Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 5

“Na-ejinụ Oge Unu Eme Ihe Kacha Mkpa”

“Na-ejinụ Oge Unu Eme Ihe Kacha Mkpa”

“Kpacharanụ nnọọ anya ka unu ghara ịna-akpa àgwà ka ndị na-amaghị ihe, kama na-akpanụ àgwà ka ndị ma ihe. Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—EFE. 5:​15, 16.

ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú anyị na Jehova nwere ike isi na-anọrị?

 Ọ NA-AMASỊKARỊ anyị ka anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-anọrị. Ọ na-atọgbu di na nwunye hụrụ ibe ha n’anya atọgbu ma ha nọrọ. Ọ na-amasịkwa ndị na-eto eto ha na ndị enyi ha ịnọ. Ọ na-atọkwa anyị niile ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị nọrọ. Karịchaa ihe niile, obi na-abụ anyị sọ aṅụrị anyị na Chineke ịnọrị. Anyị na Chineke nwere ike ịnọrị ma anyị na-ekpe ekpere, na-agụ Okwu ya ma na-atụgharị uche n’ihe ọ ga-emere anyị nakwa n’àgwà ndị magburu onwe ha o nwere. Oge anyị na Jehova ji anọrị bara ezigbo uru.​—Ọma 139:17.

2. Gịnị nwere ike isiri anyị ike?

2 Ọ bụ eziokwu na anyị na Jehova ịnọrị na-amasị anyị, ma ọ naghị adị mfe mgbe niile. Ọrụ na-ejukarị anyị aka, nke nwere ike ime ka o siere anyị ike iwepụta oge na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Ọrụ ego, ọrụ anyị na-arụ n’ezinụlọ, nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa anyị na-eme nwere ike iwekọrọ oge anyị, ya emee ka ọ dị anyị ka ọ̀ bụ na anyị agaghị enweli ohere ikpe ekpere, ịmụ ihe, na ịtụgharị uche.

3. Olee ihe ọzọ nwere ike iwekọrọ oge anyị?

3 E nwere ihe ọzọ nwere ike ịna-ewekọrọ oge anyị. Ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike kwe ka ihe ndị na-adịghị njọ anyị na-eme mee ka anyị ghara inwe ohere anyị ga-eji bịarukwuo Jehova nso. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara ihe ndị anyị na-eme iji zurutụ ike. Ọ dị mma ka anyị na-ewepụta oge ezurutụ ike. Ma, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, ihe ndị dị mma anyị na-eme iji zurutụ ike nwere ike ime ka anyị ghara inwecha ohere ime ihe gbasara ofufe Chineke. Anyị ekwesịghị ikwe ka izurutụ ike gbochie anyị ime ihe ndị kacha mkpa.​—Ilu 25:27; 1 Tim. 4:8.

4. Olee ihe anyị ga-atụle?

4 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe mere anyị ji kwesị ikpebi ihe ndị kacha anyị mkpa ná ndụ. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị kwesịrị iji oge anyị wepụtara ka anyị na Jehova nọrịa eme nakwa uru ọ ga-abara anyị.

HỌRỌ IHE NDỊ DỊ MMA, CHỌPỤTAKWA IHE NDỊ KACHA MKPA

5. Olee otú ileba anya n’ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:​15-17 nwere ike isi nyere onye na-eto eto aka ime ihe kacha mma ná ndụ ya?

5 Họrọ ndụ kacha mma. Ndị na-eto eto na-echekarị gbasara ihe ha ga-eji ndụ ha eme. Ndị nkụzi ha na ndị ezinụlọ ha na-abụghị Ndị Kraịst nwekwara ike ịgba ha ume ka ha banye mahadum, nke ga-eme ka ha nweta ezigbo ọrụ ma bụrụ aka ji akụ̀. Ihe a nwere ike iwekọrọ oge ha. Ma, nne na nna ha na ndị enyi ha n’ọgbakọ nwere ike ịna-agba ha ume ka ha jiri oge ha jeere Jehova ozi. Olee ihe nwere ike inyere onye na-eto eto hụrụ Jehova n’anya aka ikpebi ihe ga-akacha baara ya uru? Ịgụ Ndị Efesọs 5:​15-17 na ịtụgharị uche na ya ga-abara ya uru. (Gụọ ya.) Ọ bụrụ na onye na-eto eto agụchaa amaokwu Baịbụl ndị a, o nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Gịnị bụ “ihe Jehova chọrọ”? Olee ihe m ga-eme ya amasị ya? Olee ihe m ga-eme ya abụrụ na m ji oge m na-eme ihe kacha mma?’ Cheta na “oge a anyị bi na ya jọrọ njọ” nakwa na ụwa a Ekwensu na-achị na-agba egwú ụla ya. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị ga-eme Jehova obi ụtọ, ọ ga-egosi na anyị ma ihe.

6. Olee ihe Meri họọrọ, gịnịkwa mere o ji bụrụ ihe dị mma?

6 Chọpụta ihe ndị kacha mkpa ná ndụ. Mgbe ụfọdụ, iji oge anyị na-eme ihe kacha mkpa na-apụta na anyị ga-ahọrọ nke anyị ga-eme n’ihe abụọ na-adịghị njọ. Akụkọ Baịbụl gbasara oge Jizọs gara n’ụlọ Meri na Mata mere ka nke a doo anya. O doro anya na obi tọrọ Mata ụtọ ịnabata Jizọs n’ụlọ ha, nke mere ka ọ gaa na-esi ọtụtụ ihe. Ma, nwanne ya nwaanyị bụ́ Meri gara nọrọ Jizọs nso, na-ege ya ntị mgbe ọ na-akụzi ihe. Ọ bụ eziokwu na ihe Mata mere adịghị njọ, mana, Meri “họọrọ ihe ka mma.” (Luk 10:​38-42) Ka oge na-aga, o nwere ike ịbụ na Meri chefuru ụdị nri e siri n’oge ahụ. Ma, anyị ma na o chefughị ihe ọ mụtara n’aka Jizọs. Otú ahụ Meri si jiri obere oge ya na Jizọs ji nọrịa kpọrọ ihe, ka anyị na-eji oge anyị na Jehova ji anọrị akpọrọ ihe. Olee ihe anyị ga-eme ka oge ahụ bakwuoro anyị uru?

JIRI OGE I WEPỤTARA KA GỊ NA JEHOVA NỌRỊA MEE IHE BARA URU

7. Gịnị mere ekpere, ịmụ Baịbụl, na ịtụgharị uche ji bụrụ ihe anyị kwesịrị iwepụtara oge?

7 Cheta na ekpere, ịmụ ihe, na ịtụgharị uche so n’ofufe anyị na-efe Jehova. Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere, anyị na-agwa Jehova bụ́ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya nke ukwuu okwu. (Ọma 5:7) Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Baịbụl, anyị na-amụ “banyere Chineke,” Onye amamihe niile si n’aka ya. (Ilu 2:​1-5) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche, anyị na-echebara ụdị onye Jehova bụ echiche nakwa ihe ndị magburu onwe ha o kpebiri imere ụmụ mmadụ. Ihe a bụ ihe kacha mma anyị ga-eji oge anyị eme. Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ime ya?

Ì nwere ike ịchọta ebe dị jụụ ị ga-anọ na-amụ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

8. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Jizọs ji oge ọ nọ n’ala ịkpa mee?

8 O kwe omume, nọrọ ebe dị jụụ. Ka anyị legodị ihe Jizọs mere. Tupu ya amalite ozi ya n’ụwa, ọ gara nọọ n’ala ịkpa ụbọchị iri anọ. (Luk 4:​1, 2) Jizọs nọ n’ebe ahụ dị jụụ kpee ekpere ma tụgharịa uche n’ihe Nna ya chọrọ ka o mee. O doro anya na ime otú ahụ mere ka Jizọs dịrị njikere maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ya n’oge na-adịghị anya. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’ihe a Jizọs mere? Ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ndị n’ezinụlọ unu, o nwere ike ọ gaghị adịchara gị mfe mgbe niile ịchọta ebe dị jụụ. Ọ dịrị otú ahụ, i nwere ike ịga ebe ọzọ na-abụghị n’ụlọ unu. Ọ bụ ihe Julie na-eme mgbe ọ bụla ọ chọrọ ikpe ekpere. Ya na di ya bi n’otu obere ụlọ na Frans. Ọ na-esikwara ya ike inweta ebe ọ ga-ekpe ekpere n’enweghị onye na-enye ya nsogbu. Julie sịrị: “N’ihi ya, m na-aga n’otu ogige ụbọchị ọ bụla. M na-anọ naanị m ebe ahụ, obi m niile adịrịkwa n’ekpere m na-ekpe.”

9. N’agbanyeghị na Jizọs na-ejikarị ọrụ n’aka, olee otú o si gosi na o ji adịm ná mma ya na Jehova kpọrọ ihe?

9 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-ejikarị ọrụ n’aka mgbe niile. Ìgwè mmadụ na-eso ya agagharị ebe ọ na-aga, na-achọ ka ya na ha na-anọ. O nwere otu oge ‘obodo niile gbakọkwara n’ọnụ ụzọ’ ịhụ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs wepụtara oge ya na Jehova ga-eji nọrịa. Tupu anyanwụ awaa, ọ chọtara “ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị” o nwere ike ịnọ naanị ya kpee ekpere.​—Mak 1:​32-35.

10-11. Dị ka e kwuru na Matiu 26:​40, 41, olee ndụmọdụ dabara adaba Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya n’ogige Getsemeni? Ma, gịnị mere?

10 N’abalị ikpeazụ Jizọs nọrọ n’ụwa mgbe ozi ya na-akụrụ ọnụ, ọ gakwara chọọ ebe dị jụụ o nwere ike ịnọ tụgharịa uche ma kpee ekpere. Ọ chọtara ebe dị jụụ n’ogige Getsemeni. (Mat. 26:36) N’oge ahụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe dị ezigbo mkpa gbasara ekpere.

11 Legodị ihe merenụ. Mgbe ha rutere n’ogige Getsemeni, chi ejiela. O nwere ike ịbụ n’ime ime abalị. Jizọs gwara ndịozi ya ka ha “na-eche nche,” ya agawazie ikpe ekpere. (Mat. 26:​37-39) Ma, ka ọ nọ na-ekpe ekpere, ụra buuru ha. Mgbe ọ hụrụ na ha na-ehi ụra, ọ gwakwara ha ọzọ, sị: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.” (Gụọ Matiu 26:​40, 41.) Jizọs ma na ike gwụchara ha. Ọ ma na ‘anụ ahụ́ adịghị ike.’ Ma, ugboro abụọ ọzọ Jizọs gara ikpe ekpere, mgbe ọ laghachiri, ọ hụkwara na ndịozi ya anaghị ekpe ekpere, kama ha na-ehi ụra.​—Mat. 26:​42-45.

Ì nwere ike iwepụta oge kpee ekpere mgbe ike na-agwụbeghị gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. Olee ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ike na-agwụ anyị mgbe ụfọdụ ikpe ekpere?

12 Chọta oge dabara adaba. Mgbe ụfọdụ, ike nwere ike ịgwụcha anyị ikpe ekpere. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emetụla gị, ọ bụghị naanị gị ka o metụrụla. Gịnị ka i nwere ike ime? Ụfọdụ ndị na-ekpekarị ekpere n’abalị achọpụtala na ọ na-akara ha mma ikpe ekpere tupu chi ejichaa n’ihi na ike agwụchabeghị ha mgbe ahụ. Ụfọdụ ndị achọpụtakwala na otú ha na-anọ ekpe ekpere nwere ike ime ka uche ha dịrị n’ekpere ha na-ekpe, dị ka ịnọrọ ọdụ ma ọ bụ igbusa ikpere n’ala. Ma, ọ bụrụkwanụ na nchegbu ma ọ bụ otú obi si jọọ gị njọ emee ka ikpe ekpere ghara ịna-agụ gị agụụ? Gwa Jehova otú ọ dị gị. Obi kwesịkwara isi gị ike na Nna anyị nke na-eme ebere ga-aghọta otú o si dịrị gị.​—Ọma 139:4.

Ì nwere ike ịhapụ ịgụ ozi ndị e ziteere gị ma ị nọrọ n’ọmụmụ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

13. Olee otú ekwentị na ihe ndị yiri ya nwere ike isi akpa oge anyị na Jehova ji anọrị aka?

13 Zere ihe ndị ga-eme ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-amụ. Ọ bụghị naanị ekpere ga-eme ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Ịmụ Okwu Chineke na ịga ọmụmụ ihe nwere ike inyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso. È nwere ihe i nwere ike ime ka oge i ji amụ ihe na oge i ji nọrọ n’ọmụmụ ihe bakwuoro gị uru? Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ndị na-eme ka uche m ghara ịdị n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ mgbe m na-amụ ihe n’onwe m?’ O nwere ike ịbụ ịza ekwentị gị, ile ozi e ziteere gị n’iimel ma ọ bụkwanụ n’ekwentị gị, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Taa, ọtụtụ ijeri mmadụ na-eji ihe ndị a ezirịta ozi. Ụfọdụ ndị na-eme nchọpụta na-ekwu na naanị ekwentị ịdị anyị nso nwere ike ime ka uche anyị anyị ghara ịdị n’ihe anyị chọrọ ime. Otu ọkachamara sịrị: “Uche gị agaghị adị n’ihe ị na-eme. Ọ ga-adị n’ebe ọzọ.” Tupu a malite mgbakọ, a na-agwakarị anyị ka anyị pịnye ekwentị anyị na ihe ndị ọzọ yiri ya otú ha na-agaghị eme ka uche ndị ọzọ pụọ n’ihe a na-eme. Ànyị nwere ike ime ihe a mgbe anyị chọrọ ịmụ ihe n’onwe anyị, tinye ekwentị anyị otú ọ na-agaghị eme ka uche anyị pụọ ma anyị na Jehova na-anọrị?

14. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:​6, 7, olee otú Jehova ga-esi nyere gị aka itinye uche gị n’ihe ị na-eme?

14 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka uche gị dịrị n’ihe ị na-eme. Ọ bụrụ na ị chọpụta na uche gị na-awagharị ma ị na-amụ ihe n’onwe gị ma ọ bụkwanụ n’ọmụmụ ihe, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị, o nwere ike ọ gaghị adịrị gị mfe ịhapụ ihe ndị ahụ na-echegbu gị ma mee ka uche gị dịrị n’Okwu Chineke. Ma, ọ dị mkpa ka i mee otú ahụ. Rịọ Jehova ka o nye gị udo nke ga-eche ma obi gị ma “echiche” gị nche.​—Gụọ Ndị Filipaị 4:​6, 7.

OGE ANYỊ NA JEHOVA JI ANỌRỊ NA-ABARA ANYỊ EZIGBO URU

15. Olee otu uru anyị na Jehova ịna-anọrị na-abara anyị?

15 Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge na-agwa Jehova okwu, na-ege ya ntị, ma na-atụgharị uche gbasara ya, ọ ga-abara anyị uru na-enweghị atụ. Olee uru ndị ọ ga-abara gị? Nke mbụ, ị ga na-eme ihe dị mma. Baịbụl gwara anyị na “onye ya na ndị ma ihe na-akpa ga-ama ihe.” (Ilu 13:20) N’ihi ya, ka gị na Nna gị nke eluigwe bụ́ Onye amamihe niile si n’aka ya bụ́ Jehova na-anọrị, ị ga-amakwu ihe. Ị ga-aghọtakwu ihe ị ga-eme ga-adị ya mma nakwa otú ị ga-esi zere ime ihe ndị ga-ewute ya.

16. Olee otú ikpe ekpere na ịmụ Baịbụl si eme ka anyị na-akụzikwu ihe nke ọma?

16 Nke abụọ, ị ga na-akụzikwu ihe nke ọma. Otu n’ime ihe ndị na-akacha anyị mkpa ma anyị mụwara mmadụ Baịbụl bụ inyere ya aka ịbịarukwu Jehova nso. Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere mgbe niile ma na-amụkwu gbasara Jehova, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, meekwa ka anyị dịrị njikere ịkụziri onye anyị na-amụrụ Baịbụl ịhụ Jehova n’anya. Chegodị gbasara Jizọs. Otú o si kọwaara ndị na-eso ụzọ ya Nna ya mere ka ha hụ Jehova n’anya ka Jizọs.​—Jọn 17:​25, 26.

17. Gịnị mere ekpere na ịmụ ihe ji eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

17 Nke atọ, okwukwe gị ga-esikwu ike. Chegodị ihe na-eme ma ị rịọ Jehova ka o duzie gị, kasie gị obi, ma ọ bụkwanụ kwado gị. Mgbe ọ bụla Jehova zara ekpere ahụ, okwukwe gị na-esikwu ike. (1 Jọn 5:15) Olee ihe ọzọ nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike? Ọ bụ ịmụ Baịbụl n’onwe gị. A sị ka e kwuwe, “ọ bụ ihe mmadụ nụrụ na-eme ka o nwee okwukwe.” (Rom 10:17) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka okwukwe anyị sie ike, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịna-amụ ihe. Olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime?

18. Nye ihe atụ ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-atụgharị uche.

18 Anyị kwesịrị ịna-atụgharị uche n’ihe anyị na-amụ. Legodị ihe mere onye dere Abụ Ọma nke iri asaa na asaa. Ọ nọ na-echegbu onwe ya n’ihi na o chere na Jehova ajụla ya na ndị Izrel ibe ya. Ihe ndị a na-echegbu ya mere ka ọ ghara ịna-ehi ụra abalị. (Amaokwu nke 2 ruo na nke 8) Gịnị ka o mere? Ọ gwara Jehova, sị: “M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị niile, chebakwara ihe dị iche iche ị na-eme echiche.” (Amaokwu nke 12) N’eziokwu, ọbụ abụ ahụ ma ihe Jehova meere ndị ya n’oge gara aga nke ọma. Ma, ọ na-echegbu onwe ya, sị: “Chineke ò chefuola imere anyị amara, ka iwe ya ò meela ka ọ kwụsị imere anyị ebere?” (Amaokwu nke 9) Ọbụ abụ ahụ tụgharịrị uche n’ọrụ Jehova nakwa n’otú Jehova si meere ndị ya ebere n’oge gara aga. (Amaokwu nke 11) Olee uru ọ baara ya? Obi bịara sie ya ezigbo ike na Jehova agaghị ahapụ ndị ya. (Amaokwu nke 15) Okwukwe gị ga-esikwa ike otú ahụ ma ọ bụrụ na ị na-atụgharị uche n’ihe ndị Jehova meere ndị ya nakwa n’ihe o meere gịnwa.

19. Olee uru ọzọ anyị na Jehova ịnọ na-abara anyị?

19 Nke anọ, bụ́kwanụ nke kacha mkpa, ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ ga-esikwu ike. Ọ bụ ịhụnanya bụ ihe kachanụ ga-eme ka anyị na-erubere Jehova isi, hapụ ihe ụfọdụ iji mee ihe dị ya mma, na ịna-edi ọnwụnwa ọ bụla bịaara anyị. (Mat. 22:​37-39; 1 Kọr. 13:​4, 7; 1 Jọn 5:3) O nweghị ihe kwesịrị ịdị anyị mkpa karịa anyị na Jehova ịdị n’ezigbo mma.​—Ọma 63:​1-8.

20. Olee ihe ndị ị chọrọ ime ka i nwee ike inwe oge gị na Jehova ga-eji na-anọrị?

20 Cheta na ekpere, ịmụ Baịbụl, na ịtụgharị uche so n’ofufe anyị na-efe Jehova. Dịkwa ka Jizọs, anyị kwesịrị ịna-achọta ebe dị jụụ anyị na Jehova ga na-anọrị. Anyị kwesịkwara iwepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka uche anyị pụọ n’ihe anyị na-eme. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ka uche gị niile dịrị n’ekpere ị na-ekpe, n’ihe ị na-amụ, nakwa n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na i jiri oge gị na-eme ihe bara ezigbo uru ugbu a, Jehova ga-eme ka ị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya.​—Mak 4:24.

ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova

^ par. 5 Jehova bụ Enyi kachanụ anyị nwere. Anyị ji enyi anyị na ya bụ kpọrọ ihe. Anyị chọkwara ịmatakwu ya nke ọma. Ịmata mmadụ na-ewe oge. Ọ ga-ewekwa anyị oge ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova nọgide na-adị ná mma. Ebe ọ bụ na anyị anaghị enwekarị ohere, olee otú anyị nwere ike isi wepụta oge anyị ga-eji bịarukwuo Nna anyị nke eluigwe nso, oleekwa uru ime otú ahụ ga-abara anyị?