Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 4

ABỤ NKE 18 Anyị Na-ekele Chineke Maka Ihe Mgbapụta

Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Na-akụziri Anyị?

Gịnị Ka Ihe Mgbapụta Na-akụziri Anyị?

“Ọ bụ otú a ka e si mee ka anyị mata na Chineke hụrụ anyị n’anya.”​—1 JỌN 4:9.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ihe mgbapụta na-akụziri anyị gbasara àgwà ọma ndị Jehova Chineke na Jizọs Kraịst nwere.

1. Olee uru ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs a na-eme kwa afọ ga-abara anyị?

 O DORO anya na i kwetara na ihe mgbapụta bụ onyinye pụrụ ezigbo iche Chineke nyere anyị. (2 Kọr. 9:15) Gị na Jehova Chineke nwere ike ịbụ ezigbo enyi n’ihi na Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ àjà. I nwekwara ike inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, anyị kwesịrị igosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ nakwa maka Jehova, onye nyere anyị ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (Rom 5:8) Iji nyere anyị aka ka obi na-adị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ nakwa ka anyị ghara iwere ya ka ihe na-enweghị oké uru ọ bara, Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya a ga na-eme kwa afọ.​—Luk 22:19, 20.

2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 A ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na Satọdee, abalị iri na abụọ n’ọnwa Eprel, n’afọ 2025. O doro anya na anyị niile na-ejikere ịga ya. Ọ ga-abara anyị ezigbo uru ma anyị wepụta oge n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs chebara ihe Jehova na Ọkpara ya meere anyị echiche. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ihe mgbapụta na-akụziri anyị gbasara Jehova na Ọkpara ya. Isiokwu na-eso nke a ga-enyere anyị aka ịghọta otú ihe mgbapụta ga-esi baara anyị uru nakwa otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ya.

IHE IHE MGBAPỤTA NA-AKỤZIRI ANYỊ GBASARA JEHOVA

3. Olee otú ọnwụ otu onye ga-esi anapụta ọtụtụ nde mmadụ? (Kọwaakwa foto.)

3 Ihe mgbapụta na-akụziri anyị na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diut. 32:4) Olee otú ọ bụ? Chegodị echiche: Adam nupụụrụ Chineke isi. Anyị si n’aka ya keta mmehie nke mere ka anyị na-anwụ anwụ. (Rom 5:12) Jehova mere ndokwa ka Jizọs jiri ndụ ya chụọ àjà iji napụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Ma, olee otú àjà otu onye zuru okè chụrụ ga-esi agbapụta ọtụtụ nde mmadụ? Pọl onyeozi kọwara ya. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na nnupụisi otu onye [bụ́ Adam] mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị mmehie, otú ahụkwa ka nrubeisi otu onye [bụ́ Jizọs] ga-esi eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ezi omume.” (Rom 5:19; 1 Tim. 2:6) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ otu onye zuru okè nupụụrụ Chineke isi nke mere ka mmadụ niile bụrụ ndị mmehie ma na-anwụ anwụ. N’ihi ya, ọ bụkwa otu onye zuru okè rubeere Chineke isi ga-anapụta ha.

Otu onye mere ka anyị bụrụ ohu mmehie na ọnwụ. Ọ dabakwara adaba otu onye ịnapụta anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


4. Gịnị mere na Jehova ahapụghị ụmụ Adam rubeere ya isi ka ha dịrị ndụ ebighị ebi?

4 Ọ̀ dị mkpa ka Jizọs nwụọ iji gbapụta anyị? Ọ́ gaaraghị aka mma ka Jehova kpebie ịhapụ ụmụ Adam na Iv rubeere ya isi ka ha dịrị ndụ ebighị ebi? N’anya ụmụ mmadụ na-ezughị okè, o yiri ihe dị mma ime. Mana, Jehova mee otú ahụ, ọ gaghị egosi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. Ebe ọ bụ na Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ gaghị agbachi nkịtị maka isi ahụ Adam kpachaara anya nupụrụ ya.

5. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Jehova ga-eme ihe ziri ezi mgbe niile?

5 Ma, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na Jehova ekpeghị ikpe ziri ezi mee ka e nwee ihe mgbapụta, ya ahapụ ụmụ Adam na Iv na-ezughị okè ka ha dị ndụ ebighị ebi? Ndị mmadụ nwere ike ichewe na o nwekwara ike ịhapụ ikpe ikpe ziri ezi n’ihe ndị ọzọ. O nwekwara ike ịna-eme ha obi abụọ ma ọ̀ ga-emezukwa nkwa ndị ọzọ o kwere. Ma anyị ekwesịghị ichewe na ụdị ihe ahụ ga-eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova kpere ikpe ziri ezi, ọ bụ eziokwu na o furu ya nnukwu ihe, ya bụ, Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya o ji chụọ àjà. Ihe a na-emesi anyị obi ike na ọ ga-eme ihe ziri ezi mgbe niile.

6. Olee otu ụzọ ihe mgbapụta si egosi otú Jehova hụruru anyị n’anya? (1 Jọn 4:9, 10)

6 Ọ bụ eziokwu na ihe mgbapụta na-enyere anyị aka ịghọta na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, ma ọ kacha enyere anyị aka ịghọta otú ọ hụruru anyị n’anya. (Jọn 3:16; gụọ 1 Jọn 4:9, 10.) Jehova zitere Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi na ọ chọrọ ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi nakwa ka anyị soro n’ezinụlọ ya. Chegodị echiche: Mgbe Adam mehiere, Jehova mere ka ọ gharazie iso n’ezinụlọ ya. Ihe a mere na o nweghị onye n’ime anyị so n’ezinụlọ Jehova mgbe a mụrụ ya. Ma, n’ihi ihe mgbapụta ahụ, Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị. Ọ ga-emecha kpọbata mmadụ niile nwere okwukwe ma na-erubere ya isi n’ezinụlọ ya. Ugbu a, anyị na Jehova nwere ike ịdị ná mma, anyị na ndị ọzọ na-efe ya adịrịkwa ná mma. N’eziokwu, Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.​—Rom 5:10, 11.

7. Olee otú ahụhụ Jizọs tara si egosi anyị otú Jehova hụruru anyị n’anya?

7 Anyị ga-aghọtakwu otú Jehova hụruru anyị n’anya ma anyị chee gbasara ihe ihe mgbapụta furu ya. Ekwensu kwuru na e nweghị onye na-efe Jehova ga na-erubere ya isi ma o siere ya ike ime otú ahụ. Iji gosi na ihe ahụ Ekwensu kwuru bụ ụgha, Jehova kwere ka Ọkpara ya taa ahụhụ tupu ya anwụọ. (Job 2:1-5; 1 Pita 2:21) Ka Jehova nọ n’eluigwe na-ele anya, ọ hụrụ ka ndị ndú okpukpe na-emegide Jizọs na-akwa ya emo, ndị agha ana-apịa ya ihe, a kpọgidekwa ya n’osisi. Jehova nọkwa na-ele ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya tagidere ahụhụ nwụọ. (Mat. 27:28-31, 39) Jehova ga-akwụsịli ahụhụ ahụ Jizọs na-ata. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị na-emegide Jizọs sịrị ka Chineke “napụta ya ugbu a ma ọ bụrụ na ihe ya masịrị ya,” Jehova gaara eme nnọọ otú ahụ. (Mat. 27:42, 43) Ma, a sị na Jehova mere ka Jizọs ghara ịta ahụhụ, a gaaraghị akwụ ihe mgbapụta, anyị agakwaaraghị enwe olileanya. N’ihi ya, Jehova kwere ka Ọkpara ya taa ahụhụ ruo mgbe o kubiri ume.

8. Ò wutere Jehova mgbe ọ hụrụ ka Ọkpara ya na-ata ahụhụ? Kọwaa. (Kọwaakwa foto.)

