Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Anyi Ga-eji Enye Jehova Chineke Onyinye?

Gịnị Mere Anyi Ga-eji Enye Jehova Chineke Onyinye?

“Chineke anyị, anyị na-ekele gị ma na-eto aha ọma gị.”—1 IHE 29:13.

ABỤ: 80, 50

1, 2. Olee otú Jehova si emesapụ aka?

JEHOVA bụ Chineke na-emesapụ aka. Ihe niile anyị nwere si n’aka ya. Ọ bụ ya nwe ọlaọcha na ọlaedo nakwa akụ̀ ndị ọzọ dị n’ụwa. Ọ na-ejikwa ụfọdụ n’ime ha enyere ihe ndị dị ndụ aka. (Ọma 104:13-15; Hag. 2:8) E nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru otú Jehova si jiri akụ̀ ndị ahụ rụọ ọrụ ebube iji gbooro ndị ya mkpa ha.

2 Jehova nyere ndị Izrel mana na mmiri ruo afọ iri anọ mgbe ha nọ n’ala ịkpa. (Ọpụ. 16:35) N’ihi ya, “ọ dịghị ihe kọrọ ha.” (Nehe. 9:20, 21) Jehova si n’aka Ịlaịsha onye amụma mee ka obere mmanụ nke otu nwaanyị di ya nwụrụ mụbaa. Ihe a Chineke meere nwaanyị a na-atụ egwu ya mere ka ọ kwụchaa ụgwọ o ji, ya enweekwa ego fọrọ ya na ụmụ ya ji na-eri nri. (2 Eze 4:1-7) Jehova mekwara ka Jizọs jiri ọrụ ebube nye ndị mmadụ nri, nyekwa ha ego mgbe ọ dị mkpa.—Mat. 15:35-38; 17:27.

3. Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

3 Jehova nwere ike iji ihe ọ bụla masịrị ya nyere ihe ndị o kere eke aka. Ma, ọ chọkwara ka ndị ohu ya jiri ihe ndị ha nwere na-akwado ọrụ nzukọ ya na-arụ. (Ọpụ. 36:3-7; gụọ Ilu 3:9.) Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị nye ya ihe ndị o nyere anyị? Olee otú ndị ohu Chineke n’oge ochie si jiri ihe ndị ha nwere rụọrọ Chineke ọrụ? Olee ihe nzukọ Jehova na-eji ego ndị e nyere n’onyinye eme taa? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI ENYE JEHOVA ONYINYE?

4. Olee ihe anyị na-egosi Jehova ma anyị na-akwado ọrụ ya?

4 Anyị na-enye Jehova onyinye n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ndị ọ na-emere anyị. Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị chebara ihe ọma niile Jehova meere anyị echiche. Mgbe Eze Devid na-agwa ndị Izrel ihe ndị a chọrọ iji rụọ ụlọ nsọ Chineke, o kwuru na ihe niile anyị nwere si n’aka Jehova, nakwa na ihe ọ bụla anyị nyere ya bụ ihe o nyere anyị.—Gụọ 1 Ihe E Mere 29:11-14.

5. Olee otú Baịbụl si gosi na iji obi anyị niile na-enye onyinye bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si efe Chineke?

5 Inye Chineke onyinye bụ otu ụzọ anyị si efe ya. N’ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi, ọ nụrụ ka ndị ohu Jehova nọ n’eluigwe na-ekwu, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” (Mkpu. 4:11) N’eziokwu, anyị kwesịrị inye Jehova otuto na nsọpụrụ niile. Otú anyị ga-esi eme ya bụ inye ya ihe ndị kacha mma anyị nwere. Jehova si n’aka Mozis gwa ụmụ Izrel ka ha bịa n’ihu ya n’ememme atọ ha na-eme kwa afọ. Otu ụzọ ha si efe Chineke n’ememme ndị ahụ bụ inye ya ihe ndị ha nwere. A gwara ha ka ha ghara ‘ịgba aka bịa n’ihu Jehova.’ (Diut. 16:16) Taa, iji obi anyị niile na-enye onyinye bụ otu ụzọ anyị si efe Jehova. Ime otú ahụ na-egosi na anyị na-akwado ọrụ nzukọ Jehova na-arụ nakwa na anyị ji ya kpọrọ ihe.

