Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 28

Na-eme Udo Kama Ịna-akpata Ịma Aka

Na-eme Udo Kama Ịna-akpata Ịma Aka

“Ka anyị ghara ikwe ka onwe anyị na-ebu anyị isi, ghara ịna-amarịta aka, gharakwa ịna-enwere ibe anyị anyaụfụ.”​—GAL. 5:26.

ABỤ NKE 101 Anyị Na-arụkọ Ọrụ ma Dịrị n’Otu

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe ịma aka nwere ike ime ndị mmadụ?

N’ỤWA taa, ọtụtụ ndị na-achọkarị ịka ndị ọzọ. Ha anaghịkwa achọ ịma ihe ihe ha na-eme ga-akpatara ndị ọzọ. Onye na-azụ ahịa nwere ike ime ihe ga-akpatara ndị ọzọ nsogbu ka o nwee ike ịka ndị ọzọ. Onye na-eme egwuregwu nwere ike zọọ ibe ya ụkwụ ka o nwee ike merie n’asọmpi. Nwa akwụkwọ chọrọ ịba mahadum a ma ama nwere ike ghọọ aghụghọ n’ule ka o nwee ike ịbanye. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị ma na ihe ndị a dị njọ. Ha so n’ọrụ “ndị e ji mara anụ ahụ́.” (Gal. 5:​19-21) Ụfọdụ ụmụnna hà nwere ike ịna-achọ ka ha ka ndị ọzọ mma n’amaghị ama, na-emekwa ka ndị ọzọ na-eme otú ahụ? Ihe a bụ ajụjụ dị ezigbo mkpa n’ihi na ịma aka nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị ghara ịdị n’udo.

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’àgwà ndị nwere ike ime ka anyị chọwa ịka ụmụnna anyị mma. Anyị ga-ekwukwa gbasara ndị ji obi ha fee Chineke n’oge ochie na-achọghị ka ha ka ndị ọzọ. Ma, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe nwere ike ime ka anyị mee ihe ụfọdụ.

CHEBARA IHE I BU N’OBI ECHICHE

3. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

3 O kwesịrị anyị nọtụ, anyị echebara ihe anyị bu n’obi na-eme ihe ụfọdụ echiche. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Obi ọ̀ na-adị m mma naanị ma m chee na m ka ndị ọzọ mma? Ihe mere m ji agbasi mbọ ike n’ofufe Jehova ọ̀ bụ ka m ka mmadụ niile nọ n’ọgbakọ mma ma ọ bụkwanụ, ma e nweghị ihe ọzọ, ka e nwee nwanna m ka mma? Ka ihe m bu n’obi ọ̀ bụ naanị ime ike m niile n’ofufe Jehova?’ Gịnị mere anyị ji kwesị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a? Lee ihe Okwu Chineke kwuru.

4. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 6:​3, 4, gịnị mere na anyị ekwesịghị iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ?

4 Baịbụl gwara anyị ka anyị zere iji onwe anyị na-atụnyere ndị ọzọ. (Gụọ Ndị Galeshia 6:​3, 4.) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị echee na anyị ka nwanna anyị mma, o nwere ike ime ka anyị dịwa mpako. Ọ bụrụkwa na anyị echee na nwanna anyị ka anyị mma, o nwere ike ime ka anyị daa mbà. Nke ọ bụla n’ime ha adịghị mma. (Rom 12:3) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Katerina * bi na Gris sịrị: “M na-ejibu onwe m atụnyere ụmụnna ndị ka m maa mma, ndị ka m eme nke ọma n’ozi ọma, nakwa ndị ka m emeta ndị enyi. Ihe a mere ka m chee na e nweghị uru m bara.” Anyị kwesịrị icheta na ihe mere Jehova ji dọta anyị n’ebe ọ nọ abụghị na anyị mara mma, na anyị na-ekwu okwu nke ọma, ma ọ bụkwanụ na a ma anyị ama, kama, ọ bụ n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya, chọọkwa ige Ọkpara ya ntị.​—Jọn 6:44; 1 Kọr. 1:​26-31.

