Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 4

Na-enwere Ụmụnna Gị Ọmịiko

Na-enwere Ụmụnna Gị Ọmịiko

“N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ.”—ROM 12:10.

ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ụfọdụ na-egosi na ndị ezinụlọ anaghị ahụcha ibe ha n’anya taa?

BAỊBỤL kwuru na n’oge ikpeazụ, ndị mmadụ ga-abụ ndị “na-enweghị obi mmadụ.” (2 Tim. 3:1, 3) Anyị na-ahụ ka ihe a Baịbụl kwuru na-emezu taa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde ezinụlọ ekewaala n’ihi ịgba alụkwaghịm, ya emee ka ndị nne na nna ghara ịdị ná mma, ụmụaka ana-echekwa na a hụghị ha n’anya. Ndị ezinụlọ bi n’otu ụlọ nwedịrị ike ghara ịdịcha ná mma. Otu onye ọrụ ya bụ inye ndị ezinụlọ ndụmọdụ kwuru na “nne, nna, na ụmụaka nwedịrị ike ghara ịna-ekwurịta okwu n’ihi na ha ji oge ha niile na-apị ekwentị, kọmputa ma ọ bụ na-egwu egwuregwu kọmputa. Ọ bụ eziokwu na ha bi n’otu ụlọ, ma ha amaghị ibe ha nke ọma.”

2-3. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 12:10, olee ndị anyị kwesịrị ịna-enwere ọmịiko? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 Anyị achọghị ịdị ka ndị ụwa na-anaghị ahụ ibe ha n’anya. (Rom 12:2) Kama, anyị chọrọ ịna-enwere ma ndị ezinụlọ anyị ma ụmụnna anyị ọmịiko. (Gụọ Ndị Rom 12:10.) Anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya otú anyị si hụ ndị ezinụlọ anyị anyị na ha dị ná mma n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ụmụnna anyị ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị na ha jiri obi ụtọ na-efe Jehova.—Maị. 2:12.

3 Iji nwee ike ịna-egosi ụmụnna anyị ụdị ọmịiko a, ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl.

JEHOVA “NWERE OBI ỌMỊIKO DỊ UKWUU”

4. Olee otú Jems 5:11 si enyere anyị aka ịghọta otú Jehova hụruru anyị n’anya?

4 Baịbụl mere ka anyị mata àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere. Dị ka ihe atụ, ọ gwara anyị na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ịmata gbasara ya ga-eme ka anyị chọọ ịbụ enyi ya. Baịbụl gwakwara anyị na “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu.” (Gụọ Jems 5:11.) Ihe a na-eme ka anyị ghọta otú Jehova hụruru anyị n’anya.

5. Olee otú Jehova si emere anyị ebere, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya?

5 Ị̀ hụrụ na Jems 5:11 kwuru na Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, kwuokwa na ọ na-eme ebere? (Ọpụ. 34:6) Otu ụzọ Jehova si emere anyị ebere bụ ịgbaghara anyị mmehie anyị. (Ọma 51:1) Na Baịbụl, ime ebere abụghị naanị ịgbaghara mmadụ ihe o mejọrọ. Ebere bụ otú ọ na-adị anyị n’obi ma anyị hụ onye nọ n’ahụhụ. Ọ na-eme ka anyị chọọ inyere onye ahụ aka. Jehova kwuru na otú ọ na-adị ya n’obi inyere anyị aka karịrị nke nne na-elekọta nwa ya. (Aịza. 49:15) Anyị nọrọ n’ahụhụ, obi ebere Jehova na-eme ka o nyere anyị aka. (Ọma 37:39; 1 Kọr. 10:13) Otu ụzọ anyị si emere ụmụnna anyị ebere bụ ịghara iburu ha iwe n’obi ma ha mee anyị ihe ọjọọ. (Efe. 4:32) Ma, ụzọ bụ́ isi anyị si emere ụmụnna anyị ebere bụ inyere ha aka ma nsogbu bịara ha. Ọ bụrụ na otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya emee ka anyị na-emere ha ebere, anyị na-eme ka Jehova, bụ́ onye kacha enwe ọmịiko.—Efe. 5:1.

