Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 2

‘Gbanweenụ Otú Unu Si Eche Echiche’

‘Gbanweenụ Otú Unu Si Eche Echiche’

“Gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche, ka unu wee chọpụta ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.”—ROM 12:2.

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme ma e mechaa anyị baptizim? Kọwaa.

 UGBORO ole ka ị na-ehichasị ụlọ gị? O nwere ike ịbụ na tupu gị akwaba na ya, i hichasịrị ya nke ọma. Ma, gịnị ga-eme ma ị kwụsị ịna-ehicha ya? Ị manụ na uzuzu na unyi ga-eju na ya ngwa ngwa. Ị chọọ ka ụlọ gị na-adị mma n’anya, ị ga na-ehichasị ya mgbe niile.

2 Ọ bụ otú ahụ ka anyị kwesịrị ịna-eme echiche anyị na àgwà anyị. O doro anya na tupu anyị emee baptizim, anyị gbasiri mbọ ike gbanwee ihe ndị anyị kwesịrị ịgbanwe ná ndụ anyị iji “sachapụ ihe niile na-emerụ ahụ́ anyị na obi anyị.” (2 Kọr. 7:1) Ma, ugbu a, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Pọl onyeozi gwara anyị, nke bụ́ ‘ịna-eme ka otú anyị si eche echiche dị ọhụrụ.’ (Efe. 4:23) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ya mgbe niile? Ọ bụ n’ihi na ọ naghị esi ike mmadụ amụta omume ọjọọ juru n’ụwa a. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ụdị ihe ahụ mee anyị, chọọkwa ka anyị na Jehova na-adị ná mma mgbe niile, anyị kwesịrị ịna-eleru echiche anyị, àgwà anyị, na ihe ndị na-agụ anyị agụụ anya.

‘NA-AGBANWE OTÚ I SI ECHE ECHICHE’

3. Gịnị ka ‘ịgbanwe otú anyị si eche echiche’ pụtara? (Ndị Rom 12:2)

3 Gịnị ka anyị kwesịrị ime iji gbanwee otú anyị si eche echiche? (Gụọ Ndị Rom 12:2.) Okwu Grik a sụgharịrị ‘gbanweenụ otú unu si eche echiche’ nwekwara ike ịpụta “rụzigharịanụ echiche unu.” Ịrụzigharị ụlọ apụtaghị naanị ịgbanwe ihe ụfọdụ a na-ahụ anya. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara àgwà anyị. Ịgbanwe otú anyị si eche echiche apụtaghị ime ihe ọma ole na ole. Kama, ọ pụtara na anyị ga-eleru onwe anyị anya ma gbanwee ihe ọ bụla anyị kwesịrị ịgbanwe ka ndụ anyị nwee ike ịdaba n’ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme. Ọ bụghị ihe anyị ga-eme naanị otu ugboro, kama ọ bụ ihe anyị ga-emere na-aga.

Ihe ndị ị na-ekpebi gbasara agụmakwụkwọ na ọrụ ego hà na-egosi na ọ bụ ijere Jehova ozi kacha gị mkpa ná ndụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4 na nke 5) c

4. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-eche echiche otú ụwa ochie a si eche?

4 Mgbe anyị ga-ezu okè, anyị ga-enwe ike ịna-eme ihe dị Jehova mma mgbe niile. Ma ka ọ dị ugbu a, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ime ihe dị Jehova mma. Ná Ndị Rom 12:2, cheta na Pọl kwuru na anyị kwesịrị ịgbanwe otú anyị si eche echiche ka anyị nwee ike ịmata ihe bụ́ uche Chineke. Anyị ekwesịghị ikwe ka ọ bụrụ ụwa ochie a na-akụziri anyị ihe anyị ga na-eme. Kama, anyị kwesịrị ichebara onwe anyị echiche ka anyị chọpụta ma ànyị na-ekwe ka ọ bụrụ uche Jehova na-eme ka anyị kpebie ihe ndị anyị chọrọ ime.

