ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 2
Mụta Ihe n’Aka Nwanne Jizọs
“Jems, ohu Chineke na ohu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.”—JEMS 1:1.
ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee otú ị ga-esi kọwaa ezinụlọ Jems?
JEMS nwanne Jizọs toro n’ezinụlọ ji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Nne na nna ya bụ́ Meri na Josef hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ha mekwara ike ha niile n’ofufe ya. E nwekwara ihe ọma ọzọ meere Jems. Ọkpara nne ya ga-abụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa. Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere Jems na ọ nọ n’ụdị ezinụlọ a.
2. Olee ihe ndị mere Jems ji kwesị ịna-akwanyere ọkpara nne ya ùgwù?
2 E nwere ezigbo ihe mere Jems kwesịrị iji kwanyere ọkpara nne ya ùgwù. (Mat. 13:55) Dị ka ihe atụ, Jizọs ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma nke na mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ihe ọ na-ekwu tụrụ ndị okenye gụrụ ezigbo akwụkwọ nọ na Jeruselem n’anya nke ukwuu. (Luk 2:46, 47) Ọ ga-abụkwa na Jems na Jizọs rụkọrọ ọrụ ịkwa nkà. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ọ matara onye nwanne ya nwoke bụ nke ọma. Nathan H. Knorr na-ekwukarị, sị: “Gị na mmadụ rụkọwa ọrụ, ị ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara ya.” * Ọ ga-abụkwa na Jems hụrụ otú Jizọs si ‘na-eto, na-enwekwu amamihe, ihe ya ana-amasịkwa ma Chineke ma ndị mmadụ.’ (Luk 2:52) N’ihi ihe a, anyị nwere ike iche na Jems so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ma, ọ bụghị ihe merenụ.
3. Olee ihe Jems mere mgbe Jizọs malitere ozi ya n’ụwa?
3 Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’ụwa, Jems aghọghị onye na-eso ụzọ ya. (Jọn 7:3-5) O nwedịrị ike ịbụ na Jems so ná ndị ikwu Jizọs ndị chere na “isi emebiela” ya. (Mak 3:21) E nwekwanụghị ihe gosiri na Jems so mama ha nọrọ mgbe a na-akpọgide Jizọs n’osisi ịta ahụhụ.—Jọn 19:25-27.
4. Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha?
4 Jems mechara nwee okwukwe na Jizọs, ghọọkwa okenye a na-akwanyere ùgwù n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe abụọ anyị nwere ike ịmụta n’aka Jems. Nke mbụ bụ ihe mere anyị kwesịrị iji dịrị umeala n’obi, nke abụọ abụrụ otú anyị nwere ike isi na-akụzi ihe nke ọma.
DỊRỊ UMEALA N’OBI KA JEMS
5. Mgbe Jizọs pụtara n’ihu Jems n’oge a kpọlitechara ya n’ọnwụ, gịnị ka Jems mere?
5 Olee mgbe Jems ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs? Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara “n’ihu Jems, mechaakwa, pụta n’ihu ndịozi niile.” (1 Kọr. 15:7) Mgbe Jems na Jizọs hụchara, Jems ghọrọ onye na-eso ụzọ ya. Ọ nọkwa ya mgbe ndịozi Jizọs nọ n’ụlọ dị n’elu na Jeruselem na-eche mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa. (Ọrụ 1:13, 14) Mgbe e mechara, Jems sokwa n’òtù na-achị isi n’oge ndịozi. (Ọrụ 15:6, 13-22; Gal. 2:9) Tupu afọ 62, mmụọ nsọ mekwara ka o deere Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi ahụ na-abakwara anyị uru taa, ma ànyị nwere olileanya ibi n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa. (Jems 1:1) E nwere otu nwoke aha ya bụ Josifọs kọrọ ihe ndị mere n’oge ndịozi Jizọs. O kwuru na ọ bụ nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Ananayas nwa Anas nyere iwu ka e gbuo Jems. Jems nọgidekwara na-efe Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ.
6. Olee otú Jems si dị iche ná ndị isi okpukpe n’oge ahụ?
6 Jems dị umeala n’obi. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Chegodị otú ihe o mere si dị iche n’ihe ọtụtụ ndị isi okpukpe mere. Mgbe Jems hụrụ ihe doro anya gosiri na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, o kwetara. Ọ bụghị ihe ahụ ka ndị isi nchụàjà nọ na Jeruselem mere. Dị ka ihe atụ, o doro ha anya na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. Ma, kama ikweta na ọ bụ Jehova zitere Jizọs, ha gbalịrị igbu ma Jizọs ma Lazarọs. (Jọn 11:53; 12:9-11) Mgbe e mechakwara kpọlite Jizọs n’onwe ya n’ọnwụ, ha kpara nkata izochiri ya ndị mmadụ. (Mat. 28:11-15) Mpako mere ka ndị isi okpukpe ahụ jụ Mezaya.
