Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 1

Obi Sie Gị Ike na ‘Okwu Chineke Bụ Eziokwu’

Obi Sie Gị Ike na ‘Okwu Chineke Bụ Eziokwu’

ISIOKWU AFỌ 2023: “Okwu gị niile bụ eziokwu.”—ỌMA 119:160.

ABỤ NKE 96 Okwu Chineke Bụ Akụ̀

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị mere na ọtụtụ ndị atụkwasịghị Baịbụl obi?

 ỌTỤTỤ ndị taa amaghị onye ha ga-atụkwasị obi. Obi esighị ha ike na ndị ha na-akwanyere ùgwù, dị ka ndị ọchịchị, ndị sayensị, na ndị ọchụnta ego na-agbalị ime ihe ga-abara ha uru. Ihe ọzọkwa bụ na e nweghịzi ihe ha ji ndị isi chọọchị kpọrọ. N’ihi ya, o jughị anyị anya na ha atụkwasịghị Baịbụl obi ebe ọ bụ ya ka ndị isi chọọchị ndị ahụ sị na ha na-eme ihe o kwuru.

2. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 119:160, gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

2 Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, obi siri anyị ike na ọ bụ “onye eziokwu,” nakwa na ihe ọ na-achọ mgbe niile bụ ihe ga-akacha baara anyị uru. (Ọma 31:5; Aịza. 48:17) Anyị ma na anyị ga-atụkwasịli Baịbụl obi. Obi siri anyị ike na “okwu [Chineke] niile bụ eziokwu.” (Gụọ Abụ Ọma 119:160.) Anyị kwetara ihe otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “O nweghị ihe ọ bụla Chineke kwuru na-abụghị eziokwu ma ọ bụ nke na-agaghị emezu. Ndị na-efe Chineke ga-atụkwasịli ihe Chineke kwuru obi n’ihi na ha tụkwasịrị Chineke kwuru ya obi.”

3. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

3 Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka ka ha tụkwasị Okwu Chineke obi ka anyịnwa? Ka anyị kwuo ihe atọ mere anyị ga-eji tụkwasị Baịbụl obi. Anyị ga-ekwu otú ihe niile e kwuru na ya si bụrụ eziokwu, otú amụma ndị e buru na ya si na-emezu, nakwa otú o si agbanwe ndụ ndị mmadụ.

A GBANWEBEGHỊ IHE NDỊ E DERE NA BAỊBỤL

4. Gịnị mere ụfọdụ ndị ji eche na a gbanweela ihe dị na Baịbụl?

4 Jehova Chineke ji ihe dị ka ụmụ nwoke iri anọ dee Baịbụl. Ma, e nweghị nke ha ji aka ha dee dị ruo n’oge anyị a. Ihe anyị nwere n’oge a bụ ndị nke ndị ọzọ depụtara edepụta. Ihe a na-eme ka ụfọdụ ndị na-eche ma ihe e dere na Baịbụl anyị na-agụ taa ọ̀ ka bụkwa ihe ahụ e dere ná ndị nke mbụ ahụ ụmụ nwoke ndị ahụ ji aka ha dee. Ì chetụla ihe mere obi ga-eji sie anyị ike na ọ ka bụ ya?

Ndị bụ́ aka ochie n’idepụta ihe depụtara ọtụtụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ha gbara ezigbo mbọ hụ na ihe ndị ha dere bụ eziokwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

5. Olee otú e si depụta Akwụkwọ Nsọ Hibru? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

5 Iji mee ka ihe ndị e dere n’Okwu Jehova dịgide, ọ gwara ndị ya ka ha depụta ya. Ọ gwara ndị eze Izrel ka ha depụtara onwe ha Iwu ya n’akwụkwọ. Ọ họpụtakwara ndị Livaị ka ha na-akụziri ya ndị mmadụ. (Diut. 17:18; 31:24-26; Nehe. 8:7) Mgbe a tọhapụrụ ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn, ndị bụ́ aka ochie n’idepụta ihe depụtara ọtụtụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. (Ihe e dere n’ala ala peeji Ezra 7:6.) Ụmụ nwoke ndị a na-akpachapụ anya ede ihe. Ka oge na-aga, ha bidoro gụkọwa ma okwu ole dị na ya ma mkpụrụ akwụkwọ ole dị na ya ka ha jide n’aka na ha depụtara ihe niile nke ọma. N’agbanyeghị mbọ ha gbara, ezughị okè mmadụ mere ka e nwee obere ihe ụfọdụ ha dehiere. Ma, ebe ọ bụ na e depụtara nke ọ bụla ka ọ dị ọtụtụ, e mechara hụ ihe ndị ahụ e dehiere edehie. Olee otú e si hụ ha?

