Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 2

ABỤ NKE 132 Anyị Bụzi Di na Nwunye

Otú Ndị Di Ga-esi Na-akwanyere Nwunye Ha Ùgwù

Otú Ndị Di Ga-esi Na-akwanyere Nwunye Ha Ùgwù

“Ndị di, . . . na-akwanyerenụ ha ùgwù.”​—1 PITA 3:7.

IHE A GA-AMỤ

Otú di ga-esi si n’omume ya na n’okwu ọnụ ya na-akwanyere nwunye ya ùgwù.

1. Olee otu n’ime ihe ndị mere Jehova ji nye anyị onyinye alụmdi na nwunye?

 JEHOVA bụ “Chineke, onye obi ụtọ.” Ọ chọkwara ka anyịnwa na-enwe obi ụtọ. (1 Tim. 1:11) O nyela anyị ọtụtụ onyinye ga-eme ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. (Jems 1:17) Otu n’ime onyinye ndị ahụ bụ alụmdi na nwunye. Nwoke na nwaanyị lụọ, ha na-ekwe ibe ha nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya, na-akwanyere ibe ha ùgwù ma jiri ibe ha kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na ha abụọ ahụ ibe ha n’anya, ha nwere ike ịna-enwe obi ụtọ.​—Ilu 5:18.

2. Olee otú ọtụtụ ndị di si emeso nwunye ha?

2 Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị di na nwunye nọ n’ụwa taa na-echefu nkwa ha kwere n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ. Ihe a na-eme ka ha ghara ịna-enwe obi ụtọ. Ihe Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike chọpụtara na nso nso a gosiri na ọtụtụ ndị di na-akụ nwunye ha ihe, na-agwa ha okwu ọjọọ, ma ọ bụ si n’ụzọ ndị ọzọ na-emeso ha otú na-adịghị mma. Nwoke na-eme ihe ndị a nwere ike ịna-eme ka ọ̀ hụrụ nwunye ya n’anya n’ihu ndị ọzọ ma na-emegbu ya n’ụlọ. Ọtụtụ ụmụ nwoke na-ele ndị gba ọtọ, ya ana-eme ka obi na-agbawa nwunye ha.

3. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka nwoke na-emegbu nwunye ya?

3 Olee ihe nwere ike ime ka ụfọdụ ụmụ nwoke na-emeso nwunye ha ihe otú na-adịghị mma? O nwere ike ịbụ na papa ha na-emekpọ mama ha ọnụ, n’ihi ya, ha echee na o nweghị ihe o mere ma ha na-emekpọkwa nwunye ha ọnụ. O nwekwara ndị na-emegbu nwunye ha n’ihi na ọ bụ ihe ọtụtụ ndị nọ n’obodo ha na-eme. Ha chere na otú ha ga-esi egosi na ha bụ nwoke bụ iji aka ike na-emeso nwunye ha. A kụzikwaraghị ụfọdụ ụmụ nwoke otú ha ga-esi na-ejide onwe ha, ma mgbe iwe ji ha. Ụfọdụ ụmụ nwoke na-elekwa ndị gba ọtọ mgbe niile, ya emee ka ha na-ele ụmụ nwaanyị na mmekọahụ anya otú na-adịghị mma. Ihe ọzọ bụ na ihe ndị a chọpụtara gosiri na ọrịa koronavaịrọs so mee ka nsogbu ndị a ka njọ. N’eziokwu, o nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a kwesịrị ime ka nwoke na-emegbu nwunye ya.

4. Gịnị ka Ndị Kraịst bụ́ di kwesịrị ịkpachara anya maka ya? Maka gịnị?

4 Nwoke bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ka ọ ghara ịna-ele ụmụ nwaanyị anya otú na-adịghị mma. a N’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ihe mmadụ na-eche na-emekarị ka ọ na-eme ihe ndị ọ na-eme. Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ na Rom aka ná ntị, sị: “Kwụsịkwanụ ịna-eme omume otú ndị oge a si eme.” (Rom 12:1, 2) Mgbe Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ ozi ahụ, ndị nọ n’ọgbakọ ahụ abụrụla Ndị Kraịst ruo afọ ụfọdụ. N’agbanyeghị ya, ihe Pọl kwuru gosiri na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-eche echiche otú ndị oge ahụ si eche. Ọ bụ ya mere o ji nye ha ndụmọdụ ka ha gbanwee otú ha si eche echiche na otú ha si eme omume. Ndụmọdụ ahụ gbasakwara Ndị Kraịst bụ́ di taa. Ọ dị mwute na ụfọdụ n’ime ha echewela echiche ka ndị ụwa ma na-emegbu ndị nwunye ha. b Olee otú Jehova chọrọ ka nwoke si na-emeso nwunye ya? Azịza ya dị n’amaokwu Baịbụl e si nweta isiokwu a.

