Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndịàmà Jehova hà kwesịrị isi n’ebe ndị mmadụ na-esi achọta onye ha ga-alụ n’Ịntanet chọta onye ha ga-alụ?

Jehova chọrọ ka mmadụ abụọ lụrụ ibe ha na-enwe obi ụtọ ma nọgide na-adị ná mma. (Mat. 19:​4-6) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, olee otú ị ga-esi achọta ezigbo onye ị ga-alụ? Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, ọ ma ihe anyị ga-eme ka alụmdi na nwunye anyị tọọ anyị ụtọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na i mee ihe ọ gwara anyị, ị ga na-enwe ezigbo obi ụtọ. Legodị ụfọdụ n’ime ha.

Nke mbụ, ihe anyị kwesịrị ịmata gbasara onwe anyị bụ na “obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. O sikwara ike njite.” (Jere. 17:9) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ onwe ha ma malite ịkpa, ha nwere ike iri ibe ha obi ọsọ ọsọ. Ọ́ dị otú ahụ, o nwere ike isiri ha ike ime ezigbo mkpebi. Ọ bụrụ na mmadụ ekpebie ịlụ ibe ya naanị n’ihi na ọ na-anwụrụ ya, o nwere ike imecha kwaa mmakwaara. (Ilu 28:26) Ọ bụ ya mere mmadụ ekwesịghị ịgwa onye ya na ya ka bidoro ịkpa ọhụrụ na ya na-anwụrụ ya ma ọ bụkwanụ kwe ya nkwa ọlụlụ. O kwesịrị ichere ruo mgbe ha matara onwe ha nke ọma.

Ilu 22:3 sịrị: “Onye ma ihe hụ nsogbu, ọ na-aga zoo, Ma ndị na-amaghị ihe na-agara banye ná nsogbu, ha na-atakwa ahụhụ ya.” Olee ihe dị njọ ná mmadụ isi n’ebe ndị mmadụ si achọta onye ha ga-alụ n’Ịntanet achọta onye ọ ga-alụ? Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị si ebe ahụ nweta ndị ha na ha na-akpa mechara chọpụta na ndị ahụ ghọgburu ha. Ihe ọzọ bụ na ndị aghụghọ na-eme ka hà bụ ndị ha na-abụghị n’ụdị ebe a ka ha nwee ike ịnapụ ndị ọzọ ego ha. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eme ihe ọjọọ ndị a na-ekwu na ha bụ Ndịàmà Jehova.

Ọghọm ọzọ dị n’isi n’ebe ndị a na-achọta onye mmadụ ga-alụ n’Ịntanet bụ na ụfọdụ ebe ndị ahụ na-eji mgbakọ na mwepụ ekpebi ma ihe ọ̀ ga-adabara mmadụ na ibe ya. Ma, e nweghị ihe ọ bụla na-egosi na ọ bụ eziokwu. Ọ̀ ga-adị mma ka mmadụ si otú a kpebie ihe ọ ga-eme n’okwu alụmdi na nwunye bụ́kwanụ ihe dị ezigbo mkpa? È nwere ike iji ụdị ihe ahụ tụnyere mmadụ ime ihe Baịbụl kwuru?​—Ilu 1:7; 3:​5-7.

Ilu 14:15 sịrị: “Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru, ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.” Tupu gị ekpebie onye ị ga-alụ, i kwesịrị ịmata onye ahụ nke ọma. Ma, ịhụ mmadụ n’Ịntanet na-eme ka o sie ezigbo ike. Ọ bụrụgodị na i nwere ike ịhụ ihe gbasara onye ahụ n’Ịntanet ma ọ bụ na unu na-eji oge buru ibu esi n’Ịntanet n’akparịta, ì nwere ike ikwu na ị ma onye ahụ nke ọma? Ụfọdụ ndị matara mmadụ n’Ịntanet chere na ha ahụla ọ̀ dị ha n’obi. Ma mgbe ha hụrụ onye ahụ ihu na ihu, ihe ha chọpụtara gbara ha anya mmiri.