6. Olee otú e nwere ike isi mata ihe ndị e dehiere na Baịbụl ndị ahụ e ji aka depụta?

6 Ndị ọkachamara e nwere n’oge a nwere otú doro anya e si achọpụta ihe ndị depụtara Baịbụl dehiere. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na a gwara otu narị ụmụ nwoke ka ha jiri aka depụta otu ihe, otu onye n’ime ha edehie obere ihe na nke o depụtara. Otu ụzọ e nwere ike isi chọpụta ihe ahụ o dehiere bụ ileru nke ya na nke ndị ọzọ anya ka a mara ma è nwere ihe dị iche. Otú ahụ ka ọ dịkwa na Baịbụl ndị ahụ e ji aka depụta. Ileru nke otu onye depụtara na nke onye nke ọzọ depụtara anya na-enyere ndị ọkachamara aka ịchọpụta ihe otu onye dehiere ma ọ bụ ihe ọ na-edenyeghị.

7. Olee ihe gosiri na ọtụtụ ndị depụtara Baịbụl kpachapụrụ anya?

7 Ndị ahụ ji aka depụta Baịbụl sara anya ná mmiri ka ha ghara idehie ihe. Legodị ihe atụ gosiri na ọ bụ ihe ha mere. E nwere Akwụkwọ Nsọ Hibru zuru ezu kacha ochie e ji aka depụta. Aha ya bụ Leningrad Kodeks. E depụtara ya n’afọ 1008 ma ọ bụ n’afọ 1009 Oge Ndị Kraịst. Ma, n’oge na-adịbeghị anya, a hụrụ ụfọdụ akwụkwọ Baịbụl nakwa iberibe akwụkwọ Baịbụl ndị e ji aka depụta. E dere ha ihe dị ka otu puku (1,000) afọ tupu e depụta Leningrad Kodeks. Mmadụ nwere ike iche na otú ahụ e si na-eme, e depụtachaa ya, e depụtagharịa ya ruo ihe karịrị otu puku afọ ga-eme ka ihe e dere na Leningrad Kodeks ahụ dị ezigbo iche n’ihe e dere ná ndị nke ahụ ka ya mee ochie. Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị. Mgbe ndị ọkachamara leruru ndị nke mbụ ahụ na ndị nke ahụ e depụtara mgbe ọtụtụ afọ gara anya, ha chọpụtara na e nwere obere ihe ole na ole dịtụ iche n’otú e si kwuo ha nakwa na ihe Baịbụl na-ekwu agbanweghị.

8. Olee ihe dị iche n’Akwụkwọ Nsọ Grik ndị e ji aka dee na akwụkwọ ndị ọzọ merela ochie e ji aka dee e nwere taa?

8 Ndị Kraịst n’oge ndịozi mere ihe ahụ ndị depụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru mere. Ha kpachapụrụ anya depụta Akwụkwọ Nsọ Grik nwere akwụkwọ iri abụọ na asaa. Ha ji ha na-enwe ọmụmụ ihe ma na-ezi ndị ọzọ ozi ọma. E nwere otu ọkachamara leruru Akwụkwọ Nsọ Grik e depụtara edepụta na akwụkwọ ndị ọzọ e dere n’oge ahụ anya. Mgbe o mechara ya, ọ sịrị: ‘Akwụkwọ Nsọ Grik ndị e ji aka dee e nwere taa dị ọtụtụ karịa akwụkwọ ndị ọzọ e ji aka dee, ha zukwara ezu karịa ha.’ Otu akwụkwọ nke na-akọwa gbasara Agba Ọhụrụ kwuru na obi kwesịrị isi onye na-agụ Akwụkwọ Nsọ Grik e nwere taa ike na ihe e dere na ya bụ otu ihe ahụ e dere n’oge ochie.

9. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 40:8, olee ihe bụ́ eziokwu gbasara ihe dị na Baịbụl?

