Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 1

“Ihe Ọma Agaghị Akọ Ndị Na-achọ Jehova”

“Ihe Ọma Agaghị Akọ Ndị Na-achọ Jehova”

ISIOKWU AFỌ 2022: “Ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.”​—ỌMA 34:10.

ABỤ NKE 4 “Jehova Bụ Onye Na-azụ M Dị Ka Atụrụ”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

Devid ma na e nweghị ihe ọma kọrọ ya, ma mgbe ọ nọ ná nsogbu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1 ruo na nke 3) *

1. Olee nsogbu bịaara Devid?

 DEVID nọ na-agba ọsọ ndụ. Eze Izrel na-akpa ezigbo ike aha ya bụ Sọl chọsiri ike imemila ya. Mgbe Devid chọrọ ihe ọ ga-eri, ọ kwụsịrị n’obodo Nọb, rịọ Ahimalek bụ́ onye nchụàjà ka o nye ya ogbe achịcha ise. (1 Sam. 21:​1, 3) Mgbe e mechara, ya na ndị agha ya gara zoo n’ọgba. (1 Sam. 22:1) Olee otú Devid si banye ná nsogbu a?

2. Olee ihe dị ezigbo njọ Sọl mere? (1 Samuel 23:​16, 17)

2 Sọl na-emere Devid ezigbo anyaụfụ n’ihi na ọtụtụ ndị hụrụ ya n’anya nakwa n’ihi na o meriri n’ọtụtụ agha. Sọl makwa na nnupụisi ya mere ka Jehova jụ ya ma họrọ Devid ka ọ bụrụzie eze Izrel. (Gụọ 1 Samuel 23:​16, 17.) Ma, Sọl ka bụ eze Izrel, nweekwa ọtụtụ ndị agha na ọtụtụ ndị na-akwado ya. N’ihi ya, Devid gbara ọsọ ndụ. Sọl ò chere na ya ga-enwe ike ịkwụsịli Jehova ime Devid eze? (Aịza. 55:11) Baịbụl ekwughị otú ahụ. Ma, otu ihe doro anyị anya bụ na ihe ahụ Sọl mere bụ itinye onwe ya n’ezigbo nsogbu. O nweghị mgbe ndị na-alụso Jehova ọgụ na-agaghị akụ afọ n’ala.

3. Olee otú obi dị Devid n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya?

3 Devid bụ nwoke dị umeala n’obi. Ọ bụghị ya họpụtara onwe ya ịbụ eze Izrel. Ọ bụ Jehova họpụtara ya. (1 Sam. 16:​1, 12, 13) Sọl weere Devid ka ezigbo onye iro ya. Ma, Devid abịaghị tawa Jehova ụta maka nsogbu nhọpụta ọ họpụtara ya kpataara ya. O meghịkwanụ mkpesa na ya enweghị nri ma ọ bụkwanụ na ya bi n’ọgba. Kama nke ahụ, o nwedịrị ike ịbụ mgbe ahụ o zoro n’ọgba ka o dere abụ ndị ahụ magburu onwe ha e ji eto Jehova nke otu n’ime ha bụ amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu afọ a, nke bụ́: “Ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.”​—Ọma 34:10.

4. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza? Gịnịkwa mere ha ji dị ezigbo mkpa?

4 Taa, ọtụtụ ndị ohu Jehova na-anọ n’enweghị nri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị ha mkpa ná ndụ. * Ihe a bụ eziokwu, karịchaa n’oge a ọrịa koronavaịrọs na-akpa mkpamkpa. Ugbu a “oké mkpagbu” ahụ na-abịa n’ike n’ike, o doro anya na ihe ga na-atakwu akpụ. (Mat. 24:21) N’ihi ihe ndị a anyị kwuru, ka anyị zaa ajụjụ anọ ndị a: Olee otú o si bụrụ na e nweghị “ihe ọma” kọrọ Devid? Gịnị mere ihe ndị anyị nwere kwesịrị iji ju anyị afọ? Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga na-elekọta anyị? Olee ihe ndị anyị ga-eme ugbu a iji jikere maka ọdịnihu?