5. Olee otú anyị nwere ike isi mata ihe anyị na-eche gbasara otú ụbọchị Jehova si dị ezigbo nso? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

5 Chegodị ihe atụ a. Jehova chọrọ ka anyị ‘na-echere ụbọchị ya, burukwa ya n’uche.’ (2 Pita 3:12) Jụọ onwe gị, sị: ‘Otú m si ebi ndụ ọ̀ na-egosi na m ghọtara na ọgwụgwụ ụwa ochie a adịla ezigbo nso? Ihe ndị m na-ekpebi gbasara agụmakwụkwọ na ọrụ ego hà na-egosi na ọ bụ ijere Jehova ozi kacha mkpa ná ndụ m? M̀ nwere okwukwe na Jehova ga na-egboro mụ na ndị ezinụlọ m mkpa anyị, ka m̀ na-echegbu onwe m mgbe niile banyere ihe m ga-eji na-egbo mkpa m?’ Chegodị otú obi si adị Jehova ụtọ ma ọ hụ ka anyị na-agbalị ime uche ya n’ihe niile anyị na-eme.—Mat. 6:25-27, 33; Fil. 4:12, 13.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme?

6 Anyị kwesịrị ịna-eleru otú anyị si eche echiche anya mgbe niile ma gbanwee ihe ọ bụla anyị kwesịrị ịgbanwe. Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, sị: “Na-enyochanụ onwe unu ka unu mara ma okwukwe unu ò sikwara ike. Na-egosinụ ụdị mmadụ unu bụ.” (2 Kọr. 13:5) Otú anyị si egosi na ‘okwukwe anyị siri ike’ abụghị naanị ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Anyị ga-egosikwa ya n’ihe ndị anyị na-eche, n’ihe ndị na-agụ anyị agụụ, nakwa n’ihe ndị anyị bu n’obi ime. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbanwe otú anyị si eche echiche. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agụ Okwu Chineke, ịmụta ịna-eche echiche otú Chineke si eche, na ịna-eme ihe ọ bụla anyị kwesịrị ime iji mee uche Jehova.—1 Kọr. 2:14-16.

‘YIRI ÀGWÀ ỌHỤRỤ’

7. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:31, 32, olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime? Gịnịkwa nwere ike ime ka o siere anyị ike?

7 Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32. E wepụ ịgbanwe otú anyị si eche echiche, anyị kwesịkwara “iyiri àgwà ọhụrụ.” (Efe. 4:24) Anyị ga-agbasi mbọ ike tupu anyị emee ya. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị anyị ga-agbalịsi ike wepụ bụ obi ilu, iwe, na ọnụma. Gịnị nwere ike ime ka o siere anyị ike? Ọ bụ n’ihi na mmadụ ịkwụsị àgwà ọjọọ ụfọdụ riri ya ahụ́ anaghị adị mfe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ụfọdụ ndị “na-ewekarị oké iwe.” (Ilu 29:22) Mmadụ nwere ike ịna-agbasi mbọ ike tupu ya akwụsị àgwà ọjọọ riri ya ahụ́, ọ bụrụgodị na o meela baptizim. Ọ bụ ihe akụkọ otu nwanna na-egosi.

8-9. Olee otú akụkọ Nwanna Stephen si gosi na anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ịkpa àgwà ọjọọ anyị na-akpabu?

8 E nwere otu nwanna aha ya bụ Stephen. Ọ na-esiri ya ike ijide onwe ya ma iwe bịa ya. Ọ sịrị: “N’agbanyeghị na e meela m baptizim, o nwere mgbe ụfọdụ ọ na-esiri m ike ijide onwe m ma a kpasuo m iwe. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ụbọchị anyị nọ n’ozi ọma, mụ adọwa ụgbọala m otu ebe na-aga. Obere oge, mụ ahụ ka otu onye ohi bịara tụrụ redio dị n’ụgbọala m. Mụ achụwa ya. Mgbe m chụkwutewere ya, ya atụsa redio ahụ n’ala gbalaga. Mgbe m kọọrọ ndị mụ na ha so ihe merenụ, otu n’ime ha bụ́ okenye ọgbakọ jụrụ m, sị: ‘Stephen, gịnịdị ka ị gaara eme ma a sị na i jidere onye ohi ahụ?’ Ihe ahụ ọ jụrụ m mere ka m chebara onwe m echiche, meekwa ka m na-agbakwu mbọ ka mụ na ndị ọzọ na-adị ná mma.” b

