Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 3

Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Anya Mmiri Gbara Jizọs

Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Anya Mmiri Gbara Jizọs

“Anya mmiri wee gbaa Jizọs.”​JỌN 11:35.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-3. Olee ihe nwere ike ime ka anya mmiri na-agba ndị Jehova?

 OLEE mgbe ikpeazụ anya mmiri gbara gị? Mgbe ụfọdụ, anya mmiri nwere ike gbaa anyị n’ihi na obi dị anyị ụtọ. Ma, anya mmiri na-agbakarị anyị mgbe ihe na-ewute anyị, dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị. Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Lorilei kwuru, sị: “E nwere mgbe ụfọdụ obi na-agbawa m n’ihi ọnwụ nwa m nwaanyị. N’oge ndị ahụ, echeghị m na m ga-edili ya.” *

2 E nwekwara ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anya mmiri gbaa anyị. Otu ọsụ ụzọ bi na Japan aha ya bụ Hiromi sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-ewute m na ndị mmadụ anaghị ege m ntị n’ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, anya mmiri na-agba m ma m rịọwa Jehova ka o nyere m aka ịchọta ndị chọrọ ịmụ Baịbụl.”

3 Ò nwere mgbe obi na-adị gị otú a ọ dị ụmụnna nwaanyị ndị a? Obi na-adị ọtụtụ n’ime anyị otú ahụ. (1 Pita 5:9) Anyị chọrọ iji “ọṅụ na-efe Jehova.” Ma, anyị nwere ike iji anya mmiri na-efe Jehova n’ihi na anyị na-eru uju, obi na-ajọ anyị njọ, ma ọ bụ n’ihi nsogbu ọzọ chọrọ ime ka anyị hapụ Jehova. (Ọma 6:6; 100:2) Olee ihe anyị nwere ike ime ma ọ dịrị anyị otú ahụ?

4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Jizọs. O nwere ihe ndị wutere Jizọs mere ‘anya mmiri ji gbaa ya.’ (Jọn 11:35; Luk 19:41; 22:44; Hib. 5:7) Ka anyị tụlee ihe ndị ahụ. Ka anyị na-atụle ha, anyị ga-ahụ ihe ndị anyị nwere ike ịmụta na ha, hụkwa ihe ụfọdụ anyị nwere ike ime ma anyị nwee nsogbu ndị nwere ike ime ka anya mmiri gbaa anyị.

ANYA MMIRI GBARA JIZỌS MAKA NDỊ ENYI YA

Na-akasi ndị na-eru uju obi otú ahụ Jizọs mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 ruo na nke 9) *

5. Gịnị ka anyị na-amụta gbasara Jizọs na Jọn 11:​32-36?

5 N’oge oyi nke afọ 32, ọrịa bịara ezigbo enyi Jizọs aha ya bụ Lazarọs, ya emechaakwa nwụọ. (Jọn 11:​3, 14) Lazarọs nwere ụmụnne nwaanyị abụọ bụ́ Meri na Mata. Jizọs hụkwara ezinụlọ ha n’anya nke ukwuu. Obi gbawara ha mgbe nwanne ha nwoke nwụrụ. Mgbe Lazarọs nwụchara, Jizọs gara Betani, bụ́ ebe Meri na Mata bi. Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, o ji ọsọ gakwuru ya. Chegodị otú obi dị ya mgbe ọ sịrị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” (Jọn 11:21) Mgbe Jizọs hụkwara ka Meri na ndị ọzọ na-ebe ákwá, ‘anya mmiri gbara ya.’​—Gụọ Jọn 11:​32-36.

6. Gịnị mere anya mmiri ji gbaa Jizọs mgbe Lazarọs nwụrụ?

6 Gịnị mere anya mmiri ji gbaa Jizọs n’oge ahụ? Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures sịrị: “Ọnwụ enyi ya nwoke Lazarọs na obi gbawara ụmụnne Lazarọs mere ka Jizọs ‘sụọ ude, anya mmiri agbaakwa ya.’” * O nwekwara ike ịbụ na Jizọs nọ na-eche ụdị ahụhụ enyi ya nwoke a tara mgbe ahụ ọ nọ n’ọrịa, nakwa otú obi dị ya mgbe ọ chọpụtara na ọ gaghị agbake. Ihe ọzọ mekwara anya mmiri ji gbaa Jizọs bụ otú o si wute Meri na Mata na nwanne ha anwụọla. Ọ bụrụ na enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị nwụrụ, obi nwekwara ike ịdị gị otú ahụ. Legodị ihe atọ i nwere ike ịmụta n’ihe a.