“E KEKỌTARA MKPỤRỤ OBI JỌNATAN NA MKPỤRỤ OBI DEVID”

6. Olee otú Jọnatan na Devid si gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya?

6 Baịbụl kọrọ gbasara ụmụ mmadụ na-ezughị okè nweere ibe ha ọmịiko. Ka anyị mụọ gbasara Jọnatan na Devid. Baịbụl kwuru, sị: “E kekọtara mkpụrụ obi Jọnatan na mkpụrụ obi Devid, Jọnatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi nke ya.” (1 Sam. 18:1) Jehova tere Devid mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-anọchi Sọl. Ihe a mere ka Sọl mewere Devid anyaụfụ ma chọọ igbu ya. Ma, Jọnatan bụ́ nwa Sọl esoghị nna ya na-achụgharị Devid ka e gbuo ya. Jọnatan na Devid kwere ibe ha nkwa na ha agaghị akwụsị ịbụ enyi nakwa na ha ga na-akwado ibe ha.—1 Sam. 20:42.

Ọtụtụ afọ Jọnatan ji tọ Devid emeghị ka ha abụọ ghara ịbụ ezigbo enyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 9)

7. Olee otu ihe gaara eme ka Jọnatan na Devid ghara ịbụ enyi?

7 Ụdị ịhụnanya dị n’etiti Jọnatan na Devid pụrụ iche n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe gaara eme ka ha ghara ịbụ enyi. Dị ka ihe atụ, Jọnatan ji ihe dị ka afọ iri atọ tọ Devid. Ihe a nwere ike ime ka Jọnatan kpebie na o nweghị ihe ga-ejikọ ya na Devid ebe ọ bụ na ọ tọgburu Devid atọgbu, kakwa ya mara ihe. Ma, Jọnatan emeghị otú ahụ. Kama, o ji Devid kpọrọ ihe.

8. Olee ihe i chere mere Jọnatan ji bụrụ ezigbo enyi Devid?

Jọnatan gaara enwewere Devid anyaụfụ. Ebe Jọnatan bụ ọkpara Eze Sọl, ọ gaara asị na ọ bụ ya ka o ruuru ịnọchi nna ya. (1 Sam. 20:31) Ma, Jọnatan dị umeala n’obi, na-erubekwara Jehova isi. N’ihi ya, ọ kwadoro mkpebi Jehova mere ka Devid bụrụ eze. Ọ kwadokwara Devid n’agbanyeghị na ime otú ahụ were nna ya ezigbo iwe.—1 Sam. 20:32-34.

9. Jọnatan ò weere Devid ka onye na-ama ya aka? Kọwaa.

Jọnatan hụrụ Devid n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere na o wereghị ya ka onye ya na ya na-azọ ihe. Jọnatan na-agba ụta nke ọma, bụrụkwa ezigbo onye agha. A makwa ya na papa ya bụ́ Sọl ama ka ndị “na-efe ọsọ karịa ugo” na ndị “dị ike karịa ọdụm.” (2 Sam. 1:22, 23) Ihe ndị a nwere ike ime ka Jọnatan tuwe ọnụ gbasara ihe ndị o mere. Ma, o meghị ka ọ mawa Devid aka ma ọ bụkwanụ nwewere ya anyaụfụ. Kama nke ahụ, Jọnatan nwere mmasị n’ebe Devid nọ n’ihi na o nwere obi ike ma tụkwasị Jehova obi. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid gbuchara Golayat, Jọnatan bịara hụ ya n’anya otú o si hụ onwe ya. Olee otú anyị nwere ike isi na-ahụ ụmụnna anyị n’anya otú ahụ?

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NA-AHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA TAA?

