Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 4

Jehova Na-agọzi Mbọ Anyị Na-agba Ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs

Jehova Na-agọzi Mbọ Anyị Na-agba Ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs

“Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”—LUK 22:19.

ABỤ NKE 19 Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Gịnị mere anyị ji aga Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ?

 IHE fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà maka anyị, mepeere anyị ụzọ ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha jiri achịcha na mmanya na-echeta àjà ahụ o ji ndụ ya chụọ.—1 Kọr. 11:23-26.

2 Anyị na-eme ihe ahụ Jizọs kwuru n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. (Jọn 14:15) Kwa afọ, n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-ewepụta oge na-ekpe ekpere, na-echebakwara ihe ọnwụ Jizọs pụtara echiche iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe o meere anyị. Obi na-adịkwa anyị ụtọ ịgbakwu mbọ n’ozi ọma, na-akpọ ọtụtụ ndị ọzọ ka ha bịa sonyere anyị n’oge ahụ pụrụ iche. N’eziokwu, anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla gbochie anyị ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs.

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-amụ banyere ụzọ atọ ndị na-efe Jehova sirila gbalịsie ike ime Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha bụ: (1) ime ya otú Jizọs kụziri ka e si na-eme ya, (2) ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, na (3) ime Ncheta Ọnwụ Jizọs n’agbanyeghị otú ihe si sie ike.

IME NCHETA ỌNWỤ JIZỌS OTÚ JIZỌS KỤZIRI KA E SI NA-EME YA

4. Olee eziokwu ndị a na-akọwa kwa afọ ná Ncheta Ọnwụ Jizọs? Gịnịkwa mere na anyị ekwesịghị iji eziokwu ndị a gwuo egwu? (Luk 22:19, 20)

4 Kwa afọ, e mewe Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị na-egere okwu si na Baịbụl, nke na-aza ajụjụ ụfọdụ otú doro anya. Anyị na-amụta ihe mere o ji dị mkpa ka a gbapụta ụmụ mmadụ nakwa otú ọnwụ otu nwoke nwere ike isi mee ka a gbaghara ọtụtụ ndị mmehie ha. A na-echetara anyị ihe achịcha ahụ na mmanya ahụ nọchiri anya ha nakwa ndị kwesịrị ịta achịcha ahụ ma ṅụọ mmanya ahụ. (Guọ Luk 22:19, 20.) Anyị na-atụgharịkwa uche n’ihe ọma Chineke ga-emere ndị nwere olileanya ibi n’ụwa. (Aịza. 35:5, 6; 65:17, 21-23) Anyị ekwesịghị iji eziokwu ndị a gwuo egwu. Ọtụtụ ijeri mmadụ aghọtaghị ha. Ha amaghịkwa uru àjà ahụ Jizọs chụrụ bara. Ha anaghịkwa eme Ncheta Ọnwụ Jizọs otú ọ sịrị ka e si na-eme ya. Maka gịnị?

5. Mgbe ọtụtụ ndịozi Jizọs nwụchara, olee otú ndị mmadụ sizi na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs?

5 Mgbe ọtụtụ ndịozi Jizọs nwụchara, Ndị Kraịst adịgboroja gbebatara n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (Mat. 13:24-27, 37-39) Ha bidoro “ịna-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.” (Ọrụ 20:29, 30) Otu n’ime “ihe ndị na-abụghị eziokwu” Ndị Kraịst adịgboroja ndị ahụ malitere ịkụzi bụ na Jizọs ejighị ahụ́ ya chụọ àjà “naanị otu ugboro ka o buru mmehie ọtụtụ ndị” otú ahụ Baịbụl kwuru, kama na a ga na-achụ àjà ahụ ugboro ugboro. (Hib. 9:27, 28) Taa, ọtụtụ ndị ji obi ha niile kweta ihe a na-abụghị eziokwu. Ha na-aga chọọchị kwa izu, mgbe ụfọdụ kwa ụbọchị, ịga rie ihe ha na-akpọ “Oriri Nsọ.” b Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ chọọchị anaghị eme ya kwa ụbọchị ma ọ bụ kwa izu, ma, ndị òtù ha aghọtachaghị ihe àjà ahụ Jizọs chụrụ pụtara. Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọnwụ Jizọs ọ̀ pụtara n’eziokwu na a ga-agbagharali mmehie m?’ Gịnị mere ha ji ajụ ajụjụ ahụ? Mgbe ụfọdụ, ọ bụ maka ihe ha mụtara n’aka ndị na-ekwu na àjà Jizọs chụrụ agaghị emeli ka a gbaghara ndị mmadụ mmehie ha. Olee otú ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs sirila mee ka a mata nke bụ́ eziokwu?