9 Ruo ọtụtụ narị afọ, ọtụtụ ndị depụtara Baịbụl kpachapụkwara anya na-edepụta ihe ndị dị na ya. Ọ bụ ya mere ka ihe ndị e dere na Baịbụl anyị na-agụ taa bụrụ eziokwu. b O doro anya na ọ bụ Jehova hụrụ na Okwu ya ka dị ruo taa nakwa na ihe ndị e dere na ya bụ eziokwu. (Gụọ Aịzaya 40:8.) Ma, ụfọdụ ndị nwere ike ịna-ekwu na naanị maka na ihe e dere na Baịbụl agbanweghị anaghị egosi na ọ bụ uche Chineke ka e dere na ya. N’ihi ya, ka anyị lebazie anya n’ihe ụfọdụ gosiri na ọ bụ uche Chineke ka e dere na Baịbụl.

Ị GA-ATỤKWASỊLI AMỤMA NDỊ DỊ NA BAỊBỤL OBI

N’aka ekpe: C. Sappa/DeAgostini/Getty Images; right: Image © Homo Cosmicos/Shutterstock

Amụma Baịbụl emezuola, ọ ka na-emezukwa taa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 na nke 11) d

10. Mee ihe atụ amụma Baịbụl buru mezurulanụ nke gosiri na ihe e kwuru na 2 Pita 1:21 bụ eziokwu. (Kọwaa ihe ndị e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

10 E nwere ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl mezurulanụ. Ụfọdụ n’ime ha mezuru ọtụtụ narị afọ e dechara ha. Ihe ndị mere eme gosiri na amụma ndị ahụ mezuru. Ihe a ejughị anyị anya n’ihi na ọ bụ Jehova nwe amụma ndị ahụ e dere na Baịbụl. (Gụọ 2 Pita 1:21.) Chegodị gbasara amụma ndị e buru banyere otú a ga-esi merie Babịlọn oge ochie. N’ihe dị ka n’agbata afọ 778 na afọ 732 Tupu Oge Ndị Kraịst, Aịzaya onye amụma si n’ike mmụọ nsọ buo amụma na a ga-emeri Babịlọn oge ochie bụ́ obodo ukwu. O kwuru na ọ bụ Saịrọs ga-emeri Babịlọn, kwuokwa otú a ga-esi emeri ya. (Aịza. 44:27–45:2) Aịzaya bukwara amụma na a ga-emecha bibie Babịlọn, e nweghịzikwa onye ga-ebi na ya. (Aịza. 13:19, 20) Ọ bụkwa ihe mere. N’afọ 539 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị Midia na ndị Peshia bibiri Babịlọn, e nweghịzikwa onye bi n’ebe ahụ bụ́bu nnukwu obodo.—Lee vidio isiokwu ya bụ Baịbụl Kwuru na Babịlọn Ga-ada. Ọ dị n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, isi nke 3, nọmba nke 5, ma i mepee ya n’ekwentị.

11. Kọwaa otú ihe e kwuru na Daniel 2:41-43 si emezu taa.

11 Ọ bụghị naanị n’oge ochie ka amụma ndị e buru na Baịbụl mezuru. Anyị na-ahụkwa ka ọtụtụ amụma na-emezu taa. Dị ka ihe atụ, chee gbasara amụma dị ịtụnanya Daniel buru gbasara ọchịchị Briten na Amerịka, bụ́ mba abụọ jikọrọ aka na-achị ụwa. (Gụọ Daniel 2:41-43.) Amụma ahụ kwuru na mba abụọ a ga-esi ike ka ígwè n’ebe ụfọdụ, ma ọ ga-adị ka ụrọ n’ebe ụfọdụ, ọ gaghị esi ike. Anyị ahụla na ihe a o kwuru bụkwa eziokwu. Briten na Amerịka siri ike ka ígwè. Ike ha kpara mere ka e merie n’Agha Ụwa Mbụ na nke abụọ. Ha nwekwara ọtụtụ ndị agha na-akpa ike. Ma, ndị ha na-achị mekwara ka ha gharazie isicha ike. Ndị ahụ ha na-achị na-agbalị ịzọta ihe ndị ruuru ha. Ha na-eji ma ngagharị iwe ma òtù ndị ọrụ eme ya. N’oge na-adịbeghị anya, otu ọkachamara n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru, sị: “N’ime obodo niile ọchịchị ha bụ ọchịchị onye kwuo uche ya, e nweghị nke kewara ekewa ka Amerịka.” Briten ha na ha gbakọrọ aka na-achị ụwa kewakwara ekewa n’afọ ndị na-adịbeghị anya n’ihi na obi ndị mmadụ abụghị otu n’ihe gbasara otú ha na mba ndị ọzọ nọ n’Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop ga-esi na-emekọ ihe. Otú a ha si kewaa ekewa na-eme ka o siere Briten na Amerịka ike ime ihe ha kpebiri.

