Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ụdị Ịhụnanya Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ezigbo Obi Ụtọ?

Olee Ụdị Ịhụnanya Na-eme Ka Mmadụ Na-enwe Ezigbo Obi Ụtọ?

“Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova.”—ỌMA 144:15.

ABỤ: 111, 109

1. Gịnị mere oge anyị a ji pụọ iche?

ANYỊ bi n’oge pụrụ nnọọ iche. O nwetụbeghị oge dị ka ya kemgbe ụwa. Baịbụl kwuru na Jehova na-achịkọta “oké ìgwè mmadụ . . . si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta.” Ha bụ “mba dị ike” nke karịrị nde mmadụ asatọ obi dị ụtọ. Ha ‘na-ejekwara Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị.’ (Mkpu. 7:9, 15; Aịza. 60:22) E nwetụbeghị mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya otú a.

2. Olee ụdị ịhụnanya e ji amata ndị na-anaghị efe Chineke? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Baịbụl kwukwara na n’oge anyị a, a ga-enwe ụdị ịhụnanya e ji amata ndị na-anaghị efe Chineke. Ọ bụ mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Pọl onyeozi kwuru, sị: “N’oge ikpeazụ . . . , ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Tim. 3:1-4) Ụdị ịhụnanya a dị iche n’ịhụnanya a chọrọ ka Ndị Kraịst nwee. Mmadụ ịchọ naanị ihe ga-abara ya uru anaghị eme ka onye ahụ na-enwe obi ụtọ o chere na ya ga-enwe. Kama, ọ na-eme ka ndị mmadụ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru, ya emee ka ihe na-esiri ndị mmadụ ike.

3. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a? N’ihi gịnịkwa?

3 Pọl ma na ọtụtụ ndị ga na-ahụ naanị onwe ha n’anya, nakwa na o nwekwara ike ịkpa Ndị Kraịst aka ọjọọ. Ọ bụ ya mere o ji dọọ anyị aka ná ntị ka anyị “zere” ndị nwere ụdị ịhụnanya a. (2 Tim. 3:5) Ma, anyị agaghị ezereli ha kpamkpam. Oleezi ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-akpa àgwà ndị ụwa na-akpa ma na-eme ihe dị Chineke nke ịhụnanya, mma? Ka anyị tụlee ihe dị iche n’ịhụnanya Chineke chọrọ ka anyị nwee na ịhụnanya e kwuru okwu ya na 2 Timoti 3:2-4. Ọ ga-eme ka anyị lezie onwe anyị anya ma chọpụta otú anyị nwere ike isi na-egosi ụdị ịhụnanya nke ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ.

MMADỤ ỊHỤ CHINEKE N’ANYA KA Ọ̀ BỤ ỊHỤ NAANỊ ONWE YA N’ANYA?

4. Gịnị mere na ọ dịghị njọ ịhụ onwe anyị n’anya?

4 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.” Ọ̀ dị njọ anyị ịhụ onwe anyị n’anya? Mba. Anyị kwesịrị ịhụ onwe anyị n’anya. Jehova kere anyị ka anyị hụ onwe anyị n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mak 12:31) Ọ bụrụ na anyị ahụghị onwe anyị n’anya, anyị agaghị ahụ ndị agbata obi anyị n’anya. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.” (Efe. 5:28, 29) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ onwe anyị n’anya.

5. Olee otú ị ga-esi akọwa ndị hụrụ onwe ha n’anya gabiga ókè?

5 Ịhụnanya e kwuru okwu ya na 2 Timoti 3:2 adịghị mma. Ọ bụ mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ndị hụrụ onwe ha n’anya gabiga ókè na-eche gbasara onwe ha karịa otú ha kwesịrị iche. (Gụọ Ndị Rom 12:3.) Ihe bụ́ mkpa ha bụ onwe ha. Ha achọchaghị ịma gbasara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ha mejọọ ihe, ha na-ata ndị ọzọ ụta, kama ikweta na ha mejọrọ ihe. Ụdị ndị ahụ anaghị enwe ezigbo obi ụtọ.