“E NWEGHỊ IHE GA-AKỌ M”

5-6. Olee otú Abụ Ọma 23:​1-6 si nyere anyị aka ịghọta ihe Devid bu n’obi mgbe ọ sịrị na “ihe ọma agaghị akọ” ndị ohu Chineke?

5 Gịnị ka Devid bu n’obi mgbe ọ sịrị na “ihe ọma agaghị akọ” ndị ohu Jehova? Anyị ga-aghọta ihe o bu n’obi ma ọ bụrụ na anyị atụlee ihe ndị dị n’Abụ Ọma nke iri abụọ na atọ. (Gụọ Abụ Ọma 23:​1-6.) Otú Devid si malite abụ ọma ahụ bụ: “Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. E nweghị ihe ga-akọ m.” N’ebe ndị ọzọ n’Abụ Ọma nke iri abụọ na atọ ahụ, Devid kwuru ihe ndị bara ezigbo uru, ya bụ, uru ndị o ritere n’ihi ikwe ka Jehova bụrụ Onye na-azụ ya. Jehova ‘na-edu ya aga n’ụzọ ziri ezi.’ Jehova na-akwado ya ma mgbe ihe dịịrị ya mma ma mgbe ihe na-adịghịrị ya mma. Devid makwa na “n’ebe ahịhịa ndụ juru” Jehova mere ka ọ makpuru emeghị ka ọ ghara inwe nsogbu ọ bụla. Mgbe ụfọdụ, nsogbu nwere ike ime ka obi dị ya ka ọ̀ na-eje ije “na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị.” Ọ ga-enwekwa ndị iro. Ma, ọ gaghị “atụ egwu ihe ọ bụla” ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye na-azụ ya dị ka atụrụ.

6 Ugbu a, anyị ahụla azịza ajụjụ ahụ bụ́: Gịnị mere Devid ji kwuo na “ihe ọma agaghị akọ” ndị ohu Jehova? Ebe ọ bụ na o nwere ihe niile ga-enyere ya aka ka ya na Chineke dịrị ná mma, o nweghị ihe kọrọ ya. Ihe na-eme ka ọ na-enwe obi ụtọ abụghị akụnụba. Obi dị ya ụtọ maka ihe ndị Jehova nyere ya. Ihe kacha ya mkpa bụ na Jehova na-agọzi ya, na-echebekwa ya.

7. Dị ka e kwuru na Luk 21:​20-24, olee nsogbu bịaara Ndị Kraịst bi na Judia?

7 Ihe Devid kwuru gosiri na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị ghara ikwe ka ihe onwunwe bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Ihe ndị anyị nwere na-abara anyị uru. Ma, anyị ekwesịghị ime ka ọ bụrụ ha kacha anyị mkpa. Ihe a bụ otu eziokwu doro anya Ndị Kraịst bi na Judia mechara ghọta. (Gụọ Luk 21:​20-24.) Jizọs ebula ụzọ dọọ ha aka ná ntị na oge na-abịa mgbe ‘ndị agha ga-agba Jeruselem gburugburu.’ Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ha kwesịrị ‘ịmalite ịgbaga n’ugwu.’ Mgbapụ ahụ ha ga-agbapụ ga-eme ka a zọpụta ha. Ma, ọ ga-eme ka ha hapụ ọtụtụ ihe. Afọ ole na ole gara aga, otu Ụlọ Nche kwuru na ha hapụrụ ubi ha na ụlọ ha, n’akwaraghị ngwongwo ndị ha nwere n’ụlọ. Ha weere ofufe Jehova ka ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla maka na obi siri ha ike na Jehova ga-echebe ha ma kwado ha.