10. Gịnị ka inwe ‘ịhụnanya siri ike n’ebe ibe anyị nọ site n’obi anyị’ pụtara?

10 Baịbụl gwara anyị, sị: “Nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.” (1 Pita 1:22) Jehova egosila anyị otú anyị nwere ike isi mee ya. Ịhụnanya o nwere n’ebe anyị nọ siri ezigbo ike nke na ọ gaghị akwụsị ịhụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-erubere ya isi. (Rom 8:38, 39) Onye nwere ịhụnanya “siri ike” n’ebe mmadụ ibe ya nọ na-agba ezigbo mbọ iji na-egosi onye ahụ ịhụnanya. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbaa ezigbo mbọ iji gosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Ndị ọzọ kpasuo anyị iwe, ọ dị mkpa ka anyị jiri ‘ịhụnanya na-ediri ibe anyị ihe, na-agbasi mbọ ike ka anyị nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.’ (Efe. 4:1-3) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ime ka anyị na ụmụnna anyị dịrị ‘n’udo,’ ọ ga-eme ka anyị leghara mmejọ ha anya. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha.—1 Sam. 16:7; Ọma 130:3.

Pọl gbara Yuodia na Sintiki ume ka ha gbalịa bụrụ ezigbo enyi. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike anyị na ụmụnna anyị ịbụ ezigbo enyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike inwere ụmụnna anyị ọmịiko mgbe ụfọdụ?

11 Ọ naghị adịcha mfe mgbe niile inwere ụmụnna anyị ọmịiko, nke ka nke, ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ebe ndị ha na-anaghị emeta. O doro anya na o siiri ụfọdụ Ndị Kraịst ike ime ya n’oge ndịozi. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na Yuodia, Sintiki, na Pọl ‘gbakọwa mbọ ọnụ n’ozi ọma,’ ha anaghị enwe nsogbu. Ma ihe anaghị adabara Yuodia na Sintiki. Ọ bụ ya mere Pọl ji gwa ha ka ha “nwee otu obi n’ime Onyenwe anyị.”—Fil. 4:2, 3.

Ndị okenye na-akatabeghị ahụ́ na ndị okenye merela agadi nwere ike ịbụ ezigbo enyi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-enwekwuru ụmụnna anyị ọmịiko?

12 Olee otú anyị nwere ike isi na-enwere ụmụnna anyị ọmịiko taa? Ọ bụrụ na anyị amatakwuo ụmụnna anyị, o nwere ike ime ka ọ dịrị anyị mfe ịna-aghọta ha ma na-enwere ha ọmịiko. Ebe mmadụ si ma ọ bụ afọ ole ọ dị ekwesịghị ime ka anyị na ya ghara ịbụ enyi. Cheta na Jọnatan ji ihe dị ka afọ iri atọ tọ Devid. Ma ha abụọ ghọrọ ezigbo enyi. È nwere onye tọrọ gị ma ọ bụ onye ị tọrọ nọ n’ọgbakọ unu ì nwere ike imeta enyi? I mee otú ahụ, anyị na-egosi na anyị hụrụ “òtù ụmụnna dum n’anya.”—1 Pita 2:17.

A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 *

13. Gịnị mere na otú anyị na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ si dịrị ná mma agaghị aha otu?

13 Inwere ụmụnna anyị ọmịiko ọ̀ pụtara na otú anyị na ha niile ga-esi adị ná mma ga-aha otu? Mba. Ọ gaghị ekwe omume. Ọ dịghị njọ anyị na ụfọdụ ụmụnna anyị ịdị ná mma karịa ndị ọzọ n’ihi na ihe na-amasị ha na-amasị anyị. Jizọs na-akpọ ndịozi ya niile ndị enyi ya, ma ọ bụ Jọn ka ọ kacha hụ n’anya. (Jọn 13:23; 15:15; 20:2) Ma Jizọs anaghị emelara Jọn ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Jọn na Jems nwanne ya gwara Jizọs ka ha nọrọ n’aka nri ya n’Alaeze Chineke, Jizọs gwara ha, sị: “Ọ bụghị m na-eme ka a nọdụ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m.” (Mak 10:35-40) Dị ka Jizọs, anyị ekwesịghị ịna-emelara ndị ezigbo enyi anyị ihe. (Jems 2:3, 4) Ime otú ahụ nwere ike ịkpata nkewa, bụ́kwanụ ihe a na-achọtụdịghị n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Jud 17-19.

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:3, gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịchọ ka anyị na ndị ọzọ na-ama aka n’ọgbakọ?