6. Olee uru ịhụ Chineke n’anya ga-abara anyị?

6 Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na Pọl bu ụzọ kwuo banyere mmadụ ịhụ naanị onwe ya n’anya n’ihi na ọ bụ ya na-eme ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ ndị ọzọ o mechara kwuo okwu ha. Ma, ụdị ịhụnanya Chineke chọrọ ka anyị na-enwe na-eme ka anyị na-akpa àgwà ọma. Baịbụl kwuru na ọ na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ, udo, ndidi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye. (Gal. 5:22, 23) Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova.” (Ọma 144:15) Jehova bụ Chineke obi ụtọ, ndị na-efe ya na-enwekwa obi ụtọ. Ndị ohu Jehova na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-enye ndị ọzọ ihe. Ma ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya ma na-achọ ka ndị ọzọ na-enye ha enye anaghị enwe ụdị obi ụtọ a.—Ọrụ 20:35.

Olee otú anyị ga-esi ghara ịhụ naanị onwe anyị n’anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịchọpụta ma ànyị hụrụ Chineke n’anya?

7 Olee otú anyị ga-esi amata ma ànyị ahụwala onwe anyị n’anya karịa otú anyị hụrụ Chineke? Chegodị banyere ndụmọdụ a dị ná Ndị Filipaị 2:3, 4. Ebe ahụ kwuru ka anyị “ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-eme ihe a e kwuru ebe a? M̀ na-agbalịsi ike ime ihe Chineke chọrọ ka m na-eme? M̀ na-achọ ụzọ m ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka ma n’ọgbakọ ma n’ozi ọma?’ Ọ naghị adịcha mfe anyị iwepụta oge na iji ike anyị na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ pụtara na anyị ga-agbasi mbọ ike ma hapụ ihe ụfọdụ na-eme anyị obi ụtọ. Ma, ò nwere ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ karịa ịmata na ihe anyị na-eme na-amasị Ọkaakaa eluigwe na ụwa?

8. Olee ihe ụfọdụ ndị merela n’ihi na ha hụrụ Chineke n’anya?

8 Ụfọdụ Ndị Kraịst ahapụla ezigbo ọrụ ha na-arụ nke gaara eme ka ha baa ọgaranya. Ihe mere ha ji mee ya bụ na ha hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ijekwuru ya ozi. Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Ericka bụ dọkịta. Ma, kama ịchọwa ka ọ bụrụ onye ukwu n’ọrụ ya, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile. Ya na di ya ejeekwala ozi n’ọtụtụ mba. O kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe anyị mụtara n’ozi anyị jere ná mba ndị ahụ nakwa ndị enyi anyị metara emeela ka ndụ anyị kakwuo mma. M ka na-arụ ọrụ dọkịta, ma m na-eji oge buru ibu na ike m na-akụziri ndị mmadụ banyere Jehova, na-enyekwara ụmụnna anyị aka. Ihe ndị a m na-eme emeela ka m na-enwe obi ụtọ, obi eruokwa m ala.”

ỊKPAKỌBA AKỤ̀ N’ELUIGWE KA Ọ̀ BỤ N’ỤWA?

9. Gịnị mere ịhụ ego n’anya anaghị eme ka mmadụ nwee obi ụtọ?

9 Pọl kwuru na ndị mmadụ ga-abụ “ndị hụrụ ego n’anya.” Afọ ole na ole gara aga, otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ bi n’Ayaland gwara otu nwoke okwu banyere Chineke. Nwoke ahụ wepụtara obere akpa o ji, si na ya wepụta ego, welie ya elu ma kwuo, sị: “Ihe a bụ chi m.” Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị agaghị ekwu ihe a nwoke a kwuru n’ihu ọha, ma ha hụrụ ego na ihe ndị a na-eji ego azụ n’anya. Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.” (Ekli. 5:10) Ego anaghị eju ụdị ndị ahụ afọ. Ka ha na-agbalị inweju ya enweju, ha na-akpatara onwe ha “ọtụtụ ihe mgbu.”—1 Tim. 6:9, 10.

10. Gịnị ka Egọ kwuru banyere ịba ọgaranya na ịda ogbenye?

10 Nke bụ́ eziokwu bụ na ego dị anyị niile mkpa. Ọ na-echebe anyị mgbe ụfọdụ. (Ekli. 7:12) Ma, onye nwere naanị ihe na-ezuru ya, ò nwere ike inwe obi ụtọ? Eheenụ. (Gụọ Ekliziastis 5:12.) Egọ nwa Jeke kwuru, sị: “Emela ka m daa ogbenye, enyekwala m akụnụba. Ka m rie nri e kenyere m.” Anyị nwere ike ịghọta ihe mere o ji kwuo na ya achọghị ịda ogbenye. Ọ gara n’ihu ikwu na ọ chọghị izu ohi n’ihi na ọ ga-eme ka a kpọọ Chineke aha ọjọọ. Ma, gịnị mere o ji kpee ekpere ka Chineke ghara inye ya akụnụba? O kwuru, sị: “Ka afọ ghara iju m, m wee gọnahụ gị, sị: ‘Ònye bụ Jehova?’” (Ilu 30:8, 9) O nwere ike ịbụ na ị ma ndị tụkwasịrị akụnụba ha obi kama ịtụkwasị Chineke obi.

