Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 3

Jehova Bụ́ Chineke Gị Ji Gị Kpọrọ Ihe

Jehova Bụ́ Chineke Gị Ji Gị Kpọrọ Ihe

“[O] chetara anyị mgbe e wedara anyị ala.”—ỌMA 136:23.

ABỤ NKE 33 Tụkwasị Jehova Ibu Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee nsogbu na-abịara ọtụtụ ndị Jehova? Oleekwa ihe o nwere ike ịkpatara ha?

CHEGODỊ gbasara nsogbu atọ ndị a e ji mee ihe atụ: A chọpụtara na otu nwanna nwoke na-eto eto na-arịa ọrịa ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ ya. A chụrụ otu nwanna karịrịla afọ iri ise n’ọrụ n’agbanyeghị na ọ na-arụsi ọrụ ike. Ọ gbalịsiri ike ịchọta ọrụ ọzọ, ma e nweghị nke ọ hụrụ. Otu nwanna nwaanyị merela agadi anaghịzi emeli ihe ndị ọ na-emebu n’ozi Jehova.

2 Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ọ dị otu n’ime ndị a e kwuru okwu ha, i nwere ike ịna-eche na e nweghịzi uru ị bara. Nsogbu ndị ahụ nwere ike ime ka ị gharazie ịna-enwe obi ụtọ, ihere onwe gị ana-eme gị. O nwekwara ike ime ka gị na ndị ọzọ ghara ịna-adị ná mma.

3. Olee otú Setan na ndị òtù ya si were ndụ mmadụ?

3 Ụwa weere ndụ mmadụ otú ahụ Setan si were ya. Kemgbe ụwa, o nweghị ihe Setan ji ndụ mmadụ kpọrọ. Ọ gwara Iv na o nupụrụ Chineke isi, ọ ga-enwere onwe ya n’agbanyeghị na ọ ma na ọ ga-akpatara ya ọnwụ. Ihe ahụ Setan mere gosiri na obi fere ya azụ. Ọ bụ ya na-ekwu ihe na-eme n’azụmahịa, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa n’okpukpe nke ụwa a. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ ndị ọchụnta ego, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị isi okpukpe ejighị ndụ mmadụ kpọrọ ihe. Ha achọghịkwa ịma otú obi dị ndị mmadụ.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

4 Jehova anaghị eme ka Setan. Ọ chọrọ ka anyị mata na o ji anyị kpọrọ ihe. Ọ na-enyere anyị aka ma nsogbu chọọ ime ka anyị chewe na e nweghịzi uru anyị bara. (Ọma 136:23; Rom 12:3) N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jehova si enyere anyị aka ma nsogbu ndị a bịara anyị: (1) Mgbe anyị na-arịa ọrịa, (2) mgbe ihe siiri anyị ike, nakwa (3) mgbe nká mere ka ọ dị anyị ka e nweghịzi ihe bara uru anyị ga-emeli n’ozi Jehova. Ka anyị burugodị ụzọ hụ ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ji onye ọ bụla n’ime anyị kpọrọ ihe.

JEHOVA JI ANYỊ KPỌRỌ IHE

5. Gịnị mere obi ji sie gị ike na Jehova ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe?

5 N’agbanyeghị na Chineke ji ájá si n’ala kpụọ anyị, anyị bara uru karịa ájá. (Jen. 2:7) Chegodị ihe ụfọdụ mere anyị ji mara na Jehova ji anyị kpọrọ ihe. O kere ndị mmadụ ka ha nwee ike ịna-akpa àgwà ka ya. (Jen. 1:27) O si otú ahụ mee ka anyị karịa ihe ndị ọzọ o kere n’ụwa a. O mere ka anyị na-elekọta ụwa na ụmụ anụmanụ.—Ọma 8:4-8.

6. Olee ihe ọzọ gosiri na Jehova ji ụmụ mmadụ na-ezughị okè kpọrọ ihe?

6 Mgbe Adam mehiechara, Jehova ka jikwa ndụ mmadụ kpọrọ ihe. Ọ bụ otú o si hụ anyị n’anya mere o ji zite Ọkpara ya bụ́ Jizọs ka ọ bịa gbapụta anyị ná mmehie. (1 Jọn 4:9, 10) N’ihi àjà ahụ Jizọs chụrụ, Jehova ga-akpọlite ndị nwụrụ n’ihi mmehie Adam, “ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na o ji anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị ihe ọrịa, ihe isi ike, ma ọ bụ nká na-eme anyị.—Ọrụ 10:34, 35.

