Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 1

‘Ya Mere, Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’

‘Ya Mere, Gaanụ Mee Ndị Na-eso Ụzọ’

ISIOKWU AFỌ 2020: ‘Ya mere, gaanụ mee ndị na-eso ụzọ. Na-eme ha baptizim.’—MAT. 28:19.

ABỤ NKE 79 Na-ezi Ha Ihe Ka Okwukwe Ha Sie Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ihe mmụọ ozi gwara ụmụ nwaanyị ahụ n’ebe e liri Jizọs, oleekwa ihe Jizọs gwara ha ka ha mee?

N’ISI ụtụtụ, n’abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan afọ 33, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke gara n’ili Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Anya mmiri juru ha n’anya. O ruwela abalị abụọ kemgbe e liri ya. Ha gara ebe ahụ ka ha tee ozu Jizọs mmanụ na-esi ísì ụtọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, o juru ha anya na ozu Jizọs adịghịzi n’ili ahụ. Otu mmụọ ozi gwara ha na a kpọlitela Jizọs n’ọnwụ. Ọ gwakwara ha, sị: “O buruwo unu ụzọ gawa Galili; n’ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya.”—Mat. 28:1-7; Luk 23:56; 24:10.

2 Mgbe ụmụ nwaanyị ndị ahụ si n’ili ahụ pụọ, Jizọs bịakwutere ha ma gwa ha ihe ha ga-eme. Ọ sịrị ha: “Gaanụ kọọrọ ụmụnna m, ka ha gaa Galili; n’ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.” (Mat. 28:10) A ga-enwerịrị ihe dị ezigbo mkpa Jizọs chọrọ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, n’ihi na ọ bụ nnọkọ a bụ ihe mbụ ọ haziri mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ.

OLEE NDỊ JIZỌS NYERE IWU AHỤ?

Ebe Jizọs na ndịozi ya na ndị ọzọ zukọrọ na Galili mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ya ana-agwa ha ka ha ‘gaa mee ndị na-eso ụzọ’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3 na nke 4)

3-4. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụghị naanị ndịozi ka Jizọs nyere iwu ahụ dị na Matiu 28:19, 20? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

3 Gụọ Matiu 28:16-20. Ná nnọkọ ahụ Jizọs haziri, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ dị mkpa ọ chọrọ ka ha rụọ n’oge ahụ. Ọ bụkwa ọrụ ahụ ka anyịnwa na-arụ taa. Jizọs sịrị: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”

4 Jizọs chọrọ ka ndị niile na-eso ụzọ ya na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụghị naanị ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi ka o nyere iwu ahụ. Olee otú anyị si mata? Ọ̀ bụ naanị ndịozi Jizọs nọ mgbe o nyere iwu ahụ n’ugwu dị na Galili? Cheta na mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwaanyị ahụ bịara n’ili Jizọs, sị: “[Na Galili] ka unu ga-ahụ ya.” N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ụmụ nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi so gaa nnọkọ ahụ. Ma, e nwere ihe ọzọ. Pọl onyeozi kwuru na Jizọs “pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.” (1 Kọr. 15:6) N’ebee?

5. Olee ihe anyị na-amụta ná 1 Ndị Kọrịnt 15:6?

5 E nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo na ihe Pọl bu n’obi mgbe ọ na-ede ihe dị ná 1 Ndị Kọrịnt 15:6 bụ nnọkọ ahụ e nwere na Galili e kwuru gbasara ya na Matiu isi 28. Olee ihe ndị ọ bụ? Nke mbụ bụ na ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị Galili. N’ihi ya, ọ ga-aka mfe ka ọtụtụ ndị zukọọ n’ugwu dị na Galili, kama izukọ n’ụlọ mmadụ na Jeruselem. Nke abụọ bụ na Jizọs na ndịozi ya iri na otu ebula ụzọ zukọọ n’ụlọ mmadụ na Jeruselem mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ. Ọ bụrụ na Jizọs chọrọ ịgwa naanị ndịozi ya ka ha kwusaa ozi ọma ma mee ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, ọ gaara agwa ha ya na Jeruselem kama ịgwawa ha na ụmụ nwaanyị ndị ahụ na ndị ọzọ ka ha bịa hụ ya na Galili.—Luk 24:33, 36.

6. Olee otú Matiu 28:20 si egosi na anyịnwa so ná ndị Jizọs nyere iwu ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya? Oleekwa ihe gosiri na a na-eme ihe ahụ Jizọs kwuru?

