Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 4

”Mmụọ Nsọ n’Onwe Ya So Mmụọ Anyị Na-agba Àmà”

”Mmụọ Nsọ n’Onwe Ya So Mmụọ Anyị Na-agba Àmà”

“Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.”—ROM 8:16.

ABỤ NKE 25 Ndị Pụrụ Iche nke Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Jehova si n’ụzọ pụrụ iche wụkwasị Ndị Kraịst dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ mmụọ nsọ ya n’ụbọchị Pentikọst (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 na nke 2)

1-2. Olee ihe pụrụ iche mere n’ụbọchị Pentikọst afọ 33?

N’ỤTỤTỤ otu ụbọchị Sọnde, a nọ na-eme ememme Pentikọst na Jeruselem n’afọ 33. Ndị na-eso ụzọ Jizọs dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ gbakọrọ “n’ọnụ ụlọ dị n’elu.” (Ọrụ 1:13-15; 2:1) Abalị ole na ole gara aga, Jizọs gwara ha ka ha nọrọ na Jeruselem n’ihi na ha ga-enweta onyinye pụrụ iche. (Ọrụ 1:4, 5) Oleezi ihe mere?

2 “Na mberede, a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike.” A nụrụ ụzụ ahụ n’ebe niile n’ụlọ ahụ. A hụkwara “ihe ndị dị ka ire ọkụ” dị n’isi ndị na-eso ụzọ ahụ. “Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 2:2-4) Jehova si n’ụzọ a pụrụ iche wụkwasị ha mmụọ nsọ ya. (Ọrụ 1:8) Ọ bụ ha bụ ndị mbụ Chineke ji mmụọ nsọ tee mmanụ, * meekwa ka ha nwee olileanya iso Jizọs chịa n’eluigwe.

GỊNỊ NA-EME MA E TEE MMADỤ MMANỤ?

3. N’ụbọchị Pentikọst, gịnị mere obi ji sie Ndị Kraịst ike na e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ?

3 A sị na i so ná ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs zukọrọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu n’ụbọchị ahụ, i mekataghị chefuo ya echefu. Ihe yiri ire ọkụ bịara dị gị n’isi, gị ebido ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. (Ọrụ 2:5-12) Obi ga-esi gị ezigbo ike na e ji mmụọ nsọ tee gị mmanụ. Ma, ọ̀ bụ mmadụ niile ka e si n’ụzọ pụrụ iche jiri mmụọ nsọ tee mmanụ nakwa n’otu oge ahụ ná ndụ ha? Mba. Olee otú anyị si mara?

4. Ná ndị niile e tere mmanụ n’oge ndịozi Jizọs, ọ̀ bụ n’otu oge ná ndụ ha ka e tere ha mmanụ? Kọwaa.

4 Ka anyị leba anya na mgbe e nwere ike iji mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ. Ọ bụghị naanị Ndị Kraịst ahụ dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ ka e tere mmanụ na Pentikọst afọ 33. N’otu ụbọchị ahụ, e mechara nye ihe dị ka puku mmadụ atọ ndị ọzọ mmụọ nsọ Jizọs kwere ná nkwa. Ọ bụ mgbe ha mere baptizim ka e tere ha mmanụ. (Ọrụ 2:37, 38, 41) Ma, n’afọ ndị na-eso ya, ọ bụghị Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ka e tere mmanụ mgbe e mere ha baptizim. E tere ndị Sameria mmanụ mgbe e mechara ha baptizim. (Ọrụ 8:14-17) Ndị nke ha dị iche bụ Kọnịliọs na ezinụlọ ya. E tere ha mmanụ tupu e mee ha baptizim.—Ọrụ 10:44-48.

5. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22, olee ihe na-eme ma e jiri mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ?

5 Ka anyị leba anya n’ihe na-eme ma e jiri mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ. O nwere ike isiri ụfọdụ ndị e tere mmanụ ike ná mmalite ikweta na Jehova ahọrọla ha. Ha nwere ike ịna-eche, sị: ‘Gịnị mere Chineke ji họrọ m?’ O nwere ike ọ gaghị adị ndị ọzọ otú ahụ. Otú ọ bụla ọ dị mmadụ, Pọl onyeozi kọwara ihe na-eme ndị niile e tere mmanụ. Ọ sịrị: “Mgbe unu kweresịịrị, e sikwa n’aka ya jiri mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa kaa unu akara, * bụ́ ihe àmà e bu ụzọ nye anyị tupu anyị enweta ihe nketa anyị.” (Efe. 1:13, 14) N’ihi ya, Jehova na-eji mmụọ nsọ ya eme ka o doo Ndị Kraịst ndị ahụ anya na ọ họrọla ha. Ọ bụ otú ahụ ka mmụọ nsọ si bụrụ ‘ihe àmà,’ ya bụ, ihe na-eme ka obi sie ha ike na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’eluigwe, ọ bụghị n’ụwa.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22.