5. Dị ka e kwuru na 1 Pita 3:7, olee otú di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya?

5 Gụọ 1 Pita 3:7. Jehova nyere ụmụ nwoke iwu ka ha na-akwanyere nwunye ha ùgwù. Mmadụ na-akwanyere onye o ji kpọrọ ihe ùgwù. Nwoke na-akwanyere nwunye ya ùgwù na-eji obiọma emeso ya ihe, na-emesokwa ya otú gosiri na ọ hụrụ ya n’anya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú nwoke ga-esi na-akwanyere nwunye ya ùgwù. Ma, ka anyị buru ụzọ kwuo ụfọdụ omume na-egosi na nwoke anaghị akwanyere nwunye ya ùgwù.

EMELA IHE NDỊ GA-EMEWA NWUNYE GỊ OBI

6. Olee otú obi na-adị Jehova gbasara ụmụ nwoke na-akụ nwunye ha ihe? (Ndị Kọlọsi 3:19)

6 Di ịkụ nwunye ya ihe. Jehova kpọrọ onye ọ bụla na-eme tigbuo zọgbuo asị. (Ọma 11:5) Jehova kpọrọ ndị di na-emegbu nwunye ha asị. (Mal. 2:16; gụọ Ndị Kọlọsi 3:19.) Dị ka e kwuru n’amaokwu e si nweta isiokwu a bụ́ 1 Pita 3:7, ọ bụrụ na nwoke anaghị emeso nwunye ya ihe otú dị mma, ọ ga-akpa adịm ná mma ya na Chineke aka ọjọọ. O nwedịrị ike ime ka Jehova ghara ịna-anụ ekpere ya.

7. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:31, 32, olee ụdị okwu ndị di kwesịrị izere? (Kwuokwa ihe dị ná “Nkọwakwu.”)

7 Nwoke ịgwa nwunye ya okwu ọjọọ. Ụfọdụ ndị di na-eji ezigbo iwe agwa nwunye ha okwu, na-agwakwa ha ihe na-agbawa ha obi. Ma, Jehova kpọrọ ‘iwe, ọnụma, iti mkpu, na ịkparị mmadụ’ c asị. (Gụọ Ndị Efesọs 4:31, 32.) Ọ na-anụ ihe niile. Jehova ejighị otú di si agwa nwunye ya okwu egwu egwu, ma mgbe naanị ha abụọ nọ n’ụlọ. Nwoke na-agwa nwunye ya okwu ọjọọ na-emebi adịm ná mma ya na nwunye ya nakwa nke ya na Jehova.​—Jems 1:26.

8. Olee otú Jehova si ewere ile ndị gba ọtọ? Maka gịnị?

8 Ile ndị gba ọtọ. Olee otú Jehova si ewere ile ndị gba ọtọ? Ọ kpọrọ ya asị. N’ihi ya, nwoke na-ele ndị gba ọtọ na-emebi adịm ná mma ya na Jehova, na-akparịkwa nwunye ya. d Jehova chọrọ ka ndị di ghara ịhapụ nwunye ha. Nwoke na-achọghị ịhapụ nwunye ya agaghị aga ka ya na nwaanyị ọzọ mee omume rụrụ arụ. Ọ gadịghị eche ya n’echiche. Jizọs kwuru na ọ bụrụ na nwoke elee nwaanyị ọzọ anya nke na ọ gụwara ya agụụ ka ya na ya kwaa iko, na ọ kwasola ya iko “n’obi ya.” e​—Mat. 5:28, 29.