5. Olee ihe ị mụtara n’akụkọ Nwanna Hyun?

5 Ajụjụ ọzọ anyị nwere ike ịjụ onwe anyị bụ, ‘À ma m ama n’ọgbakọ ka onye na-eme udo ka ọ̀ bụ onye ya na ndị ọzọ na-esekarị okwu?’ Legodị ihe mere otu okenye aha ya bụ Hyun bi na Saụt Koria. E nwere otu oge ọ na-ele ụmụnna ndị nwere ọrụ n’ọgbakọ anya ka ndị ya na ha na-ama aka. Ọ sịrị: “M bịara na-akatọ ụmụnna ndị a. Anaghịkwa m ekweta ihe ndị ha kwuru.” Gịnị ka nke a kpatara? O kwuru, sị: “Ihe a m na-eme mere ka udo ghara ịdị n’ọgbakọ.” Ụfọdụ ndị enyi Hyun nyeere ya aka ịchọpụta nsogbu o nwere. Hyun gbanwere. Taa, ọ bụzi okenye na-eme nke ọma. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị na-achọkarị ka anyị na ndị ọzọ na-ama aka kama ịna-achọ ka udo dịrị, anyị kwesịrị ịgbanwe.

ADỊLA MPAKO MA Ọ BỤ NA-EMERE NDỊ ỌZỌ ANYAỤFỤ

6. Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 5:​26, olee àgwà ndị nwere ike ime ka mmadụ chọwa ịka ndị ọzọ mma?

6 Gụọ Ndị Galeshia 5:26. Olee àgwà ndị nwere ike ime ka mmadụ chọọ ịka ndị ọzọ mma? Otu n’ime ha bụ mpako. Onye dị mpako na-eche naanị gbasara onwe ya. Àgwà ọjọọ ọzọ bụ anyaụfụ. Onye anyaụfụ na-achọ inweta ihe onye ọzọ nwere, na-achọkwa ịnapụ ya ihe ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-emere mmadụ anyaụfụ kpọrọ ya asị. Anyị kwesịrị ịgbara àgwà ọjọọ ndị a ọsọ.

7. Olee ihe e nwere ike iji maa atụ nsogbu mpako na anyaụfụ nwere ike ịkpata?

7 E nwere ike iji àgwà ọjọọ ndị a bụ́ mpako na anyaụfụ tụnyere unyi dị ná mmanụ e ji akwọ ụgbọelu. Ụgbọelu ahụ nwere ike ifeli. Ma, unyi ndị ahụ nwere ike ịkpọchi ebe mmanụ si abanye na njin ụgbọelu ahụ, mee ka ọ ghara inwe ike ifedata ma kpọkaa. Mmadụ nwekwara ike malite ife Jehova. Ma ọ bụrụ na ihe mere o ji efe Jehova bụ n’ihi mpako ma ọ bụ anyaụfụ, ihe agaghị agaziri ya. (Ilu 16:18) Ọ ga-akwụsị ife Jehova. O nwekwara ike ịkpatara onwe ya na ndị ọzọ nsogbu. Ma, olee otú anyị ga-esi zere mpako na anyaụfụ?

8. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịdị mpako?

8 Ihe ga-enyere anyị aka ịlụso mpako ọgụ bụ iburu ihe Pọl onyeozi gwara ndị Filipaị n’obi. Ọ sịrị: “Unu esela okwu n’ihe ọ bụla unu na-eme ma ọ bụ kwe ka onwe unu na-ebu unu isi, kama dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.” (Fil. 2:3) Ọ bụrụ na anyị ana-ewere na ndị ọzọ ka anyị, anyị na ndị nwere nkà karịa anyị agaghị na-ama aka. Kama nke ahụ, obi ga-adị anyị ụtọ maka ya, karịchaa, ma ọ bụrụ na ha ji nkà ndị ahụ na-efe Jehova. Ọ bụrụkwa na ụmụnna anyị ndị ahụ nwere nkà ana-eme ihe ahụ Pọl kwuru, ha ga-achọpụta ebe anyịnwa na-eme nke ọma. Ihe a ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu.

9. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-emere ụmụnna anyị anyaụfụ?

