Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 1

ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị

Too Jehova

Too Jehova

ISIOKWU AFỌ 2025: “Toonụ aha Jehova dị ebube.”​—ỌMA 96:8.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụta otú anyị ga-esi eto Jehova ma ọ bụ mee ka a mata na aha ya dị ebube.

1. Gịnị bụ mkpa ọtụtụ ndị taa?

 Ị̀ CHỌPỤTALA na ọtụtụ ndị taa bụ ndị onwe ha na-ebu isi? Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-etu ọnụ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, na-egosikwa onwe ha na ihe ndị ha na-eme. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-enye Jehova Chineke otuto. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi eme ka a mata na Jehova dị ebube na ihe kwesịrị ime ka anyị mee otú ahụ. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi enye Jehova otuto kwesịrị ya nakwa otú ọ ga-esi mee ka e too aha ya n’ọdịnihu.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI EME KA A MATA NA JEHOVA DỊ EBUBE?

2. Olee otú Jehova si mee ka a hụ ebube ya n’Ugwu Saịnaị? (Kọwaakwa foto.)

2 Baịbụl kwuru na Jehova dị ebube. Jehova mere ka a hụ ebube ya obere oge ọ napụtachara ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. Weregodị ya na ị na-ahụ ka ọtụtụ nde ndị Izrel gbakọtara n’ala ala Ugwu Saịnaị izute Chineke ha. Ígwé ojii kpuchiri ugwu ahụ. Na mberede, anwụrụ ọkụ kwụchiri ugwu ahụ, ala ana-ama jijiji, àmụ̀mà ana-egbu, égbè eluigwe ana-agba, a na-anụkwa ụda opi na-adasi ike. (Ọpụ. 19:16-18; 24:17; Ọma 68:8) Mgbe Jehova mere ihe ndị a, ọ ga-abụrịrị na o juru ndị Izrel anya ịhụ otú Jehova diruru n’ike.

Jehova mere ka ndị Izrel hụ ebube ya n’Ugwu Saịnaị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 2)


3. Olee otú anyị ga-esi eme ka a mata na Jehova dị ebube?

3 Ànyị ga-emeli ka ndị ọzọ mata na Jehova dị ebube? Ee, anyị ga-emeli ya. Otu ụzọ anyị nwere ike isi eme ya bụ ịgwa ndị ọzọ gbasara ike dị egwu Jehova nwere na àgwà ya ndị magburu onwe ha. Anyị na-emekwa ka a mata na Jehova dị ebube ma ọ bụrụ na anyị ana-eto ya maka ihe ndị o nyere anyị ike anyị arụọ. (Aịza. 26:12) Eze Devid mere ka ndị ọzọ mata na Jehova dị ebube. N’ekpere o kpere n’ihu ndị Izrel niile, ọ sịrị: “Jehova, ị bụ onye ukwu. Ị dịkwa ike. Ị bụ onye ọma, dịrịkwa ebube. E kwesịrị ịna-asọpụrụ gị n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị.” Mgbe Devid kpechara ekpere ahụ, ‘ha niile toro Jehova.’​—1 Ihe 29:11, 20.

4. Olee otú Jizọs si mee ka a mata na Jehova dị ebube?

4 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kwuru na ọ bụ Jehova nyere ya ike o ji rụọ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, si otú ahụ mee ka a mata na Nna ya dị ebube. (Mak 5:18-20) O tokwara Jehova n’otú o si kwuo gbasara Nna ya nakwa n’otú o si meso ndị ọzọ. N’otu oge Jizọs nọ na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ, otu nwaanyị mmụọ ọjọọ ji kemgbe afọ iri na asatọ so ná ndị na-ege ya ntị. Mmụọ ọjọọ ahụ emeela ka nwaanyị ahụ na-ehu ehu nke na ọ naghị akwụli kwem. Nwaanyị a nọ n’ezigbo ahụhụ. Jizọs nweere ya ọmịiko ma gakwuru ya, sị ya: “Nwaanyị, a gwọọla gị ọrịa gị.” Jizọs bikwasịziri ya aka. Ozugbo ahụ, nwaanyị ahụ ebilie, kwụrụ kwem, “malite ito Chineke.” Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ na Jehova agwọọla ya. (Luk 13:10-13) E nwere ezigbo ihe mere nwaanyị ahụ kwesịrị iji eto Jehova. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI ETO JEHOVA?