9. Gịnị mere o ji ewute Jehova ma nwoke na-amanye nwunye ya ime ihe ga-enye akọnuche ya nsogbu ma ha nwewe mmekọahụ?

9 Nwoke ịmanye nwunye ya ka o mee ihe ga-enye akọnuche ya nsogbu ma ha nwewe mmekọahụ. Ụfọdụ ụmụ nwoke na-amanye nwunye ha ka ha mee ihe ga-enye akọnuche ha nsogbu ma ọ bụkwanụ ihe ụfọdụ na-eme ka ọ dị ha ka e jighị ha kpọrọ ihe ma ha nwewe mmekọahụ. Jehova kpọrọ ụdị omume ahụ asị. Ọ chọrọ ka di na-ahụ nwunye ya n’anya ma jiri ya kpọrọ ihe, na-echebakwara otú obi dị ya echiche. (Efe. 5:28, 29) Ma, ọ bụrụkwanụ na nwoke bụ́ Onye Kraịst na-emegbu nwunye ya ma ọ bụ na-ele ndị gba ọtọ? Olee otú ọ ga-esi agbanwe echiche ya na omume ya?

OTÚ NWOKE GA-ESI KWỤSỊ ÀGWÀ ỌJỌỌ

10. Olee otú ihe Jizọs mere nwere ike isi baara ndị di uru?

10 Gịnị ga-enyere nwoke aka ịkwụsị imegbu nwunye ya ma ọ bụkwanụ ime ihe ga-eme ka nwunye ya chee na e jighị ya kpọrọ ihe? Ọ bụ ịgbalị ime ka Jizọs. Ọ bụ eziokwu na Jizọs alụghị nwaanyị, ma di nwere ike ịmụta otú ọ ga-esi na-emeso nwunye ya ma ọ mụọ otú Jizọs si mesoo ndị na-eso ụzọ ya. (Efe. 5:25) Dị ka ihe atụ, legodị ihe ndị di nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si meso ndị na-eso ụzọ ya nakwa n’otú o si gwa ha okwu.

11. Olee otú Jizọs si meso ndịozi ya?

11 Jizọs ji obiọma meso ndịozi ya ihe. Ọ kwanyekwaara ha ùgwù. O nweghị mgbe ọ gwara ha okwu ọjọọ ma ọ bụkwanụ jiri aka ike soro ha. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Onyenwe ha na Nna ha ukwu, o nweghị mgbe ọ bụla o ji ike ya mee ka ha tụwa ya ụjọ. Kama o weturu onwe ya ala jeere ha ozi. (Jọn 13:12-17) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, unu ga-enwetakwa ume.” (Mat. 11:28-30) Ị̀ chọpụtara na Jizọs dị nwayọọ? Onye dị nwayọọ abụghị onye na-adịghị ike. Kama, o siri ike nke na ọ na-ejide onwe ya. A kpasuo ya iwe, ọ na-anọrọ jụụ ma jide onwe ya.

12. Olee otú Jizọs si gwa ndị ọzọ okwu?

12 Jizọs ji okwu ya kasie ndị ọzọ obi ma gbaa ha ume. Ọ gwaghị ndị na-eso ụzọ ya okwu ọjọọ. (Luk 8:47, 48) N’oge ndị na-emegide ya kparịrị ya ma chọọ ịkpasu ya iwe, ‘ọ kparịgwaraghị ha.’ (1 Pita 2:21-23) Mgbe ụfọdụ, Jizọs na-ahọrọdị ịgbachi nkịtị kama iji iwe azaghachi. (Mat. 27:12-14) Ihe a bụ ihe magburu onwe ya ndị di bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịmụta.

13. Dị ka e kwuru na Matiu 19:4-6, olee otú di ga-esi “rapara n’ahụ́ nwunye ya”? (Kọwaakwa foto.)

13 Jizọs gwara ndị di ka ha ghara ịhapụ nwunye ha. O kwughachiri ihe Nna ya kwuru. Nna ya sịrị na di kwesịrị ‘ịrapara n’ahụ́ nwunye ya.’ (Gụọ Matiu 19:4-6.) Okwu Grik a sụgharịrị ‘ịrapara’ pụtara ‘ịnyakọta’ ihe. N’ihi ya, ịhụnanya di na nwunye kwesịrị isi ezigbo ike nke na ọ ga-adị ka à nyakọtara ha ọnụ. E nweghị ike ikewa ha n’akpataraghị ha abụọ nsogbu. Nwoke si otú a hụ nwunye ya n’anya agaghị ele ụdị ndị gba ọtọ ọ bụla. Ọ ga-eme ngwa jụ “ịna-ele ihe na-abaghị uru.” (Ọma 119:37) Ọ ga-eme ka Job, onye kpebisiri ike na ọ gaghị ele nwaanyị ọzọ anya otú na-adịghị mma.​—Job 31:1.