11. Olee ihe Jizọs kwuru banyere ego?

11 Ndị hụrụ ego n’anya enweghị ike ịhụ Chineke n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” Ma, o bu ụzọ kwuo, sị: “Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa, ebe nla na nchara na-erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-awabakwa zuo ohi. Kama nke ahụ, na-akpakọbaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe, ebe nla ma ọ bụ nchara na-adịghị erichapụ ihe, ebe ndị ohi na-adịghịkwa awaba zuo ohi.”—Mat. 6:19, 20, 24.

12. Olee otú mmadụ ịhapụ ibi ndụ okomoko ga-esi eme ka ọ dịrị ya mfe ijere Chineke ozi? Nye ihe atụ.

12 Ọtụtụ ndị ohu Chineke na-agbalị ka ha ghara ibi ndụ okomoko. Ha achọpụtala na ime otú ahụ na-eme ka ha nwekwuo oge ijere Jehova ozi, na-emekwa ka ha na-enwekwu obi ụtọ. Otu nwanna bi n’Amerịka aha ya bụ Jack rere nnukwu ụlọ ya na ụlọ ọrụ ya ka o nwee ike iso nwunye ya na-asụ ụzọ. O kwuru, sị: “Ọ dịghịrị anyị mfe ire ụlọ anyị na ihe ndị anyị nwere n’obodo anyị. Ma, afọ ndị ahụ anyị bi n’ụlọ anyị ahụ, ọ na-abụ m gachaa ọrụ lọta, ike ụwa na-agwụ m n’ihi nsogbu ndị m nwere n’ụlọ ọrụ m. Ma nwunye m bụ́ ọsụ ụzọ na-enwekarị obi ụtọ. Ọ na-ekwu, sị: ‘O nweghị ihe dị ka mmadụ ịrụrụ Jehova ọrụ.’ Ugbu a m so ya na-asụ ụzọ, mụ na ya na-arụrụ otu Onye ahụ ọrụ, ya bụ, Jehova.”

Olee otú anyị ga-esi ghara ịhụ ego n’anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta otú anyị si ele ego anya?

13 Ka anyị nwee ike ịchọpụta otú anyị si ele ego anya, anyị nwere ike iji obi anyị niile jụọ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Otú m si ebi ndụ, ọ̀ na-egosi na m kwetara ihe Baịbụl kwuru banyere ego? Ịchụ ego, ọ̀ bụ ya kacha m mkpa ná ndụ? M̀ ji adị m ná mma mụ na Jehova na ndị mmadụ kpọrọ ihe karịa ịchụ akụnụba? M̀ tụkwasịrị Jehova obi n’eziokwu na ọ ga-egboro m mkpa m?’ Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agaghị agbahapụ ndị tụkwasịrị ya obi.—Mat. 6:33.

ÀNYỊ HỤRỤ JEHOVA N’ANYA KA Ọ̀ BỤ NTỤRỤNDỤ?

14. Olee otú anyị kwesịrị isi ele ntụrụndụ anya?

14 Ọtụtụ ndị taa “hụrụ ihe ụtọ n’anya” dị ka Baịbụl kwuru. Otú ahụ ọ na-adịghị njọ mmadụ ịhụ onwe ya n’anya na inweta ego o ji egbo mkpa ya, ka ọ na-adịghịkwa njọ ịtụrụ ndụ. Jehova achọghị ka anyị na-ata ndụ anyị ahụhụ, ma ọ bụ ghara ime ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Baịbụl gwara ndị ohu Jehova, sị: “Gaa jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa obi aṅụrị ṅụọ mmanya gị.”—Ekli. 9:7.

15. Gịnị ka mmadụ ‘ịhụ ihe ụtọ n’anya’ pụtara?

15 Na 2 Timoti 3:4, Baịbụl kwuru banyere ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya ma hapụ ịhụ Chineke n’anya. Buru n’obi na amaokwu ahụ ekwughị na ndị mmadụ ga-ahụ ihe ụtọ n’anya karịa otú ha hụrụ Chineke n’anya. Ọ bụrụ na o kwuru otú ahụ, ọ pụtara na ha hụtụrụ Chineke n’anya. Ma, ihe amaokwu ahụ kwuru bụ ‘kama ịhụ Chineke n’anya.’ Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Amaokwu a anaghị ekwu na ha hụtụrụ Chineke n’anya. Kama, ọ na-ekwu na ha ahụtụdịghị Chineke n’anya.” Ihe a bụ ihe e kwuru iji dọọ ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya aka ná ntị. Baịbụl kọwara “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya” dị ka ndị “ihe ụtọ dị iche iche nke ndụ na-adọpụ uche ha.”—Luk 8:14.

16, 17. Olee ihe Jizọs mere iji gosi otú anyị ga-esi na-ele ntụrụndụ anya?

16 Jizọs gosiri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ele ntụrụndụ anya. Ọ gara “oriri alụmdi na nwunye,” gaakwa “oké oriri” e meere ya. (Jọn 2:1-10; Luk 5:29) N’otu agbamakwụkwọ ọ gara, o mere ka mmiri ghọọ mmanya mgbe mmanya ha gwụrụ. N’oge ọzọ mgbe ndị mmadụ na-akatọ ya n’ihi na ọ na-eri ihe na-aṅụkwa mmanya, o mere ka o doo ha anya na mmadụ ịtụrụ ndụ adịghị njọ.—Luk 7:33-36.

17 Ma ihe kacha Jizọs mkpa ná ndụ abụghị ịtụrụ ndụ. O butere ife Jehova ụzọ ná ndụ ya, meekwa ihe niile o nwere ike ime iji nyere ndị ọzọ aka. O ji obi ya niile nwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ ka ọ zọpụta ụmụ mmadụ. Jizọs gwara ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, na-aghagide unu ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide unu n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.”—Mat. 5:11, 12.

Olee otú anyị ga-esi ghara ịhụ ntụrụndụ n’anya? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Olee ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịchọpụta ma ànyị hụrụ ntụrụndụ n’anya?

18 Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta ma ànyị hụrụ ntụrụndụ n’anya? Anyị nwere ike jụọ onwe anyị, sị: ‘M̀ ji ntụrụndụ kpọrọ ihe karịa ọmụmụ ihe na ozi ọma? M̀ dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ na-atọ m ụtọ n’ihi na m chọrọ ijere Chineke ozi? Mgbe m na-ahọrọ ụdị ihe ndị m ji atụrụ ndụ, m̀ na-echebara otú Jehova si ele ha anya echiche?’ Ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, ọ bụghị naanị na anyị agaghị eme ihe ndị anyị ma na ha adịghị ya mma, kama, anyị agaghịkwa eme ihe ndị anyị chere nwere ike ịkpasu ya iwe.—Gụọ Matiu 22:37, 38.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ

19. Olee ndị na-emekataghị nwee ezigbo obi ụtọ?

19 Kemgbe ihe dị ka puku afọ isii ụmụ mmadụ nọ na-ahụsi anya n’ụwa Setan, oge Chineke ga-ebibi ya eruwela. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa a bụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, na ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya. Ha na-echekarị ihe ha ga-enweta. Ihe ka ha mkpa ná ndụ bụ inweta ihe ọ bụla na-agụ ha agụụ. Ụdị ndị a emekataghị nwee ezigbo obi ụtọ. Ma Baịbụl gwara anyị ndị na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye nwere Chineke nke Jekọb dị ka onye na-enyere ya aka, onye olileanya ya dị n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ.”—Ọma 146:5.

20. Olee otú ịhụ Chineke n’anya sirila mee ka ị na-enwe obi ụtọ?

20 Ndị ohu Jehova na-ahụkwu ya n’anya. Kwa afọ, ọtụtụ ndị na-amata ya ma na-ahụ ya n’anya. Ihe a na-egosi na Alaeze Chineke na-achị, nakwa n’oge na-adịghị anya, ọ ga-agọzi anyị otú anyị na-atụghị anya ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Jehova chọrọ, ọ ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ, meekwa ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ. Ndị hụrụ Jehova n’anya ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime àgwà ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya na-akpa. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ha si dị iche n’àgwà Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na-akpa.