Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE I NWERE IKE ỊMỤ

Ise Ihe Nwere Ike Inyere Gị Aka Icheta Ihe Ị Mụrụ

Ise Ihe Nwere Ike Inyere Gị Aka Icheta Ihe Ị Mụrụ

O nwere ike isiri gị ike icheta ihe ị mụrụ. Ọ na-esikwara ọtụtụ n’ime anyị. Mana, ị̀ chọpụtala na ọ na-adị mfe icheta ihe atụ ndị Jizọs mere? Ị ga-ejili uche gị hụ ihe ndị ọ kụziri, nke ga-enyere gị aka ịna-echeta ha. I nwekwara ike ime ihe yiri ya ma ị mụwa ihe. Ị ga-aka echeta ihe ị mụrụ ma ị gbalịa jiri uche gị na-ahụ ihe ị na-agụ. Olee otú i nwere ike isi eme ya? Ọ bụ ise ihe ndị ị mụtara ese.

Ndị na-ese ihe ọhụrụ ha mụtara na-echetakarị ya. Ha achọpụtala na ọ na-enyere ha aka icheta ma okwu ma ihe ndị bụ́ isi n’ihe ha mụrụ. Ihe ha na-ese anaghị amagbu onwe ya, kama ọ na-adị mfe. Ise ihe na-akacha enyere ndị agadi aka icheta ihe ha na-amụ.

Ị mụwa ihe n’oge ọzọ, i nwere ike ịgbalị see ihe ụfọdụ ị mụtara. Ihe ole ọ ga-enyere gị aka icheta nwere ike iju gị anya.