6. Olee ihe Onye Kraịst e tere mmanụ ga-eme ka o nwee ike ịga eluigwe?

6 Onye Kraịst ghọọ onye e tere mmanụ, ọ̀ pụtara na e nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara ịga eluigwe? Mba. Ọ ga-edo ya anya na a họrọla ya ka ọ gaa eluigwe. Ma, o kwesịrị icheta ihe Pita kwuru. Ọ sịrị: “Ụmụnna m, gbalịsienụ ike ọbụna karị ka unu mee ka òkù a kpọrọ unu na nhọrọ a họọrọ unu bụrụ ihe unu onwe unu ji n’aka; n’ihi na ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, unu agaghị ada mgbe ọ bụla.” (2 Pita 1:10) N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na a họrọla Onye Kraịst e tere mmanụ ịga eluigwe, naanị ihe ga-eme ka o nweta ụgwọ ọrụ ya bụ ma o jiri obi ya niile na-efe Jehova.—Fil. 3:12-14; Hib. 3:1; Mkpu. 2:10.

OLEE OTÚ MMADỤ SI AMATA NA E TEELA YA MMANỤ?

7. Olee otú ndị e tere mmanụ si amata na Chineke ahọrọla ha ịga eluigwe?

7 Ma olee otú mmadụ si amata na a họrọla ya ịga eluigwe? Ihe Pọl degaara ndị Rom “a kpọrọ ịbụ ndị nsọ” ga-eme ka azịza ajụjụ a doo anya. Ọ sịrị ha: “Unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu, nke na-akpata egwu ọzọ, kama unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’ Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke.” (Rom 1:7; 8:15, 16) Ọ pụtara na Chineke na-eji mmụọ nsọ ya eme ka o doo ndị e tere mmanụ anya na ọ họrọla ha ịga eluigwe.—1 Tesa. 2:12.

8. Olee otú 1 Jọn 2:20, 27 si gosi na ọ bụghị onye ọzọ ga-eme ka obi sie onye e tere mmanụ ike na e teela ya mmanụ?

8 E nwee ndị Jehova kpọrọ ịga eluigwe, ọ na-eme ka o doo ha anya na ọ họrọla ha. (Gụọ 1 Jọn 2:20, 27.) N’eziokwu, Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị iso ná ndị Jehova si n’ọgbakọ ya na-akụziri ihe. Ma ọ bụghị onye ọzọ ga-eme ka obi sie ha ike na e teela ha mmanụ. Jehova ejirila mmụọ nsọ ya, bụ́ ike kacha ike niile, mee ka o doo ha anya nke ọma na ha bụ ndị e tere mmanụ.

‘A MỤRỤ HA ỌZỌ’

9. E tee mmadụ mmanụ, olee ihe Ndị Efesọs 1:18 kwuru na-agbanwe n’onye ahụ?

9 O nwere ike isiri ọtụtụ ndị na-efe Chineke ike taa ịghọta ihe na-eme mmadụ ma Chineke tee ya mmanụ. O kwesịghị iju anyị anya, n’ihi na e teghị hanwa mmanụ. Chineke kere mmadụ ka ọ dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa, ọ bụghị n’eluigwe. (Jen. 1:28; Ọma 37:29) Ma, Jehova ahọrọla ụfọdụ ịga biri n’eluigwe. N’ihi ya, o tee ha mmanụ, ọ na-agbanwe olileanya ha na otú ha si eche echiche, ha atụwazie anya ibi n’eluigwe.—Gụọ Ndị Efesọs 1:18.

10. Olee otú e si ‘amụ mmadụ ọzọ’? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)

10 Ọ bụrụ na e jiri mmụọ nsọ tee Onye Kraịst mmanụ, ‘a na-amụ ya ọzọ.’ * Ihe Jizọs kwuru gosikwara na, e tee mmadụ mmanụ, o nweghị otú ọ ga-esi akọwara ya onye a na-eteghị mmanụ ka ọ ghọta otú ọ na-adị ma ‘a mụọ mmadụ ọzọ,’ ma ọ bụ ma ‘a mụọ mmadụ site na mmụọ nsọ.’—Jọn 3:3-8.