7. Gịnị ka anyị na-amụta gbasara Jehova n’anya mmiri gbara Jizọs?

7 Jehova na-aghọta otú obi dị gị. Jizọs ‘yiri nnọọ’ Nna ya. (Hib. 1:3) Mgbe anya mmiri gbara Jizọs, o gosiri otú ọ na-adị Nna ya mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ. (Jọn 14:9) Ọ bụrụ na e nwere onye nwụnahụrụ gị, obi sie gị ike na ọ bụghị naanị na Jehova na-ahụ otú obi dị gị, kama, ọ na-emetara gị ebere, chọọkwa ịkasi gị obi.​—Ọma 34:18; 147:3.

8. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jizọs ga-akpọlite ndị anyị nwụrụ anwụ?

8 Jizọs chọrọ ịkpọlite ndị gị nwụrụ anwụ. Obere oge tupu anya mmiri agbaa Jizọs, ọ sịrị Mata: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Mata kwetara. (Jọn 11:​23-27) Ebe Mata na-efe Jehova, o doro anya na ọ ma banyere ndị ndị amụma bụ́ Ịlaịja na Ịlaịsha kpọlitere n’ọnwụ ọtụtụ afọ gara aga. (1 Eze 17:​17-24; 2 Eze 4:​32-37) Ọ ga-abụkwa na ọ nụrụ gbasara ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. (Luk 7:​11-15; 8:​41, 42, 49-56) Ka obi sie gị ike na ị ga-ahụ ndị gị nwụrụ anwụ ọzọ. Mgbe Jizọs na-akasi ndị enyi ya na-eru uju obi, anya mmiri gbara ya gosiri na ọ chọsiri ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

9. Dị ka Jizọs, olee otú i nwere ike isi nyere ndị na-eru uju aka? Mee ihe atụ.

9 I nwere ike inyere ndị na-eru uju aka. Ọ bụghị naanị na Jizọs so Meri na Mata bee ákwá, o gere ha ntị, kasiekwa ha obi. Anyị nwekwara ike inyere ndị na-eru uju aka. Otu okenye bi n’Ọstrelia aha ya bụ Dan sịrị: “Mgbe nwunye m nwụrụ, m chọrọ ka e nyere m aka. Ọtụtụ ndị di na nwunye wepụtara oge gee m ntị. Ha hapụrụ m ka m bee ákwá ma ruo uju. Ha nyekwaara m aka mee ihe ụfọdụ, dị ka ịsara m ụgbọala, ịzụtara m ihe, na isiri m nri mgbe m na-enweghị ike ime ha n’onwe m. Ha kpekwaara m ekpere ọtụtụ ugboro, gosikwa m na ha bụ ezigbo ndị enyi na ‘nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.’”​—Ilu 17:17.

ANYA MMIRI GBARA JIZỌS MAKA NDỊ Ọ NA-EZI OZI ỌMA

10. Olee ihe a kọrọ na Luk 19:​36-40?

10 Jizọs ruru Jeruselem n’abalị itoolu n’ọnwa Naịsan afọ 33. Ka ọ na-erute obodo ahụ, ìgwè mmadụ gbakọtara na-agbasara ya ákwà ha n’ụzọ iji gosi na ha nabatara ya ịbụ eze ha. N’eziokwu, ihe ahụ bụ ihe obi ụtọ. (Gụọ Luk 19:​36-40.) N’ihi ya, ọ ga-abụ na ihe mechara mee juru ndị na-eso ụzọ ya anya. ‘Mgbe Jizọs rutere Jeruselem nso, o lere ya anya ma beere ya ákwá.’ O ji anya mmiri buo amụma ihe ọjọọ ga-eme ndị bi na Jeruselem n’oge na-adịghị anya.​—Luk 19:​41-44.

11. Gịnị mere Jizọs ji beere ndị Jeruselem ákwá?

11 Obi gbawara Jizọs n’ihi na ọ ma na n’agbanyeghị otú a ndị Juu si nabata ya, ọtụtụ n’ime ha agaghị anabata ozi ọma Alaeze Chineke. N’ihi ya, a ga-ebibi Jeruselem, dọrọkwa ndị Juu fọrọ ndụ n’agha. (Luk 21:​20-24) Ọ dị mwute na ihe ahụ Jizọs kwuru mere. Ọtụtụ ndị ekweghị ege ya ntị. Ndị mmadụ hà na-ege ntị n’ozi ọma n’ebe i bi? Ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ ole na ole na-ege ntị, olee ihe i nwere ike ịmụta n’anya mmiri gbara Jizọs? Lee ihe atọ anyị nwere ike ịmụta.