8. Olee ihe dị ezigbo mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Ndị Kraịst bi na Judia?

8 Olee ihe dị ezigbo mkpa anyị na-amụta n’ihe ahụ mere Ndị Kraist bi na Judia? Ụlọ Nche ahụ anyị kwuburu okwu ya kwukwara na e nwere ike inwe ihe ga-eme ka a mata ma ọ̀ bụ ihe ndị anyị nwere dị anyị mkpa karịa nzọpụta a ga-azọpụta ndị niile na-erubere Chineke isi. Ihe nwere ike isiri anyị ike n’oge ahụ, ya adịkwa mkpa ka anyị hapụ ihe ụfọdụ anyị nwere. Anyị kwesịrị ịdị njikere ime ihe ọ bụla anyị kwesịrị ime, otú ahụ Ndị Kraịst ibe anyị mere n’oge ndịozi Jizọs mgbe ha si na Judia gbapụ. *

9. Olee otú ihe ahụ Pọl gwara ndị Hibru nwere ike isi gbaa anyị ume?

9 Chegodị ihe ọ dị ka ya Ndị Kraịst ahụ ịhapụ ihe niile ha nwere ma bido ụwa n’isi. Ọ bụ okwukwe ha nwere ga-eme ka ha tụkwasị Jehova obi na ọ ga-egboro ha mkpa ha. Ma, e nwere ihe ga-enyere ha aka. Afọ ise tupu ndị Rom agbaa Jeruselem gburugburu, Pọl onyeozi nyere ndị Hibru ndụmọdụ dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Ka otú unu si ebi ndụ gosi na unu ahụghị ego n’anya, kama ka ihe ndị dị ugbu a ju unu afọ. N’ihi na o kwuru, sị: ‘E nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị, e nweghịkwa ihe ga-eme ka m gbakụta gị azụ.’ Ka anyị wee nwee obi ike ma sị: ‘Jehova bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?’” (Hib. 13:​5, 6) O doro anya na ọ ka dịrị ndị mere ihe Pọl kwuru mfe ihe ha nwere iju ha afọ n’ebe ọhụrụ a ha kwagara. Obi siri ha ike na Jehova ga-enye ha ihe ndị dị ha mkpa. Ihe ahụ Pọl kwuru mesikwara anyị obi ike na Jehova ga-egboro anyị mkpa anyị.

IHE NDỊ A “KWESỊRỊ IJU ANYỊ AFỌ”

10. Gịnị ka Pọl kwuru nyeere ya aka?

10 Pọl nyekwara Timoti ụdị ndụmọdụ ahụ. Ọ ga-abakwara anyị uru taa. Ọ sịrị: “N’ihi ya, ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.” (1 Tim. 6:8) Ihe a Pọl kwuru ọ̀ pụtara na anyị enweghị ike iri nri dị mma, biri n’ezigbo ụlọ, ma ọ bụkwanụ zụta uwe ma ọ dị mkpa? Ọ bụghị ihe ọ pụtara. Pọl na-ekwu na ihe ọ bụla anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ. (Fil. 4:12) Ọ bụ ihe a nyeere Pọl aka. Ihe kacha mkpa anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova, ọ bụghị ihe ọ bụla anyị nwere.​—Hab. 3:​17, 18.

E nweghị ihe ọma kọrọ ndị Izrel n’ime afọ iri anọ ahụ ha nọrọ n’ala ịkpa. Ihe ndị anyị nwere ugbu a hà nwere ike iju anyị afọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Olee ihe anyị si n’ihe Mosis gwara ụmụ Izrel na-amụta gbasara ihe anyị nwere iju anyị afọ?

11 Ihe Jehova weere ka ihe dị anyị mkpa nwere ike ịdị iche n’ihe anyị chọrọ. Legodị ihe Mosis gwara ụmụ Izrel mgbe ha nọchara afọ iri anọ n’ala ịkpa. Ọ sịrị ha: “Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu n’ihe niile unu merela. Ọ ma nnọọ otú unu si na-agagharị ná nnukwu ala ịkpa a. Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu afọ iri anọ a, e nweghịkwa ihe kọrọ unu.” (Diut. 2:7) N’ime afọ iri anọ ahụ, Jehova nyere ụmụ Izrel mana ka ha rie. Uwe ha yi si n’Ijipt pụta akaghị. (Diut. 8:​3, 4) Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike ịna-asị na ihe ndị ha nwere n’oge ahụ ezurughị ha, ma Mosis chetaara ụmụ Izrel na ha nwere ihe niile dị ha mkpa. Obi ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ihe anyị nwere eju anyị afọ. Ọ chọrọ ka obi na-adị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-enye anyị, n’agbanyeghị otú ọ ha, nakwa ka anyị ghọta na ha bụ onyinye si ya n’aka.