6. Gịnị mere inye onyinye ji dị mma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Ọ dị mma ka anyị na-enye onyinye. Iji obi anyị niile na-enye onyinye, ọ bụghị naanị ịnara anara, na-abara anyị uru. (Gụọ Ilu 29:21.) Chegodị banyere nwatakịrị si n’obere ego ndị mụrụ ya nyere ya zụta ihe ma nye ha. Olee otú obi ga-adị ndị mụrụ ya? Ma ọ bụ chegodị banyere otu onye ọsụ ụzọ na-eto eto ya na ndị mụrụ ya bi nke nyere ha ego iji nyere ha aka kwụọ ụgwọ ụlọ ma ọ bụ zụta ihe ha ga-eri. Ọ bụ eziokwu na ha atụghị anya na ọ ga-enye ha ego a, ha nwere ike ịnara ya ego ahụ n’ihi na ọ bụ otú nwa ahụ si egosi na obi dị ya ụtọ maka ihe niile ha na-emere ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jehova. Ọ ma na isi n’ihe ndị anyị nwere na-enye onyinye baara anyị uru.

OTÚ NDỊ OHU CHINEKE SI NYE ONYINYE N’OGE OCHIE

7, 8. Olee otú ndị ohu Chineke n’oge ochie si nye onyinye (a) mgbe e nwere ihe a chọrọ ịrụ? (b) iji kwado ọrụ Chineke?

7 Baịbụl gwara anyị na ndị ohu Chineke si n’ihe ndị ha nwere nye onyinye iji kwado ọrụ ya. N’oge ụfọdụ, ndị Chineke nyere onyinye mgbe e nwere ihe a chọrọ ịrụ. Dị ka ihe atụ, Mozis gwara ndị Izrel ka ha nye onyinye iji rụọ ụlọikwuu. Ka oge na-aga, Eze Devid gwakwara ndị Izrel ka ha nye onyinye maka ịrụ ụlọ nsọ Chineke. (Ọpụ. 35:5; 1 Ihe 29:5-9) Mgbe Eze Jehoash na-achị, ndị nchụàjà ji ego ndị Izrel nyere n’onyinye rụzigharịa ụlọ Jehova. (2 Eze 12:4, 5) N’oge ndịozi Jizọs, mgbe Ndị Kraịst nụrụ na ụnwụ dara na Judia nakwa na ụmụnna nọ ebe ahụ chọrọ ka a gbatara ha ọsọ enyemaka, ha “kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka o nwere ike inye, izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.”—Ọrụ 11:27-30.

8 E nwekwara mgbe ndị ohu Chineke nyere ihe ha nwere iji kwado ndị na-elekọta ọrụ Jehova. Dị ka ihe atụ, n’Iwu Mozis, e kenyere ebo niile ala, ma e kenyeghị ndị Livaị. Kama, ndị Izrel na-enye ha otu ụzọ n’ụzọ iri ka ha nwee ike iji obi ha niile na-arụ ọrụ n’ụlọikwuu ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 18:21) Otú ahụkwa ka ụmụ nwaanyị ụfọdụ si jiri ihe ndị ha nwere kwado Jizọs na ndịozi ya.—Luk 8:1-3.

