Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 5

ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke

Uru Anyị Na-erite Maka na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya

Uru Anyị Na-erite Maka na Jehova Hụrụ Anyị n’Anya

“Kraịst Jizọs bịara n’ụwa a ka ọ zọpụta ndị mmehie.”​—1 TIM. 1:15.

IHE A GA-AMỤ

Otú ihe mgbapụta si abara anyị uru na otú anyị ga-esi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ya.

1. Gịnị ka anyị ga-eme iji mee Jehova obi ụtọ?

 WEREGODỊ ya na e nwere onye ị hụrụ n’anya i nyere onyinye magburu onwe ya ma baa ezigbo uru. Chegodị otú ọ ga-esi wute gị ma ọ bụrụ na onye ahụ weere onyinye ahụ tinye n’igbe, chefuo ya. Ma obi ga-adị gị ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na o ji onyinye ahụ mee ihe bara uru, keleekwa gị maka ya. Gịnị ka ihe atụ a na-akụzi? Jehova nyere Ọkpara ya ka ọ nwụọ maka anyị. Obi ga-adị Jehova ezigbo ụtọ ma anyị gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a pụrụ iche o nyere anyị nakwa maka ịhụnanya ya nke mere o ji nye anyị ihe mgbapụta.​—Jọn 3:16; Rom 5:7, 8.

2. Olee ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?

2 Ma, ka chi na-eji na-abọ, o nwere ike ịdịwa anyị ka ihe mgbapụta ahụ Jehova nyere anyị abụghị onyinye pụrụ iche. Ọ ga-adị ka ebe anyị weere onyinye Chineke nyere anyị tinye n’igbe, chefuo ya n’agbanyeghị na obi dị anyị ụtọ na o nyere anyị ya. Ọ bụrụ na anyị achọghị ka ihe a mee anyị, anyị kwesịrị ịna-echebara ihe Jehova na Jizọs Kraịst meere anyị echiche. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ime otú ahụ. Anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi rite uru n’ihe mgbapụta ahụ ugbu a nakwa n’otú anyị ga-esi rite uru na ya n’ọdịnihu. Anyị ga-ekwukwa otú anyị ga-esi gosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ịhụnanya ya, nke kachanụ, n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs.

URU ANYỊ NA-ERITE UGBU A

3. Olee otu uru anyị na-erite ugbu a n’àjà ahụ Jizọs chụrụ?

3 Anyị na-erite uru ugbu a n’àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe mgbapụta ahụ mere ka Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị. Iwu ejighị ya ịgbaghara anyị mmehie anyị. Ma, ọ chọrọ ime otú ahụ. Obi dị otu ọbụ abụ ụtọ maka ihe Jehova meere ya. Ọ bụ ya mere o ji sị: “N’ihi na gịnwa bụ́ Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.”​—Ọma 86:5; 103:3, 10-13.

4. Olee ndị Jehova nyere ihe mgbapụta maka ha? (Luk 5:32; 1 Timoti 1:15)

4 Ụfọdụ nwere ike iche na ha erughị eru ka Jehova gbaghara ha mmehie ha. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị niile erughị eru. Pọl onyeozi ghọtara na ‘e kwesịghị ịkpọ ya onyeozi.’ N’agbanyeghị ya, ọ sịrị: “Ọ bụ amara Chineke meere m ka m ji nwee ike ịna-arụ ọrụ a.” (1 Kọr. 15:9, 10) Ọ bụrụ na anyị echegharịa ná mmehie anyị, Jehova na-agbaghara anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụghị n’ihi na ọ bụ ihe ruuru anyị, kama ọ bụ n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na ị na-eche mgbe ụfọdụ na i rughị eru ka Jehova gbaghara gị mmehie gị, cheta na Jehova nyere ihe mgbapụta maka ndị mmehie chegharịrị echegharị, ọ bụghị maka ndị na-anaghị eme mmehie.​—Gụọ Luk 5:32; 1 Timoti 1:15.

5. È nwere onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iche na ya ruru eru ka Jehova meere ya ebere? Kọwaa.

5 O nweghị onye n’ime anyị kwesịrị iche na o ruru eru ka Jehova meere ya ebere ọ bụrụgodị na onye ahụ efeela ya ọtụtụ afọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova na-echeta ihe niile anyị mere n’ozi ya. (Hib. 6:10) O nyere anyị Ọkpara ya ka ọ bụrụ onyinye amara, ọ bụghị ihe o ji kwụọ anyị ụgwọ maka ozi anyị jeere ya. Ọ bụrụ na anyị echee na Chineke ji anyị ụgwọ imere anyị ebere ma ọ bụ na anyị ruru eru ka o nye anyị ihe pụrụ iche, ihe ọ pụtara bụ na anyị na-ewere ya na ọnwụ Jizọs nwụrụ bụ na nkịtị.​—I nwere ike ịtụle Ndị Galeshia 2:21.