5. Olee ihe ndị mere anyị kwesịrị iji na-asọpụrụ Jehova?

5 Anyị na-eto Jehova n’ihi na anyị na-akwanyere ya ezigbo ùgwù. E nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji na-asọpụrụ ya. Jehova pụrụ ime ihe niile, ike ya enweghịkwa atụ. (Ọma 96:4-7) A na-ahụ amamihe ya pụrụ iche n’ihe ndị o kere. Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, na-enyekwa anyị ihe ndị na-eme ka anyị dịrị ndụ. (Mkpu. 4:11) Ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. (Mkpu. 15:4) Ihe ọ bụla ọ na-eme na-aga nke ọma. Ọ na-emezukwa nkwa ya mgbe niile. (Josh. 23:14) Ọ bụ ya mere Jeremaya onye amụma ji kwuo gbasara Jehova, sị: “N’ime ndị niile ma ihe ná mba dị iche iche nakwa n’alaeze ha niile, e nweghị otu mkpụrụ onye dị ka gị.” (Jere. 10:6, 7) O doro anya na e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-asọpụrụ Nna anyị nke eluigwe. Ma, ihe anyị na-eme abụghị naanị ịkwanyere Chineke ùgwù. Anyị hụkwara ya n’anya.

6. Gịnị mere anyị ji hụ Jehova n’anya?

6 Anyị na-eto Jehova n’ihi na anyị ji obi anyị niile hụ ya n’anya. Chegodị gbasara ụfọdụ àgwà Jehova nwere mere anyị ji hụ ya n’anya. Ọ na-eme ebere ma na-enwe ọmịiko. (Ọma 103:13; Aịza. 49:15) Ihe gbasara anyị na-emetụ ya n’obi. Ihe ọ bụla na-ewute anyị na-ewutekwa ya. (Zek. 2:8) Ọ na-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịbịaru ya nso, anyị na ya abụrụ enyi. (Ọma 25:14; Ọrụ 17:27) Ọ dị umeala n’obi. “Ọ na-ehulata ka o lee eluigwe na ụwa anya. Ọ na-esi n’ájá ekulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.” (Ọma 113:6, 7) Ihe ndị a niile mere anyị ji chọọ ịna-eto Chineke anyị dị ukwuu.​—Ọma 86:12.

7. Olee ohere magburu onwe ya anyị nwere?

7 Anyị na-eto Jehova n’ihi na anyị chọrọ ka ndị ọzọ mata ya. Ọtụtụ ndị amaghị eziokwu gbasara Jehova. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu ejirila ụgha ndị ọ na-agha gbasara Chineke kpuchie echiche ha. (2 Kọr. 4:4) Setan emeela ka ndị mmadụ kweta na Jehova bụ onye ụfụ obi, na ihe gbasara anyị anaghị emetụ ya n’obi, nakwa na ọ bụ ya na-akpata ọtụtụ n’ime ahụhụ a na-ata n’ụwa taa. Ma, anyị ma nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke anyị. Anyị nwere ohere ime ka ndị ọzọ mata ụdị onye Chineke anyị bụ ma mee ka ha na-eto ya. (Aịza. 43:10) Abụ Ọma nke 96 kwuru gbasara ito Jehova. Ka anyị na-eleba anya n’ụfọdụ amaokwu ndị dị n’abụ ọma a, chee gbasara ụzọ ndị i nwere ike isi enye Jehova otuto kwesịrị ya.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NYE JEHOVA OTUTO KWESỊRỊ YA?

8. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eto Jehova? (Abụ Ọma 96:1-3)

8 Gụọ Abụ Ọma 96:1-3. Anyị nwere ike isi n’ihe ndị anyị na-ekwu gbasara Jehova na-eto ya. Amaokwu ndị a gwara anyị ka anyị ‘na-abụku Jehova abụ,’ ‘na-eto aha ya,’ ‘na-ekwusa ozi ọma banyere otú o si azọpụta ndị mmadụ,’ ‘na-akọkwara mba dị iche iche na ọ dị ebube.’ Anyị ga-esili n’ụzọ ndị a niile na-eto Nna anyị nke eluigwe. Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi na Ndị Kraịst n’oge ndịozi egbughị oge ịgwa ndị ọzọ gbasara ihe ọma dị iche iche Jehova meere ha nakwa ụdị onye ọ bụ. (Dan. 3:16-18; Ọrụ 4:29) Olee otú anyị ga-esi eme ka ha?

9-10. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Angelena? (Kọwaakwa foto.)

9 Ka anyị kwuo gbasara Nwanna Nwaanyị Angelena. a O bi n’Amerịka. Ọ katara obi kwuo banyere Jehova n’ụlọ ọrụ ha. Mgbe ọ batara ọhụrụ n’ụlọ ọrụ ahụ, a kpọrọ ya ka ọ bịa nnọkọ ebe ndị bịara ọhụrụ ga-agwa ndị ọrụ ibe ha gbasara onwe ha. Nwanna Nwaanyị Angelena kwadoro foto ụfọdụ ọ ga-eji gosi obi ụtọ ọ na-enwe maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ma, ọ dabara na tupu ya ekwuo okwu, e nwere onye ọrụ ibe ya kwuru na nne na nna ya na-akpọ ya aga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova mgbe ọ dị obere. Ọ malitere ịkwa Ndịàmà Jehova na ihe ha kweere emo. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Obi nọ na-akụ m kpum kpum. Ma, m chere, sị: ‘M̀ ga-agba nkịtị ka mmadụ na-aghagide Jehova ụgha, ka m̀ ga-agbachitere Jehova?’”

10 Mgbe onye ọrụ ibe ya ahụ kwuchara okwu, nwanna nwaanyị ahụ kpere ekpere ozugbo n’obi ya. O medaziri obi gwa nwoke ahụ, sị: “Mụ na gị yiri. Nne na nna m bụ Ndịàmà Jehova. Mụnwa bụkwa Onyeàmà Jehova ruo taa.” Ọ bụ eziokwu na oge ahụ adịcharaghị Nwanna Nwaanyị Angelena mfe, ọ gbalịrị wetuo obi. O gosiri ndị ọrụ ibe ya foto ya na ndị enyi ya sere iji gosi otú obi si na-atọ ha ụtọ maka ofufe ha na-efe Jehova. O jizi akọ kwuo gbasara ihe ndị o kweere. (1 Pita 3:15) Gịnị mechara mee? Mgbe Nwanna Nwaanyị Angelena kwuchara okwu ya, obi dajụtụrụ nwoke ahụ, ya emechaa kwuo na ya na-echeta oge ndị magburu onwe ha n’oge ahụ ọ na-eso Ndịàmà Jehova. Nwanna nwaanyị ahụ sịrị: “Anyị kwesịrị ịgbachitere Jehova. Ọ bụ ihe ọma meere m ịgwa ndị ọzọ eziokwu gbasara Jehova.” Ọ bụkwa ihe ọma meere anyị taa ito Jehova, ma mgbe ndị ọzọ na-akparị ya.

Anyị nwere ike iji okwu ọnụ anyị na-eto Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10) b


11. Olee otú ndị ji obi ha niile na-efe Jehova si na-eme ihe e kwuru n’Abụ Ọma 96:8 kemgbe ụwa?

11 Gụọ Abụ Ọma 96:8. Anyị nwere ike iji ihe ndị bara uru anyị nwere too Jehova. Ndị ji obi ha niile na-efe Jehova na-eme otú ahụ kemgbe ụwa. (Ilu 3:9) Dị ka ihe atụ, ndị Izrel nyere onyinye maka ịrụ ụlọ nsọ nakwa maka ilekọta ya. (2 Eze 12:4, 5; 1 Ihe 29:3-9) Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs “ji ihe ha nwere” jeere ya na ndịozi ya ozi. (Luk 8:1-3) Ndị Kraịst oge mbụ tụkọtakwara ihe ha ji gbatara ụmụnna ha ọsọ enyemaka n’oge e nwere ụnwụ nri. (Ọrụ 11:27-29) Taa, anyị nwekwara ike ito Jehova ma anyị na-enye onyinye.

