Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 4

Ihe Mere Anyị Ji Aga Ncheta Ọnwụ Jizọs

Ihe Mere Anyị Ji Aga Ncheta Ọnwụ Jizọs

“Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”​—LUK 22:19.

ABỤ NKE 20 I Nyere Anyị Ọkpara Ị Hụrụ n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee mgbe anyị na-akacha echeta onye nwụnahụrụ anyị? (b) Gịnị ka Jizọs hiwere n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ?

 N’AGBANYEGHỊ afọ ole garalanụ kemgbe mmadụ nwụnahụrụ anyị, anyị ka na-echeta ya. Anyị na-echetakarị onye ahụ n’ụbọchị dabara n’ụbọchị ahụ ọ nwụrụ.

2 N’afọ ọ bụla, anyị so n’ọtụtụ nde mmadụ ndị na-ezukọta n’ụwa niile ma na-echeta ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya bụ́ Jizọs Kraịst. (1 Pita 1:8) Anyị na-ezukọta echeta onye nyere ndụ ya ka ọ gbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. (Mat. 20:28) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya na-echeta ọnwụ ya. N’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, o hiwere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”​—Luk 22:19.

3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

3 Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ndị na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs nwere olileanya ịga eluigwe. Ma, ọtụtụ nde ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na-esokwa aga. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere ndị nwere olileanya ịga eluigwe na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ịga ya si abara anyị uru. Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ụfọdụ mere ndị e tere mmanụ ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs.

IHE MERE NDỊ E TERE MMANỤ JI AGA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

4. Gịnị mere ndị e tere mmanụ ji ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs?

4 Kwa afọ, ndị e tere mmanụ na-atụ anya ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs taa achịcha ma ṅụọ mmanya e ji eme ya. Gịnị mere ha ji ata achịcha ahụ ma na-aṅụ mmanya ahụ? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị leba anya n’ihe mere n’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa. Mgbe ha richara nri Ememme Ngabiga, Jizọs Kraịst malitere ihe e mechara kpọwa Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. O nyere ndị na-eso ụzọ ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi achịcha na mmanya, gwa ha ka ha taa achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ. Jizọs gwara ha gbasara ọgbụgba ndụ abụọ, ya bụ, ọgbụgba ndụ ọhụrụ na ọgbụgba ndụ Alaeze. * (Luk 22:​19, 20, 28-30) Ọgbụgba ndụ abụọ a mere ka ndịozi ahụ na ụfọdụ ndị ọzọ nwee olileanya ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 5:10; 14:1) Ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, ya bụ, ndị so n’ọgbụgba ndụ abụọ a, nwere ike ịta achịcha ma ṅụọ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs.

5. Gịnị ka ndị e tere mmanụ ma gbasara olileanya ha nwere?

5 Ihe ọzọ mere ndị e tere mmanụ ji atụ anya ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ na oge ahụ bụ oge ha na-eji echebara olileanya ha nwere echiche. Jehova enyela ha olileanya pụrụ iche, ya bụ, inwe ahụ́ na-enweghị ike ịnwụ anwụ ma ọ bụ ire ure n’eluigwe, iso Jizọs na ndị ọzọ so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ chịa n’eluigwe, nakwa ịhụ Jehova ihu na ihu. (1 Kọr. 15:​51-53; 1 Jọn 3:2) Ndị e tere mmanụ ma na Jehova akpọọla ha ịbịa eluigwe maka ihe ndị ahụ. Ma, tupu ha enwee ike ịga eluigwe, ha ga-eji obi ha niile fee Chineke ruo ọnwụ. (2 Tim. 4:​7, 8) Obi na-atọgbu ndị e tere mmanụ atọgbu ma ha na-eche gbasara olileanya ha nwere ịga eluigwe. (Taị. 2:13) Oleekwanụ gbasara “atụrụ ọzọ” ahụ? (Jọn 10:16) Olee ihe ụfọdụ mere ha ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