6. Gịnị mere Pọl ji rụsie ọrụ ike n’ozi Jehova?

6 Pọl ma na ya agaghị arụtali obi ebere Jehova n’ọrụ. Gịnịzi mere o ji gbasie mbọ ike n’ozi Jehova? Ọ bụghị iji gosi na ya ruru eru inweta ihe ọ bụla n’aka Chineke, kama ọ bụ iji gosi na obi dị ya ụtọ maka amara Jehova meere ya. (Efe. 3:7) Dịkwa ka Pọl, ihe mere anyị ji jiri ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova abụghị maka na anyị ga-arụtali ebere Jehova n’ọrụ, kama ọ bụ igosi na obi dị anyị ụtọ maka ya.

7. Olee uru ọzọ anyị na-erite n’ihe mgbapụta ahụ ugbu a? (Ndị Rom 5:1; Jems 2:23)

7 Uru ọzọ anyị na-erite n’ihe mgbapụta ahụ ugbu a bụ na anyị na Jehova ga-adịli ná mma ma bụrụkwa enyi. a Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, mgbe a mụrụ anyị, anyị na Jehova adịghị ná mma. Ma, ihe mgbapụta ahụ emeela ka ‘anyị na Chineke dịrị n’udo.’ N’ihi ya, anyị na ya nwere ike ịdị ná mma.​—Gụọ Ndị Rom 5:1; Jems 2:23.

8. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova maka na o mere ka anyị nwee ike ịna-agwa ya okwu n’ekpere?

8 Ikpe ekpere bụ ihe pụrụ iche anyị ga-emeli n’ihi na anyị na Jehova dị ná mma. Jehova na-anụ ekpere ndị ya na-ekpe n’ihu ọha mgbe ha zukọtara, na-anụkwa ekpere onye ọ bụla n’ime anyị na-ekpe mgbe naanị ya nọ. Ekpere na-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị. Ma, ọ bụghị naanị ya bụ uru ekpere na-abara anyị. Ọ na-eme ka anyị na Chineke dikwuo ná mma. (Ọma 65:2; Jems 4:8; 1 Jọn 5:14) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o kpere ekpere ugboro ugboro n’ihi na ọ ma na Jehova na-ege ya ntị nakwa na ekpere ga-eme ka ya na Nna ya nke eluigwe dịkwuo ná mma. (Luk 5:16) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na àjà ahụ Jizọs chụrụ mere ka anyị nwee ike ịbụ ndị enyi Jehova, na-agwakwa ya okwu n’ekpere.

URU IHE MGBAPỤTA GA-ABARA ANYỊ N’ỌDỊNIHU

9. Olee uru ihe mgbapụta ga-abara ndị ji obi ha niile na-efe Jehova n’ọdịnihu?

9 Olee uru ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ga-erite n’ihe mgbapụta ahụ n’ọdịnihu? Jehova ga-enye ha ndụ ebighị ebi. Ọtụtụ ndị chere na ọ gaghị ekwe omume n’ihi na ụmụ mmadụ na-anwụ kemgbe ọtụtụ puku afọ. Ma, ihe Jehova bu n’obi kee ndị mmadụ bụ ka ha dịrị ndụ ebighị ebi. A sị na Adam emehieghị, o nweghị onye gaara eche na ịdị ndụ ebighị ebi agaghị ekwe omume. N’agbanyeghị na o siri ike ugbu a iche na mmadụ ga-adịli ndụ ebighị ebi, anyị kwesịrị ikweta na anyị ga-adịli ndụ ebighị ebi n’ihi na anyị ma na Jehova kwụrụ ụgwọ kachanụ, ya bụ, iji ndụ Ọkpara ya chụọ àjà, ka o kwe anyị omume ịdị ndụ ebighị ebi.​—Rom 8:32.

10. Gịnị ka ndị e tere mmanụ na ndị so n’atụrụ ọzọ na-atụ anya ya?

10 Ọ bụ eziokwu na ndụ ebighị ebi bụ ihe Jehova ga-enye anyị n’ọdịnihu, ma ọ chọrọ ka anyị na-atụ anya ya ugbu a. Ndị e tere mmanụ na-atụ anya ibi ndụ bara uru n’eluigwe mgbe ha na Jizọs Kraịst ga na-achị ụwa. (Mkpu. 20:6) Ndị so n’atụrụ ọzọ na-atụ anya ibi na Paradaịs nke ga-adị n’ụwa, ebe ihe mgbu na iru uju na-agaghịzi adị. (Mkpu. 21:3, 4) Ì so n’atụrụ ọzọ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa? Ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa abụghị ihe a ga-eji tie ha aka n’obi. Ọ bụ ihe Chineke kere ndị mmadụ ka ha dịrị. Ibi n’ụwa ga-eme ka anyị nwee ezigbo obi ụtọ.