6 Ihe ọzọkwa dị mkpa bụ na ọ bụghị naanị ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’oge ndịozi ka o nyere iwu ka ha mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Olee otú anyị si mara? Ihe ikpeazụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya bụ: “M nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.” (Mat. 28:20) Taa, ọtụtụ ndị na-eme ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs otú ahụ o kwuru. Chegodị echiche. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị puku mmadụ atọ na-eme baptizim kwa afọ ma ghọọ Ndịàmà Jehova na ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

7. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya? N’ihi gịnịkwa?

7 Ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-emecha mee baptizim. Ma, ọ dị ka ụjọ ọ̀ na-atụ ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ihe ha na-amụ na-atọ ha ụtọ. Ma, ha anaghị agba mbọ ka ha mee baptizim. Ọ bụrụ na e nwere onye ị na-amụrụ ihe, o doro anya na ị chọrọ inyere ya aka ka ọ na-eme ihe ọ na-amụta ma bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi kụzie ihe ga-eru n’obi ndị anyị na-amụrụ ihe ma nyere ha aka ifewe Jehova. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụ gbasara ihe a? Ọ bụ n’ihi na o nwere ebe ọ ga-eru, anyị ekpebie ma ànyị ga-akwụsị ịmụrụ onye ahụ ihe.

KỤZIERE YA IHE GA-ERU YA N’OBI

8. Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike inyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ka ha hụ Jehova n’anya?

8 Jehova chọrọ ka ndị mmadụ fee ya maka na ha hụrụ ya n’anya. N’ihi ya, ihe anyị na-ebu n’obi amụrụ ndị mmadụ Baịbụl bụ ka ha ghọta na ihe gbasara onye ọ bụla n’ime ha na-emetụ Jehova n’obi nakwa na ọ hụrụ ha n’anya nke ukwuu. Anyị chọrọ inyere ha aka ka ha mata na Jehova bụ “nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.” (Ọma 68:5) Ọ bụrụ na ndị ị na-amụrụ ihe amata na Chineke hụrụ ha n’anya, o nwere ike ime ka ha malite ịhụ ya n’anya. O nwere ike isiri ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ike ikweta na Jehova bụ Nna hụrụ ha n’anya n’ihi na nna mụrụ ha ahụghị ha n’anya. (2 Tim. 3:1, 3) N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-amụrụ ụdị ndị a ihe, na-akụziri ha àgwà Jehova ndị magburu onwe ha. Nyere ha aka ịghọta na Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya, chọrọ ka ha nweta ndụ ebighị ebi. Ọ dịkwa njikere inyere ha aka ka ha nweta ya. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime?

9-10. Olee akwụkwọ ndị anyị kwesịrị iji na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl? N’ihi gịnịkwa?

9 Jiri akwụkwọ bụ́ “Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?” na “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” nyere ha aka. Ihe mere e ji bipụta akwụkwọ abụọ a bụ ka anyị jiri ha kụzie ihe ga-eru n’obi ndị anyị na-amụrụ ihe. Dị ka ihe atụ, isi nke mbụ n’akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị zara ajụjụ ndị a: Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị, ka ọ̀ dị obi ọjọọ?, Olee otú obi na-adị Chineke ma ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ?, na Ị̀ ga-abụli enyi Jehova? Akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” ga-enyere onye a na-amụrụ ihe aka ịghọta otú ime ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi mee ka ndụ ya ka mma, ya na Jehova abụrụkwa enyi. Ọ bụrụgodị na i jirila akwụkwọ ndị ahụ mụọrọ ndị ọzọ ihe, kwadebe nke ọma mgbe ọ bụla ị na-aga ịmụrụ mmadụ ihe ka ị mata otú ị ga-esi jiri ya nyere onye ahụ aka.

10 Ma, ka e were ya na e nwere ihe onye ị na-amụrụ ihe chọrọ ịmatakwu gbasara ya. Mana, a kọwaghị ya n’akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe. I nwere ike ịgwa ya ka o wepụta oge gụọ akwụkwọ kwuru gbasara ya ka unu ghara ịkwụsị ihe unu na-amụ n’akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị ma ọ bụ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.”

Na-ekpe ekpere tupu gị ebido ịmụrụ onye ahụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. E nwee onye anyị malitere ịmụrụ ihe, olee mgbe anyị kwesịrị ibido ịna-ekpe ekpere? Olee otú i nwere ike isi kwute ihe gbasara ekpere?