12. Gịnị ka amụma ndị dị na Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na ya?

12 Ọtụtụ amụma Baịbụl ndị mezurulanụ mere ka obi sie anyị ezigbo ike na nkwa ndị Chineke kwere ga-emezu n’ọdịnihu. Obi dị anyị otú ọ dị otu n’ime ndị dere Abụ Ọma. O kpere ekpere sị Jehova: “M na-atụsi anya ike ka ị zọpụta m, n’ihi na ọ bụ okwu gị ka m tụkwasịrị obi.” (Ọma 119:81) Baịbụl kwuru na Jehova ‘chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu nakwa ka anyị nwee olileanya.’ (Jere. 29:11) Ihe mere anyị ji nwee olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu abụghị maka mbọ ndị mmadụ na-agba, kama, ọ bụ n’ihi na Jehova kwere anyị nkwa ya. Ka anyị na-amụsi amụma ndị dị na Baịbụl ike, si otú ahụ na-atụkwasịkwu Okwu Chineke obi.

NDỤMỌDỤ NDỊ DỊ NA BAỊBỤL NA-ENYERE ỌTỤTỤ NDE MMADỤ AKA

13. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 119:66, 138, olee ihe ọzọ gosiri na anyị ga-atụkwasịli Baịbụl obi?

13 Ihe ọzọ gosiri na anyị ga-atụkwasịli Baịbụl obi bụ na ime ihe o kwuru na-abara ndị mmadụ uru. (Gụọ Abụ Ọma 119:66, 138.) Dị ka ihe atụ, ndị di na nwunye chọburu ịgba alụkwaghịm na-ebizi n’udo n’ihi na ha mere ihe Baịbụl kwuru. Obi dịkwa ụmụ ha ụtọ n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst, nne na nna ha hụrụ ha n’anya, na-elekọtakwa ha.—Efe. 5:22-29.

14. Kọọ otu akụkọ gosiri na ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka ndụ mmadụ ka mma.

14 Ụfọdụ ndị omekome agbanweela n’ihi na ha malitere mewe ihe Baịbụl kwuru. Legodị otú ihe Baịbụl kwuru si nyere otu onye mkpọrọ aha ya bụ Jack aka. c Ọ na-eme tigbuo zọgbuo, a makwa ya ama maka na o so ná ndị mkpọrọ a mara ikpe ọnwụ. Ma, otu ụbọchị, Jack so ndị a na-amụrụ Baịbụl mụọ Baịbụl. Otú ụmụnna ndị na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ si dị obiọma metụrụ ya n’ahụ́, ya amalite ịmụ Baịbụl. Ka ọ na-eme ihe Baịbụl kwuru, àgwà ya malitere ịgbanwe na-akakwu mma. Jack mechara ruo eruo ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. E mechakwara mee ya baptizim. O ji obi ya niile na-ezi ndị mkpọrọ ibe ya ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. O nyekwaara ọ dịkarịa ala mmadụ anọ aka ha amụta nke bụ́ eziokwu. Mgbe oge a ga-egbu ya ruru, Jack bụzi ezigbo mmadụ. Otu n’ime ndị ọkàiwu ya sịrị: “Jack a abụghị Jack m ma afọ iri abụọ gara aga. Ihe Ndịàmà Jehova kụziiri ya agbanweela ndụ ya.” Ọ bụ eziokwu na e mechara gbuo Jack, akụkọ ya mere ka o doo anya na anyị ga-atụkwasịli Baịbụl obi, nakwa na ọ na-emeli ka àgwà mmadụ ka mma.—Aịza. 11:6-9.

Ndụmọdụ ndị na Baịbụl emeela ka ndụ ọtụtụ ndị si n’ebe dị iche iche ka mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) e