9. Olee otú ndị ohu Chineke n’oge ochie si enweta onyinye?

9 E nwere ụzọ dị iche iche ha si nweta onyinye ndị ahụ. Mgbe ndị Izrel na-enye onyinye iji rụọ ụlọikwuu, ọ ga-abụ na ihe ndị ha nwetara n’ala Ijipt so n’ihe ndị ha nyere n’onyinye. (Ọpụ. 3:21, 22; 35:22-24) N’oge ndịozi Jizọs, ụfọdụ Ndị Kraịst rere ihe ndị ha nwere, dị ka ala ha ma ọ bụ ụlọ ha ma wetara ndịozi ego ha retara na ha. Ndịozi ji ego ndị ahụ nyere ụmụnna ndị nọ ná mkpa aka. (Ọrụ 4:34, 35) Ndị Kraịst ndị ọzọ na-ewepụtakwa ego iche iji nye onyinye maka ọrụ ndị a na-arụrụ Jehova. (1 Kọr. 16:2) Ma ndị dara ogbenye ma ndị bara ọgaranya nyere onyinye.—Luk 21:1-4.

OTÚ ANYỊ SI ENYE ONYINYE TAA

10, 11. (a) Olee otú anyị ga-esi eṅomi ndị ohu Chineke ji obi ha niile nye onyinye n’oge ochie? (b) Olee otú obi na-adị gị ma ị na-akwado ọrụ Alaeze ndị a na-arụ?

10 Taa, e nwekwara ike ịgwa anyị ka anyị nye onyinye ma e nwee ihe a chọrọ ịrụ. Dị ka ihe atụ, à na-eme ndokwa ịrụrụ ọgbakọ unu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ? Ka à na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze unu? O nwekwara ike ịbụ na a chọrọ ịrụzigharị alaka ụlọ ọrụ anyị. Anyị nwekwara ike inye onyinye maka ihe ndị a na-emefu ná mgbakọ ukwu, ma ọ bụ ịgbatara ụmụnna ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. Anyị na-enyekwa onyinye iji lekọta ndị na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ anyị, nakwa n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche. A na-ejikwa onyinye ndị anyị na-enye elekọta ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, nakwa ndị nlekọta sekit. O nwekwara ike ịbụ na o nwere ego ọgbakọ unu kwuru na ha ga na-enye iji nye aka na-arụ Ụlọ Mgbakọ na Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụwa niile. Ụlọ ndị a na-abara ụmụnna anyị uru n’ụwa niile.

11 Anyị niile nwere ike inye onyinye iji kwado ọrụ nzukọ Jehova na-arụ n’oge ikpeazụ a. Ọtụtụ ndị na-enye onyinye ndị a anaghị achọ ka a mata aha ha. Anyị tinye ego n’igbe onyinye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ si na jw.org nye onyinye, anyị anaghị achọ ka ndị ọzọ mara ego ole anyị nyere. Anyị nwere ike na-eche na obere ego anyị nyere n’onyinye agaghị abacha uru. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ obere ego obere ego ọtụtụ mmadụ na-enye ka e si enweta ihe ka ukwuu n’ego ndị nzukọ a ji eme ihe, ọ bụghị ná nnukwu ego mmadụ ole na ole na-enye. Ụmụnna anyị, ma ndị na-enweghị ka ọ hà ha na-eṅomi Ndị Kraịst oge ochie nọ na Masedonia. Ndị Kraịst oge ochie a “dara ogbenye nke ukwuu,” ma ha rịọrọ ka e kwe ha nye onyinye, ha jikwa obi ha niile mee otú ahụ.—2 Kọr. 8:1-4.

12. Olee otú nzukọ Jehova si na-agbalị iji ego ndị mmadụ na-enye n’onyinye eme ihe?

12 Òtù Na-achị Isi kwesịrị ntụkwasị obi ma nweekwa uche n’otú ha si eji ego ndị mmadụ nyere n’onyinye eme ihe. (Mat. 24:45) Ha na-akapị ihe ndị a chọrọ iji ego ndị ahụ eme ọnụ, jirikwa ha mee ha. (Luk 14:28) N’oge ochie, ndị na-elekọta ego ndị mmadụ na-enye n’onyinye na-eji ego ndị ahụ eme ihe e ji maka ha nye ha. Dị ka ihe atụ, Ezra bu ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze Peshia nyere maka ịrụghachi ụlọ nsọ gaa Jeruselem. Ọnụ ego ihe ndị ahụ ugbu a karịrị ijeri naịra iri atọ na isii. Ezra weere onyinye ndị a ka onyinye e nyere Jehova. N’ihi ya, o kwuru ihe a ga-eme ka ihe ọ bụla ghara ime ihe ndị ahụ n’okporo ụzọ ọjọọ ha si na-ala. (Ezra 8:24-34) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Pọl onyeozi ji ego ndị e nwetara n’onyinye nyere ụmụnna ndị nọ ná mkpa na Judia aka. Ọ hụrụ na ndị wegara ego ndị ahụ ‘mere ihe n’eziokwu, ọ bụghị naanị n’anya Jehova, kamakwa n’anya ụmụ mmadụ.’ (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:18-21.) Taa, nzukọ Jehova na-eme ihe a Ezra na Pọl mere. Ha na-elezi anya n’otú ha si eji ego ndị mmadụ na-enye n’onyinye na-eme ihe.

13. Olee otú anyị kwesịrị isi were mgbanwe nzukọ Jehova mere n’oge na-adịbeghị anya?

13 Ezinụlọ nwere ike gbanwee otú ha si emefu ego ka mmefu ha ghara ịka mkpata ha. Ha nwere ike chọọ ụzọ ha ga-esi sepụ aka n’ihe ụfọdụ na-eri ha ego ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Nzukọ Jehova na-emekwa ụdị ihe a taa. N’oge na-adịbeghị anya, e nweela ọtụtụ ọrụ ọhụrụ ndị a na-arụ. Mgbe ụfọdụ, ha emefuo ego karịa ego ha nwetara n’onyinye. Nzukọ Jehova dị ka ezinụlọ. Ha na-achọ ụzọ ha ga-esi ebelata ego ndị a na-emefu ma mee ka ọrụ dịkwuo mfe ka ha nwee ike iji ego ndị mmadụ ji obi ha niile na-enye n’onyinye mee ihe ndị kacha mkpa.

OTÚ Ị GA-ESI RITE URU N’ONYINYE NDỊ Ị NA-ENYE

E ji onyinye ị na-enye na-akwado ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16)

14-16. (a) Olee ụfọdụ ihe a na-eji onyinye ndị ị na-enye na-eme? (b) Olee otú ihe ndị a sirila baara gị uru?

14 Ọtụtụ ụmụnna nọrọla n’ọgbakọ ọtụtụ afọ ekwuola na anyị na-enweta ọtụtụ ihe n’aka nzukọ Jehova ugbu a karịa n’oge mbụ. Ugbu a, anyị nwere jw.org na Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. A na-ebipụtakwu Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’ọtụtụ asụsụ. N’afọ 2014 ruo ná mbido afọ 2015, e mere mgbakọ mba niile nke were abalị atọ n’ụfọdụ ámá egwuregwu ndị kacha buo ibu n’obodo iri na anọ. Isiokwu mgbakọ ahụ bụ “Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Chineke.” Obi tọgburu ndị bịara ya atọgbu.

15 Ọtụtụ ndị ekwuola na obi dị ha ụtọ maka ihe nzukọ Jehova na-enye anyị. Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye na-eje ozi n’otu obodo dị n’Eshia kwuru banyere Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova, sị: “Anyị na-eje ozi n’otu obere obodo. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, ọ na-adị anyị ka ọ̀ bụ naanị anyị na-eje ozi a, ya emee ka anyị chefuo na anyị nwere ọtụtụ ụmụnna n’ụwa niile sokwa na-eje ozi a. Ma, ozugbo anyị lere ihe omume dị iche iche a na-eme n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova, anyị na-echeta na anyị so n’ụmụnna anyị nọ n’ụwa dum. Obi na-atọgbu ụmụnna anyị atọgbu maka Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. Anyị na-anụkarị ka ha na-ekwu na ha lechaa ihe omume ndị a na-eme kwa ọnwa, ọ na-eme ka ha bịarukwuo Òtù Na-achị Isi nso. Obi na-atọ ha ụtọ ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ, na ha bụ Ndịàmà Jehova.”