7. Olee ihe ndị ọzọ mere ndị na-efe Chineke ji kwesị ikweta na Jehova ji ha kpọrọ ihe?

7 E nwere ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji kweta na Jehova ji anyị kpọrọ ihe. Jehova dọtara anyị, hụkwa otú anyị si nabata ozi ọma e ziri anyị. (Jọn 6:44) Mgbe anyị chọrọ ka anyị na ya bụrụ enyi, ọ bịakwuru anyị nso. (Jems 4:8) Jehova na-ewepụta ezigbo oge, na-agbakwa ezigbo mbọ, ịkụziri anyị ihe. O gosiri na o jighị anyị egwu egwu. Ọ ma ụdị ndị anyị bụ ugbu a, marakwa ụdị ndị anyị nwere ike ịbụ. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Ilu 3:11, 12) Ihe a niile gosiri na Jehova ji anyị kpọrọ ihe.

8. Olee otú ihe e kwuru n’Abụ Ọma 18:27-29 ga-esi nyere anyị aka ịna-ele nsogbu bịaara anyị anya otú kwesịrị ekwesị?

8 Ụfọdụ ndị chere na o nweghị uru Eze Devid bara, ma ọ ma na Jehova hụrụ ya n’anya ma na-akwado ya. Ihe a Devid ma nyeere ya aka ịna-ele nsogbu ndị bịaara ya anya otú kwesịrị ekwesị. (2 Sam. 16:5-7) Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị ma ọ bụ anyị adaa mbà, Jehova nwere ike inyere anyị aka ilewe nsogbu ahụ anya otú kwesịrị ekwesị ma merie ya. (Gụọ Abụ Ọma 18:27-29.) Ebe ọ bụ na Jehova kwụ anyị n’azụ, o nweghị ihe ga-emeli ka anyị ghara iji obi ụtọ na-efe ya. (Rom 8:31) Ka anyị lebazie anya ná nsogbu atọ ndị ahụ ọ ga-abụ ha bịara anyị, ya akacha dị mkpa ka anyị cheta na Jehova hụrụ anyị n’anya, jirikwa anyị kpọrọ ihe.

MGBE ANYỊ NA-ARỊA ỌRỊA

Ịgụ ihe ndị si n’Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ịkwụsị ichegbu onwe anyị n’ihi ọrịa anyị na-arịa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 ruo na nke 12)

9. Olee otú ọrịa nwere ike isi mee ka anyị na-ele onwe anyị anya?

9 Ọrịa nwere ike ime ka obi na-ajọ anyị njọ, meekwa ka ọ dị anyị ka o nweghị ihe anyị dị mma ya. O nwere ike ịna-eme anyị ihere ma ndị ọzọ mata na e nwere ihe na-eme anyị ma ọ bụ na anyị agaghị emeli ihe ụfọdụ ma e nyereghị anyị aka. Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ amaghị na anyị na-arịa ọrịa, ihere nwere ike ịna-eme anyị maka na anyị anaghịzi emeli ihe ndị anyị na-emebu. Ụdị ihe ahụ mee, Jehova na-agba anyị ume. Olee otú o si eme ya?

10. Dị ka e kwuru n’Ilu 12:25, gịnị nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị na-arịa ọrịa?

10 Anyị rịawa ọrịa, “okwu ọma” nwere ike ime ka obi dị anyị mma. (Gụọ Ilu 12:25.) Na Baịbụl, Jehova gwara anyị ọtụtụ ihe ọma na-echetara anyị na o ji anyị kpọrọ ihe n’agbanyeghị ọrịa anyị na-arịa. (Ọma 31:19; 41:3) Ọ bụrụ na anyị agụọ ihe ndị ahụ, ma ọ bụdị gụọ ha ọtụtụ ugboro, Jehova ga-enyere anyị aka ịkwụsị ichegbu onwe anyị n’ihi ọrịa anyị na-arịa.

11. Olee otú Jehova si nyere otu nwanna aka?

11 Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Jorge. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ malitere ịrịa otu ọrịa ọjọọ. Ọrịa ahụ nọ na-aka njọ, meekwa ka ọ na-eche na e nweghị ihe ọ dị mma ya. O kwuru, sị: “Atụghị m anya ma otú ọrịa a si na-eme m obi ọjọọ ma ihere ọ na-eme m n’ihi anya ndị mmadụ na-ele m. Ka ọrịa ahụ na-aka njọ, m nọ na-eche otú ọ ga-esi mee ka ihe ụfọdụ gbanwee ná ndụ m. Obi gbawara m, mụ arịọ Jehova ka o nyere m aka.” Olee otú Jehova si nyere ya aka? Ọ sịrị: “N’oge ahụ, ọ na-esiri m ike ime ka uche m dịrị n’ihe m na-agụ. N’ihi ya, a gbara m ume ka m na-agụ amaokwu ole na ole n’akwụkwọ Abụ Ọma, ebe gosiri na Jehova ji ndị ohu ya kpọrọ ihe. M na-agụghachi amaokwu ndị ahụ kwa ụbọchị. Ha kasiri m obi. Ka oge na-aga, ndị mmadụ malitere ịhụ na obi na-adịzi m ụtọ. Ha kwudịrị na otú m si enwe obi ụtọ na-agba ha ume. M chọpụtara na Jehova azala ekpere m. O nyerela m aka ịgbanwe otú m si ele onwe m anya. M malitere ịna-eche ihe Baịbụl kwuru gbasara otú o si were m n’agbanyeghị ọrịa m.”

12. Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa, olee ihe i nwere ike ime ka Jehova nyere gị aka?

12 Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa, obi sie gị ike na Jehova ma ihe gị na ya na-alụ. Rịọ ya ka o nyere gị aka ka ị na-ele nsogbu gị anya otú kwesịrị ekwesị. Gụọ Baịbụl ka ị hụ ihe ndị Jehova kwuru ga-akasi gị obi. Na-eche gbasara amaokwu ndị gosiri otú Jehova si jiri ndị ohu ya kpọrọ ihe. Ka ị na-eme ihe ndị a, ị ga-ahụ na Jehova na-emere ndị ji obi ha na-efe ya ihe ọma.—Ọma 84:11.

MGBE IHE SIIRI GỊ IKE

Icheta na Jehova kwere nkwa na ya ga na-egboro anyị mkpa anyị ga-enyere anyị aka ma o siere anyị ike ịchọta ọrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 ruo na nke 15)

13. Olee otú obi nwere ike ịdị onyeisi ezinụlọ ma a chụọ ya n’ọrụ?

13 Onyeisi ezinụlọ ọ bụla chọrọ ịna-enye ndị ezinụlọ ya ihe dị ha mkpa ná ndụ. Ma, ka e were ya na a chụrụ nwanna n’ọrụ n’enweghị ihe o mere. Ya agbalịa ịchọta ọrụ ọzọ, ma e nweghị nke ọ hụrụ. Ụdị ihe a nwere ike ime ka o chewe na ya abaghịzi uru. Olee otú nkwa ndị Jehova kwere nwere ike isi nyere ya aka?

14. Olee ihe ndị mere Jehova ji emezu nkwa ya?

14 Jehova na-emezu nkwa ọ bụla o kwere. (Jọsh. 21:45; 23:14) O nwere ọtụtụ ihe mere o ji eme ya. Otu bụ na ma Jehova emezughị nkwa ya, o nwere ike ime ka a kọchaa aha ya. Jehova kwuru na ya ga na-elekọta ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. O weere nkwa ahụ ka ihe ọ ga-emezurịrị. (Ọma 31:1-3) Ihe ọzọ bụ na Jehova maara na ọ ga-ewute anyị ma ọ bụrụ na o lekọtaghị ndị so n’ezinụlọ ya. O kwere nkwa na ya ga na-egboro anyị mkpa anyị, na-enyekwa anyị ihe ndị ga-eme ka anyị jiri obi anyị niile na-efe ya. O nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara imezu ya.—Mat. 6:30-33; 24:45.

15. (a) Olee nsogbu bịaara Ndị Kraịst n’oge ndịozi? (b) Gịnị ka Abụ Ọma 37:18, 19 na-eme ka obi sie anyị ike na ya?

15 Ọ bụrụ na anyị echeta ihe ndị mere Jehova ji emezu nkwa ya, obi ga-esi anyị ike na ọ ga-enyere anyị aka ma o siere anyị ike inweta ego ga-ezuru anyị. Chegodị gbasara Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Mgbe a malitere ịkpagbu ọgbakọ dị na Jeruselem, “a chụsasịrị mmadụ niile . . . ma e wezụga ndịozi.” (Ọrụ 8:1) Chetụgodị ihe ọ kpataara ha. Ọ kpataara ha ihe isi ike. O nwere ike ịbụ na o mere ka ha hapụ ụlọ ha na ihe ha ji akpata ego. Ma, Jehova ahapụghị ha. Ha akwụsịghịkwa ịna-enwe obi ụtọ. (Ọrụ 8:4; Hib. 13:5, 6; Jems 1:2, 3) Jehova nyeere Ndị Kraịst ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka. Ọ ga na-enyekwara anyịnwa aka.—Gụọ Abụ Ọma 37:18, 19.