11. Kọwaa otú echiche mmadụ si agbanwe ma e tee ya mmanụ.

11 Olee otú echiche Ndị Kraịst si agbanwe ma e tee ha mmanụ? Tupu Jehova etee ha mmanụ, ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ha na-atụsibu anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-ewepụ ihe ọjọọ niile ma mee ka ụwa bụrụ Paradaịs. O nwekwara ike ịbụ na ha nọkwa na-eche otú ọ ga-adị ha mgbe ha ga-ahụ onye ezinụlọ ha ma ọ bụ enyi ha nwụrụ anwụ a kpọlitere n’ọnwụ. Ma mgbe e tere ha mmanụ, ọ bụghịzi ihe ahụ ka ha na-eche. N’ihi gịnị? Ọ bụghị n’ihi na olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa agwụla ha ike. Ha agbanweghị obi ha maka na obi dara ha mbà ma ọ bụ na ha atagbuola onwe ha n’ahụhụ. Ha anọkataghị kpebie na ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ga na-agwụ ike. Kama, ọ bụ Chineke ji mmụọ nsọ ya gbanwee otú ha si eche echiche na ụgwọ ọrụ ha na-atụ anya ya.

12. Dị ka e kwuru na 1 Pita 1:3, 4, olee otú obi na-adị Ndị Kraịst e tere mmanụ maka olileanya ha nwere?

12 Onye e tere mmanụ nwere ike ịna-eche na ya erughị eru ịrụ ọrụ a pụrụ iche. Ma o nwetụdịghị mgbe ọ ga-eme ya obi abụọ ma Jehova ọ̀ họọrọ ya. Obi ga na-adị ya ezigbo ụtọ, ya ana-ekelekwa Chineke ma o cheta na o nwere olileanya ịga eluigwe.—Gụọ 1 Pita 1:3, 4.

13. Olee otú obi na-adị ndị e tere mmanụ gbasara ndụ ha dị n’ụwa a?

13 Ma ọ̀ pụtara na ndị e tere mmanụ chọrọ ịnwụ? Pọl onyeozi zara ajụjụ a. O ji ahụ́ ha tụnyere ụlọikwuu ma kwuo, sị: “N’eziokwu, anyị ndị nọ n’ụlọikwuu a na-asụ ude, ebe ọ na-anyịgbu anyị; n’ihi na anyị chọrọ, ọ bụghị iyipụ ya, kama iyiri nke ọzọ, ka ndụ wee loda ihe ahụ nke pụrụ ịnwụ anwụ.” (2 Kọr. 5:4) Ike ịdị ndụ n’ụwa a agwụbeghị ndị e tere mmanụ, ha achọghịkwanụ ịnwụ ozugbo. Ndụ na-atọ ha ụtọ. Ha chọkwara ka ha na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha na-ejere Jehova ozi kwa ụbọchị. Ma, n’agbanyeghị ihe ha na-eme, ha na-echeta ihe magburu onwe ya Chineke kwere nkwa imere ha n’ọdịnihu.—1 Kọr. 15:53; 2 Pita 1:4; 1 Jọn 3:2, 3; Mkpu. 20:6.

JEHOVA Ò TEELA GỊ MMANỤ?

14. Olee ihe ndị na-anaghị egosi na Chineke ejirila mmụọ nsọ tee mmadụ mmanụ?

14 I nwere ike ịna-eche ma Jehova ò jirila mmụọ nsọ ya tee gị mmanụ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, chebara ajụjụ ndị a dị mkpa echiche: Ime ihe Jehova chọrọ ọ̀ na-enu gị enu n’obi? Obi gị ọ̀ na-agwa gị na ị na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma? Ịmụ Baịbụl na ịmụta “ihe ndị miri emi nke Chineke” ọ̀ na-atọ gị ezigbo ụtọ? (1 Kọr. 2:10) Ị̀ hụla ihe dị iche iche gosiri na Jehova na-agọzi ozi ọma ị na-ekwusa? Ị̀ na-ewere ya ka ọrụ dịịrị gị inyere ndị ọzọ aka ka ha mụta gbasara Jehova? Ị̀ hụla ihe gosiri na Jehova esila n’ụzọ dị iche iche nyere gị aka? Ọ bụrụ na ị zara ee n’ajụjụ a niile, ò gosiri na Chineke ahọrọla gị ka ị gaa eluigwe? Mba. Ọ bụghị ihe o gosiri. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere ike ịdị ndị niile na-efe Chineke otú ahụ, ma hà bụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ na ha abụghị. Jehova nwekwara ike iji mmụọ nsọ ya mee ka onye ọ bụla bụ́ ohu ya mee ihe ndị a n’agbanyeghị olileanya onye ahụ nwere. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ma Chineke ò ji mmụọ nsọ ya tee gị mmanụ, ọ pụtara na e teghị gị mmanụ. Ọ naghị eme ndị ọ họọrọ obi abụọ. Ọ na-edo ha anya na ọ họrọla ha.