9 Akụkọ Nwanna Stephen gosiri na mmadụ nwere ike ịnọkata kpaa àgwà ọjọọ ririla ya ahụ́ ọ bụrụgodị na o chere na ọ kwụsịla ya. Ọ bụrụ na ụdị ihe ahụ emee gị, ike agwụla gị. Echekwala na ị bụghịzi ezigbo Onye Kraịst. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe dị mma, ihe ọjọọ na-abata m n’obi.” (Rom 7:21-23) Ndị Kraịst niile na-ezughị okè nwere àgwà ụfọdụ na-adịghị mma ha na ha na-alụ nke na-eselite isi mgbe ụfọdụ. E nwere ike iji ya tụnyere ebe e hichachara ụlọ, uzuzu na unyi ejirikwa nwayọọ nwayọọ na-abata na ya. Anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị dịrị ọcha. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

10. Olee otú anyị ga-esi gbaara àgwà ọjọọ ọsọ? (1 Jọn 5:14, 15)

10 Kpee ekpere kọọrọ Jehova gbasara àgwà ahụ siiri gị ike ịgbanwe. Ka obi siekwa gị ike na ọ ga-anụ ekpere gị ma nyere gị aka. (Gụọ 1 Jọn 5:14, 15.) Ọ bụ eziokwu na Jehova agaghị arụ ọrụ ebube wepụrụ gị àgwà ọjọọ ahụ, ma o nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ịkpa ya. (1 Pita 5:10) Ka ọ dị ugbu a, na-eme ihe gosiri na ekpere gị si gị n’obi. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịhapụ ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka ị kpawakwa àgwà ochie ahụ. Dị ka ihe atụ, kpachara anya n’ihe ndị ị na-ele na vidio nakwa na tiivi, ma ọ bụ ịgụ akụkọ ndị na-eme ka ịkpa àgwà ọjọọ ndị ị na-agbalị ịkwụsị yie ihe dị mma. Ekwela ka uche gị dịrị n’ihe ndị na-adịghị mma.—Fil. 4:8; Kọl. 3:2.

11. Olee ihe ndị anyị nwere ike ime ka anyị ghara iyipụ àgwà ọhụrụ?

11 N’agbanyeghị na ị kwụsịla ịkpa àgwà ochie, ọ dị mkpa ka ị mụta ịna-akpa àgwà ọhụrụ. Olee otú ị ga-esi eme ya? Ka ị na-amụ banyere àgwà ndị e ji mara Jehova, kpebie ịna-eme ka ya. (Efe. 5:1, 2) Dị ka ihe atụ, ị gụwa akụkọ Baịbụl mere ka a mata na Jehova na-agbaghara mmehie, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-agbaghara ndị ọzọ?’ Ị gụọ otú Jehova si nweere ndị ihe na-esiri ike ọmịiko, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ na-enwere ụmụnna ihe na-esiri ike ụdị ọmịiko ahụ, na-emekwa ihe gosiri na m na-enwere ha ọmịiko?’ Na-akpa àgwà ọhụrụ, si otú ahụ na-agbanwe otú i si eche echiche. Na-enwekwara onwe gị ndidi ka ị na-eme otú ahụ.

12. Olee otú Baịbụl si kpaa ike n’ahụ́ Nwanna Stephen?

12 Nwanna Stephen anyị kwuburu okwu ya ji nwayọọ nwayọọ na-eyiri àgwà ọhụrụ. Ọ sịrị: “Kemgbe m mechara baptizim, e nweela ọtụtụ ihe merenụ nke gaara eme ka m jiri iwe mebie ihe. Ma, amụtala m isi n’ebe ndị chọrọ ịkpasu m iwe nọ pụọ ma ọ bụkwanụ ijide onwe m ma a kpasuo m iwe. Ma nwunye m ma ọtụtụ ndị ọzọ ajaala m mma n’ihi otú m si ejide onwe m ma a kpasuo m iwe. Ọ na-ejudị mụnwa anya na agbanweela m. Ama m na ọ bụghị n’ike m. Kama, ọ bụ ike Baịbụl kpara n’ahụ́ m mere m ji gbanwee.”