OBI SIE GỊ IKE NA JEHOVA GA NA-ELEKỌTA GỊ

12. Olee ihe gosiri na Devid tụkwasịrị Jehova obi kama ịtụkwasị onwe ya?

12 Devid ma na Jehova anaghị ahapụ ndị hụrụ ya n’anya. Ọ na-elekọtakwa ha. Ọ bụ eziokwu na e nwere ndị chọrọ igbu ya mgbe ọ na-ede Abụ Ọma nke iri atọ na anọ, ma, obi siri ya ike na “mmụọ ozi Jehova na-echebe” ya. (Ọma 34:7) O nwere ike ịbụ na Devid ji ndị mmụọ ozi Jehova na-atụnyere onye agha nọ na nche maka ndị iro. Ọ bụ eziokwu na Devid bụ ezigbo onye agha nakwa na Jehova kwere ya nkwa na ọ ga-abụ eze, ọ ma na ihe ga-eme ka o merie ndị iro ya abụghị na ọ ma otú e si agba èbè ma ọ bụkwanụ na ọ ma otú e si eji mma alụ agha. (1 Sam. 16:13; 24:12) Devid tụkwasịrị Jehova obi, obi esiekwa ya ike na mmụọ ozi Jehova ‘na-anapụta’ ndị na-atụ egwu ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na taa, anyị anaghị atụ anya ka Jehova rụọ ọrụ ebube chebe anyị, ma, anyị ma na onye ọ bụla tụkwasịrị Jehova obi ga-enweta ndụ ebighị ebi ọ bụrụgodị na ọ nwụọ ugbu a.

N’oge oké mkpagbu, Gọg nke Megọg nwere ike ịbịa lụso anyị ọgụ n’ụlọ anyị. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na Jizọs na ndị mmụọ ozi ma ihe niile na-emenụ. Ha ga-echebekwa anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Mgbe Gọg nke Megọg ga-alụso ndị Chineke ọgụ, olee ihe mere anyị ga-eji dị ha ka anụ oriri, gịnịkwa mere obi ji kwesị isi anyị ike? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

13 N’oge na-adịghị anya, a ga-enwe ihe ga-eme ka o doo anya ma ànyị ga-atụkwasị Jehova obi na ọ ga-echebe anyị. Mgbe Gọg nke Megọg, ya bụ, ọtụtụ mba gbakọrọ aka ọnụ, ga-alụso ndị Chineke ọgụ, anyị nwere ike ịna-eche na ha ga-egbu anyị. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-azọpụtali anyị nakwa na ọ ga-azọpụta anyị. Mba ndị ahụ nwere ike ịna-eche na anyị dị ka atụrụ na-enweghị onye ga-echebe ya. (Ezik. 38:​10-12) Anyị agaghị eji ngwá agha, a gaghịkwanụ azụ anyị ịlụ agha. Mba ndị ahụ nwere ike ịna-eche na anyị bụ anụ oriri. Ha agaghị ama na anyị ji okwukwe na-ahụ ọtụtụ ndị mmụọ ozi gbara anyị gburugburu dị njikere ichebe anyị. Oleekwanụ otú mba ndị ahụ ga-esi ama ebe ọ bụ na ha enweghị okwukwe na Chineke? Ọ ga-ejuzi ha anya mgbe ndị agha nke eluigwe ga-alụrụ anyị ọgụ.​—Mkpu. 19:​11, 14, 15.

KWADEBE UGBU A MAKA ỌDỊNIHU

14. Olee ihe anyị nwere ike ime ugbu a iji jikere maka ọdịnihu?

14 Gịnị ka anyị nwere ike ime ugbu a iji jikere maka ọdịnihu? Nke mbụ, anyị kwesịrị ịna-ele ihe ndị anyị nwere anya otú kwesịrị ekwesị n’ihi na e nwere mgbe ọ ga-adị mkpa ka anyị hapụ ha. Ihe ndị anyị nwere kwesịkwara iju anyị afọ. Anyị kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ na anyị na Jehova dị ná mma. Ka anyị na-amatakwu Chineke, obi ga-esikwu anyị ike na ọ ga-echebeli anyị mgbe Gọg nke Megọg ga-abịa ịlụso anyị ọgụ.

