela ụdị ihe e mere ya. Ma, enyi Chineke a anọghị na-ebu iwe n’obi. Kama, o kwuru, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma; ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.” (Ọma 37:8) Ihe kacha mkpa mere anyị ga-eji “hapụ” iwe iwe bụ n’ihi na anyị na-eṅomi Jehova bụ́ onye na-adịghị “emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị.” (Ọma 103:10) Ma e nwekwara uru ‘ịhapụ’ iwe iwe na-abara anyị. Iwe nwere ike ime ka mmadụ nwewa ọbara mgbali elu na nsogbu iku ume. O nwekwara ike ime ka imeju, anyịnya ma ọ bụ elò na ihe ndị na-eme ka nri na-agbari ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma. Iwe jide anyị, anyị anaghị echekarị echiche nke ọma. Mgbe ụfọdụ, iwe nwere ike ime ka anyị daa mbà n’obi ruo ogologo oge. Ma Baịbụl kwuru na “obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” (Ilu 14:30) Oleezi ihe anyị ga-eme ma nwanna kpasuo anyị iwe, oleekwa otú anyị na ya ga-esi eme udo? Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ ime ihe Baịbụl kwuru.

MGBE ỤMỤNNA ANYỊ KPASURU ANYỊ IWE

15, 16. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma nwanna kpasuo anyị iwe?

15 Gụọ Ndị Efesọs 4:26. Ọ naghị eju anyị anya ma ndị ụwa mee anyị ihe ọjọọ. Ma, ọ bụrụ na nwanna ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị agwa anyị okwu ma ọ bụ mee anyị ihe wutere anyị, o nwere ike ịgbawa anyị obi. Ọ bụrụ na ọ dịghịrị anyị mfe ichefu ya, ànyị ga-ebuwe iwe n’obi ruo ọtụtụ afọ? Ka, ànyị ga-edozi nsogbu ahụ ngwa ngwa otú Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na anyị egbuo oge ịga ka anyị na nwanna anyị kpezie, ọ ga-eme ka o siere anyị ike ime udo.

16 Ka e were ya na nwanna kpasuru gị iwe, ya esiekwara gị ike ichefu ya. Olee ihe ndị i nwere ike ime ka gị na ya mee udo? Nke mbụ, kpesie ekpere ike. Gwa Jehova ka o nyere gị aka ka gị na nwanna ahụ nwee ike ikwurịta okwu nke ọma. Cheta na ọ bụ enyi Jehova. (Ọma 25:14) Chineke hụrụ ya n’anya. Jehova na-eji obiọma emeso ndị enyi ya ihe, ọ chọkwara ka anyị na-emeso ha otú ahụ. (Ilu 15:23; Mat. 7:12; Kọl. 4:6) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ichebara ihe ị chọrọ ikwu echiche tupu gị agaa. Echekwala na nwanna gị ma ụma mee gị ihe wutere gị. Burugodị ụzọ gaa ka unu kwurịta ya. Burukwa n’obi na e nwere ike inwe ebe gịnwa si mejọọ. I nwere ike isi otú a bido: “O nwere ihe ị gwara m ụnyaahụ. O nwere ike ịbụ na o kwesịghị inyewa m nsogbu ma o mere ka . . . ” Ọ bụrụ na unu edozilighị okwu ahụ mgbe ahụ, gbalịa gaa oge ọzọ ka gị na ya nwee ike ime udo. Tupu gị agaa ọzọ, na-ekpere nwanna ahụ ekpere, na-arịọ Jehova ka ọ gọzie ya. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka i lekwasị anya n’àgwà ọma ndị nwanna ahụ nwere. Obi kwesịrị isi gị ike na obi ga-atọ Jehova ụtọ na ị na-agba ezigbo mbọ ka gị na nwanna gị bụ́ enyi ya, mee udo.

MGBE OBI ANYỊ NA-AMA ANYỊ IKPE MAKA IHE ANYỊ MEJỌRỌ N’OGE GARA AGA

17. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ka anyị na ya dịghachi ná mma mgbe anyị mere mmehie dị oké njọ? Olee ihe mere anyị kwesịrị iji nabata aka ahụ ọ na-enye?

17 Mmehie dị oké njọ ụfọdụ ndị mere n’oge gara aga na-eme ka ha na-eche na ha erughị eru ife Jehova. Ọ bụrụ na obi anyị na-ama anyị ikpe, o nwere ike ime ka ahụ́ ghara ịna-eru anyị ala, anyị agaghị na-enwe obi ụtọ, ike ga na-agwụkwa anyị. E nwere mgbe obi Eze Devid nọ na-ama ya ikpe. O kwuru, sị: “Mgbe m gbara nkịtị, ike gwụrụ ọkpụkpụ m n’ihi ude m na-asụ ogologo ụbọchị dum. N’ihi na aka gị dị arọ n’ahụ́ m ehihie na abalị.” Ma, Devid katara obi mee ihe Jehova chọrọ ka ndị ohu ya mee ma ha mee mmehie. O kwuru, sị: “N’ikpeazụ, ekwupụtaara m gị mmehie m.” O kwukwara, sị: “Gị onwe gị gbaghaara m njehie m na mmehie m.” (Ọma 32:3-5) Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, Jehova dị njikere inyere gị aka ka gị na ya dịghachi ná mma. Ma ọ dị mkpa ka ị nabata aka ọ ga-esi n’ọgbakọ ya nyere gị. (Ilu 24:16; Jems 5:13-15) Egbukwala oge ime ihe i kwesịrị ime n’ihi na ndụ ebighị ebi gị dabeere na ya. Ka e were ya na a gbagharala gị mmehie gị kemgbe, ma obi gị ka na-ama gị ikpe, olee ihe ị ga-eme?

18. Olee otú ihe mere Pọl ga-esi enyere ndị obi ha ka na-ama ikpe n’ihi mmehie ha mere n’oge gara aga aka?

18 E nwere oge ụfọdụ Pọl onyeozi dara mbà n’obi n’ihi mmehie ndị o mere tupu ya aghọọ Onye Kraịst. O kwuru, sị: “Abụ m onye kasị nta n’ime ndịozi, ekwesịghịkwa m ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na akpagburu m ọgbakọ Chineke.” Ma Pọl kwukwara, sị: “Ma site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, abụ m ihe m bụ.” (1 Kọr. 15:9, 10) Jehova nabatara Pọl n’agbanyeghị ihe ndị o mejọrọ n’oge gara aga. Jehova chọkwara ka ọ ghọta na ya agbagharala ya. Ọ bụrụ na i sila n’ala ala obi gị chegharịa ná mmehie ndị i mere n’oge gara aga ma kwupụtara ya Jehova, kọọkwara ya ndị okenye, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova agbagharala gị. N’ihi ya, kwere na Jehova agbagharala gị.—Aịza. 55:6, 7.

19. Gịnị bụ isiokwu afọ 2018, gịnịkwa mere o ji daba adaba?

19 Ka anyị na-eru n’ọgwụgwụ ụwa a, anyị ga na-atụ anya na ihe ga na-akawanye njọ. Ma, anyị kwesịrị icheta na Onye ahụ ‘na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike; na-emekwa ka onye na-enweghị ike nwee ume nke ukwu,’ ga-enye anyị ihe ọ bụla ga-adị anyị mkpa iji nọgide na-efe ya. (Aịza. 40:29; Ọma 55:22; 68:19) Anyị ga na-echeta ihe a mgbe ọ bụla anyị bịara ọmụmụ ihe n’afọ a ma lee anya n’ebe e dere isiokwu afọ 2018. Isiokwu ya bụ: “Ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enwetaghachi ike.”Aịza. 40:31.