6. Ka ọ na-erule afọ 1872, gịnị ka mmadụ ole na ole na-amụ Baịbụl ghọtara?

6 N’afọ 1870, Nwanna Charles Taze Russell na mmadụ ole na ole ndị ọzọ malitere ịmụsi Baịbụl ike. Ha chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu gbasara uru àjà Jizọs chụrụ bara nakwa otú e kwesịrị isi na-echeta ọnwụ ya. Ka ọ na-erule afọ 1872, ha aghọtala na Baịbụl kwuru na Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta mmadụ niile. Ha ezochighị ihe ndị ha mụtara. Kama, ha si n’akwụkwọ akụkọ nakwa akwụkwọ ndị ọzọ mee ka ndị mmadụ mata gbasara ya. N’oge na-adịghị anya, ha bidoro ịna-ezukọta naanị otu ugboro n’afọ ka ha mee Ncheta Ọnwụ Jizọs otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere.

7. Olee otú ihe ndị mbụ mụrụ Baịbụl chọpụtara si abara anyị uru taa?

7 Taa, ihe ụmụnna ndị ahụ ji obi ha niile chọpụta ọtụtụ afọ gara aga na-abara anyị uru. Olee uru ọ na-abara anyị? Jehova emepeela anya anyị, anyị aghọta nke bụ́ eziokwu banyere àjà ahụ Jizọs chụrụ na uru ọ bara. (1 Jọn 2:1, 2) Anyị amụtakwala na Baịbụl kwuru na e nwere olileanya abụọ ndị mere uche Chineke nwere, ya bụ, na ụfọdụ ga-aga eluigwe bụ́ ebe ha na-agaghị anwụ anwụ, ọtụtụ nde ndị ọzọ adịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Anyị na-abịarukwu Jehova nso ka anyị na-eche banyere otú o si hụ anyị n’anya nakwa ọtụtụ uru àjà ahụ Jizọs chụrụ na-abara onye ọ bụla n’ime anyị. (1 Pita 3:18; 1 Jọn 4:9) N’ihi ya, anyị na-eme ihe ụmụnna anyị mere n’oge gara aga. Anyị na-akpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị mee Ncheta Ọnwụ Jizọs otú ahụ Jizọs kwuru ka e si na-eme ya.

NDỊ JEHOVA NA-AKPỌ NDỊ ỌZỌ KA HA BỊA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS

Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike jiri obi gị niile soro mee mkpọsa maka Ncheta Ọnwụ Jizọs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10) e

8. Gịnị ka ndị Jehova merela iji kpọọ ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

8 Kemgbe ọtụtụ afọ, ndị Jehova na-akpọ ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’afọ 1881, a mara ọkwa n’Ụlọ Nche gwa ụmụnna nọ n’Amerịka ka ha zukọta n’ụlọ otu nwanna n’obodo Alegeni dị na Pensụlvenịa maka nnọkọ ahụ pụrụ iche. Ka oge na-aga, ọgbakọ nke ọ bụla bidoro ime Ncheta Ọnwụ Jizọs nke ha. N’ọnwa Mach afọ 1940, a gwara ndị nkwusa ka ha kpọọ onye ọ bụla nọ n’ebe ha na-ezi ozi ọma, nke chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl, ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ bụ n’afọ 1960 bụ mgbe mbụ alaka ụlọ ọrụ wetaara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ ịkpọ òkù e biri ebi. Kemgbe ahụ, e kesaala ọtụtụ ijeri akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Gịnị mere anyị ji agbalịsi ike otú a ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs?

9-10. Olee ndị mbọ anyị na-agba ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na-abara uru?

9 Otu n’ime ihe ndị mere anyị ji akpọ ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị mee Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ na anyị chọrọ ka ndị na-abịa nke mbụ ha mụta eziokwu banyere ihe Jehova na Jizọs meere anyị niile. (Gụọ Jọn 3:16.) Anyị chọrọ ka ihe ha hụrụ na ihe ha nụrụ ná Ncheta Ọnwụ Jizọs mee ka ha mụtakwuo ihe ma bịa fewe Jehova. Ma, e nwere ndị ọzọ ọ na-abara uru.

