Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ịgụ akụkọ ndụ ụmụnna anyị ọ̀ na-amasị gị?

Otu di na nwunye na-agụ akụkọ ndụ n’ụtụtụ ọ bụla kwuru, sị: “Ịgụ akụkọ ndị ahụ na-agba anyị ume, na-emekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. Ha na-echetara anyị na anyị nwere ike irubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị na ya na-alụ.” Otu nwanna nwaanyị obi dịkwa otú ọ dị di na nwunye ahụ sịrị: “Akụkọ ndụ ndị ahụ na-akasi obi, na-eme obi ụtọ, na-emekwa ka m chọkwuo ijere Jehova ozi. Ndụ ụmụnna ndị ahụ bara uru. Akụkọ ha na-eme ka m chọkwuo ịna-ekwusa ozi ọma nakwa inyere ụmụ m aka ha ha banye n’ozi oge niile.”

Akụkọ ndụ ụmụnna anyị nwere ike ime ka ị chọkwuo iji ndụ gị eme ihe bara uru, mee ka ị kwụsị àgwà na-adịghị mma i nwere, nyekwara gị aka iji ọṅụ na-edi nsogbu ndị na-abịara gị. Olee ebe i nwere ike ịhụ akụkọ ndị ahụ?

  • Gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” na jw.org ma ọ bụ na JW Library®.

  • Chọọ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” n’Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET ma ọ bụkwanụ na Watchtower Library.