Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

À na-eji ihe ndị e kwuru n’Iwu Mozis na-edozi okwu ndị mmadụ na-ese kwa ụbọchị n’Izrel oge ochie?

MGBE ỤFỌDỤ, a na-eji ha edozi esemokwu. Tụlee ihe atụ a. Diuterọnọmi 24:14, 15 kwuru, sị: “Erigbula onye ọrụ e goro ego nke nọ ná nsogbu, nke dakwara ogbenye, ma ọ bụ otu n’ime ụmụnne gị ma ọ bụ otu n’ime ndị mbịarambịa, bụ́ ndị nọ n’ala gị . . . Ka o wee ghara itiku Jehova n’ihi gị, ọ ga-aghọkwara gị mmehie.”

Iberibe ite ụrọ ahụ e dere arịrịọ ahụ onye e goro ọrụ iwe ihe ubi rịọrọ

E nwere otu arịrịọ a hụrụ e dere n’otu iberibe ite ụrọ a kpụrụ ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii gara aga. A hụrụ ya n’ebe dị nso n’obodo Ashdọd. Ọ dị ka ọ̀ bụ ihe mmadụ nyeere onye ọrụ ugbo e goro ọrụ aka degara gọvanọ obodo ha. A sịrị na o nyeghị onye goro ya n’ọrụ ihe ubi ole a chọrọ ka o wee n’ụbọchị. Ihe ahụ e dere n’ite ụrọ ahụ bụ: “Mgbe ohu gị [onye na-arịọ arịrịọ a] wechara ihe ubi a sịrị ya wee ma chekwaa ha abalị ole na ole gara aga, Hoshayahu nwa Shobay bịara chịrị uwe ohu gị. . . . Ndị niile mụ na ha so wee ihe ubi n’oké anwụ ga-agbara m akaebe.  . . na m kwuru eziokwu. Aka m dị ọcha n’ihe ọ bụla a sịrị na m mere. Ọ bụrụ na gịnwa bụ́ gọvanọ echeghị na i kwesịrị ime ka a chịghachịrị ohu gị uwe ya, biko, meere m ebere mee ka a chịghachịrị m ya. Agbala nkịtị ebe ọ bụ na a chịịrị uwe ohu gị.”

Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Simon Schama kwuru, sị: “Ihe arịrịọ a na-egosi anyị abụghị naanị na onye ahụ e goro ọrụ iwe ihe ubi chọsiri ike ka a chịghachịrị ya [uwe ya]. Kama, ọ na-egosikwa na ọ ma iwu ndị dị na Baịbụl, karịchaa ndị nke dị na Levitikọs na Diuterọnọmi kwuru gbasara imegbu ndị ogbenye.”