10 Anyị na-akpọkwa ndị kwụsịrịla ife Jehova ka ha bịa. Ihe mere anyị ji akpọ ha bụ ka anyị chetara ha na Chineke ka hụrụ ha n’anya. Ọtụtụ n’ime ha na-aza òkù ahụ. Obi na-adịkwa anyị ezigbo ụtọ ịhụ ha. Ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs na-echetara ha otú ife Jehova sibu atọ ha ụtọ. Chegodị banyere Nwanna Nwaanyị Monica. c Ọ bụ n’oge ọrịa koronavaịrọs ka e nyeere ya aka ibidokwa gawa ozi ọma. Mgbe ọ gachara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2021, ọ sịrị: “M weere Ncheta Ọnwụ Jizọs a ka ihe pụrụ ezigbo iche. Kemgbe afọ iri abụọ, nke a bụ nke mbụ m ziri ndị mmadụ ozi ọma ma kpọọ ha ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. M gbalịsiri ike kpọọ ndị ọzọ n’ihi na obi dị m ezigbo ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere m.” (Ọma 103:1-4) Ma ndị anyị kpọrọ hà kwere bịa ma ọ bụ na ha ekweghị, anyị na-agbasi mbọ ike ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi na anyị ma na mbọ anyị na-agba na-eme Jehova obi ụtọ.

11. Olee otú Jehova sirila gọzie mbọ anyị na-agba ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Hagaị 2:7)

11 Otú Jehova sirila gọzie mbọ anyị na-agba ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. N’afọ 2021, n’agbanyeghị nsogbu ọrịa koronavaịrọs kpatara, ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs dị nde iri abụọ na otu, narị puku atọ na puku iri isii na asaa, na narị isii na atọ (21,367,603). Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ okpukpu abụọ na ọkara nke Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile. Ma, ihe dị Jehova mkpa abụghị naanị na ọtụtụ ndị bịara ya. Ihe ka ya mkpa bụ onye nke ọ bụla bịara ya. (Luk 15:7; 1 Tim. 2:3, 4) Obi siri anyị ike na Jehova na-eji òkù ahụ anyị na-akpọ ndị ọzọ enyere anyị aka ịchọta ndị chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu.—Gụọ Hagaị 2:7.

IME NCHETA ỌNWỤ JIZỌS N’AGBANYEGHỊ OTÚ IHE SI SIE IKE

Jehova na-agọzi mbọ anyị na-agba ime Ncheta Ọnwụ Jizọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) f

12. Olee nsogbu ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ime Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

12 Jizọs kwuru na n’oge ikpeazụ, e nweghị ụdị nsogbu na-agaghị abịara anyị, ma mmegide ndị ezinụlọ anyị ga na-emegide anyị, ma mkpagbu, ma agha, ma ọrịa na-efe efe, ma nsogbu ndị ọzọ. (Mat. 10:36; Mak 13:9; Luk 21:10, 11) Mgbe ụfọdụ, nsogbu ndị a nwere ike ime ka o siere anyị ike ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Olee otú ụmụnna anyị si merie nsogbu ndị ahụ? Oleekwa otú Jehova si nyere ha aka?

13. Olee otú Jehova si gọzie Nwanna Artem maka ịkata obi mee Ncheta Ọnwụ Jizọs mgbe a tụrụ ya mkpọrọ?

13 Ndị a tụrụ mkpọrọ. Ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ maka ihe ha kweere na-eme ihe ha ga-emeli iji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. Chegodị banyere Nwanna Artem. N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2020, a tụrụ ya mkpọrọ n’ọnụ ụlọ dị ezigbo obere a na-etinye ihe ruru ndị mkpọrọ ise n’otu oge. N’agbanyeghị na ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, o nwetara ihe ndị o ji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. O bukwa n’obi ikwuru onwe ya okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ma, ndị ha na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ ahụ na-aṅụ sịga, na-akpọkwa mmadụ iyi. Gịnị ka o mere? Ọ jụrụ ha ma hà ga-enwe ike ịnọ otu awa n’akpọghị mmadụ iyi, n’aṅụghịkwa sịga. O juru Nwanna Artem anya na ha kwetara na ha agaghị aṅụ sịga ma ọ bụ kpọọ mmadụ iyi n’oge ahụ ọ ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ sịrị: “M gwara ha ka m kọwaara ha banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs ahụ.” N’agbanyeghị na ha sịrị na ha achọghị ịnụ banyere ya, mgbe ha hụchara ka Nwanna Artem mere Ncheta Ọnwụ Jizọs, nụkwa ihe ndị o kwuru, ha jụrụ ya banyere ya.