Jehova nyere Ebreham, Sera, Devid, na Jọn Onye Na-eme Baptizim ike mmụọ nsọ ime ihe ndị dị ịtụnanya, ma o jighị ya mee ka ha nwee olileanya ịga eluigwe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị ndị niile Chineke nyere mmụọ nsọ ka ọ họọrọ ka ha gaa eluigwe?

15 Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi Jehova nyere mmụọ nsọ ya, ma ha enweghị olileanya ibi n’eluigwe. Mmụọ nsọ duziri Devid. (1 Sam. 16:13) Mmụọ nsọ nyeere ya aka ịghọta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere Jehova nakwa iso dee Baịbụl. (Mak 12:36) N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, Pita onyeozi kwuru na “Devid arịgoghị n’eluigwe.” (Ọrụ 2:34) Jọn Onye Na-eme Baptizim ‘jupụtara na mmụọ nsọ.’ (Luk 1:13-16) Jizọs kwuru na e nwebeghị onye ka Jọn ukwuu, ma o kwuru na Jọn esoghị ná ndị ga-achị n’Alaeze eluigwe. (Mat. 11:10, 11) Jehova nyere ndị a ike mmụọ nsọ ime ihe ndị dị ịtụnanya, ma o jighị ya họrọ ha ịga eluigwe. Ọ̀ pụtara na ha ekwesịghị ntụkwasị obi ka ndị ahụ ọ họọrọ ịga chịa n’eluigwe? Mba. Ọ pụtara na Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri na Paradaịs ga-adị n’ụwa.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.

16. Olee olileanya ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke nwere taa?

16 Ọtụtụ ndị ohu Chineke taa enweghị olileanya ịga eluigwe. Ha nwere olileanya ahụ Ebreham, Sera, Devid, Jọn Onye Na-eme Baptizim, na ọtụtụ ndị ọzọ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, dịrị ndụ n’oge ochie nwere, ya bụ, ibi n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ha.—Hib. 11:10.

17. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu na-esonụ?

17 Ebe ọ bụ na a ka nwere ụfọdụ ndị Chineke taa e tere mmanụ, anyị nwere ike ịna-ajụ ajụjụ ụfọdụ. (Mkpu. 12:17) Dị ka ihe atụ, olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya? Onye ọgbakọ unu malite ịta achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, olee otú i kwesịrị isi na-emeso ya? Ọ bụrụ na mmadụ ole sịrị na ha bụ ndị e tere mmanụ na-ebukwu ibu, ò kwesịrị ịna-echu gị ụra? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

^ par. 5 Kemgbe ụbọchị Pentikọst afọ 33, Jehova na-eme ka ụfọdụ Ndị Kraịst nwee olileanya dị ịtụnanya, ya bụ, olileanya iso Ọkpara ya chịa n’eluigwe. Ma, olee otú Ndị Kraịst ndị ahụ si amata na Chineke ahọrọla ha maka ọrụ ahụ pụrụ iche? Gịnị na-eme ma Jehova kpọọ mmadụ ịga eluigwe? Isiokwu a si na nke gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 2016. Ọ ga-aza ajụjụ ndị a dị mkpa.

^ par. 2 NKỌWAKWU: Ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ: Jehova na-eji mmụọ nsọ ya ahọrọ mmadụ ka o soro Jizọs bụrụ eze n’eluigwe. Ọ na-eji mmụọ nsọ ya ekwe onye ahụ nkwa ihe a ga-enye ya n’ọdịnihu. Ọ bụ ya ka Baịbụl kpọrọ ‘ihe àmà e bu ụzọ nye’ ndị e tere mmanụ. (Efe. 1:13, 14) Ndị Kraịst ndị a nwere ike ikwu na mmụọ nsọ na-agbara ha àmà, ya bụ, na-eme ka o doo ha anya na ha ga-enweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.—Rom 8:16.

^ par. 5 NKỌWAKWU: Akara. E nwere ike iwepụ akara ahụ. Mana, mgbe a ga-eme ka ọ dịgide bụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka onye e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi nwụọ ma ọ bụkwanụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka oké mkpagbu malite.—Efe. 4:30; Mkpu. 7:2-4; gụọ Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, nke Eprel 2019, peeji nke 8.

^ par. 10 Ị chọọ ịghọtakwu ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara, gụọ Ụlọ Nche Eprel 1, 2009, peeji nke 3 ruo na nke 12.

ABỤ NKE 27 A Ga-ekpughe Ụmụ Chineke

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ma à tụrụ anyị mkpọrọ n’ihi ihe anyị kweere, ma ànyị nọ n’ebe anyị ga-ezili onye ọ bụla ozi ọma, anyị ga-atụli anya ibi n’ụwa mgbe Alaeze Chineke ga na-achị anyị.