7. Gịnị mere anyị kwesịrị iji zere mpako?
7 Ihe anyị na-amụta: Zere mpako, kwekwa ka Jehova na-akụziri gị ihe. Otú ahụ ọrịa nwere ike ime ka obi mmadụ ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, ka mpako nwere ike ime ka anyị ghara ikwe ka Jehova na-eduzi anyị. Ndị Farisii dị ezigbo mpako, ya emee ka ha ghara ikweta n’ihe doro anya gosiri na mmụọ nsọ na-eduzi Jizọs nakwa na ọ bụ Ọkpara Chineke. (Jọn 12:37-40) Mpako ahụ kpataara ha ezigbo nsogbu n’ihi na o mere ka ndụ ebighị ebi kwaa ha. (Mat. 23:13, 33) N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị kwe ka Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya na-eme ka àgwà anyị na-akakwu mma, na-eduzikwa ihe ndị anyị na-eche na ihe ndị anyị na-ekpebi. (Jems 3:17) Jems kwere ka Jehova kụziere ya ihe n’ihi na ọ dị umeala n’obi. Ọ bụkwa maka na ọ dị umeala n’obi mere o ji bụrụ ezigbo onye nkụzi.
NA-AKỤZI IHE NKE ỌMA KA JEMS
8. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-akụzi ihe nke ọma?
8 Jems agụghị oké akwụkwọ. Ọ ga-abụkwa na ndị isi okpukpe weere ya ka onye “nkịtị na-agụghị akwụkwọ” otú ahụ ha si were Pita onyeozi na Jọn onyeozi. (Ọrụ 4:13) Ma, Jems mụtara ịkụzi ihe nke ọma. Ọ bụrụ na anyị agụọ akwụkwọ Jems, anyị ga-amata na nke ahụ bụ eziokwu. O nwere ike ịbụ na anyị agụghị oké akwụkwọ otú ahụ Jems na-agụghị. N’agbanyeghị ya, mmụọ nsọ Jehova na ihe ndị a na-akụziri anyị ná nzukọ ya nwere ike inyere anyị aka ka anyị bụrụ ezigbo ndị nkụzi. Ka anyị tụlee otú Jems si kụzie ihe nakwa ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’aka ya.
9. Olee otú i nwere ike isi kọwaa otú Jems si akụzi ihe?
9 Jems ejighị okwu ndị siri ike nghọta na-akụzi ihe ma ọ bụkwanụ na-ekwu ihe ndị mmadụ na-agaghị aghọta nke ọma. Ihe ahụ mere ka ndị ọ kụziiri ihe mata ihe ha kwesịrị ime nakwa otú ha kwesịrị isi eme ya. Dị ka ihe atụ, legodị otú dị mfe Jems si kụziere Ndị Kraịst na ha kwesịrị ịdị njikere idi ihe na-adịghị mma mmadụ mere ha, gharakwa iburu onye ahụ iwe n’obi. Ọ sịrị: “Anyị na-asị na ndị tachiri obi na-enwe obi ụtọ. Unu anụla otú Job si tachie obi, hụkwa ihe Jehova mechara mee. Unu ejirikwala ya mata na ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.” (Jems 5:11) Ị̀ hụrụ na ihe ndị Jems na-akụziri ụmụnna ya si n’Akwụkwọ Nsọ? O ji Akwụkwọ Nsọ nyere ha aka ịhụ na Jehova na-agọzi ndị na-erubere ya isi ka Job. Otú Jems si kụzie ihe a dị mfe nghọta ma doo anya. O si otú ahụ mee ka e too Jehova kama ito yanwa.
10. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi na-akụzi ihe ka Jems?
10 Ihe anyị na-amụta: Mee ka ozi ọma gị dị mfe, jirikwa Okwu Chineke na-akụzi ihe. Anyị kụziwe ihe, mkpa anyị ekwesịghị ịbụ igosi ndị mmadụ otú anyị maruru n’ihe. Kama, ọ bụ igosi ha na Jehova ma ezigbo ihe nakwa na ọ hụrụ ha n’anya. (Rom 11:33) Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ma ihe niile anyị na-ekwu si n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, kama ịgwa ndị anyị na-amụrụ ihe ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ anyị, anyị kwesịrị inyere ha aka ichebara akụkọ ndị dị na Baịbụl echiche nakwa ịghọta otú Jehova si eche echiche. Ọ ga-enyeziri ha aka ime ihe ha mụtara n’ihi na ha chọrọ ime Jehova obi ụtọ, ọ bụghị ime anyịnwa obi ụtọ.
11. Olee ihe ndị na-esiri ụfọdụ ụmụnna ike n’oge Jems? Oleekwa ndụmọdụ o nyere ha? (Jems 5:13-15)
11 Jems ezoghị ọnụ. Akwụkwọ ozi Jems dere gosiri na ọ ma ihe ndị na-esiri ụmụnna ya ike. Ọ gwakwara ha ihe ga-enyere ha aka. Dị ka ihe atụ, Ụfọdụ ụmụnna anaghị eme ihe a gwara ha ngwa ngwa. (Jems 1:22) Ụfọdụ n’ime ha na-emelara ndị bara ọgaranya ihe. (Jems 2:1-3) E nwekwara ndị nke na-anaghị ejideli ire ha aka. (Jems 3:8-10) Ụmụnna ndị ahụ nwere ezigbo nsogbu. Ma, Jems ma na ha ga-agbanweli. O ji obiọma gbazie ha. Ma, o zoghị ọnụ ịgwa ha ihe ndị ha kwesịrị ime. Ọ gwakwara ndị nke chọrọ enyemaka ka ha gakwuru ndị okenye ka ha nyere ha aka.—Gụọ Jems 5:13-15.
12. Olee otú anyị nwere ike isi na-enyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka?
12 Ihe anyị na-amụta: Ezola ọnụ, ma ewerekwala ndị mmadụ ka ndị na-enweghị ike ịgbanwe. O nwere ike ịna-esiri ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ike ime ihe Baịbụl kwuru. (Jems 4:1-4) O nwere ike iwetụ ha oge ịkwụsị àgwà ọjọọ ụfọdụ nakwa ịna-akpa àgwà ka Ndị Kraịst. Dị ka Jems, anyị kwesịrị iji obi ike na-agwa ndị anyị na-amụrụ ihe ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe. Anyị kwesịkwara iburu n’obi na ha ga-agbanweli, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-eme ka ndị dị umeala n’obi bịa fewe ya, nyekwa ha ike ha ga-eji gbanwee ihe ndị ha kwesịrị ịgbanwe ná ndụ ha.—Jems 4:10.
13. Dị ka e kwuru na Jems 3:2, gịnị ka Jems ma?
13 Jems lere onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị. Jems echeghị na ọ ka Ndị Kraịst ndị ọzọ n’ihi na Jizọs bụ nwanne ya ma ọ bụkwanụ n’ihi na e nwere ọrụ dị mkpa ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ọ kpọrọ ndị ya na ha na-efe Jehova “ụmụnna m m hụrụ n’anya.” (Jems 1:16, 19; 2:5) O meghị ka ndị ọzọ lewe ya anya ka onye na-enweghị ike imejọ ihe. Kama, ọ gụpụghị onwe ya mgbe o kwuru, sị: “Anyị niile na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.”—Gụọ Jems 3:2.
14. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kweta na anyị na-emehie?
14 Ihe anyị na-amụta: Cheta na anyị niile bụ ndị mmehie. Anyị ekwesịghị iche na anyị ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl mma. N’ihi gịnị? Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka onye anyị na-amụrụ Baịbụl chee na anyị enweghị ike imehie ihe, o nwere ike ime ka o chee na ya agaghị edebeli iwu Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị ekweta na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị anyị mfe ime ihe Baịbụl kwuru, kọwaakwara ya otú Jehova si nyere anyị aka ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ anyị, anyị ga-enyere ya aka ịhụ na yanwa ga-efelikwa Jehova.
15. Olee ihe i nwere ike ikwu gbasara ihe atụ ndị Jems mere? (Jems 3:2-6, 10-12)
15 Jems ji ihe atụ na-eru n’obi kụzie ihe. O doro anya na mmụọ nsọ nyeere Jems aka. Ma, ọ ga-abụ na ọ mụtara ọtụtụ ihe gbasara ịkụzi ihe mgbe ọ mụrụ gbasara ihe atụ ndị Jizọs ji kụzie ihe. N’akwụkwọ ozi Jems dere, o mere ihe atụ dị mfe, meekwa ka ihe a ga-amụta na ya doo anya.—Gụọ Jems 3:2-6, 10-12.
16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eji ihe atụ ndị dabara adaba akụzi ihe?
16 Ihe anyị na-amụta: Jiri ihe atụ ndị na-eru n’obi na-akụzi ihe. Ọ bụrụ na anyị ejiri ihe atụ ndị dabara adaba na-akụzi ihe, ọ ga-adị ndị mmadụ ka hà na-ahụ ihe anyị chọrọ ka ha mụta. Ihe a ga-enyere ha aka icheta eziokwu Baịbụl anyị chọrọ iji ihe atụ ahụ kụziere ha. Jizọs bụ ọkà n’iji ihe atụ dabara adaba akụzi ihe. Nwanne ya nwoke mekwara ka ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe atụ Jems ji kụzie ihe nakwa ihe mere ha ji daba adaba.
17. Gịnị mere ihe atụ Jems dere na Jems 1:22-25 ji daba adaba?
17 Gụọ Jems 1:22-25. E nwere ọtụtụ ihe mere ihe atụ Jems ji enyo mee ji daba adaba. E nwere ihe dị mkpa o ji ya na-akụzi. Ihe ahụ bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Okwu Chineke baara anyị uru, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgụ ya agụ, anyị kwesịkwara ịna-eme ihe ndị anyị mụtara. Jems ji ihe ndị ọ na-akụziri ihe ma nke ọma mee ihe atụ ahụ, ya bụ, mmadụ ile onwe ya n’enyo. Gịnị ka o ji ya kụziere ha? Ọ ga-abụrụ mmadụ iberiibe ma o lechaa onwe ya n’enyo hụ ihe o kwesịrị imezi, mana e nweghị ihe o mere gbasara ya. Ọ ga-abụkwara anyị iberiibe ma anyị gụchaa Okwu Chineke, hụ àgwà anyị kwesịrị ịgbanwe, anyị aghara ime ihe ọ bụla gbasara ya.
18. Olee ihe atọ anyị kwesịrị ime ma anyị jiri ihe atụ na-akụzi ihe?
18 I mewe ihe atụ, i nwere ike ịna-eme ka Jems ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe atọ ndị a: Nke mbụ, mee ihe atụ dabara n’ihe ị na-akụzi. Nke abụọ, jiri ihe ndị ị na-agwa okwu ga-aghọta nke ọma mee ihe atụ. Nke atọ, mee ka ihe ị chọrọ ka a ghọta doo anya. Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike icheta ihe atụ ndị dabara adaba, gaa n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́, “Ihe Atụ.” Ị ga-ahụ ọtụtụ ihe atụ i nwere ike iji kụzie ihe. Ma, cheta na e nwere ike iji ihe atụ tụnyere maịkrofon. Otú ahụ maịkrofon na-eme ka a na-anụkwuo ihe mmadụ na-ekwu ka ihe atụ na-eme ka a na-aghọtakwuo ihe mmadụ na-ekwu. N’ihi ya, gbalịsie ike ka ihe atụ ị na-eme mee ka a ghọta isi ihe ị na-akụzi. Cheta na ihe kacha mkpa mere anyị ji achọ ka anyị na-akụzi ihe nke ọma abụghị ka ndị mmadụ towe anyị, kama ka anyị jiri ya nyere ọtụtụ ndị aka ka ha bata n’ezinụlọ Jehova.
19. Olee otú anyị si egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?
19 Anyị enweghị ọkpara nne zuru okè otú ahụ Jems nwere. Ma, anyị na ìgwè ụmụnna anyị na-efekọ Jehova ọnụ. Anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya ma anyị na ha na-akpakọrịta, ma anyị na-amụta ihe n’aka ha, nakwa ma anyị na ha na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe. Ọ bụrụ na anyị agbalịa na-akpa àgwà ka Jems, na-eme ihe ndị o mere, na-akụzikwa ihe ka ya, anyị na-eto Jehova, na-enyekwara ndị nwere ezi obi aka ịbịa fewe Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya.
ABỤ NKE 114 ‘Na-enwenụ Ndidi’
^ par. 5 Jems na Jizọs toro n’otu ezinụlọ. Jems ma Ọkpara Chineke zuru okè karịa ọtụtụ ndị biri ndụ n’oge ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị ga-amụta ná ndụ nwanne Jizọs, onye mechara soro ná ndị na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ. Anyị ga-amụtakwa ihe n’ihe ndị ọ kụziri.
^ par. 2 Nathan H. Knorr sobu n’Òtù Na-achị Isi. O jechara ozi ya n’ụwa n’afọ 1977.
^ par. 60 NKỌWA FOTO: Jems ji ihe ndị ọ na-akụziri ihe ma nke ọma mee ihe atụ, ya bụ, obere ọkụ. O ji ya gosi ọghọm dị ná mmadụ ejidelighị ire ya.