11 Kpeenụ ekpere ma unu chọọ ibido. E nwee onye anyị malitere ịmụrụ ihe, ọ na-akacha mma ibido ikpe ekpere n’egbughị oge ma a chọọ ịmalite nakwa ma a mụchaa. Ọ na-abụkarị n’ime izu ole na ole a malitere ịmụrụ onye ahụ ihe. Anyị kwesịrị inyere onye ahụ aka ka ọ ghọta na naanị ihe ga-eme ka anyị ghọta Okwu Chineke bụ ma mmụọ nsọ nyere anyị aka. Ụfọdụ ụmụnna na-eji ihe e kwuru na Jems 1:5 akọwa ihe mere anyị ji kwesị ikpe ekpere tupu e bido ịmụ ihe. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke.” Ha na-ajụ onye a na-amụrụ ihe, sị, “Olee otú anyị ga-esi rịọ Chineke ka o nye anyị amamihe?” Onye ahụ a na-amụrụ ihe nwere ike ikweta na ọ bụ ikpe ekpere.

12. Olee otú ị ga-esi jiri ihe e kwuru n’Abụ Ọma 139:2-4 nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ka ọ na-akọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi?

12 Kụziere onye ị na-amụrụ ihe otú e si ekpe ekpere. Mee ka obi sie ya ike na Jehova chọrọ ịnụ ekpere si ya n’obi. Kọwaara ya na o kpewe ekpere, o nwere ike ịkọrọ Jehova ihe niile dị ya n’obi, ma ihe ndị ọ na-agaghị achọ ịkọrọ mmadụ ọ bụla. A sị ka e kwuwe, Jehova ebula ụzọ mara ihe niile anyị na-eche. (Gụọ Abụ Ọma 139:2-4.) Anyị nwekwara ike ịgwa onye anyị na-amụrụ ihe ka ọ rịọ Chineke ka o nyere ya aka ịgbanwe ihe na-adịghị mma ọ na-eche, kwụsịkwa àgwà ọjọọ ọ na-akpa. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na e nwere ememme ndị okpukpe ụgha na-atọgbu ya atọgbu. Ọ ma na ememme ahụ adịghị mma. Ma, ihe ụfọdụ a na-eme na ya ka na-atọ ya ụtọ. Gwa ya ka ọ kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi ma rịọ ya ka o nyere ya aka ka ihe ga na-amasị ya bụrụ naanị ihe dị Jehova mma.—Ọma 97:10.

Gwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ bịawa ọmụmụ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị igbu oge ịgwa onye anyị na-amụrụ ihe ka ọ bịawa ọmụmụ ihe? (b) Gịnị ka anyị ga-eme ka ahụ́ nwee ike iru onye anyị na-amụrụ ihe ala ma ọ bịa ọmụmụ ihe?

13 Egbula oge ịgwa onye ị na-amụrụ ihe ka ọ bịawa ọmụmụ ihe. Ihe ọ ga-anụ na ihe ọ ga-ahụ n’ọmụmụ ihe nwere ike iru ya n’obi ma mee ka o fewe Jehova. Gosi ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? ma gwa ya ka o soro gị gaa ọmụmụ ihe. Gwa ya ka ị bịa buru ya ma ọ bụ gbaara ya ụgbọ ma o kwe omume. Ọ dị mma ka gị na ndị nkwusa dị iche iche na-eso aga amụrụ ya ihe. I mee otú ahụ, ọ ga-amata ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu. O nwekwara ike ime ka ahụ́ rukwuo ya ala ma ọ bịa ọmụmụ ihe.

NYERE ONYE Ị NA-AMỤRỤ IHE AKA KA Ọ BỊA FEWE CHINEKE

14. Olee ihe nwere ike ime ka onye anyị na-amụrụ ihe bịa fewe Jehova?

14 Anyị chọrọ inyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ka ọ bịa fewe Chineke. (Efe. 4:13) Mmadụ kweta ịmụ Baịbụl, ihe nwere ike ịbụ mkpa ya bụ uru ọ ga-abara ya. Ma, ka ọ na-ahụkwu Jehova n’anya, o nwere ike ichewe otú ọ ga-esi nyewere ndị ọzọ aka, ma ndị nọ n’ọgbakọ. (Mat. 22:37-39) Jiri ohere dabara adaba mee ka ọ mata na o nwere ike inye onyinye iji kwado ọrụ gbasara Alaeze Chineke.