11-12. Olee ụfọdụ ngọzi anyị ga-enweta na Paradaịs anyị na-atụ anya ya? (Kọwaakwa foto.)

11 Chegodị otú ihe ga-adịrị gị mgbe ụwa ga-abụ Paradaịs. Ị gaghịzi na-echegbu onwe gị banyere ọrịa ma ọ bụ ọnwụ. (Aịza. 25:8; 33:24) Jehova ga-eme ka i nweta ezigbo ihe niile na-agụ gị agụụ. Olee ihe ndị i nwere ike ịchọ ịmụ mgbe ahụ? Ọ̀ bụ ịmụ gbasara ụmụ anụmanụ, ka ọ̀ bụ ịmụ ịkụ egwú? Ka ị̀ ga-achọ ịmụ otú e si ese ihe? Na Paradaịs, a ga-achọ ndị na-ese ụlọ, ndị na-arụ ụlọ, nakwa ndị na-akọ ugbo. Ọ ga-adịkwa mkpa ka e nwee ndị ga na-arụ ọrụ ga na-abara ndị mmadụ uru, dị ka ịkọpụta nri na isi nri, ịrụpụta ngwá ọrụ, na ime ka mbara ala maa ezigbo mma. (Aịza. 35:1; 65:21) Mgbe ị ga-adị ndụ ebighị ebi, ị ga-enwe oge zuru ezu ịmụ ihe niile ị chọrọ ịmụ.

12 Chegodị ụdị ọṅụ anyị ga-enwe ịnabata ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite n’ọnwụ. (Ọrụ 24:15) Cheekwa ụdị obi ụtọ ị ga-enwe ịmụta banyere Jehova ma ị mụọ gbasara ọtụtụ ihe ndị o kere eke. (Ọma 104:24; Aịza. 11:9) Nke ka nke bụ na obi ga-atọgbu anyị atọgbu ife Jehova n’enweghị ihe ọ bụla ga na-enye akọnuche anyị nsogbu. Ị̀ ga-achọ iji ‘mmehie nke ga-emetụ gị obi ụtọ obere oge’ gbanwere ihe ọma ndị a ga-emere anyị n’ọdịnihu? (Hib. 11:25) Mbanụ. Anyị kwesịrị ịdị njikere ịhapụ ihe ọ bụla iji nweta ngọzi ndị a. Cheta na Paradaịs ga-adị n’ụwa abụghị olileanya anyị ga na-enwe mgbe niile. Anyị ga-emecha biri na ya. Ihe ndị a niile agaraghị ekwe omume ma a sị na Jehova ahụghị anyị n’anya nke na o nyere anyị Ọkpara ya.

Olee ihe ọma ị kacha atụ anya ya Chineke ga-emere anyị na Paradaịs? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)


IHE Ị GA-EME IJI GOSI NA OBI DỊ GỊ ỤTỌ MAKA OTÚ JEHOVA SI HỤ GỊ N’ANYA

13. Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si hụ anyị n’anya? (2 Ndị Kọrịnt 6:1)

13 Gịnị ka anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka na Jehova nyere anyị ihe mgbapụta? Ọ bụ iwere ọrụ ya ka ihe kacha mkpa ná ndụ anyị. (Mat. 6:33) A sị ka e kwuwe, Jizọs nwụrụ “ka ndị dị ndụ wee ghara ịna-eme ihe masịrị ha, kama ka ha na-eme ihe masịrị onye nwụrụ maka ha, nke a kpọlitekwara.” (2 Kọr. 5:15) N’eziokwu, anyị agatụdịghị achọ iji amara a Jehova meere anyị egwu egwu.​—2 Ndị Kọrịnt 6:1.

14. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi ma na-eso ntụziaka ya?