Di na-achọghị ịhapụ nwunye ya anaghị ele ndị gba ọtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) g


14. Olee ihe di na-akụ nwunye ya ihe ma ọ bụ na-agwa ya okwu ọjọọ kwesịrị ime ka ya na Jehova nakwa nwunye ya dịrị ná mma?

14 Ọ bụrụ na di na-akụ nwunye ya ihe ma ọ bụ na-agwa ya okwu ọjọọ, o nwere ihe ndị ọzọ o kwesịrị ime ka ya na Jehova nakwa nwunye ya dịrị ná mma. Olee ihe ndị ọ bụ? Nke mbụ, o kwesịrị ịghọta na ya nwere ezigbo nsogbu. O nweghị ihe zoro ezo n’anya Jehova. (Ọma 44:21; Ekli. 12:14; Hib. 4:13) Nke abụọ, ọ ga-akwụsị ịkụ nwunye ya ihe ma ọ bụ ịgwa ya okwu ọjọọ ma gbanwee àgwà ya. (Ilu 28:13) Nke atọ, ọ ga-arịọ nwunye ya mgbaghara, rịọkwa Jehova mgbaghara. (Ọrụ 3:19) O kwesịkwara ịrịọ Jehova ka o mee ka ọ chọọ ịgbanwe ma nyere ya aka ịgbanwe echiche ya, okwu ya, na omume ya. (Ọma 51:10-12; 2 Kọr. 10:5; Fil. 2:13) Nke anọ, o kwesịrị ịna-eme ihe dabara n’ekpere ọ na-ekpe. Otú ọ ga-esi eme ya bụ ịmụta ịkpọ ụdị tigbuo zọgbuo niile na okwu ọjọọ niile asị. (Ọma 97:10) Nke ise, o kwesịrị ịga ozugbo ka ndị okenye ọgbakọ nyere ya aka. (Jems 5:14-16) Nke isii, ọ ga-ekpebi imewe ihe ga-enyere ya aka izere ụdị àgwà ahụ n’ọdịnihu. Di na-ele ndị gba ọtọ kwesịkwara ime ihe ndị a. Jehova ga-agọzi mbọ ọ na-agba ịgbanwe àgwà ya. (Ọma 37:5) Ma, ihe ọ ga-eme abụghị naanị ịkwụsị ime ihe ndị ga-ewute nwunye ya. O kwesịkwara ịmụta otú ọ ga-esi na-akwanyere nwunye ya ùgwù. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

OTÚ Ị GA-ESI NA-AKWANYERE NWUNYE GỊ ÙGWÙ

15. Olee otú di nwere ike isi gosi nwunye ya na ọ hụrụ ya n’anya?

15 Na-egosi ya na ị hụrụ ya n’anya. Ụfọdụ ụmụnna ha na nwunye ha na-ebi n’udo na-agbalịsi ike ime ihe ga-egosi nwunye ha na ha hụrụ ha n’anya kwa ụbọchị. (1 Jọn 3:18) Di nwere ike ime obere ihe ndị ga-egosi na ọ hụrụ nwunye ya n’anya, dị ka ijide ya aka ma ọ bụ ịmakụ ya. O nwere ike izigara ya ozi n’ekwentị, ozi ndị dị ka “ọ na-agụsi m ike ịhụ gị” ma ọ bụ “olee otú ihe si aga taa?” Ya gụrụ gụrụ, o nwere ike igosi nwunye ya na ọ hụrụ ya n’anya ma o dee ihe ụfọdụ na kaadị nye ya ma ọ bụ zụtara ya ihe na-amasị ya. Ọ bụrụ na di ana-eme ihe ndị a, ọ na-akwanyere nwunye ya ùgwù ma na-eme ka ha na-adịkwu ná mma.

16. Gịnị mere di kwesịrị iji na-eto nwunye ya?

16 Na-agwa ya na i ji ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na di na-akwanyere nwunye ya ùgwù, ọ ga na-agwa ya okwu ga na-eme ya obi ụtọ ma na-agba ya ume. Otu ụzọ ọ ga-esi eme ya bụ icheta ịna-ekele ya maka ihe niile ọ na-eme iji na-akwado ya. (Kọl. 3:15) Ọ bụrụ na di ejiri obi ya niile na-eto nwunye ya, obi ga na-adị nwunye ya ụtọ. Obi ga-esikwa nwunye ya ike, ya aghọta na a hụrụ ya n’anya nakwa na a na-akwanyere ya ùgwù.​—Ilu 31:28.

17. Olee otú di ga-esi gosi na ọ na-akwanyere nwunye ya ùgwù?

17 Na-emere ya obiọma ma na-akwanyere ya ùgwù. Di hụrụ nwunye ya n’anya na-eji ya akpọrọ ihe. Ọ naghịkwa eji ya egwu egwu. Ọ na-aghọta na ọ bụ onyinye bara ezigbo uru Jehova nyere ya. (Ilu 18:22; 31:10) N’ihi ya, ọ ga na-eji obiọma emeso ya ihe ma na-akwanyere ya ùgwù, ma mgbe ha na-enwe mmekọahụ. Ọ gaghị amanye ya ka o mee ihe ga-eme ka obi ghara iru ya ala ma ọ bụkwanụ ihe ga-eme ka akọnuche ya nyewe ya nsogbu. f Ọ ga-agbalịsi ike ka o nwee ezigbo akọnuche n’ihu Jehova.​—Ọrụ 24:16.

18. Gịnị ka ndị di kwesịrị ikpebisi ike ime? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ụzọ Anọ Di Ga-esi Na-akwanyere Nwunye Ya Ùgwù.”)

18 Ndị bụ́ di, obi sie unu ike na Jehova na-ahụ mbọ unu na-agba ịkwanyere nwunye unu ùgwù n’ihe niile unu na-eme ná ndụ. O jikwa ya kpọrọ ihe. Kpebisienụ ike ịna-akwanyere nwunye unu ùgwù. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịhapụ ime ihe ọ bụla ga-agbawa ha obi, iji obiọma na-emeso ha ihe, ịna-akwanyere ha ùgwù, na ịna-eme ihe ndị gosiri na unu hụrụ ha n’anya. Ọ ga-egosi na unu hụrụ ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe. Na-akwanyerenụ nwunye unu ùgwù. Unu ga-esi otú ahụ mee ka unu na Jehova dịrị ná mma. Ọ bụkwanụ ya bụ adịm ná mma kacha mkpa.​—Ọma 25:14.

ABỤ NKE 131 “Ihe Chineke Kekọtara”

a Ọ ga-abara ndị di uru ma ha gụọ isiokwu bụ́ “Ị̀ Na-emeso Ụmụ Nwaanyị Otú Jehova Si Emeso Ha?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 2024.

b O nwere ike ịbara ndị di ha na-emekpọ ọnụ uru ma ha gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ga-enyere Nwaanyị Di Ya Na-emekpọ Ọnụ Aka.” Ị ga-ahụ ya n’ebe a kpọrọ “Isiokwu Ndị Ọzọ,” nke na-agba na jw.org nakwa na JW Library®.

c NKỌWAKWU: Ihe so ‘n’ịkparị mmadụ’ bụ ịkọ ọnụ, ịgwa mmadụ okwu ọjọọ, na ịkatọ mmadụ mgbe niile. Okwu ọ bụla na-agbawa mmadụ obi, na-eme ka obi na-ajọ ya njọ, ma ọ bụ okwu e ji ewetu mmadụ ala socha n’ịkparị onye ahụ.

d Gaa na jw.org nakwa na JW Library gụọ isiokwu bụ́ “Ile Ndị Gba Ọtọ Nwere Ike Ime Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Tisaa.”

e Nwaanyị di ya na-ele ndị gba ọtọ nwere ike irite uru n’isiokwu bụ́ “Ihe Ị Ga-eme ma Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-ele Ndị Gba Ọtọ,” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 2023.

f Baịbụl ekwughị ihe niile gbasara ụdị mmekọahụ di na nwunye kwesịrị ịna-enwe ya abụrụ na ọ dị ọcha ma ọ bụ na ọ dịghị ọcha. Di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-eji aka ha kpebie ihe ndị ha ga-eme iji gosi na ha kpebisiri ike ịna-asọpụrụ Jehova, ịna-eme ihe ga-adị ibe ha mma, nakwa ịna-eme ihe ga-eme ka ha nwee ezigbo akọnuche. Di na nwunye ekwesịghị ịga ka ha na ndị ọzọ kwuwe gbasara mmekọahụ ha abụọ na-enwe.

g NKỌWA FOTO: Ebe ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ha na otu nwanna na-arụkọ ọrụ na-agbalị ime ka o lee ndị gba ọtọ e sere n’akwụkwọ.