12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara Jehova n’ákwá Jizọs beere ndị mmadụ?

12 Jehova hụrụ ndị mmadụ n’anya. Anya mmiri Jizọs na-echetara anyị otú Jehova si hụ ndị mmadụ n’anya. Baịbụl sịrị: “O nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Taa, anyị na-egosi na anyị hụrụ ndị agbata obi anyị n’anya ma anyị na-agba mbọ ime ka ha mụta eziokwu.​—Mat. 22:39. *

Na-agbanwe mgbe i ji aga ozi ọma otú ahụ Jizọs mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14) *

13-14. Olee otú Jizọs si gosi na ọ na-emetere ndị mmadụ ebere? Oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?

13 Jizọs gbasiri mbọ ike n’ozi ọma. O ji ohere ọ bụla kụziere ndị mmadụ ihe iji gosi na ọ hụrụ ha n’anya. (Luk 19:​47, 48) Gịnị mere o ji mee otú ahụ? O metaara ha ebere. Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-achọ ka Jizọs kụziere ha ihe nke na ya “na ndị na-eso ụzọ ya enweghịdị ike iri nri.” (Mak 3:20) O nwekwara mgbe Jizọs ziri otu nwoke ozi ọma n’abalị n’ihi na ọ bụ oge kaara nwoke ahụ mma. (Jọn 3:​1, 2) Ọtụtụ n’ime ndị mbụ gere Jizọs ntị aghọghị ndị na-eso ụzọ ya. Ma, ọ gbaara ndị niile gere ya ntị àmà nke ọma. Taa, anyị chọrọ ime ka onye ọ bụla nụ ozi ọma ahụ. (Ọrụ 10:42) Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịna-agbanwe otú anyị si ezi ozi ọma.

14 Dị njikere ịna-agbanwe otú i si ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị anaghị agbanwe oge anyị ji aga ozi ọma, o nwere ike anyị agaghị enweta ndị chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl. Otu ọsụ ụzọ aha ya bụ Matilda sịrị: “Mụ na di m na-agbalị ịga ozi ọma n’oge dị iche iche. N’isi ụtụtụ, anyị na-ezi ozi ọma n’ebe a na-azụ ahịa. N’ehihie, mgbe ọtụtụ ndị nọ n’ụzọ, anyị na-eji ihe nkwagharị ezi ozi ọma. Anyị chọpụtara na anyị na-ahụkarị ọtụtụ ndị n’ụlọ ná mgbede.” Anyị ekwesịghị ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma naanị mgbe ọ ga-adabara anyị. Anyị kwesịrị ịdị njikere ịga ozi ọma n’oge e nwere ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị Jehova ụtọ.

ANYA MMIRI GBARA JIZỌS N’IHI AHA JEHOVA

Na-akọrọ Jehova obi gị ma ị nọrọ ná nsogbu otú ahụ Jizọs mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 17) *

15. Dị ka e kwuru na Luk 22:​39-44, gịnị mere n’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa?

15 N’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33, Jizọs gara n’ogige Getsemeni n’abalị. N’ebe ahụ, ọ kọọrọ Jehova obi ya. (Gụọ Luk 22:​39-44.) Ọ bụ n’oge a ihe siiri Jizọs ike ka “o kpesiri ekpere ike, besie ákwá ike ma jiri anya mmiri rịọ . . . arịrịọ.” (Hib. 5:7) Olee ihe Jizọs kpere ekpere maka ya n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ? Ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike ịnọgide na-erubere ya isi, na-emekwa uche ya. Jehova zara ekpere ahụ o ji obi ya niile kpee, zitekwa mmụọ ozi ka ọ bịa gbaa ya ume.

16. Gịnị na-echegbu Jizọs mgbe ọ na-ekpe ekpere n’ogige Getsemeni?

16 O doro anya na ihe mere Jizọs ji bee ákwá mgbe ọ nọ n’ogige Getsemeni na-ekpe ekpere bụ na ọ na-echegbu onwe ya gbasara otú ndị mmadụ ga-esi were ya ka onye na-ekwulu Chineke. Ọ ma na ọ dị ezigbo mkpa ka ọ tachie obi ma mee ka e too aha Nna ya. Ọ bụrụ na nsogbu nke chọrọ ime ka ị hapụ Jehova abịara gị, gịnị ka i nwere ike ịmụta n’aka Jizọs? Legodị ihe atọ ọzọ i nwere ike ịmụta.

17. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta gbasara Jehova n’otú o si za Jizọs ekpere ya?