MGBE ANYỊ NA NKÁ NA-ALỤ

Ọ bụrụgodị na anyị emeela agadi, ime ihe ndị anyị ga-emeli ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ji anyị na ozi anyị ji obi anyị niile na-ejere ya kpọrọ ihe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 ruo na nke 18)

16. Olee ihe nwere ike ime ka anyị chewe ma Jehova ò jikwa ofufe anyị kpọrọ ihe?

16 Ka anyị na-aka nká, anyị nwere ike ichewe na o nweghịzi ezigbo ihe anyị ga-emeli n’ozi Jehova. O nwere ike ịbụ na Eze Devid chere ụdị ihe ahụ mgbe ọ na-aka nká. (Ọma 71:9) Olee otú Jehova nwere ike isi nyere anyị aka?

17. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jheri?

17 Chegodị gbasara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jheri. A kpọrọ ya ka ọ bịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze soro ná ndị a ga-akụziri otú a ga-esi na-elekọta ụlọ ndị nzukọ Jehova rụrụ. Ma, ọ chọbughị ịga. O kwuru, sị: “Emeela m agadi. Di m anwụọla. Enweghịkwa m aka ọrụ ọ bụla ga-abara Jehova uru. E nweghị uru ọ bụla m bara.” N’abalị bọtara ụbọchị a kụziri ihe ahụ, o kpere ekpere gwa Jehova otú obi dị ya. Mgbe o ruru n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’echi ya, ọ ka nọkwa na-eche ma ò kwesịrị ịnọ ebe ahụ. Otu n’ime ụmụnna ndị kụziri ihe ahụ kwuru na nkà kachanụ anyị ga-enwe bụ anyị ịdị njikere ka Jehova kụziere anyị ihe. Nwanna nwaanyị ahụ kwuru, sị: “M sịrị onwe m, ‘Enwere m nkà a.’ Anya mmiri malitere ịgba m mgbe m chọpụtara na Jehova azala ekpere m. O ji ihe nwanna ahụ kwuru na-eme ka obi sie m ike na o nwere uru m ga-abara ya nakwa na ọ dị njikere ịkụziri m ihe.” Mgbe o chetara ihe ahụ merenụ, ọ sịrị: “Mgbe m na-aga ebe a ga-akụzi ihe ahụ, ụjọ na-atụ m, obi dara m mbà, mụ echeekwa na o nweghị ihe m dị mma ya. Ma, mgbe m na-ala, obi siri m ike, a gbaa m ume, mụ amatakwa na m bara uru.”

18. Olee otú Baịbụl si gosi na Jehova ka ji ofufe anyị na-efe ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị na anyị akawala nká?

18 Ka anyị na-aka nká, obi kwesịrị isi anyị ike na a ka nwere ọrụ Jehova chọrọ ka anyị rụọ. (Ọma 92:12-15) Jizọs kụziiri anyị na Jehova ji ihe ọ bụla anyị ga-emeli n’ozi ya kpọrọ ihe n’agbanyeghị otú ike anyị hà ma ọ bụ otú o si dị anyị ka ihe ahụ ọ̀ dị obere. (Luk 21:2-4) N’ihi ya, na-eme ihe ndị ị ga-emeli. Dị ka ihe atụ, ị ga-agwali ndị ọzọ gbasara Jehova, chetakwa ụmụnna gị n’ekpere ma gbaa ndị ọzọ ume ka okwukwe ha sie ike. Jehova weere gị ka onye ya na ya na-arụkọ ọrụ maka na ị na-erubere ya isi, ọ bụghị maka ihe ị rụrụ.—1 Kọr. 3:5-9.

19. Olee ihe Ndị Rom 8:38, 39 na-enyere anyị aka ịghọta?

19 Obi atọgbuola anyị na anyị na-efe Jehova, bụ́ Chineke nke ji ndị na-efe ya kpọrọ ihe. O kere anyị ka anyị na-eme uche ya. Ọ bụ ofufe ya na-emekwa ka ndụ anyị na-atọ anyị ụtọ. (Mkpu. 4:11) N’agbanyeghị na ụwa nwere ike iwere anyị ka ndị na-enweghị ihe ha bụ, Jehova ewereghị anyị otú ahụ. (Hib. 11:16, 38) Ọ bụrụ na ọrịa, ihe isi ike, ma ọ bụ nká emee ka anyị daa mbà, ka anyị cheta na o nweghị ihe ga-ekewapụli anyị n’ịhụnanya Nna anyị nke eluigwe.—Gụọ Ndị Rom 8:38, 39.

^ par. 5 È nwetụla nsogbu bịaara gị mere ka i chewe na e nweghịzi uru ị bara? Isiokwu a ga-echetara gị na Jehova ejighị gị egwu egwu. Ọ ga-akọwa ihe i nwere ike ime ka ị ghara ịna-eche na ị baghịzi uru n’agbanyeghị ihe ọ bụla mere gị.

ABỤ NKE 30 Nna M, Chineke M na Enyi M