14. Olee mbọ ndị a gbara ka e nwee ike mee Ncheta Ọnwụ Jizọs n’agbanyeghị ọrịa koronavaịrọs?

14 Ọrịa koronavaịrọs. Mgbe ọrịa koronavaịrọs bidoro, ndị Jehova agalighị Ncheta Ọnwụ Jizọs ihu na ihu. Ma, o meghị ka ha ghara ime Ncheta Ọnwụ Jizọs. d Ọgbakọ ndị nwere Ịntanet si n’Ịntanet mee nke ha. Gịnịkwanụ ka ọtụtụ nde ndị ọzọ na-enweghị Ịntanet mere? Ná mba ụfọdụ, alaka ụlọ ọrụ haziri ka e kwuo okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs na tiivi ma ọ bụ na redio. Alaka ụlọ ọrụ tinyere okwu ahụ n’ígwè n’ihe karịrị narị asụsụ ise ka ndị bi n’ime obodo nwee ike ime Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ụmụnna anyị gara nye ya ndị bi n’ebe ndị a chọrọ ya.

15. Gịnị ka ị mụtara n’ihe otu onye a na-amụrụ Baịbụl aha ya bụ Sue mere?

15 Mmegide si n’aka ndị ezinụlọ. Ihe kacha mee ka o siere ụfọdụ ndị ike ime Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ mmegide ndị ezinụlọ ha na-emegide ha. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị a na-amụrụ Baịbụl aha ya bụ Sue. N’afọ 2021, n’ụbọchị bọtara ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs, Sue gwara onye na-amụrụ ya ihe na ya agaghị agali Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi otú ụfọdụ ndị ezinụlọ ha si emegide ya. Onye na-amụrụ ya ihe gụrụ Luk 22:44, kọwaara ya na ọ bụrụ na ihe esiere anyị ike, anyị kwesịrị ime ihe Jizọs mere, nke bụ́ ikpe ekpere kọọrọ ya Jehova ma tụkwasị ya obi anyị niile. N’echi ya, Sue kwadebere achịcha na mmanya ma lee vidio Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị pụrụ iche na jw.org. Ná mgbede, ọ banyere n’ime ụlọ naanị ya ma jiri ekwentị gee okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mgbe e mechara, Sue degaara onye na-amụrụ ya ihe akwụkwọ ozi, sị: “Ị gbara m ezigbo ume ụnyaahụ. M gbalịsiri ike mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jehova nyekwaara m ezigbo aka. Agaghị m ekwuchali otú obi si bụrụ m sọ aṅụrị. M na-ekelekwa Jehova maka ya.” Ì chere na Jehova ga-enyeliri gị aka ma ụdị nsogbu ahụ bịara gị?

16. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs? (Ndị Rom 8:31, 32)

16 Mbọ anyị na-agba ime Ncheta Ọnwụ Jizọs na-eme Jehova ezigbo obi ụtọ. Ka obi sie anyị ike na ọ ga-agọzi anyị ma anyị gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe o meere anyị. (Gụọ Ndị Rom 8:31, 32.) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ a ma gbalịsie ike jekwuoro Jehova ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs.

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

a Na Tuzdee, abalị anọ n’ọnwa Eprel afọ 2023, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. E nwere ọtụtụ ndị ọ ga-abụ nke mbụ ha na-abịa ya. Ndị ga-eso bịa bụ ụfọdụ ndị kwụsịrịla ife Jehova, ndị na-abịabeghịkwa ya kemgbe ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị ga-emeri ọtụtụ nsogbu ka ha nwee ike ịbịa ya. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị, ka obi sie gị ike na obi ga-adị Jehova ụtọ ma ị gbalịsie ike bịa.

b Ndị ahụ kweere na n’ememme ahụ, achịcha ahụ na mmanya ahụ na-agbanwe bụrụzie ahụ́ Jizọs na ọbara ya. Ha chere na a na-eji ahụ́ Jizọs na ọbara ya achụ àjà mgbe ọ bụla mmadụ so mee ememme ahụ.

c Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

d Gụọ isiokwu ndị gbara na jw.org bụ́ “2021 Memorial Commemoration.”

e NKỌWA FOTO Dị: Kemgbe afọ 1960, e meela ka akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs na-akakwu mma. E nwere ya ugbu a ma nke e biri ebi ma nke na-adị na kọmputa.

f NKỌWA FOTO Dị: Foto na-egosi ebe ụmụnna na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs mgbe e nwere ọgba aghara.