14 Ụzọ ọzọ anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si hụ anyị n’anya bụ ịtụkwasị ya obi nakwa isoro ntụziaka ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụrụ na e nwere ihe anyị chọrọ ikpebi, dị ka ebe anyị ga-agụru akwụkwọ ma ọ bụ ụdị ọrụ anyị ga-arụ, anyị kwesịrị ibu ụzọ chee gbasara ihe Jehova ga-achọ ka anyị mee. (1 Kọr. 10:31; 2 Kọr. 5:7) Ọ bụrụ na mkpebi ndị anyị na-eme ana-egosi na anyị nwere okwukwe na Jehova, okwukwe anyị nwere na ya ga na-esikwu ike, anyị na ya ana-abụkwukwa enyi. Ọ ga-emekwa ka olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi sikwuo ike.​—Rom 5:3-5; Jems 2:21, 22.

15. Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ịhụnanya Jehova n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?

15 E nwekwara ihe ọzọ anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si hụ anyị n’anya. Ọ bụ iji oge Ncheta Ọnwụ Jizọs anyị nọ na ya ugbu a egosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ. E wepụ ịgba mbọ hụ na anyị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị kwesịkwara ịkpọ ndị ọzọ òkù ka ha bịa. (1 Tim. 2:4) Kọwaara ndị ị na-akpọ ka ha bịa ihe ga-eme ná Ncheta Ọnwụ Jizọs. Igosi ha vidio dị na jw.org bụ́ Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ? na Na-echeta Ọnwụ Jizọs nwere ike inyere gị aka. Ndị okenye kwesịrị ịgba mbọ kpọọ ndị kwụsịrịla ije ozi ọma òkù ka ha bịa. Chegodị ụdị ọṅụ ga-adị ma n’eluigwe ma n’ụwa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị kwụsịrịla ife Jehova alọghachite n’ọgbakọ. (Luk 15:4-7) Anyị gaa Ncheta Ọnwụ Jizọs, anyị kwesịrị ịgba mbọ kelee ndị bịaranụ, karịchaa ndị ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-abịabeghị ya kemgbe ọtụtụ afọ. Anyị chọrọ ka obi ruo ha ala ma ha bịa.​—Rom 12:13.

16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chee gbasara ijekwuru Jehova ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs?

16 Ì nwere ike iwepụtakwu oge jeere Jehova ozi n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs? Ime otú ahụ bụ ụzọ magburu onwe ya anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile Chineke na Kraịst meere anyị. Ọ bụrụ na anyị ewepụtakwuo oge jeere Jehova ozi, ọ ga-eme ka anyị na-ahụkwu otú o si akwado anyị, nke ga-eme ka anyị tụkwasịkwuo ya obi. (1 Kọr. 3:9) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ijide n’aka na ị gụrụ ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke dị n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị ma ọ bụ na chaatị dị n’akwụkwọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị. I nwekwara ike ikpebi ịmụkwu gbasara amaokwu Baịbụl ndị ahụ.

17. Olee ihe na-amasị Jehova? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Anyị Ga-eme Iji Gosi na Obi Dị Anyị Ụtọ Maka Otú Jehova Si Hụ Anyị n’Anya.”)

17 Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ike otú ihe si dịrị gị agaghị ekwe gị mee ihe niile e kwuru n’isiokwu a. Ma, cheta na ihe Jehova na-eme abụghị iji ihe ị na-eme atụnyere nke ndị ọzọ na-eme. Ọ na-ahụ ihe dị gị n’obi. Ọ na-amasị ya ma ọ chọpụta na obi dị gị ụtọ maka onyinye pụrụ iche o nyere gị, nke bụ́ ihe mgbapụta.​—1 Sam. 16:7; Mak 12:41-44.

18. Gịnị mere obi kwesịrị iji dị anyị ụtọ maka ihe Jehova Chineke na Jizọs Kraịst meere anyị?

18 Ọ bụ naanị n’ihi ihe mgbapụta ahụ ka e ji na-agbaghara anyị mmehie anyị, anyị na Jehova abụrụ enyi, anyị enweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ka anyị na-egosi mgbe niile na obi dị anyị ụtọ maka otú Jehova si hụ anyị n’anya, n’ihi na ọ bụ ịhụnanya ya mere o ji emere anyị ihe ọma ndị a. (1 Jọn 4:19) Ka anyị na-egosikwa na obi dị anyị ụtọ maka Jizọs, onye hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nke na o ji ndụ ya chụọ àjà n’ihi anyị.​—Jọn 15:13.

ABỤ NKE 154 Ịhụnanya Adịghị Ada Ada

a Jehova gbaghaara ndị biri ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa kwụọ ihe mgbapụta ahụ. Ihe mere Jehova ji mee ya bụ na obi siri ya ike na Ọkpara ya ga-erubere ya isi ruo ọnwụ. N’ihi ya, n’anya Jehova, o yiri ka à kwụọla ihe mgbapụta ahụ kemgbe, tupu Jizọs anwụọ.​—Rom 3:25.