Kụziere onye ị na-amụrụ Baịbụl ihe ọ ga-eme ma nsogbu bịa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ime ihe o kwesịrị ime ma mmadụ mejọọ ya?

15 Kụziere onye ị na-amụrụ Baịbụl ihe ọ ga-eme ma nsogbu bịa. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na onye ị na-amụrụ ihe na-emebeghị baptizim gwara gị na e nwere onye kpasuru ya iwe n’ọgbakọ. Kama ịdụnyere otu onye úkwù, kọwaara ya ihe Baịbụl kwuru o kwesịrị ime. O nwere ike ịgbaghara nwanna ahụ. Ma, ọ bụrụ na ọ gaghị agbagharali ya, ya gakwuru onye ahụ ma jiri olu ọma na obi nwayọọ gwa ya otú obi dị ya. Ihe ọ ga-ebu n’obi eme ya bụ ka ‘o rite nwanna ya n’uru.’ (Tụlee Matiu 18:15.) Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịkwadebe ihe ọ ga-ekwu. Gosi ya otú e si eji JW Library®, Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, nakwa jw.org® achọta ihe o nwere ike ime iji dozie nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na ị kụziere ya ime otú ahụ mgbe ọ na-emebeghị baptizim, o nwere ike ime ka ya na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-adị ná mma ma o mechaa baptizim.

16. Gịnị mere o ji dị mma ịkpọrọ ụmụnna ndị ọzọ ma anyị gawa ịmụrụ mmadụ ihe?

16 Kpọrọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu gaa mụọrọ ya ihe. Kpọrọkwa onye nlekọta sekit ma ọ bịa ileta ọgbakọ unu. N’ihi gịnị? E wezụga ihe ndị anyị kwurula, ndị nkwusa ndị ọzọ nwere ike inyere onye ị na-amụrụ ihe aka n’ebe ndị ị na-agaghị enyeliri ya aka. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọ gbalịala ugboro ugboro ịkwụsị ịṅụ sịga, ma o kwebeghị ya. Ị gawa ịmụrụ ya ihe, kpọrọ nwanna na-aṅụbu sịga. O nwere ike ịbụ na nwanna ahụ gbalịrị ugboro ugboro ịkwụsị ya ma o kweghị ya, ma ya emechaa kwụsị ya. Nwanna ahụ nwere ike ịtụrụ onye ahụ ị na-amụrụ ihe aro ga-abara ya ezigbo uru. Ọ bụrụ na ahụ́ eruchaghị gị ala ịnọ n’ihu nwanna bụ́ aka ochie mụọrọ onye ahụ ihe, i nwere ike ịgwa nwanna ahụ ka ọ mụọrọ ya ihe ma unu gaa. Ọ bụrụ na ị kpọrọ ndị ọzọ gaa mụọrọ onye ahụ ihe, o nwere ike ịmụta ihe n’aka ha. Cheta na ihe bụ́ mkpa anyị bụ ka anyị nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ka ọ bịa fewe Jehova.

M̀ KWESỊRỊ ỊKWỤSỊ ỊMỤRỤ YA IHE?

17-18. Olee ihe ị ga-echebara echiche ma i kpebiwe ma ị̀ ga-akwụsị ịmụrụ mmadụ ihe?

17 Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe ekweghị ịna-eme ihe ọ na-amụta, o nwere ebe ọ ga-eru, gị ajụọ onwe gị, sị, ‘M̀ kwesịrị ịkwụsị ịmụrụ ya ihe?’ Tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, i kwesịrị ichebara otú onye ahụ si aghọta ihe echiche. Ọ na-ewe ụfọdụ ndị oge ịbịa fewe Jehova karịa ndị ọzọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Onye a m na-amụrụ ihe ọ̀ na-eme nke ọma otú o kwesịrị ma e lechaa otú ihe si dịrị ya?’ ‘Ọ̀ malitela ime ihe ndị ọ na-amụta?’ (Mat. 28:20) Onye a na-amụrụ ihe nwere ike ịna-egbu oge ịbịa fewe Jehova. Ma o kwesịrị ịbụ na o ji nwayọọ nwayọọ na-eme ihe ọ na-amụta.