IHE MERE NDỊ SO N’ATỤRỤ ỌZỌ JI AGA

6. Olee ihe mere ndị so n’atụrụ ọzọ ji abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ?

6 Ndị so n’atụrụ ọzọ na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mana, ha anaghị ata achịcha ma ọ bụ ṅụọ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. Ma, obi na-adị ha ụtọ na ha gara. Ọ bụ n’afọ 1938 bụ mgbe mbụ a kpọrọ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ụlọ Nche March 1, 1938, sịrị: “O kwesịrị ekwesị ka ndị so n’atụrụ ọzọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ma hụ ihe na-eme. . . . Oge ahụ kwesịkwara ịbụrụ ha oge ha ji aṅụrị ọṅụ.” Otú ahụ obi na-atọ ndị a kpọrọ agbamakwụkwọ ụtọ, ka obi na-atọkwa ndị so n’atụrụ ọzọ ụtọ ịnọ ya mgbe a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.

7. Olee ihe mere ndị so n’atụrụ ọzọ ji atụ anya igere okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs?

7 Ndị so n’atụrụ ọzọ na-atụgharịkwa uche n’olileanya ha. Ha na-atụ anya igere okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi na a na-eji ya akọwa ihe Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ya na ha ga-eso chịa ga-emere ụmụ mmadụ na-erubere Chineke isi n’otu puku afọ ahụ ọ ga-achị. N’oge ahụ ha na Jizọs ga-achị, ha ga-enye aka mee ka ụwa a ghọọ paradaịs ma nyere ụmụ mmadụ rubeere Chineke isi aka izu okè. Obi na-atọgbu ọtụtụ nde ndị na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs atọgbu ma ha chee otú amụma ndị Baịbụl buru maka ọdịnihu ga-esi emezu, dị ka amụma ndị dị n’Aịzaya 35:​5, 6; 65:21-23; na Mkpughe 21:​3, 4. Okwukwe ha na-esikwu ike, ha ekpebisiekwa ike ịnọgide na-efe Jehova ma ha were ya na ha na-ahụ onwe ha na ndị ha hụrụ n’anya n’ụwa ọhụrụ.​—Mat. 24:13; Gal. 6:9.

8. Olee ihe ọzọ mere ndị so n’atụrụ ọzọ ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

8 Lee ihe ọzọ mere atụrụ ọzọ ahụ ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha chọrọ igosi na ha hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya ma na-akwado ha. Okwu Chineke buru amụma na ndị e tere mmanụ na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga na-emekọ ihe ọnụ. Olee otú o si kwuo ya? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

9. Olee ihe amụma e buru na Zekaraya 8:23 gosiri gbasara otú obi na-adị ndị so n’atụrụ ọzọ maka ndị e tere mmanụ?

9 Gụọ Zekaraya 8:23. Amụma a kwuru ihe magburu onwe ya gbasara otú obi dị ndị so n’atụrụ ọzọ maka ụmụnna ha e tere mmanụ. Okwu bụ́ “onye Juu” na “unu” na-ekwu gbasara otu ndị, ya bụ, ndị e tere mmanụ. (Rom 2:​28, 29) “Mmadụ iri ndị na-asụ asụsụ niile e nwere ná mba dị iche iche” na-anọchi anya atụrụ ọzọ ahụ. Ha ‘na-ejide’ uwe ndị e tere mmanụ, ya bụ, ha so ha na-eto Jehova. N’ihi ya, n’abalị a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs, ndị so n’atụrụ ọzọ na-abịa n’ihi na ha hụrụ ndị e tere mmanụ n’anya.

10. Olee otú Jehova si mezuo amụma e dere n’Ezikiel 37:​15-19, 24, 25?

10 Gụọ Ezikiel 37:​15-19, 24, 25. Otú Jehova si mee ka amụma a mezuo bụ na o mere ka atụrụ ọzọ na ndị e tere mmanụ dịrị n’otu. Amụma a kwuru gbasara osisi abụọ. Ndị nwere olileanya ịga eluigwe dị ka osisi “nke Juda” (ya bụ, agbụrụ e si na ha enweta eze n’Izrel oge ochie), ndị nwere olileanya ibi n’ụwa adịrị ka osisi “nke Ifrem.” * Jehova ga-eme ka ìgwè abụọ a dịrị n’otu nke na ha ga-abụ “otu osisi.” Ihe ọ pụtara bụ na ha niile ga-eji otu obi na-efe Chineke, Jizọs Kraịst abụrụ eze ha. N’afọ ọ bụla, ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha anaghị aga ya iche iche, kama, ha na-aga ya ka otu “ìgwè atụrụ” nwere otu “onye ọzụzụ atụrụ.”​—Jọn 10:16.