17 Jehova na-ege ntị n’ekpere gị. Jehova gere ntị n’ekpere Jizọs ji obi ya niile kpee. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ka Jizọs mkpa bụ irubere Nna ya isi na ime ka e too aha Nna ya. Ọ bụrụ na ihe ka anyị mkpa abụrụ irubere Jehova isi na ime ka e too aha ya, Jehova ga-aza ekpere anyị ma nyere anyị aka.​—Ọma 145:​18, 19.

18. Olee otú Jizọs si dị ka enyi ma otú ihe si dịrị anyị?

18 Jizọs ma otú obi dị gị. Nsogbu bịara anyị, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na ezigbo enyi ghọtara anyị kasie anyị obi, karịchaa onye ụdị nsogbu ahụ bịaarala. Jizọs bụ ụdị enyi ahụ. Ọ ma otú ọ na-adị mmadụ ma ike gwụ ya nakwa ma ọ chọọ ka e nyere ya aka. Ọ ma otú e si kee anyị. Ọ ga-ahụkwa na e nyeere anyị aka “n’oge anyị chọrọ ka e nyere anyị aka.” (Hib. 4:​15, 16) Otú ahụ Jizọs si kwe ka mmụọ ozi ahụ nyere ya aka n’ogige Getsemeni, anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-enyere anyị aka. O nwere ike isi n’akwụkwọ anyị, na vidio, n’okwu ma ọ bụ n’aka ndị okenye ma ọ bụ enyi anyị bịara leta anyị nyere anyị aka.

19. Olee otú i nwere ike isi nweta ike ma nsogbu chọọ ime ka ị kwụsị ịna-efe Chineke? Nye ihe atụ.

19 Jehova ga-eme ka i nwee “udo Chineke na-enye.” Olee otú Jehova ga-esi mee ka anyị dị ike? Anyị kpee ekpere, anyị ga-enweta “udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ.” (Fil. 4:​6, 7) Udo ahụ Jehova na-enye ga-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị na-eche echiche nke ọma. Ọ bụ ihe a mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Luz. Ọ sịrị: “Owu na-amakarị m. O mere ka m chee mgbe ụfọdụ na Jehova ahụghị m n’anya. Ya dị otú ahụ, m na-akọrọ Jehova ozugbo otú obi dị m. Ekpere na-eme ka m nweta onwe m.” Ihe nwanna nwaanyị a kọrọ na-egosi na ekpere nwere ike ime ka obi ruo anyị ala.

20. Olee ihe ndị anyị mụtara n’anya mmiri gbara Jizọs?

20 E nwere ọtụtụ ihe na-akasi obi anyị nwere ike ịmụta n’anya mmiri gbara Jizọs. E chetaara anyị ka anyị na-enyere ụmụnna ndị na-eru uju aka nakwa ka anyị tụkwasị Jehova na Jizọs obi na ha ga-enyere anyị aka mgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị. Anyị chọsikwara ike iji obi ebere na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha ihe n’ihi na Jehova na Jizọs na-emetere ndị mmadụ ebere. Obi na-esikwa anyị ike ma anyị cheta na Jehova na Ọkpara ya na-aghọta otú obi dị anyị, na-emetara anyị ebere, chọọkwa inyere anyị aka idi nsogbu anyị. Ka anyị gbalịsie ike na-eme ihe ndị a anyị mụtara ruo mgbe Jehova ga-emezu nkwa o kwere na ‘ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị anyị n’anya.’​—Mkpu. 21:4.

ABỤ NKE 120 Dịrị Umeala n’Obi Ka Jizọs

^ par. 5 Baịbụl kwuru na e nwere oge ndị anya mmiri gbara Jizọs. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’oge atọ anya mmiri gbara Jizọs nakwa ihe anyị nwere ike ịmụta.

^ par. 1 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 12 Okwu Grik a sụgharịrị “onye agbata obi” na Matiu 22:39 abụghị naanị onye bi mmadụ nso. Ọ pụtakwara onye ọ bụla ya na mmadụ mekọrọ ihe.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-akasi Meri na Mata obi. Anyị nwekwara ike ịna-akasi ndị mmadụ nwụnahụrụ obi.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-akụziri Nikọdimọs ihe n’abalị. Anyị kwesịrị ịna-amụrụ ndị mmadụ ihe n’oge kaara ha mma.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe Jizọs na-ekpe ekpere ka Jehova nye ya ike ịna-erubere ya isi. Anyị kwesịkwara ịna-ekpe ekpere ma ọnwụnwa bịara anyị.