NA-ALỤSO ỌCHỊCHỌ NA-ADỊGHỊ MMA ỌGỤ

13. Gịnị ga-enyere anyị aka ka ime ihe dị mma na-agụ anyị agụụ? (Ndị Galeshia 5:16)

13 Gụọ Ndị Galeshia 5:16. Jehova na-enye anyị mmụọ nsọ ya iji nyere anyị aka imeri n’ọgụ anyị na-alụ ime ihe dị mma. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke, anyị na-ekwe ka mmụọ Chineke na-eduzi anyị. Anyị na-enwetakwa mmụọ nsọ Chineke mgbe anyị gara ọmụmụ ihe. N’ọmụmụ ihe, anyị na ụmụnna anyị ndị na-agbalị ime ihe dị mma otú anyị na-eme na-anọrị. Ọ na-agbakwa anyị ume. (Hib. 10:24, 25; 13:7) Ọ bụrụ na anyị ana-ekpesi ekpere ike na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka n’ihe anyị na-anaghị emeta, ọ ga-enye anyị mmụọ nsọ ya ka anyị nwee ike ịna-agbakwu mbọ. Ime ihe ndị a nwere ike ọ gaghị ewepụ ihe ọjọọ ahụ na-agụ anyị, ma ọ ga-enyere anyị aka ijide onwe anyị ka anyị ghara ime ya. Dị ka Ndị Galeshia 5:16 kwuru, ndị na-ekwe ka mmụọ nsọ na-edu ha ‘agaghị eme ihe ọ bụla na-agụ ahụ́ ha agụụ.’

14. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-agba mbọ ka ihe dị mma na-agụ anyị agụụ?

14 Ọ bụrụ na anyị ebido ịna-eme ihe ndị ga-eme ka anyị na Jehova na-adịkwu ná mma, ọ dị mkpa ka anyị mere ya na-aga, na-agbakwa mbọ ka ime ihe dị mma na-agụ anyị agụụ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na anyị nwere onye iro ụra na-anaghị aga n’anya. Onye iro ahụ bụ ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ka anyị mee ihe ọjọọ. Anyị mechagodị baptizim, anyị nwere ike ịchọpụta na ihe ndị anyị kwesịrị ịgbara ọsọ ka na-agụ anyị agụụ, ihe ndị dị ka ịgba chaa chaa, ịṅụfe mmanya ókè, ma ọ bụ ile ndị gba ọtọ. (Efe. 5:3, 4) Otu nwanna bụ́ nwa okorobịa sịrị: “Otu n’ime ihe ndị kacha siere m ezigbo ike bụ ịchọ ka mụ na nwoke ibe m nwee mmekọahụ. Echeburu m na ọ ga-emecha pụọ m n’obi. Ma o kwebeghị apụ m n’obi.” Olee ihe ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ihe ọjọọ na-agụsi gị agụụ ike?

Ime ihe ọjọọ gụwa gị, echela na nsogbu gị enweghị ngwọta; ndị ọzọ alụsola ụdị ihe ahụ ọgụ ma merie ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16)

15. Gịnị mere o ji akasi anyị obi ma anyị cheta na ihe ọjọọ na-agụkwa “mmadụ niile”? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Ka ị na-alụso ihe ọjọọ na-agụsi gị agụụ ike ọgụ, cheta na ọ bụghị naanị gị na-alụ ụdị ọgụ ahụ. Baịbụl sịrị: “Ọnwụnwa na-abịara unu na-abịakwara mmadụ niile.” (1 Kọr. 10:13a) Ndị a gwara okwu a bụ Ndị Kraịst bi na Kọrịnt, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko, ndị na-edina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, nakwa ndị aṅụrụma. (1 Kọr. 6:9-11) Ì chere na mgbe ha mechara baptizim na e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla gụrụ ha agụụ? Mbanụ. Ọ bụ eziokwu na ha niile bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ, ma ha ka bụkwa ndị mmadụ na-ezughị okè. O doro anya na ime ihe ọjọọ ga na-agụ ha agụụ mgbe ụfọdụ. Ihe a kwesịrị ịkasi anyị obi. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ na-egosi na n’agbanyeghị ụdị ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ, e nweela onye meriri ya. N’eziokwu, ị ‘ga-esili ike n’okwukwe, ebe ị ma na ụmụnna gị niile nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a ị na-ata.’—1 Pita 5:9.

16. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị iche? Maka gịnị?

16 Echela na e nweghị onye ga-aghọtali nsogbu gị na ya na-alụ. Ichewe otú ahụ nwere ike ime ka i chee na nsogbu gị enweghị ngwọta nakwa na ị gaghị emerili ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ. Baịbụl kwuru na ị ga-emerili ya. Ọ sịrị: “Chineke na-emezu ihe o kwuru, ọ gaghịkwa ekwe ka ọnwụnwa unu na-agaghị edili bịara unu. N’ihi ya, ọnwụnwa bịara unu, ọ ga-enyere unu aka idi ya.” (1 Kọr. 10:13b) N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ihe ọjọọ agụsiwe anyị ike, anyị ga-emerili ya. Jehova ga-enyeliri anyị aka anyị agbaara ime ihe na-adịghị mma ọsọ.

17. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị emeli ka ihe ọjọọ ghara ịgụ anyị agụụ, gịnị ka anyị ga-emeli?

17 Na-echeta mgbe niile na ebe ị bụ mmadụ na-ezughị okè, ị gaghị emeli ka ihe ọjọọ ghara ịgụ gị agụụ. Ma ọ gụwa gị, ị ga-ajụli ya ozugbo otú ahụ Josef mere mgbe ọ gbaara nwunye Pọtịfa ọsọ. (Jen. 39:12) I kwesịghị ime ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ.

NA-AGBASI MBỌ IKE

18-19. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ka anyị na-agbalịsi ike ịgbanwe otú anyị si eche echiche?

18 Ịgbanwe otú anyị si eche echiche pụtara na anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka echiche anyị na omume anyị na-adị Jehova mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-enyocha onwe anyị ma jụọ onwe anyị, sị: ‘Ihe m na-eme ọ̀ na-egosi na m kwetara na oge a anyị bi na-akụzi kwarapụ kwarapụ? M̀ na-emekwu nke ọma n’iyiri àgwà ọhụrụ? M̀ na-ekwe ka mmụọ Jehova na-eduzi ndụ m ka m ghara ime ihe ọjọọ na-agụ ahụ́ m?’

19 Ka ị na-enyocha onwe gị, atụla anya na ị ga-emetacha ihe niile, kama ka obi dị gị ụtọ maka ebe ndị ị na-eme nke ọma. Ị hụ ebe i kwesịrị imekwu nke ọma, ike agwụla gị. Kama, mee ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 3:16. Ọ sịrị: “Otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.” Ka ị na-eme otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mbọ ị na-agba ịna-agbanwe otú i si eche echiche.

ABỤ NKE 36 Anyị Na-echebe Obi Anyị

a Pọl onyeozi gwara ụmụnna ya ka ha ghara ịmụta ịna-akpa àgwà ka ụwa ochie a. Ndụmọdụ ahụ ga-abakwara anyị uru taa. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka a ghara inwe otú anyị si eme omume ka ụwa ochie a. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-agbazi echiche anyị mgbe ọ bụla anyị matara na ọ dịghị Chineke mma. N’isiokwu a, anyị ga-amụ otú anyị ga-esi eme ya.

b Gụọ isiokwu bụ́ “Ndụ M Bịara Na-aka Njọ,” nke gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2015.

c NKỌWA FOTO Dị: Ebe otu nwanna bụ́ nwa okorobịa na-eche ma ọ̀ ga-aga mahadum, ka ọ̀ ga-abanye ozi oge niile.