12. Olee otú onyinye anyị si eme ka e too Jehova? (Kọwaakwa foto.)

12 Ka anyị kọọ naanị otu akụkọ gosiri na onyinye anyị na-enye na-eme ka e too Jehova. N’afọ 2020, e nwere oké ọkọchị na Zimbabwe ruo ogologo oge. Ọtụtụ nde mmadụ enweghị ihe ha ga-eri, ma nwanna anyị nwaanyị aha ya bụ Prisca. N’agbanyeghị oké ọkọchị ahụ, Nwanna Nwaanyị Prisca nọkwa na-ekwusa ozi ọma n’ụbọchị Wenezdee niile na Fraịdee niile, ma n’oge e ji akọ ugbo. Ndị agbata obi ya nọ na-akwa ya emo maka na ọ na-aga ozi ọma kama ịrụwa ọrụ n’ugbo ya. Ha nọ na-asị ya, “Agụụ ga-agụgbudị gị.” Nwanna Nwaanyị Prisca na-akata obi sị ha, “E nwetụbeghị mgbe Jehova hapụrụ ndị na-efe ya.” Mgbe obere oge gachara, o nwetara ihe nzukọ Jehova ji gbatara ya ọsọ enyemaka. Ihe mere ka o nweta ihe ndị ahụ bụ onyinye anyị na-enye. Ihe a metụrụ ndị agbata obi ya ahụ n’obi, ha asị ya: “Chineke ahapụghị gị. N’ihi ya, anyị chọrọ ịmụtakwu gbasara ya.” Mmadụ asaa n’ime ha malitere ịbịa ọmụmụ ihe.

Anyị nwere ike iji ihe ndị bara uru anyị nwere na-eto Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) c


13. Olee otú àgwà anyị nwere ike isi mee ka e too Jehova? (Abụ Ọma 96:9)

13 Gụọ Abụ Ọma 96:9. Anyị nwere ike isi n’àgwà anyị na-eto Jehova. Ndị nchụàjà na-eje ozi n’ụlọ nsọ Jehova kwesịrị ịna-asa ahụ́ ma dịrị ọcha. (Ọpụ. 40:30-32) Anyịnwa kwesịkwara ịna-adị ọcha. Ihe anyị ga-eme abụghị naanị idowe ahụ́ anyị ọcha, kama anyị kwesịrị ịgbalị zere ihe ndị Jehova kpọrọ asị. (Ọma 24:3, 4; 1 Pita 1:15, 16) Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike yipụ “àgwà ochie,” ya bụ, echiche na-adịghị ọcha na omume ndị na-adịghị ọcha ma yiri “àgwà ọhụrụ,” ya bụ, ịna-eche echiche ma na-eme omume otú ga-ewetara aha nsọ Jehova otuto. (Kọl. 3:9, 10) N’enyemaka Jehova, ndị mmadụ ga-agbanweli ma yiri àgwà ọhụrụ, ma ndị nke omume ha jọgburu onwe ya.

14. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Jack? (Kọwaakwa foto.)