8 Anyị ekwesịghị iche na ebe ọ bụ na Jehova pụrụ ime ihe niile, ihe anaghị emetụ ya n’ahụ́. E kere anyị n’oyiyi ya. Ihe na-emetụ anyị n’ahụ́. N’ihi ya, ọ pụtara na ihe na-emetụkwa Jehova n’ahụ́. Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ndị Izrel ‘kpasuru ya iwe, meekwa ihe wutere ya.’ (Ọma 78:40, 41) Cheekwa gbasara akụkọ Ebreham na Aịzik. Ị ga-echeta na Chineke nyere Ebreham iwu ka o jiri nwa ọ mụrụ naanị ya chụọrọ ya àjà. (Jen. 22:9-12; Hib. 11:17-19) Chegodị otú obi dị Ebreham mgbe o jikeere igbu nwa ya. Chezienụ otú ọ ga-esi aka ewute Jehova mgbe ọ na-ele ka ndị mmadụ na-echi Ọkpara ya ọnụ n’ala ruo mgbe ọ nwụrụ.​—Gaa na jw.org lee vidio aha ya bụ Ṅomie Okwukwe Ha​—Ebreham, Agba nke Abụọ.

O wutere Jehova ịhụ ka Ọkpara ya na-ata ahụhụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


9. Gịnị ka Ndị Rom 8:32, 38, 39 na-enyere anyị aka ịmata gbasara otú Jehova si hụ gị na ndị gị na ha na-efe ya n’anya?

9 Ihe mgbapụta na-akụzikwara anyị na e nweghị onye ọzọ hụrụ anyị n’anya ka Jehova, ma ndị ezinụlọ anyị na-anaghị eji anyị egwu egwu ma ezigbo enyi anyị. (Gụọ Ndị Rom 8:32, 38, 39.) Obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova hụrụ anyị n’anya karịa otú anyị hụrụ onwe anyị. Ị̀ chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi? Jehova chọsiri ike ka ị dịrị ndụ ebighị ebi karịa otú ị chọrọ. Ị̀ chọrọ ka ọ gbaghara gị mmehie gị? Jehova chọrọ ịgbaghara gị mmehie gị karịa otú ị chọrọ. Naanị ihe ọ chọrọ bụ ka anyị nwee okwukwe na ya ma na-erubere ya isi iji gosi na anyị nabatara onyinye o nyere anyị. Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye pụrụ iche na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. N’ụwa ọhụrụ, anyị ga-amụtakwu gbasara otú Jehova si hụ anyị n’anya.​—Ekli. 3:11.

IHE IHE MGBAPỤTA NA-AKỤZIRI ANYỊ GBASARA JIZỌS

10. (a) Olee ihe kacha wute Jizọs gbasara ọnwụ ya? (b) Olee ụzọ ndị Jizọs si gosi na Jehova bụ onye eziokwu? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Àjà Jizọs Chụrụ Gosiri na Jehova Bụ Onye Eziokwu.”)

10 Otú ndị mmadụ si ele Jehova anya dị Jizọs ezigbo mkpa. (Jọn 14:31) O wutere Jizọs na e boro ya ebubo na ọ na-ekwulu aha Chineke nakwa na ọ bụ onye omekome n’ihi na o nwere ike ime ka a katọọ aha Nna ya. Ọ bụ ya mere o ji kpee ekpere, sị: “Nna m, ọ bụrụ na o kwe mee, ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a.” (Mat. 26:39) Ebe ọ bụ na Jizọs rubeere Jehova isi ruo ọnwụ, o gosiri na ihe Ekwensu kwuru gbasara Nna ya abụghị eziokwu.

11. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu? (Jọn 13:1)

11 Ihe mgbapụta ahụ na-akụzikwara anyị na Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu, karịchaa, ndị na-eso ụzọ ya. (Ilu 8:31; gụọ Jọn 13:1.) Dị ka ihe atụ, Jizọs ma na ụfọdụ ihe ndị ọ ga-eme n’ụwa ga-ata ezigbo akpụ, nke ka nke, ahụhụ ọ ga-ata tupu ya anwụọ. N’agbanyeghị ya, ọ rụghị ọrụ ndị ọ rụrụ n’ụwa iji mezuo iwu. Kama, o ji obi ya niile kwusaara ndị mmadụ ozi ọma, kụziere ha ihe, nyekwara ha aka n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o wepụtara oge saa ụkwụ ndịozi ya ma gwa ha okwu ndị ga-agba ha ume ma kasie ha obi. (Jọn 13:12-15) Mgbe ọ nọkwa n’osisi ịta ahụhụ, o wepụtara oge gwa otu onye omekome nọ n’ọnụ ọnwụ ihe ga-eme ka o nwee olileanya, haziekwa otú a ga-esi lekọta mama ya. (Luk 23:42, 43; Jọn 19:26, 27) Ọ bụghị naanị na Jizọs nwụrụ n’ihi ndị mmadụ, ihe niile o mere n’ụwa gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya.

12. Olee otú Jizọs si enyere anyị aka ugbu a?

12 Ọ bụ eziokwu na Jizọs nwụrụ “naanị otu ugboro,” ma ọ ka na-emekwa ọtụtụ ihe iji nyere anyị aka. (Rom 6:10) Olee ihe ndị ọ na-eme? Ọ na-arụsi ọrụ ike ugbu a imere anyị ihe ọma ndị kwere omume n’ihi àjà ahụ ọ chụrụ. Chegodị gbasara ihe ndị ọ na-eme ugbu a. Ọ bụ Eze anyị, bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà anyị, nakwa onyeisi ọgbakọ. (1 Kọr. 15:25; Efe. 5:23; Hib. 2:17) Ọ bụkwa ya na-ahụ na a chịkọtara ndị e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ, nke bụ́ ọrụ a ga-arụcha tupu oké mkpagbu akwụsị. a (Mat. 25:32; Mak 13:27) Ọ na-ahụkwa na e ji Okwu Chineke na-enyeju ndị ji obi ha niile na-efe Chineke afọ n’oge ikpeazụ a. (Mat. 24:45) N’otu puku afọ ahụ ọ ga-achị, ọ ga-emekwara anyị ọtụtụ ihe ọma. N’eziokwu, Jehova nyere anyị Ọkpara ya.

AKWỤSỊLA ỊMỤTA IHE ỌHỤRỤ

13. Olee otú ichebara ihe anyị na-amụ echiche ga-esi nyere anyị aka ịmụtakwu otú Jehova na Jizọs si hụ anyị n’anya?

13 I nwere ike ịna-amụ gbasara otú Jehova Chineke na Jizọs Kraịst si hụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na ị na-echebara ihe ndị ha mere echiche. N’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs, i nwere ike ịgụ otu ma ọ bụ karịa n’ime akwụkwọ Baịbụl ndị kọrọ akụkọ ndụ Jizọs. Mkpa gị abụkwala ịgụcha ọtụtụ ebe n’otu oge. Kama, jiri nwayọọ na-agụ ya ka i nwee ike ịchọpụta ihe ndị ọzọ mere anyị kwesịrị iji hụ Jehova na Jizọs n’anya. Gwakwa ndị ọzọ gbasara ihe ndị ị mụtara.

14. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 119:97 nakwa ihe e dere n’ala ala peeji ya, olee otú ime nchọnchọ ga-esi enyere anyị aka ịna-amụtakwu gbasara ihe mgbapụta nakwa ihe ndị ọzọ? (Kọwaakwa foto.)

14 Ọ bụrụ na ị nọọla n’ọgbakọ ọtụtụ afọ, i nwere ike ịna-eche ma ị̀ ga-amụtali ihe ọhụrụ gbasara otú Jehova si ekpe ikpe ziri ezi, ịhụnanya ya, na ihe mgbapụta. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ga na-amụta ihe ọhụrụ gbasara ihe ndị a na ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, gịnị ka i nwere ike ime? Mụọ ihe ndị akwụkwọ anyị kwuru gbasara ha. Ị gụwa Baịbụl gụta ebe ị na-aghọtachaghị, mee nchọnchọ. N’ụbọchị ahụ niile kwa, na-eche banyere ihe ndị ị mụtara na ihe ọ na-akụziri gị gbasara Jehova, Ọkpara ya, nakwa otú ha si hụ anyị n’anya.​—Gụọ Abụ Ọma 119:97 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.

Ọ bụrụgodị na anyị anọọla n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, anyị ka nwere ike ịmụtakwu gbasara ihe mgbapụta ma na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)


15. Gịnị mere ike ekwesịghị ịgwụ anyị ịna-achọ akụ̀ ndị dị n’Okwu Chineke?

15 Ike agwụkwala gị ma ọ bụrụ na ị chọpụtaghị ihe ọhụrụ ma ọ bụ ihe tụrụ gị n’anya mgbe ọ bụla ị na-agụ Baịbụl ma ọ bụ na-eme nchọnchọ. E nwere ike ikwu na ị dị ka onye na-achọ ọlaedo. Ndị na-achọ ọlaedo na-enwe ndidi chọọ ya ọtụtụ awa ma ọ bụ ọtụtụ ụbọchị tupu ha ahụ ya. N’agbanyeghị ya, ike anaghị agwụ ha n’ihi na ha ma na ntakịrị ọlaedo ọ bụla ha chọtara bara uru. Eziokwu dị na Baịbụl bara uru karịa ọlaedo. (Ọma 119:127; Ilu 8:10) N’ihi ya, na-enwe ndidi, gbalịakwa na-agụ Baịbụl otú ị haziri isi agụ ya.​—Ọma 1:2.

16. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova na Jizọs?

16 Ka ị na-amụ ihe, chọpụta ụzọ ndị ị ga-esi na-eme ihe ị na-amụta. Dị ka ihe atụ, na-ekpe ikpe ziri ezi ka Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu. Jizọs hụrụ Nna ya na ndị ọzọ n’anya. I nwere ike ime ka ya ma ọ bụrụ na ị dịrị njikere ịta ahụhụ n’ihi Jehova nakwa ma ị na-ewepụta onwe gị enyere ụmụnna gị aka. Ihe ọzọ bụ na ị ga na-emekwa ka Jizọs ma ị na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma ka ha nwee ohere irite uru n’onyinye pụrụ iche Chineke nyere.

17. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a?

17 Ọ bụrụ na anyị ana-aghọtakwu gbasara ihe mgbapụta ahụ ma na-ejikwu ya akpọrọ ihe, ọ ga-eme ka anyị na-ahụkwu Jehova na Ọkpara ya n’anya. Ọ ga-emekwa ka hanwa hụkwuo anyị n’anya. (Jọn 14:21; Jems 4:8) N’ihi ya, ka anyị jiri ihe niile Jehova na-enye anyị na-amụ gbasara ihe mgbapụta. Isiokwu na-eso nke a ga-ekwu ụzọ ụfọdụ ihe mgbapụta ga-esi abara anyị uru nakwa otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si hụ anyị n’anya.

ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke

a ‘Ịchịkọta ihe niile dị n’eluigwe’ Pọl kwuru okwu ya ná Ndị Efesọs 1:10 dị iche ‘n’ịchịkọta ndị a họọrọ’ Jizọs kwuru okwu ya na Matiu 24:31 na Mak 13:27. Pọl na-ekwu gbasara oge Jehova na-ahọrọ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe ma jiri mmụọ nsọ tee ha mmanụ. Jizọs na-ekwukwanụ gbasara oge a ga-achịkọta ndị e tere mmanụ fọrọ n’ụwa gaa n’eluigwe n’oge oké mkpagbu.