16 N’ụwa niile, a na-arụ ma ọ bụ na-arụzigharị ihe fọrọ obere ka o ruo puku Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ na narị ise. Mgbe otu ọgbakọ nọ ná Họnduras malitere ịmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ a rụụrụ ha, ha kwuru, sị: “Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị so n’ezinụlọ Chineke, nakwa na anyị na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile dị n’otu, n’ihi na ọ bụ ya mere e ji rụọrọ anyị Ụlọ Nzukọ Alaeze a anyị nọ na-atụ anya ya kemgbe.” Ọtụtụ ụmụnna ekwuokwala na obi dị ha ụtọ mgbe ha nwetara Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ a sụgharịrị n’asụsụ ha, mgbe ụmụnna gbataara ha ọsọ enyemaka, ma ọ bụ mgbe ha hụrụ otú akwụkwọ anyị a na-edosa n’ebe na-ekwo ekwo, nakwa ozi ọma a na-ezi n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị si na-enyere ndị mmadụ aka n’obodo ha.

17. Olee otú ihe nzukọ a na-arụ si egosi na Jehova na-akwado ya?

17 Ọ na-esiri ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ike ikweta ma ha nụ na ọ bụ naanị ego anyị na-enye n’onyinye ka anyị ji arụ ihe niile anyị na-arụ. Mgbe otu onyeisi ọrụ nke otu nnukwu ụlọ ọrụ bịara n’alaka ụlọ ọrụ anyị, e dugharịchaa ya, o juru ya anya na a naghị akwụ ndị na-eje ozi na ya ụgwọ, nakwa na anyị anaghị agba ọnyà ego, kama, ọ bụ onyinye si ndị mmadụ n’obi ka anyị ji enweta ego anyị ji na-arụ ihe niile anyị na-arụ. O kwuru na ya ekwetaghị na ọ bụ naanị ego ndị mmadụ nyere n’onyinye ka anyị ji na-arụ ihe ndị a. Anyị kwetara ihe a o kwuru. Anyị ma na ihe mere anyị ji arụ ihe niile a bụ n’ihi na Jehova na-akwado ya.—Job 42:2.

URU INYE JEHOVA IHE NDỊ O NYERE ANYỊ NA-ABARA ANYỊ

18. (a) Olee ngọzi ndị anyị na-enweta ma anyị na-akwado Alaeze Chineke? (b) Olee otú anyị ga-esi kụziere ụmụ anyị na ndị ọhụrụ ịna-eme otú ahụ?

18 Jehova kwanyeere anyị ùgwù ma kwe ka anyị na-akwado ọrụ Alaeze a na-arụ n’ụwa niile. O kwere anyị nkwa na ya ga-agọzi anyị ma anyị na-eme otú ahụ. (Mal. 3:10) Jehova kwukwara na ya ga-agọzi onye na-emesapụ aka. (Gụọ Ilu 11:24, 25.) Inye ihe na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ, n’ihi na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Ma, anyị nwere ike isi n’ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme na-akụziri ụmụ anyị na ndị ọhụrụ otú ha ga-esi na-enye onyinye maka ọrụ ndị a na-arụ, Jehova agọziekwa ha mmaji kwuru mmaji.

19. Olee otú isiokwu a sirila gbaa gị ume?

19 Ihe niile anyị nwere si n’aka Jehova. Inye ya ihe ndị o nyere anyị gosiri na anyị hụrụ ya n’anya nakwa na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọma ndị o meere anyị. (1 Ihe 29:17) Mgbe ndị Izrel na-enye onyinye iji rụọ ụlọ nsọ Chineke, ha ‘ṅụrịrị ọṅụ n’ihi onyinye afọ ofufo ha nyere, n’ihi na ha ji obi zuru ezu nye Jehova onyinye afọ ofufo.’ (1 Ihe 29:9) Ka anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe anyị na-enye Jehova ihe ndị o nyere anyị.