11. Olee otú “atụrụ” ndị ahụ e kwuru okwu ha na Matiu 25:​31-36, 40 si akwado ụmụnna Kraịst?

11 Gụọ Matiu 25:​31-36, 40. “Atụrụ” ndị ahụ e kwuru okwu ha n’ihe atụ a nọchiri anya ndị ezi omume nọ n’oge ọgwụgwụ, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, ndị so n’atụrụ ọzọ. Ha na-akwado ụmụnna Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Otú ha si eme ya bụ inyere ha aka ịrụ ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst.​—Mat. 24:14; 28:​19, 20.

12-13. Oleekwa ụzọ ndị ọzọ atụrụ ọzọ si egosi na ha na-akwado ụmụnna Kraịst?

12 Kwa afọ, izu ole na ole tupu e mee Ncheta Ọnwụ Jizọs, atụrụ ọzọ ahụ na-eso akpọ ndị mmadụ n’ụwa niile ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, si otú ahụ na-akwado ụmụnna Kraịst. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ị̀ Na-akwadebe Maka Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?”) Ha na-esokwa ahazi ihe ndị dị mkpa ka e nwee ike ime Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ọgbakọ niile dị n’ụwa n’agbanyeghị na e nweghị ndị na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs n’ọtụtụ ọgbakọ. Obi na-atọ atụrụ ọzọ ahụ ụtọ isi otú a enyere ụmụnna Kraịst aka. Ha ma na Jizọs na-ewere ihe ha meere ụmụnna ya e tere mmanụ ka ihe ha meere yanwa.​—Mat. 25:​37-40.

13 Olee ihe ọzọ mere anyị niile ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs n’agbanyeghị olileanya anyị nwere?

IHE MERE ANYỊ NIILE JI AGA

14. Olee otú Jehova na Jizọs si gosi na ha hụrụ anyị n’anya nke ukwuu?

14 Obi dị anyị ụtọ maka ịhụnanya Jehova na Jizọs gosiri anyị. Jehova esila ọtụtụ ụzọ gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Mana, e nwere otu kachanụ n’ime ha niile. Chineke gosiri anyị na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu mgbe o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. (Jọn 3:16) Anyị makwa na Jizọs gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya n’ihi na o kwetara ịnwụ n’ihi anyị. (Jọn 15:13) Anyị enweghị ike ịkwụghachili Jehova na Jizọs ụgwọ ịhụnanya ha gosiri anyị. Ma, anyị nwere ike isi n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ha meere anyị. (Kọl. 3:15) Anyị na-agakwa Ncheta Ọnwụ Jizọs ka anyị cheta otú ha si hụ anyị n’anya nakwa ka anyị gosi na anyị hụkwara ha n’anya.

15. Gịnị mere ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ ji jiri ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe?

15 Anyị ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ezigbo ihe. (Mat. 20:28) Ndị e tere mmanụ ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe n’ihi na o mere ka ha nwee olileanya magburu onwe ya. N’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jizọs chụrụ, Jehova weere ha ka ndị ezi omume, werekwa ha ka ụmụ ya. (Rom 5:1; 8:​15-17, 23) Obi dịkwa atụrụ ọzọ ahụ ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ. N’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jizọs ji ọbara ya chụọ, ha nwere akọnuche dị ọcha n’ihu Chineke, ha nwere ike ijere ya ozi dị nsọ, nweekwa olileanya isi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:​13-15) Otu ụzọ ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ si egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ bụ ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ.