14 Ọ bụrụ na anyị na-enwere onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ọmịiko, ọ ga-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ ghara ịna-ama aka. Cheta na Jọnatan agaghị ka ya na Devid mawa aka. Ọ naghị ele ya anya ka onye ya na ya na-azọ eze. Anyị niile nwere ike ịna-eme ka Jọnatan. Emerela nwanna gị anyaụfụ n’ihi ihe ọ ma eme nke ọma, ‘kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka gị.’ (Gụọ Ndị Filipaị 2:3.) Cheta na e nwere ihe onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ga-emeli iji na-eme ka ọgbakọ na-aga nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ana-adị umeala n’obi, anyị ga na-ahụ ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma, mụtakwa ihe n’aka ha.—1 Kọr. 12:21-25.

15. Gịnị ka ị mụtara n’ihe mere Nwanna Nwaanyị Tanya na ezinụlọ ya?

15 Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, Jehova na-eme ka ụmụnna anyị na-enwere anyị ọmịiko ma na-enyere anyị aka. Chegodị ihe mere otu ezinụlọ gara otu n’ime mgbakọ mba niile e mere n’Amerịka n’afọ 2019. Isiokwu ya bụ “Ịhụnanya Adịghị Ada Ada.” Mama ha aha ya bụ Tanya kwuru ihe mere mgbe ha si ihe omume nke ụbọchị Satọdee na-alọta. Ọ sịrị: “Mgbe anyị nọ n’ụgbọala na-alaghachi ebe anyị bi, ụgbọala ọzọ hapụrụ ebe ọ na-aga, bịa kụọ anyị. O nweghị onye merụrụ ahụ́. O riri anyị ọnụ, anyị esi n’ụgbọala ahụ pụta, kwụrụ n’akụkụ ụzọ. E nwere otu onye nọ n’akụkụ ụzọ nke ọzọ na-efere anyị aka ka anyị bata n’ụgbọala ya. Ọ bụ otu nwanna sikwa otu mgbakọ ahụ na-alọta. Ọ bụghị naanị ya kwụsịrị. Ụmụnna ise ndị ọzọ bụ́ ndị Swidin kwụsịkwara. Ụmụnna ndị nwaanyị makụrụ mụ na nwa m nwaanyị. Ọ bụkwanụ ihe dị anyị mkpa mgbe ahụ. M gwara ha na nsogbu adịghị, na ha nwere ike ịlawa. Ma ha ekweghị ahapụ anyị. Anyị na ha nọrọ ruo mgbe ndị ụlọ ọgwụ bịara. Ha hụrụ na anyị nwetara ihe niile dị anyị mkpa. N’ihe niile a merenụ, anyị hụrụ na Jehova hụrụ anyị n’anya. Ihe a merenụ mere ka anyị hụkwuo ụmụnna anyị n’anya, meekwa ka anyị hụkwuo Jehova n’anya.” È nwere mgbe i chetara ị nọ ná nsogbu, nwanna gị abịa nyere gị aka?

16. Olee ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-enwere ibe anyị ọmịiko?

16 Chegodị ihe ọma ndị na-esi n’inwere ụmụnna anyị ọmịiko apụta. Anyị na-akasi ụmụnna anyị obi ma ha nọrọ ná nsogbu. Anyị na-enyere ụmụnna anyị aka iji obi ụtọ na-efe Jehova. Anyị na-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Nke a na-emekwa ka ndị nwere ezi obi bịa fewe Chineke. Nke kachanụ bụ na anyị na-eme ka e too “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile,” bụ́ Jehova. (2 Kọr. 1:3) Ka anyị niile nọgide na-enwere ụmụnna anyị ọmịiko ma na-amụtakwu otú anyị ga-esi na-enwere ha ya.

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

^ par. 5 Jizọs kwuru na ihe a ga-eji mara ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya. Anyị niile na-agbalị ịhụ ibe anyị n’anya. Anyị kwesịrị ịhụ ụmụnna anyị n’anya otú ahụ ndị nọ n’otu ezinụlọ si ahụ ibe ha n’anya. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi na-enwekwuru ụmụnna anyị ọmịiko.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye mụtara ihe n’aka okenye ọzọ merela agadi gara n’ụlọ okenye ahụ, ya na nwunye ya anabata ha nke ọma, ha enyekwa ha onyinye ha ji bịa.