18 Ọ bụrụkwanụ na anyị na mmadụ amụọla ihe ruo oge ụfọdụ, ma e nweghị ihe gosiri na o ji ọmụmụ ihe ahụ kpọrọ ihe? Dị ka ihe atụ, ka e were ya na gị na ya amụchaala akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị, nakwa ma eleghị anya malite ịmụ akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” ma e nweghị otu ọmụmụ ihe ọ bịatụrụla. Ọ bịatụbeghịdị Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ị bịa ịmụrụ ya ihe, ihe na-enweghị isi na-eme ka ọ ghara ịmụ ihe. Ọ dịrị otú ahụ, gị na ya kwesịrị ikwu gbasara ya. Gwa ya okwu n’ezoghị ọnụ. *

19. Olee ihe i nwere ike ịgwa onye yiri ka o jighị ihe ọ na-amụ kpọrọ ihe? Olee ihe i kwesịrị ichebara echiche?

19 Otú i nwere ike isi malite bụ ịjụ ya, sị: ‘Olee ihe i chere ga-akacha mee ka o siere gị ike ịbụ Onyeàmà Jehova?’ O nwere ike ịsị, ‘Ịmụ Baịbụl dị mụ mma. Ma, o nweghị ihe ga-eme ka m bụrụ Onyeàmà Jehova.’ Ọ bụrụ ihe a ka o kwuru mgbe gị na ya mụrụla ihe ruo oge ụfọdụ, ọ̀ ka bara uru ịna-amụrụ ya ihe? Ma, o nwere ike iji ohere ahụ gwa gị ihe na-egbochi ya ịbịa fee Jehova. Dị ka ihe atụ, o nwere ike iche na ya agaghị ekwusali ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ. Ugbu a ị matara otú ọ dị ya n’obi, ị ga-aka aghọta otú ị ga-esi enyere ya aka.

Egbula oge na-amụrụ onye na-achọghị ife Jehova ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. Olee otú ịghọta ihe Ọrụ Ndịozi 13:48 kwuru nwere ike isi nyere anyị aka ikpebi ma ànyị ga-akwụsị ịmụrụ mmadụ ihe?

20 Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ ihe na-eme ka ndị Izrel n’oge Ezikiel. Jehova gwara Ezikiel gbasara ha, sị: “Lee! ị dị ka abụ ịhụnanya na-atọ ụtọ n’anya ha, dị ka onye nwere olu ọma, onye na-akpọkwa ụbọ akwara nke ọma. Ha ga-anụkwa okwu gị, ma ọ dịghị onye ọ bụla ga-eme ya.” (Ezik. 33:32) O nwere ike isiri anyị ike ịgwa mmadụ na anyị ga-akwụsị ịmụrụ ya ihe. Ma, “oge fọdụrụ dị ntakịrị.” (1 Kọr. 7:29) Kama igbukwu oge na-amụrụ onye na-achọghị ife Jehova ihe, anyị kwesịrị ịchọ onye ga-egosi na o “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.”—Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:48.

E nwere ike inwe ndị ọzọ bi n’ebe unu na-ekwusa ozi ọma na-arịọ Chineke ka o nyere ha aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

21. Gịnị bụ isiokwu afọ 2020? Gịnị mere o ji daba adaba?

21 Isiokwu afọ 2020 ga-enyere anyị aka iche otú anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ebe e si nweta ya bụ ụfọdụ ihe Jizọs kwuru ná nnọkọ ahụ dị mkpa ya na ndị na-eso ụzọ ya nwere n’ugwu dị na Galili. Ọ sịrị ha: ‘Ya mere, gaanụ mee ndị na-eso ụzọ. Na-eme ha baptizim.’Mat. 28:19.

Ka anyị kpebisie ike ịna-emekwu nke ọma n’ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs nakwa n’ime ka ndị anyị na-amụrụ ihe mee baptizim (A ga-akọwa ya na paragraf nke 21)

ABỤ NKE 70 Chọpụta Ndị Ga-anabata Ozi Ọma Unu

^ par. 5 Isiokwu afọ 2020 na-agwa anyị ka anyị na-eme ka ndị mmadụ bụrụ “ndị na-eso ụzọ” Jizọs. Ndị niile na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme ya. Olee otú anyị ga-esi kụzie ihe ga-aba n’obi ndị anyị na-amụrụ ihe ka ha nwee ike ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst? N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi nyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi kpebie ma ànyị ga-akwụsị ihe anyị na-amụrụ mmadụ, ka ànyị ga-amụrụ na-aga.

^ par. 18 Lee vidio bụ́ Otú E Si Akwụsị Ọmụmụ Baịbụl Na-anaghị Amị Mkpụrụ, nke dị n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova.