Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 5

“Ịhụnanya Kraịst Na-akpa Ike n’Ahụ́ Anyị”

“Ịhụnanya Kraịst Na-akpa Ike n’Ahụ́ Anyị”

“Ịhụnanya Kraịst na-akpa ike n’ahụ́ anyị, . . . ka ndị dị ndụ wee ghara ịna-eme ihe masịrị ha.”—2 KỌR. 5:14, 15.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. (a) Olee otú obi nwere ike ịdị anyị ma anyị chee gbasara ndụ Jizọs na ozi ya? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a?

 Ọ BỤRỤ na mmadụ anwụnahụ anyị, ọ na-ewute anyị nke ukwuu. Na mbụ, obi nwere ike ịna-agbawa anyị ma anyị chee gbasara ihe ndị mere ụbọchị ole na ole tupu ya anwụọ, karịchaa, ma ọ bụrụ na ọ tara ahụhụ tupu ya anwụọ. Ma, ka oge na-aga, anyị nwere ike ịna-enwetụ obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị echeta ihe ọ kụziiri anyị ma ọ bụ ihe o mere ma ọ bụ ihe o kwuru gbara anyị ume ma ọ bụ mee ka anyị mụmụọ ọnụ ọchị.

2 Ọ bụkwa otú ọ na-ewute anyị ma anyị gụọ gbasara ahụhụ Jizọs tara na ọnwụ ya. Oge Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ oge anyị kacha echebara uru àjà ahụ o ji ndụ ya chụọ baara anyị echiche. (1 Kọr. 11:24, 25) Ma, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị na-eche gbasara ihe niile Jizọs kwuru na ihe o mere mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ na-agbakwa anyị ume ma anyị na-eche ihe ọ na-eme ugbu a na ihe ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ichebara ihe ndị a na otú o si hụ anyị n’anya echiche nwere ike ime ka anyị mee ihe ụfọdụ iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ya. Anyị ga-ahụ otú anyị ga-esi eme ya n’isiokwu a.

OTÚ OBI SI DỊRỊ ANYỊ ỤTỌ NA-EME KA ANYỊ NA-ESO JIZỌS

3. Olee ihe mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ?

3 Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na-eche gbasara ndụ Jizọs na ọnwụ ya. N’oge niile ọ nọ n’ụwa, ọ kụziiri ndị mmadụ gbasara ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị. Eziokwu ndị a gbasara Alaeze Chineke na-eme anyị ezigbo obi ụtọ. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ n’ihi na o mere ka anyị nwee ohere anyị na Jehova na Jizọs ịdị ná mma. Ndị nwere okwukwe na Jizọs nwekwara olileanya ịdị ndụ ebighị ebi nakwa ịhụ mgbe a ga-akpọlite ndị ha nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29; Rom 6:23) E nweghị ihe anyị mere ụdị ihe ọma ndị a ji ruoro anyị. Anyị agaghịkwanụ akwụghachili Chineke na Jizọs ụgwọ ihe ha meere anyị. (Rom 5:8, 20, 21) Ma anyị nwere ike igosi ha na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

Olee otú ichebara ihe Meri Magdalin mere echiche si eme ka ị chọọ igosi na obi dị gị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5)

4. Olee otú Meri Magdalin si gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe Jizọs meere ya? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 Legodị ihe mere otu nwaanyị onye Juu aha ya bụ Meri Magdalin. Ọ nọ n’ezigbo ahụhụ. Mmụọ ọjọọ asaa na-enye ya nsogbu. O nwere ike ịbụ na o chere na e nweghịzi ihe a ga-emeli gbasara ya. N’ihi ya, chegodị otú obi dị ya mgbe Jizọs mere ka mmụọ ọjọọ ndị ahụ kwụsị inye ya nsogbu. Otú obi si dị ya ụtọ mere ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Kraịst, jirikwa oge ya, ike ya, na ihe ndị o nwere na-akwado ozi ọma. (Luk 8:1-3) Ọ bụ eziokwu na obi dị Meri ezigbo ụtọ maka ihe Jizọs meere ya, o nwere ike ọ maghị na nke ọ ga-emere ya n’ihu kacha. Ọ ga-anwụ ka o nwee ike ịzọpụta ụmụ mmadụ, ‘ka onye ọ bụla nwere okwukwe na ya nwee ndụ ebighị ebi.’ (Jọn 3:16) Ma Meri kwadoro Jizọs iji gosi na obi dị ya ụtọ maka ihe o meere ya. Mgbe Jizọs na-ahụsi anya n’elu osisi ịta ahụhụ, Meri nọ ya nso, na-agba ya na ndị ọzọ ume. (Jọn 19:25) Mgbe Jizọs nwụrụ, Meri na ụmụ nwaanyị abụọ ndị ọzọ wetara ihe ndị na-esi ísì ọma ka ha tee ozu Jizọs maka olili ya. (Mak 16:1, 2) Jehova gọziri Meri maka otú a o si kwado Jizọs. Ọ hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ya na ya ekwurịtakwa okwu. Ụdị ihe ọma ahụ emereghị ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Jọn 20:11-18.

5. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile Jehova na Jizọs meere anyị?

5 Anyị nwekwara ike igosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere anyị ma anyị jiri oge anyị, ike anyị, na ego anyị na-efe Jehova. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iwepụta onwe anyị soro na-arụ ụlọ ndị nzukọ Jehova na-arụ, sorokwa na-arụzi ihe ndị mebiri na ha.

ỊHỤ JEHOVA NA JIZỌS N’ANYA NA-EME KA ANYỊ HỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA

6. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye Jehova nyere onye ọ bụla n’ime anyị?

6 Ọ bụrụ na anyị echee gbasara otú Jehova na Jizọs sị hụ anyị n’anya, ọ na-eme ka anyị hụkwa ha n’anya. (1 Jọn 4:10, 19) Anyị na-ahụkwu ha n’anya ma anyị mata na Jizọs nwụrụ maka onye nke ọ bụla n’ime anyị. Pọl onyeozi ma ihe a. O gosikwara na obi dị ya ụtọ maka ya mgbe o degaara ndị Galeshia akwụkwọ ozi. Ọ sịrị ha: “Ọkpara Chineke . . . hụrụ m n’anya ma nyefee ndụ ya n’ihi m.” (Gal. 2:20) Àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ mere ka Jehova dọta gị ka ị bụrụ enyi ya. (Jọn 6:44) Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ ịmata na e nwere ihe dị mma Jehova hụrụ n’ebe ị nọ nakwa na ọ kwụrụ ezigbo ụgwọ ka gị na ya nwee ike ịbụ enyi? Ọ̀ bụ na o meghị ka ị hụkwuo Jehova na Jizọs n’anya? Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe ịhụnanya ahụ ga-eme ka m mee?’

Otú anyị si hụ Jehova na Jizọs n’anya na-eme ka anyị na-ezi ụdị mmadụ niile ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Dị ka anyị hụrụ na foto e ji kọwaa paragraf a, olee otú anyị niile ga-esi gosi na anyị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya? (2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15; 6:1, 2)

7 Otú anyị si hụ Jehova na Jizọs n’anya ga-eme ka anyị chọọ ịhụ ndị ọzọ n’anya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15; 6:1, 2.) Otu ụzọ anyị ga-esi gosi ya bụ iji ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Anyị na-ezi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma. Anyị ekwesịghị ịhapụ izi mmadụ ozi ọma n’ihi obodo ya, agbụrụ ya, ma ọ̀ bụ ọgaranya ma ọ̀ bụ ogbenye, ma ọ bụkwanụ n’ihi ọkwá ya. Anyị na-esi otú ahụ eme uche Jehova n’ihi na uche ya bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha marakwa eziokwu nke ọma.”—1 Tim. 2:4.

8. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?

8 Otú ọzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya bụ ịhụ ụmụnna anyị n’anya. (1 Jọn 4:21) Ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi, anyị na-enyekwara ha aka ma ha nwee nsogbu. Anyị na-akasi ha obi ma mmadụ nwụnahụ ha, na-aga eleta ha ma ha na-arịa ọrịa, na-agbalịkwa ike anyị niile ịgba ha ume ma obi na-ajọ ha njọ. (2 Kọr. 1:3-7; 1 Tesa. 5:11, 14) Anyị na-etinye ha n’ekpere n’ihi na anyị ma na “ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.”—Jems 5:16.

9. Olee otú ọzọ anyị si egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?

9 Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya ma anyị na-agbasi mbọ ike eme ka anyị na ha dịrị n’udo. Anyị na-agbaghara ndị ọzọ ka Jehova. Ebe ọ bụ na Jehova hapụrụ Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbaghara ụmụnna anyị ma ha mejọọ anyị? Anyị achọghị ịdị ka ohu ọjọọ ahụ Jizọs ji mee ihe atụ. N’agbanyeghị na nna ya ukwu gbaghaara ya nnukwu ụgwọ o ji ya, o kweghị agbaghara ohu ibe ya ji ya obere ụgwọ. (Mat. 18:23-35) Ọ bụrụ na gị na nwanna enwee nghọtahie, gbaa mbọ mee ka gị na ya kpezie tupu gị agaa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Mat. 5:23, 24) Ime otú ahụ ga-egosi na ị hụrụ Jehova na Jizọs n’anya nke ukwuu.

10-11. Olee otú ndị okenye ga-esi gosi na ha hụrụ Jehova na Jizọs n’anya? (1 Pita 5:1, 2)

10 Olee otú ndị okenye nwere ike isi gosi na ha hụrụ Jehova na Jizọs n’anya? Otu ụzọ dị mkpa ha ga-esi eme ya bụ ịna-egboro atụrụ Jizọs mkpa ha. (Gụọ 1 Pita 5:1, 2.) Jizọs mere ka ihe a doo Pita onyeozi anya. Mgbe Pita gọnahụchara Jizọs ugboro atọ, ọ ga-abụ na ọ chọsiri ike igosi na ọ hụrụ Jizọs n’anya. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ jụrụ Pita, sị: “Saịmọn nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” O doro anya na Pita ga-eme ihe niile o nwere ike ime iji gosi na ọ hụrụ Nna ya ukwu n’anya. Jizọs gwara Pita, sị: “Na-azụ ụmụ atụrụ m.” (Jọn 21:15-17) Ná ndụ Pita niile, o lekọtara atụrụ Jizọs. O si otú ahụ gosi na ọ hụrụ Jizọs n’anya.

11 Ndị okenye, olee otú unu ga-esi gosi na unu ji ihe Jizọs gwara Pita kpọrọ ihe n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? Unu nwere ike igosi na unu hụrụ Jehova na Jizọs n’anya ma unu na-aga nleta ọzụzụ atụrụ mgbe niile, na-agbakwa mbọ ka unu nyere ndị kwụsịrịla ife Jehova aka ka ha lọghachikwute ya. (Ezik. 34:11, 12) Unu nwekwara ike ịgba ndị a na-amụrụ Baịbụl na ndị ọhụrụ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ume. Anyị chọrọ ka obi ruo ha ala n’ihi na anyị na-atụ anya na ha ga-esokwa anyị ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

ỊHỤ JIZỌS N’ANYA NA-EME KA ANYỊ NWEE OBI IKE

12. Gịnị mere iche gbasara ihe Jizọs kwuru n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ ji eme ka anyị nwee obi ike? (Jọn 16:32, 33)

12 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụwa, a ga-akpagbu unu, ma nweenụ obi ike. Emeriela m ụwa.” (Gụọ Jọn 16:32, 33.) Mgbe ndị iro Jizọs na-eyi ya egwu, gịnị nyeere ya aka inwe obi ike na irubere Jehova isi ruo ọnwụ? Ọ tụkwasịrị Jehova obi. Jizọs rịọrọ Jehova ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya n’ihi na ọ ma na ụdị nsogbu ahụ ga-abịakwara ha. (Jọn 17:11) Gịnị mere ihe a ji eme ka anyị nwee obi ike? Ọ bụ n’ihi na Jehova karịrị onye iro anyị ọ bụla. (1 Jọn 4:4) E nweghị ihe anya ya na-anaghị ahụ. Obi siri anyị ike na ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, anyị ga-emerili ihe ndị na-atụ anyị ụjọ ma gosi na anyị nwere obi ike.

13. Olee otú Josef onye Arimatia si gosi na o nwere obi ike?

13 Legodị akụkọ Josef onye Arimatia. Ọ bụ onye ndị Juu na-akwanyere ezigbo ùgwù. Ọ bụ onye Sanhedrin, ya bụ, ụlọikpe ndị Juu kacha elu. Ma, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Josef enweghị obi ike. Jọn kwuru na Josef “bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ma ọ na-ezo ya ezo n’ihi na ọ na-atụ egwu ndị Juu.” (Jọn 19:38) Ọ bụ eziokwu na Josef nwere mmasị n’ozi ọma Alaeze Chineke, o meghị ka ndị ọzọ mata na o nwere okwukwe na Jizọs. O nwere ike ịbụ na ụjọ ya bụ na ndị mmadụ agaghị na-akwanyere ya ùgwù ma ha mata na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. Nke ọ bụla ọ bụ, Baịbụl gwara anyị na mgbe Jizọs nwụchara, Josef “katara obi gakwuru Paịlet ma rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.” (Mak 15:42, 43) Josef ezoghịzi ezo na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs.

14. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-atụ ụjọ mmadụ?

14 Ụjọ mmadụ ọ̀ tụtụla gị otú a ọ tụrụ Josef? Ihere ọ̀ na-eme gị mgbe ụfọdụ n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ikwu na ị bụ Onyeàmà Jehova? Ị̀ na-egbu oge ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ma ọ bụ ime baptizim n’ihi na ị na-eche gbasara otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya? Ekwela ka o mee ka ị ghara ime ihe ị ma dị mma. Kpesie ekpere ike ka Jehova nyere gị aka. Rịọ ya ka o mee ka i nwee obi ike ime uche ya. Ị hụ otú Jehova si za ekpere gị, ọ ga-eme ka ị dịkwuo ike, nweekwa obi ike.—Aịza. 41:10, 13.

ỌṄỤ NA-EME KA ANYỊ NA-EFE JEHOVA N’AKWỤSỊGHỊ AKWỤSỊ

15. Mgbe Jizọs pụtachara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya, gịnị ka ọṅụ ha nwere mere ka ha mee? (Luk 24:52, 53)

15 Mgbe Jizọs nwụrụ, o wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu. Chegodị otú obi dị ha. Ọ bụghị naanị na enyi ha ha hụrụ n’anya hapụrụ ha, ha chekwara na olileanya adịghịziiri ha. (Luk 24:17-21) Ma, mgbe Jizọs mechara pụta n’ihu ha, o wepụtara oge nyere ha aka ka ha ghọta otú o si mezuo amụma Baịbụl. O nyekwara ha ọrụ dị ezigbo mkpa ka ha rụọ. (Luk 24:26, 27, 45-48) Mgbe Jizọs laghachiri eluigwe mgbe ụbọchị iri anọ gachara, ha akwụsịla inwe mwute, na-enwezi ezigbo obi ụtọ. Obi dị ha ụtọ maka na ha matara na a kpọlitela Nna ha ukwu nakwa na ọ dị njikere inyere ha aka ka ha rụọ ọrụ ahụ o nyere ha. Ọṅụ ahụ ha nwere mere ka ha na-eto Jehova n’akwụsịghị akwụsị.—Gụọ Luk 24:52, 53; Ọrụ 5:42.

16. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs?

16 Olee otú anyị ga-esi eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs? Anyị nwere ike ịna-enwe ọṅụ n’ofufe anyị na-efe Jehova, ọ bụghị naanị n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, kama n’oge niile n’afọ. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ime ka ihe gbasara Alaeze Chineke bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị agbanweela oge ha ji arụ ọrụ ka ha nwee ike ịna-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe, nakwa ịna-enwe ofufe ezinụlọ n’izu ọ bụla. Ụfọdụ ahapụla inweta ihe ndị ọzọ weere ka ihe dị mkpa ka ha nwee ike ịna-arụkwu ọrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ka ha nwee ike ịga kwusaa ozi ọma n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi iji na-efe Jehova, o kwere anyị nkwa na ọ ga-agọzi anyị ma anyị buru ụzọ na-achọ Alaeze ya.—Ilu 10:22; Mat. 6:32, 33.

N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, wepụta oge chee gbasara ihe Jehova na Jizọs meere gịnwa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị ka i kpebisiri ike ime n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Anyị na-atụsi anya ike ime Ncheta Ọnwụ Jizọs na Tuzdee, abalị anọ n’ọnwa Eprel. Ma, anyị agaghị echere ka o ruo mgbe ahụ tupu anyị echewe gbasara ndụ Jizọs na ọnwụ ya, nakwa otú ya na Jehova si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Jiri ohere ọ bụla i nwetara na-eche banyere ihe ndị a n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Dị ka ihe atụ, wepụta oge gụọ ihe ndị e dere na chaatị bụ́ “Ihe Ndị Mere n’Izu Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụwa,” nke dị n’Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara nke B12 na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ma chebara ihe ị gụrụ echiche. Mgbe ị na-agụ ya, chọọ amaokwu Baịbụl ndị ga-eme ka ị na-enwekwu obi ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere gị, na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya, na-enwekwu obi ike, na-enwekwukwa ọṅụ n’ozi Jehova. Gbalịakwa chee gbasara ụzọ ndị ị ga-esi gosi na obi dị gị ezigbo ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere gị. Ka obi sie gị ike na Jizọs ji ihe niile i mere iji cheta ya n’oge Ncheta Ọnwụ ya kpọrọ ihe.—Mkpu. 2:19.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

a N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, a na-agba anyị ume ka anyị chee gbasara ndụ Jizọs, ọnwụ ya, na otú ya na Nna ya si gosi na ha hụrụ anyị n’anya. Ime otú ahụ nwere ike ime ka anyị mee ihe gosiri na obi dị anyị ụtọ maka ya. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu ihe ụfọdụ anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ, nakwa otú Jehova na Jizọs si hụ anyị n’anya. Anyị ga-ahụkwa otú o nwere ike isi mee ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ka anyị na-enwe obi ike, nakwa ka anyị jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi.