Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 3

ABỤ NKE 35 “Na-achọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

Na-eme Mkpebi Ga-eme Jehova Obi Ụtọ

Na-eme Mkpebi Ga-eme Jehova Obi Ụtọ

“Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova, ihe na-egosikwa na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.”​—ILU 9:10.

IHE A GA-AMỤ

Otú ịmata ihe anyị kwesịrị ịmata, ịghọta ihe, na iche echiche nke ọma ga-esi enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi.

1. Olee ihe siri ike anyị niile ga-emerịrị?

 ANYỊ na-eme mkpebi kwa ụbọchị. Ụfọdụ na-adị mfe, dị ka ihe anyị ga-eri n’ụtụtụ ma ọ bụ oge anyị ga-eji alakpu. E nwere ndị nke na-esi ike ikpebi. Ha nwere ike ịbụ ihe ndị gbasara ahụ́ ike anyị, obi ụtọ anyị, ndị anyị hụrụ n’anya, ma ọ bụkwanụ ofufe anyị na-efe Chineke. Anyị chọrọ ka mkpebi ndị anyị na-eme baara anyị na ndị ezinụlọ anyị uru. Nke kacha mkpa bụ na anyị chọrọ ime mkpebi ga-eme Jehova obi ụtọ.​—Rom 12:1, 2.

2. Olee ihe ndị anyị ga-eme ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma?

2 Ị ga-enwe ike ime mkpebi dị mma ma ọ bụrụ na (1) ị mata ihe niile i kwesịrị ịmata, (2) ị chọpụta ihe bụ́ uche Jehova gbasara ihe ahụ, na (3) i chebara ihe ndị i nwere ike ime echiche nke ọma. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịchọpụta otú anyị ga-esi na-echebara ihe echiche nke ọma.​—Ilu 2:11.

MATA IHE NIILE I KWESỊRỊ ỊMATA

3. Nye ihe atụ ihe mere o ji dị mkpa ka ị mata ihe niile i kwesịrị ịmata tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme.

3 Anyị chọọ ime ezigbo mkpebi, ihe mbụ anyị ga-eme bụ ịmata ihe niile anyị kwesịrị ịmata banyere ihe ahụ. Gịnị mere o ji dị mkpa? Weregodị ya na onye ọrịa gakwuuru dọkịta ka ọ gwọọ ya ezigbo ọrịa na-enye ya nsogbu. Dọkịta ahụ ọ̀ ga-ekpebi otú ọ ga-esi agwọ onye ọrịa ahụ n’ebughị ụzọ lee ya ahụ́ ma ọ bụ jụọ ya ajụjụ ụfọdụ? Ọ gaghị eme otú ahụ. Gịnwakwa ga-eme mkpebi dị mma ma i buru ụzọ mata ihe i kwesịrị ịmata gbasara ihe ị chọrọ ikpebi. Olee otú ị ga-esi eme ya?

4. Dị ka e kwuru n’Ilu 18:13, olee otú ị ga-esi mata ihe niile i kwesịrị ịmata banyere ihe ị chọrọ ikpebi? (Kọwaakwa foto.)

4 Ọtụtụ mgbe, otú ị ga-esi amata ihe ndị i kwesịrị ịmata bụ ịjụ ajụjụ. Ka e were ya na a kpọrọ gị òkù ka ị bịa oriri. Ì kwesịrị ịga? Ọ bụrụ na ị machaghị onye kpọrọ oriri ahụ ma ọ bụ otú o si hazie ya, i kwesịrị ịjụ ya ajụjụ ndị dị ka: “Olee ebe a ga-enwe oriri ahụ? Oleekwa mgbe a ga-enwe ya? Mmadụ ole ga-abịa ya? Ònye ga-ahụ maka ihe ndị a ga-eme na ya? Olee ụdị ndị ga-abịa ya? Olee ihe ndị a ga-eme n’ebe ahụ? À ga-enye ndị bịaranụ mmanya na-aba n’anya?” Azịza ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka ime ezigbo mkpebi.​—Gụọ Ilu 18:13.

Jụọ ajụjụ ka ị mata ihe ndị i kwesịrị ịmata (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4) a


5. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ị matachaa ihe ndị i kwesịrị ịmata banyere ihe ị chọrọ ikpebi?

5 Ị chọpụtachaa ihe niile i kwesịrị ịchọpụta, chebaziere ihe niile banyere ihe ahụ echiche. Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ị chọpụta na ndị na-ejighị iwu Baịbụl kpọrọ ihe ga-abịa oriri ahụ ma ọ bụkwanụ na mmanya na-aba n’anya ga-abụ atụrụ tawa? È nweela ihe ị hụrụ gosiri na oriri ahụ nwere ike ịghọ oriri oké mkpọtụ? (1 Pita 4:3) Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na oge a ga-enwe oriri ahụ dabara n’oge ị ga-eji aga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma? Ọ bụrụ na i chebara ihe niile banyere ya echiche, ọ ga-adịrị gị mfe ime ezigbo mkpebi. Ma, e nwere ihe ọzọ i kwesịrị ime tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme. Ugbu a, ị chọpụtala otú gịnwa si lee ya anya. Mana, olee otú Jehova si ele ya anya?​—Ilu 2:6.

CHỌPỤTA IHE JEHOVA CHERE

6. Dị ka e kwuru na Jems 1:5, gịnị mere anyị ji kwesị ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka?

6 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịghọta ihe o chere banyere ihe ahụ. Jehova kwere anyị nkwa na ọ ga-enye anyị amamihe anyị ga-eji achọpụta ma ihe anyị chọrọ ime ọ̀ ga-adị ya mma. Ọ na-enye “mmadụ niile” ụdị amamihe ahụ n’ewesaghị ha iwe.​—Gụọ Jems 1:5.

7. Olee otú ị ga-esi mata ihe Jehova chere banyere mkpebi ị chọrọ ime? Mee ihe atụ.

7 I kpechaa ekpere ka Jehova duzie gị, leruo anya ala ka ị chọpụta otú ọ ga-esi aza ekpere gị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere ebe ị na-aga, gị efuo ụzọ, i nwere ike ịjụ onye bi ebe ahụ ụzọ i kwesịrị isi. Mana, ihe ị ga-eme ọ̀ bụ ịgawa tupu onye ahụ egosi gị ụzọ ị ga-esi? Mbanụ. Ị ga-ege ntị nke ọma ka ọ na-atụrụ gị aka ụzọ ị ga-esi. Otú ahụ ka ọ dị ma ị rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. I kwesịrị ịgbalị chọpụta otú o si za gị ekpere ahụ. O nwere ike ịbụ ịchọta amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka n’ihe ị chọrọ ikpebi. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-aga oriri ahụ anyị kwuburu okwu ya, i nwere ike ileba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere oriri oké mkpọtụ, mkpakọrịta ọjọọ, na iwere ihe gbasara Alaeze Chineke ka ihe dị mkpa karịa ime ihe ị chọrọ.​—Mat. 6:33; Rom 13:13; 1 Kọr. 15:33.

8. Gịnị ka ị ga-eme ma ị chọọ ka e nyere gị aka ịchọta ihe ị ga-eji eme mkpebi? (Kọwaakwa foto.)

8 Ma, mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka e nyere gị aka ịchọta ihe ga-abara gị uru. I nwere ike ịjụ nwanna ma nke a na-akọ. Mana, ọ ga-abakwara gị uru ma i jiri aka gị mee nchọnchọ. E nwere ọtụtụ ihe ga-enyere gị aka dị n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ ihe, dị ka akwụkwọ bụ́ Amaokwu Baịbụl Ndị Na-enyere Anyị Aka Ife Jehova na Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ. Cheta na ihe bụ́ mkpa gị bụ ime mkpebi ga-eme Jehova obi ụtọ.

Chee otú Jehova si ele ihe ahụ anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) b


9. Gịnị ka anyị ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe anyị kpebiri ga-eme Jehova obi ụtọ? (Ndị Efesọs 5:17)

9 Gịnị ka anyị ga-eme ka obi sie anyị ike na ihe anyị kpebiri ga-eme Jehova obi ụtọ? Nke mbụ, anyị kwesịrị ịmata Jehova nke ọma. Baịbụl sịrị na ‘ihe na-egosi na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.’ (Ilu 9:10) N’eziokwu, ihe ga-eme ka anyị na-aghọta ihe nke ọma bụ ịmata àgwà Jehova, nzube ya, ihe ndị na-adị ya mma, na ihe ndị ọ kpọrọ asị. Jụọ onwe gị, sị, ‘N’ihi ihe m ma gbasara Jehova, olee ihe m ga-ekpebi ga-adị ya mma?’​—Gụọ Ndị Efesọs 5:17.

10. Olee ihe mere ihe Baịbụl kwuru ji dị mkpa karịa ndị ezinụlọ anyị na otú e si eme ihe n’obodo anyị?

10 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, anyị ga-eme ihe na-agaghị amasị ndị anyị na ha dị ná mma mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nne na nna na-echere ụmụ ha echiche ọma nwere ike isi ọnwụ na nwa ha nwaanyị ga-alụ nwoke ji ezigbo ego ma ọ bụ onye ga-ebutere ha elu na ala ma ọ bịa ịlụ nwa ha, n’agbanyeghị na ụkwụ esighị ya ike n’ọgbakọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ha chọrọ ka a na-elekọta nwa ha nke ọma, na-egboro ya mkpa ya. Ma, ònyekwanụ ga-enyere ya aka ka ya na Jehova na-adị ná mma? Olee otú Jehova si ele okwu ahụ anya? Anyị ga-ahụ azịza ya na Matiu 6:33. N’ebe ahụ, a gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.’ Ọ bụ eziokwu na anyị na-asọpụrụ nne na nna anyị ma na-akwanyere ndị bi n’obodo anyị ùgwù, ihe bụ́ mkpa anyị bụ ime Jehova obi ụtọ.

CHEBARA IHE NDỊ Ị GA-EME ECHICHE NKE ỌMA

11. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 5:14, gịnị ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme?

11 Ị matachaa ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ahụ ị chọrọ ikpebi, i kwesịrị ichebara ihe nke ọ bụla ị ga-eme echiche nke ọma. (Gụọ Ndị Hibru 5:14.) Ichebara ihe echiche nke ọma ga-enyere gị aka ịchọpụta uru na ọghọm dị n’ihe nke ọ bụla ị ga-ekpebi. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdịrị gị mfe ikpebi ihe ị ga-eme. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga-adịrị gị mfe. Ichebara ihe echiche nke ọma ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma, ma n’ihe ndị siri ike.

12-13. Olee otú ichebara ihe echiche nke ọma ga-esi enyere gị aka ime mkpebi dị mma gbasara ọrụ ị ga-arụ?

12 Weregodị ya na ị na-achọ ọrụ ị ga-eji na-elekọta ezinụlọ gị. E nwere ọrụ abụọ pụtaranụ. Ị matala ihe niile gbasara ha, ụdị ọrụ ha bụ, oge ị ga-eji arụ ha, oge ị ga-eji na-aga ma na-alọta, na ihe ndị ọzọ. Baịbụl ekwughịkwa na ọrụ ndị ahụ dị njọ. Ma, o nwere ike ịbụ na otu masịrị gị n’ihi ụdị ọrụ ọ bụ ma ọ bụkwanụ na ego a ga-akwụ na ya ka. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ i kwesịrị ichebara echiche tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme.

13 Dị ka ihe atụ, è nwere nke ọ bụla n’ime ha abụọ ga-egbochi gị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya? È nwere nke ga-eme ka ị ghara ịna-enwecha oge ị ga-eji na-elebara ezinụlọ gị anya, na-enyekwara ha aka ka ha na Jehova na-adị ná mma? Ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a ga-enyere gị aka iwere ife Jehova na mkpa ezinụlọ gị ka ihe dị mkpa karịa ego ole a ga-akwụ gị. Ihe a ga-enyere gị aka ikpebi ihe Jehova ga-agọzi.

14. Olee otú ichebara ihe echiche nke ọma na ịhụ ndị mmadụ n’anya ga-esi eme ka anyị ghara ime ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ?

14 Ichebara ihe echiche nke ọma na-enyekwara anyị aka iche otú ihe anyị kpebiri ga-esi agbasa ndị ọzọ ka anyị ghara ime ka ha “zọhie ụkwụ.” (Fil. 1:10) Ihe a dị ezigbo mkpa mgbe anyị na-ekpebi ihe gbasara ụdị uwe anyị ga-eyi na otú anyị chọrọ ịna-adị. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na e nwere ụdị uwe na-amasị gị ma ọ bụ otú ị chọrọ ịna-adị. Ma, ọ bụrụkwanụ na o nwere ike ịkpasu ndị nọ n’ọgbakọ ma ọ bụkwanụ ndị na-anọghị n’ọgbakọ iwe? Ichebara ihe echiche nke ọma ga-enyere gị aka ime ihe na-agaghị ewute ha. Otú i si hụ ha n’anya ga-eme ka ị na-achọ ihe ga-abara “onye ọzọ uru,” na-emerukwa ihe n’ókè. (1 Kọr. 10:23, 24, 32; 1 Tim. 2:9, 10) Ihe a ga-eme ka anyị mee mkpebi na-egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù.

15. Olee ihe i kwesịrị ichebara echiche tupu gị emee mkpebi dị ezigbo mkpa?

15 Ọ bụrụ na e nwere ihe dị ezigbo mkpa ị chọrọ ikpebi, chee gbasara ihe ọ ga-efu iji mee ya. Jizọs kụziiri anyị ka anyị “gbakọọ ihe ọ ga-efu.” (Luk 14:28) N’ihi ya, chee banyere oge ọ ga-ewe gị, ego ọ ga-efu gị, nakwa ụdị mbọ ị ga-agba iji hụ na i mere ihe ahụ i kpebiri. Mgbe ụfọdụ, gị na ndị ezinụlọ gị nwere ike ikwurịta gbasara ihe onye nke ọ bụla n’ime ha kwesịrị ime iji kwado ihe ahụ ị chọrọ ikpebi. Gịnị mere o ji dị mkpa isi otú a ekpebi ihe? O nwere ike ime ka ị chọpụta na i kwesịrị ịgbanwetụ ihe ụfọdụ gbasara ihe ahụ ị chọrọ ikpebi ma ọ bụkwanụ na e nwere ihe ọzọ ka ya mma ị ga-eme. Ọ bụrụkwa na ị jụọ ndị ezinụlọ gị ihe ha chere gbasara ya ma gee ha ntị, ọ ga-eme ka ha nyere gị aka ime ihe ahụ i kpebiri.​—Ilu 15:22.

MEE MKPEBI GA-AGA NKE ỌMA

16. Olee ihe ndị ị ga-eme ka i nwee ike ime mkpebi dị mma? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Otú Ị Ga-esi Eme Ezigbo Mkpebi.”)

16 Ọ bụrụ na i mee ihe ndị anyị kwuru n’isiokwu a, ọ ga-enyere gị aka ime mkpebi dị mma. Ị matala ihe ndị i kwesịrị ịmata, chebakwara ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ime mkpebi ga-amasị Jehova echiche. Ugbu a, i nweziri ike ịrịọ Jehova ka o mee ka ihe ahụ i kpebiri gaa nke ọma.

17. Gịnị bụ ihe kacha mkpa ga-eme ka i mee ezigbo mkpebi?

17 Ọ bụrụgodị na e nweela ọtụtụ mkpebi i mere gara nke ọma n’oge gara aga, cheta na ihe ga-eme ka i mee ezigbo mkpebi abụghị ịtụkwasị onwe gị obi, kama ọ bụ ịtụkwasị Jehova obi ka o nye gị amamihe ya. Ọ bụ naanị ya ga-eme ka ị mata ihe i kwesịrị ịma, na-aghọta ihe nke ọma, na-echebakwara ihe echiche nke ọma. Ihe ndị a ga-eme ka i nwee amamihe. (Ilu 2:1-5) Jehova ga-enyere gị aka ime mkpebi ga-atọ ya ụtọ.​—Ọma 23:2, 3.

ABỤ NKE 28 Ịbụ Enyi Jehova

a NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-eto eto na-ekwurịta ozi e ziteere ha n’ekwentị gbasara oriri.

b NKỌWA FOTO: Otu n’ime ụmụnna ndị ahụ na-eme nchọnchọ tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-aga oriri ahụ ka ọ̀ bụ na ọ gaghị aga.