15. Olee otú ime ihe Baịbụl kwuru si eme ka ndị Jehova dịrị iche taa? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Ndị Jehova dị n’otu n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru. (Jọn 13:35; 1 Kọr. 1:10) Otú anyị si dị n’otu taa pụrụ iche ma e jiri ya tụnyere otú ndọrọ ndọrọ ọchịchị, agbụrụ, na ọkwá ndị mmadụ nọ na ya si kewaa ụwa a. Mgbe otu nwa okorobịa aha ya bụ Jean hụrụ otú ndị Jehova si dịrị n’otu, o juru ya anya. O toro n’otu obodo dị n’Afrịka. Mgbe agha malitere n’ebe ahụ, ọ banyere amị, mechaa gbaga n’obodo ọzọ dị ha nso. N’ebe ahụ, ya na Ndịàmà Jehova matara. Jean sịrị: “M mụtara na ndị nọ n’ezigbo okpukpe anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa na ha na-adị n’otu. Ha hụrụ ibe ha n’anya.” Ọ sịkwara: “M jibu ndụ m niile na-alụrụ otu obodo ọgụ. Ma, mgbe m mụtara eziokwu dị na Baịbụl, m kpebiziri iji ndụ m niile na-ejere Jehova ozi.” Jean gbanwere kpamkpam. Kama ịlụsowe ndị ya na ha na-esighị n’otu ebe ọgụ, ọ na-akụziziri onye ọ bụla ọ hụrụ eziokwu Baịbụl ga-eme ka ndị mmadụ dịrị n’otu. Otú a ihe Baịbụl kwuru si abara ndị si n’ebe dị iche iche ezigbo uru na-egosi na anyị ga-atụkwasịli Okwu Chineke obi.

AKWỤSỊLA ỊTỤKWASỊ OKWU CHINEKE BỤ́ EZIOKWU OBI

16. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji na-atụkwasịkwu Okwu Chineke obi?

16 Ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa a, ọnwụnwa ndị ga-eme ka a mata ma obi ò siri anyị ike na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu ga-abịara anyị. Ndị mmadụ nwere ike ịna-agbalị ime ka anyị nwewe obi abụọ ma ihe Baịbụl kwuru ọ̀ bụkwa eziokwu ma ọ bụ ma Jehova ọ̀ họpụtara ndị ga na-eduzi ndị na-efe ya taa. Ma, ọ bụrụ na obi esie anyị ike na Okwu Chineke bụ eziokwu, anyị ga-enwe ike imeri ihe ọ bụla chọrọ ime ka anyị gharazie inwe okwukwe. Anyị ga-ekpebisi ike ‘ịna-eso ntụziaka Jehova mgbe niile, sogide ya ruo n’isi.’ (Ọma 119:112) “Ihere agaghịkwa eme” anyị ịgwa ndị ọzọ gbasara eziokwu ahụ nakwa ịgba ha ume ka ha na-eme ihe o kwuru. (Ọma 119:46) Anyị ga-enwekwa ike ‘iji ọṅụ na-edi’ ihe isi ike ọ bụla, ma mkpagbu.—Kọl. 1:11; Ọma 119:143, 157.

17. Gịnị ka isiokwu afọ 2023 na-echetara anyị?

17 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova mere ka anyị mata eziokwu dị na Baịbụl. Eziokwu ahụ na-eme ka obi ruo anyị ala, na-eme ka obi sie anyị ike, na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi ebi n’ụwa a ndị mmadụ na-amaghị ihe ha na-eme eme, nke ọgba aghara jukwara. Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya na ihe ga-aka mma mgbe Alaeze Chineke ga na-achị ụwa. Ka isiokwu afọ 2023 nyere anyị aka ka obi sikwuo anyị ike na ihe niile dị n’Okwu Chineke bụ eziokwu.—Ọma 119:160.

ABỤ NKE 94 Anyị Na-ekele Chineke Maka Okwu Ya

a Isiokwu a họọrọ maka afọ 2023 bụ: “Okwu gị niile bụ eziokwu.” (Ọma 119:160) Isiokwu a ga-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. O doro anya na i kwetara ihe ahụ Baịbụl kwuru. Ma, ọtụtụ ndị ekwetaghị na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu nakwa na ndụmọdụ dị na ya na-aba uru. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe atọ anyị nwere ike iji mee ka obi sie ndị chọrọ ịma nke bụ́ eziokwu ike na ha ga-atụkwasịli Baịbụl na ndụmọdụ ya obi.

b Ị chọọ ịmatakwu gbasara otú e si mee ka Baịbụl dịrị ruo taa, gaa na jw.org, n’ebe e dere “Chọọ,” denye “Baịbụl na Akụkọ Ihe Ndị Mere n’Oge Ochie.”

c Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

d NKỌWA FOTO Dị: Jehova buru amụma na a ga-ebibi Babịlọn oge ochie.

e NKỌWA FOTO Dị: Foto e ji gosi ebe nwa okorobịa ji Baịbụl na-amụta otú ya na ndị mmadụ ga-esi na-ebi n’udo, na-akụzikwara ya ndị ọzọ kama ịna-alụso ndị mmadụ ọgụ.