14 Ka anyị kwuo gbasara otu nwoke aha ya bụ Jack. Ọ na-eme tigbuo zọgbuo, ndị mmadụ ana-ezekwa ya eze. A na-akpọdị ya Mmụọ Ọjọọ. N’ihi mpụ ndị o mere, a mara ya ikpe ọnwụ. Ma, ka Jack na-eche ka ụbọchị a ga-egbu ya ruo, o kwetara ka otu nwanna na-abịa n’ụlọ mkpọrọ ebe a tụrụ ya mkpọrọ mụwara ya Baịbụl. N’agbanyeghị na Jack bụbu onye na-eme tigbuo zọgbuo, o yipụrụ àgwà ochie ya. Ka oge na-aga, o ruru eru ka e mee ya baptizim. Jack gbanwere kpamkpam nke na n’ụbọchị a chọrọ igbu ya, anya mmiri gbara ụfọdụ ndị nche n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka ha na-asị ya ka e mesịa. Otu onye amị na-arụ n’ụlọ mkpọrọ ahụ sịrị: “E nwere mgbe Jack bụ onye mkpọrọ kacha njọ anyị nwere n’ụlọ mkpọrọ a. Mana ugbu a, o so ná ndị nke kacha mma.” Mgbe otu izu gachara e gburu Jack, ụmụnna gaghachiri n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka ha nwee ọmụmụ ihe. Ha hụrụ otu onye mkpọrọ bịara ọmụmụ ihe ahụ na nke mbụ ya. Gịnị mere o ji bịa? Ọ bụ otú Jack si gbanwee metụrụ ya n’obi, ya achọọ ịmata ihe ọ ga-eme ka o nwee ike ife Jehova. N’eziokwu, àgwà ọma anyị nwere ike ime ka e too Nna anyị nke eluigwe.​—1 Pita 2:12.

Anyị nwere ike iji àgwà ọma anyị na-eto Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14) d


OLEE OTÚ JEHOVA GA-ESI EME KA E TOO AHA YA N’ỌDỊNIHU?

15. Olee otú Jehova ga-esi eme ka e too aha ya kpamkpam n’ọdịnihu? (Abụ Ọma 96:10-13)

15 Gụọ Abụ Ọma 96:10-13. Amaokwu ndị ikpeazụ dị n’Abụ Ọma nke 96 kwuru na Jehova bụ Onyeikpe na Eze na-ekpe ikpe ziri ezi. Olee otú Jehova ga-esi eme ka e too aha ya n’ọdịnihu? Ọ ga-eme ka e kpee ikpe ziri ezi. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-ebibi Babịlọn Ukwu maka na o mere ka a na-ekwutọ aha ya dị nsọ. (Mkpu. 17:5, 16; 19:1, 2) Ụfọdụ ndị hụrụ ka a na-ebibi Babịlọn Ukwu nwere ike isonyere anyị na-efe ezi Chineke. N’ikpeazụ, n’agha Amagedọn, Jehova ga-ebibi ụwa Setan, bibiekwa ndị niile na-emegide ya ma na-ekwutọ aha ya. Ma, ọ ga-echebe ndị niile hụrụ ya n’anya, na-erubere ya isi, na-etokwa ya. (Mak 8:38; 2 Tesa. 1:6-10) Mgbe e lechara ndị mmadụ ule ikpeazụ ma Kraịst chịchaa otu puku afọ, ọ pụtara na Jehova emeela ka e doo aha ya nsọ kpamkpam. (Mkpu. 20:7-10) N’oge ahụ, “ndị ma gbasara ebube Jehova ga-ejupụta n’ụwa otú mmiri si ejupụta n’oké osimiri.”​—Hab. 2:14.

16. Gịnị ka i kpebisiri ike ime? (Kọwaakwa foto.)

16 Ọ ga-atọgbu anyị atọgbu mgbe onye ọ bụla dị ndụ ga na-eto Jehova otú o kwesịrị. Mana tupu ụbọchị ahụ eruo, anyị nwere ike ime ike anyị niile iji ohere ọ bụla anyị nwere na-eto Chineke anyị. Iji gosi na ito aha Jehova dị ezigbo mkpa, Òtù Na-achị Isi ahọrọla Abụ Ọma 96:8 ka ọ bụrụ isiokwu anyị nke afọ 2025. Ọ sịrị: “Toonụ aha Jehova dị ebube.”

Oge na-abịa mgbe onye ọ bụla dị ndụ ga na-enye Jehova otuto kwesịrị aha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

ABỤ NKE 12 Jehova Chineke Dị Ukwuu

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b NKỌWA FOTO: Foto gosiri otú akụkọ Nwanna Nwaanyị Angelena si mee.

c NKỌWA FOTO: Foto gosiri otú akụkọ Nwanna Nwaanyị Prisca si mee.

d NKỌWA FOTO: Foto gosiri otú akụkọ Nwanna Jack si mee.