15. Gịnị mere obi ji sie Devid ike na Jehova agaghị agharịpụ ya?

15 Legodị ihe ọzọ nyeere Devid aka ga-enyekwara anyị aka ịkwadebe maka nsogbu. Devid sịrị: “Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma. Onye gbabara n’ime ya na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 34:8) Okwu ndị a gosiri ihe mere obi ji sie Devid ike na Jehova ga-anọnyere ya. Ọtụtụ mgbe, Devid tụkwasịrị Jehova obi. O nweghịkwa mgbe Jehova gharịpụrụ ya. Mgbe Devid bụ okorobịa, ọ lụsoro otu dike onye Filistia aha ya bụ Golayat ọgụ. Devid gwara ya, sị: “Jehova ga-enyefe gị n’aka m taa.” (1 Sam. 17:46) Mgbe ọ na-ejere Eze Sọl ozi, Sọl gbalịrị ọtụtụ ugboro igbu ya. Ma, “Jehova nọnyeere Devid.” (1 Sam. 18:12) Ebe ọ bụ na Jehova enyerela Devid aka n’oge gara aga, ọ ma na na ọ ga-enyere ya aka ná nsogbu nke a bịaara ya.

16. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma’?

16 Ọ bụrụ na anyị ekwere ka Jehova na-eduzi anyị ugbu a, obi ga-esi anyị ike na ọ ga-azọpụta anyị n’ọdịnihu. Okwukwe ga-eme ka anyị gakwuru onye anyị na-arụrụ ọrụ gwa ya ka o nye anyị oge anyị ga-eji gaa mgbakọ, na-aga ọmụmụ ihe, na ozi ọma. Ọ bụrụkwanụ na ọ jụ ma chụọ anyị n’ọrụ, obi ò siri anyị ike na Jehova agaghị ahapụ anyị nakwa na ọ ga-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa? (Hib. 13:5) Ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge niile nwere ike ịkọ otú Jehova si enyere ha aka mgbe ọ bụla enyemaka dị ha mkpa. Jehova anaghị ahapụ ndị na-erubere ya isi.

17. Gịnị bụ isiokwu afọ 2022, gịnịkwa mere o ji daba adaba?

17 Ebe ọ bụ na Jehova nọnyeere anyị, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. Chineke anyị agaghị ahapụ anyị ma ọ bụrụhaala na ihe kacha anyị mkpa ná ndụ bụ ime uche ya. Òtù Na-achị Isi chọrọ ichetara anyị na anyị kwesịrị ịkwadebe ugbu a maka oge siri ike ga-abịa n’ọdịnihu, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ gaghị ahapụ anyị. Ọ bụ ya mere ha ji họrọ Abụ Ọma 34:10 ka ọ bụrụ isiokwu afọ 2022. Ebe ahụ sịrị: “Ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.”

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

^ par. 5 Ebe e si nweta isiokwu afọ 2022 bụ Abụ Ọma 34:10. Ọ sịrị: “Ihe ọma agaghị akọ ndị na-achọ Jehova.” Ọtụtụ ndị Jehova taa abaghị ọgaranya. Oleezi ihe mere e ji na-ekwu na “ihe ọma agaghị akọ” ndị ohu Jehova? Olee otú ịghọta ihe amaokwu a na-ekwu ga-esi nyere anyị aka ịkwadebe maka nsogbu ndị ga-abịa n’ọdịnihu?

^ par. 4 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Septemba 15, 2014.

^ par. 8 Gụọ Ụlọ Nche May 1, 1999, peeji nke 19.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Ebe Devid nọ n’ọgba mgbe ọ na-agba ọsọ maka Eze Sọl. Obi dị Devid ụtọ maka ihe ndị Jehova nyere ya.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Ebe Jehova nyere ụmụ Izrel mana ka ha rie, meekwa ka uwe ha yi ghara ịka mgbe ha hapụrụ Ijipt.