16. Olee ihe ọzọ mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

16 Ihe ọzọ mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ na anyị chọrọ irubere Jizọs isi. N’agbanyeghị olileanya anyị nwere, onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ idebe iwu Jizọs nyere n’abalị o hiwere ncheta ọnwụ ya. Ọ sịrị: “Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”​—1 Kọr. 11:​23, 24.

OTÚ ỊGA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS SI ABARA ANYỊ URU

17. Olee otú Ncheta Ọnwụ Jizọs si enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso?

17 Ọ na-eme ka anyị nọrọkwuo Jehova nso. (Jems 4:8) Dị ka anyị mụtarala, anyị na-eji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs eche gbasara olileanya Jehova mere ka anyị nwee, na-atụgharịkwa uche n’ịhụnanya o gosiri anyị. (Jere. 29:11; 1 Jọn 4:​8-10) Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara olileanya e ji n’aka anyị nwere maka ọdịnihu nakwa banyere ịhụnanya na-anaghị ada ada Chineke nwere n’ebe anyị nọ, ọ na-eme ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike, meekwa ka anyị na ya dịkwuo ná mma.​—Rom 8:​38, 39.

18. Olee ihe ịtụgharị uche n’ihe Jizọs mere ga-eme ka anyị mee?

18 Ọ na-eme ka anyị na-eṅomi Jizọs. (1 Pita 2:21) Ụbọchị ole na ole tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-agụ akụkọ Baịbụl ndị kọrọ gbasara ihe Jizọs mere n’izu ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa, nakwa gbasara ọnwụ ya na mbilite n’ọnwụ ya. N’ụbọchị a na-echeta ọnwụ Jizọs, a na-ekwu okwu na-echetara anyị otú Jizọs si hụ anyị n’anya. (Efe. 5:2; 1 Jọn 3:16) Ọ bụrụ na anyị ana-agụ gbasara otú Jizọs si nwụọ n’ihi anyị ma na-atụgharị uche na ya, ọ ga-eme ka anyị ‘na-ebi ndụ otú o biri.’​—1 Jọn 2:6.

19. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova na-ahụkwu anyị n’anya?

19 Ọ na-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịna-eme ihe ga-eme ka Chineke na-ahụ anyị n’anya. (Jud 20, 21) Anyị na Chineke ga-anọgide na-abụ enyi ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ike anyị n’irubere ya isi, ido aha ya nsọ, nakwa ime ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11; Mat. 6:9; 1 Jọn 5:3) Ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eme ka anyị kpebisikwuo ike iji ụbọchị ọ bụla anyị dị ndụ na-agwa Jehova, sị: ‘M chọrọ ka mụ na gị bụrụ enyi ruo mgbe ebighị ebi.’

20. Olee ezigbo ihe mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs?

20 Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa, e nwere ezigbo ihe mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’afọ ọ bụla, anyị gbakọta ime ya, anyị na-echeta ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya bụ́ Jizọs Kraịst. Nke kachanụ bụ na anyị na-eji oge ahụ echeta ịhụnanya kachanụ e gositụrụla, ya bụ, ịhụnanya Jehova gosiri anyị mgbe o nyere Ọkpara ya ka o jiri ndụ ya gbapụta anyị. N’afọ a, a ga-echeta ọnwụ Jizọs ná mgbede Fraịdee abalị iri na ise n’ọnwa Eprel, afọ 2022. Anyị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya. N’ihi ya, n’ụbọchị a ga-echeta ọnwụ Jizọs, e nweghị ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa karịa ịnọ ya mgbe a ga-echeta ọnwụ Jizọs.

ABỤ NKE 16 Toonụ Jaa n’Ihi Ọkpara Ya O Tere Mmanụ

^ par. 5 Ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs, anyị niile na-atụ anya ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs nakwa uru ịga ya na-abara anyị.

^ par. 4 Ị chọọ ịmatakwu gbasara ọgbụgba ndụ ọhụrụ na ọgbụgba ndụ Alaeze, gụọ isiokwu bụ́ “Unu Ga-abụ ‘Alaeze nke Ndị Nchụàjà.’” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 15, 2014, peeji nke 15 ruo na nke 17.