Ọbụ abụ ahụ sịrị: “Mụ na ndị aghụghọ anaghị akpa. Mụ na ndị na-ezochi ụdị ndị ha bụ anaghịkwa anọ.” (Ọma 26:4) Ọtụtụ ndị na-ewere ya na o nweghị ihe o mere ma ha dee ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara onwe ha n’Ịntanet iji mee ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ebe ha nọ. Ha nwere ike izochi ụdị onye ha bụ mgbe ha na mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet. Ụfọdụ ndị nwekwara ike ikwu na ha bụ Ndịàmà Jehova, ma hà mere baptizim? Hà ma nke a na-akọ n’ọgbakọ? Ha na Jehova hà dị n’ezigbo mma? À na-ele ha anya ọma n’ọgbakọ ha? Ka hà bụ ndị a na-enyo enyo ma ọ bụdị ndị na-akpa àgwà ọjọọ? (1 Kọr. 15:33; 2 Tim. 2:​20, 21) E lewe ya otú Baịbụl kwuru, hà nweere onwe ha ịlụ di ma ọ bụ nwunye? I kwesịrị ịmata ihe ndị a niile. Ma, ha ga-esiri gị ike ịmata ma ọ bụrụ na e nweghị ụmụnna ma onye ahụ nke ọma i nwere ike ịjụta gbasara ya. (Ilu 15:22) Ezigbo onye na-efe Jehova agadịghị echetụdị echiche ya na onye na-ekweghị ekwe ‘ikekọta onwe’ ha.​—2 Kọr. 6:14; 1 Kọr. 7:39.

Ebe ọ bụ na e nwere ọghọm dị ná mmadụ isi n’ebe ndị mmadụ si achọta onye ha ga-alụ n’Ịntanet achọta onye ọ ga-alụ, e nwere ụzọ ndị ọzọ ka mma mmadụ nwere ike isi chọta onye ọ ga-alụ. Olee ebe mmadụ nwere ike isi chọta onye o nwere ike ịlụ? Ọ bụrụ na a machighị ndị mmadụ ịgbakọta ọnụ, Ndịàmà Jehova nwere ike ịhụ onye ha ga-alụ ma ha gaa ọmụmụ ihe, mgbakọ, na nnọkọ ndị ọzọ.

Ka unu abụọ na-anọkọ, unu ga-achọpụta ma ihe ndị unu chọrọ ime na ihe ndị unu ji kpọrọ ihe hà bụ otu

Mgbe ọ na-agaghị ekwe omume inwe nnọkọ ndị a, dị ka n’oge e nwere ọrịa koronavaịrọs, a na-eji ngwá elektrọniks enwe ọmụmụ ihe anyị. Ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịmata onwe ha n’ebe ahụ. I nwere ike ịhụ otú ha si eme n’ọmụmụ ihe, nụkwa ka ha na-aza ajụjụ. (1 Tim. 6:​11, 12) N’ụdị ebe ahụ, gị na ndị mmadụ nwere ike ikwu okwu n’ebe a na-ahazi ka mmadụ ole na ole kwurịta okwu ma a gbasaa ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na i si n’Ịntanet gaa nnọkọ Ndịàmà Jehova haziri, i nwere ike ịhụ otú onye i nwere mmasị n’ebe ọ nọ si emeso ndị ọzọ, si otú ahụ mata ụdị onye ọ bụ. (1 Pita 3:4) Ka oge na-aga, i nwere ike ịchọpụta ma ihe unu chọrọ ime na ihe unu ji kpọrọ ihe ọ̀ bụ otu, matakwa ma ihe ọ̀ ga-adabara unu.

Ọ bụrụ na ụmụnna na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye esi otú Baịbụl kwadoro chọta onye ha ga-alụ, o nwere ike ime ka ha nwee obi ụtọ n’ezinụlọ ha. Ọ ga-adị ka ihe a e kwuru n’Ilu, nke sịrị: “Onye lụtara ezigbo nwaanyị [ma ọ bụ di] nwetara ezigbo ihe, Jehova na-emekwara ya amara.”​—Ilu 18:22.