9 Anyị agaghị na-emere ndị ọzọ anyaụfụ ma ọ bụrụ na anyị amara ebe ike anyị ruru. Ọ bụrụ na anyị ma ebe ike anyị ruru, anyị agaghị na-achọ igosi na anyị ka onye ọ bụla ọzọ nwee nkà ma ọ bụkwanụ na anyị ka ndị ọzọ mma. Kama nke ahụ, anyị ga na-achọ otú anyị ga-esi mụta ihe n’aka ndị nwere nkà karịa anyị. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na otu nwanna nọ n’ọgbakọ bụ ọkà n’ikwu okwu ihu ọha, anyị nwere ike ịjụ ya otú o si akwado okwu ya. Ọ bụrụ na e nwere nwanna nwaanyị nọ n’ọgbakọ ma esi nri nke ọma, anyị nwere ike ịjụta ya ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịna-esi nri nke ọma. Ọ bụrụ na e nwere nwanna na-eto eto ọ na-esiri ike imeta ndị enyi, o nwere ike ịgakwuru onye na-emeta ndị enyi nke ọma ka o nyere ya aka. Anyị na-eme ihe ndị a, anyị ga-ezere anyaụfụ, na-emekwa nke ọma.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ A KỌRỌ AKỤKỌ HA NA BAỊBỤL

Ihe mere Gidiọn ji mee ka ya na ndị Ifrem dịrị n’udo bụ na ọ dị umeala n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10 ruo na nke 12)

10. Olee nsogbu bịaara Gidiọn?

10 Legodị ihe mere n’etiti Gidiọn, bụ́ onye si n’ebo Manase, na ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem. Jehova nyeere Gidiọn na narị ụmụ nwoke atọ ya na ha so aka ha emerie n’agha, bụ́kwanụ ihe gaara eme ka ha dịwa mpako ma ọ bụrụ na ha chọrọ. Ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem bịakwutere Gidiọn ka ha sesa ya okwu kama ịja ya mma. Ihe mere ha ji wee iwe bụ na Gidiọn akpọghị ha mgbe ọ chọrọ ịga ịlụso ndị iro Chineke agha ka ha soro ya gaa. Ihe ka ha mkpa bụ ùgwù a ga-akwanyere ha, ya emee ka ha gharazie ịchọpụta ihe kacha mkpa, ya bụ, na Gidiọn mere ka e too aha Jehova ma zọpụta ndị ya.​—Ikpe 8:1.

11. Gịnị ka Gidiọn gwara ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem?

11 Gidiọn medara obi gwa ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem, sị: “Ihe m mere ò ruru ka ihe unu mere?” O chetaara ha ụzọ ndị Jehova si nyere ha aka ime ọtụtụ ihe. Ihe a meziri ka ‘obi jụrụ’ ha. (Ikpe 8:​2, 3) Gidiọn dị njikere iwetu onwe ya ala ka udo nwee ike ịdị n’etiti ndị Chineke.

12. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Gidiọn na ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem?

12 Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Anyị na-amụta n’aka ụmụ nwoke si n’ebo Ifrem na ihe kwesịrị ịka anyị mkpa abụghị ka a kwanyere anyị ùgwù, kama ka e too Jehova. Ndị isi ezinụlọ na ndị okenye ga-amụta ihe n’aka Gidiọn. Ọ bụrụ na ihe ha mere akpasuo nwanna iwe, ha kwesịrị ịgbalị ghọta ihe mere nwanna ahụ ji wee iwe. Ha nwekwara ike ịja onye ahụ mma maka ihe ndị ọ na-emeta. Umeala n’obi dị mkpa iji mee ihe a, karịchaa, ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ mere dị njọ. Ihe kacha mkpa bụ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo, ọ bụghị igosi na ihe anyị mere dị mma.

Obi ruru Hana ala n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14)

13. Olee nsogbu bịaara Hana, oleekwa ihe o mere gbasara ya?

13 Cheekwa gbasara ihe mere Hana. Di ya bụ onye Livaị aha ya bụ Elkena. Di ya hụkwara ya n’anya nke ukwuu. Ma, Elkena nwekwara nwunye ọzọ aha ya bụ Penina. Ọ hụrụ Hana n’anya karịa Penina. “Penina mụrụ ụmụ, ma Hana amụtaghị nwa ọ bụla.” N’ihi ya, Penina nọ na-akwa Hana emo “mgbe niile iji kpasuo ya iwe.” Gịnị ka Hana mere? O wutere ya nke ukwuu. “Ọ na-ebe ákwá, gharakwa iri nri.” (1 Sam. 1:​2, 6, 7) Ma, Baịbụl ekwughị na e nwere mgbe Hana chọrọ imegwara Penina ihe ndị o mere ya. Kama nke ahụ, ọ gwara Jehova otú obi dị ya, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-enyere ya aka. Penina ò mechara kwụsị ihe a ọ na-eme Hana? Baịbụl ekwughị otú ahụ. Ma, ihe anyị ma bụ na obi mechara ruo Hana ala. “Ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.”​—1 Sam. 1:​10, 18.

14. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Hana?

14 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Hana? Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ka gị na ya mawa aka, cheta na e nwere ihe ị ga-emeli gbasara ya. I kwesịghị ikwe ka gị na ya mawa aka. Kama iji ihe ọjọọ kwụọ ụgwọ ihe ọjọọ, gbalịa mee ka gị na ya mee udo. (Rom 12:​17-21) Ọ bụrụgodị na ọ gbanweghị, ị ka ga na-enwe obi ụtọ.

Apọlọs na Pọl onyeozi amaghị ibe ha aka n’ihi na ha chọpụtara na ọ bụ Jehova na-agọzi ọrụ ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 18)

15. Olee otú Apọlọs na Pọl si yie?

15 N’ikpeazụ, ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Apọlọs nakwa n’aka Pọl onyeozi. Ha abụọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Ha bụ ndị a ma ama, na-akụzikwa ihe nke ọma. Ha nyekwara aka mee ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Ma, ha amaghị ibe ha aka.

16. Olee ụdị mmadụ Apọlọs bụ?

16 Apọlọs bụ “onye Alegzandria,” bụ́ ebe a ma ama ndị mmadụ na-aga agụ akwụkwọ n’oge ndịozi. Ọ bụ ọkà n’ikwu okwu, “marakwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma.” (Ọrụ 18:24) Mgbe Apọlọs gara ileta ọgbakọ dị na Kọrịnt, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ mere ka o doo anya na ihe Apọlọs masịrị ha karịa nke ndị ọzọ, ma Pọl. (1 Kọr. 1:​12, 13) Apọlọs ọ̀ kwadoro ihe a nwere ike ịkpata nkewa? Mba. Mgbe oge ụfọdụ gachadịrị Apọlọs hapụrụ Kọrịnt, Pọl gbara ya ume ka ọ gaghachi ebe ahụ. (1 Kọr. 16:12) Pọl agaraghị eme otú ahụ ma ọ bụrụ na o chere na Apọlọs na-akpata nkewa n’ọgbakọ. Apọlọs ji nkà ndị o nwere na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ka ụmụnna sie ike n’okwukwe. O dokwara anya na Apọlọs dị umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, o nweghị mgbe Baịbụl kwuru na iwe were ya mgbe Akwịla na Prisila kọwakwuuru “ya eziokwu gbasara ụzọ Chineke.”​—Ọrụ 18:​24-28.

17. Olee otú Pọl si mee ka udo dịrị n’ọgbakọ?

17 Pọl onyeozi ma gbasara ọrụ ọma niile Apọlọs na-arụ. Ma, nke ahụ emeghị ka o chewe na Apọlọs ga-aka ya. Ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o zigaara ọgbakọ dị na Kọrịnt gosiri na Pọl dị umeala n’obi, mara ebe ike ya ruru, na-echekwa echiche nke ọma. Isi anaghị ebu ya ma ndị mmadụ na-asị, “Ana m eso ụzọ Pọl.” Kama, ọ na-eme ka ndị mmadụ na-eto Jehova na Jizọs.​—1 Kọr. 3:​3-6.

18. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 4:​6, 7, olee ihe Apọlọs na Pọl mere anyị na-amụta ihe na ya?

18 Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Apọlọs na Pọl? Anyị nwere ike ịna-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Anyị nwekwara ike inyere ọtụtụ ndị aka ka ha mee baptizim. Ma, anyị ma na ihe mere anyị ji nwee ike ime ihe ndị a bụ na Jehova na-enyere anyị aka. Ihe ọzọ anyị na-amụta n’akụkọ Apọlọs na Pọl bụ na ka anyị na-enwekwu ọrụ anyị na-arụ n’ọgbakọ, ka anyị na-enwekwu ohere anyị ga-eji eme ka udo dịrị n’ọgbakọ. Obi na-adị anyị ụtọ ma ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-enyere anyị aka ka anyị dịrị n’otu, dịrịkwa n’udo. Otú ha si eme ya bụ iji Baịbụl na-enye anyị ndụmọdụ. Ha anaghị achọ ka e were ha ka ndị ka mkpa, kama, ha na-enyere ndị niile nọ n’ọgbakọ aka ịna-erubere Jizọs isi nakwa ịna-eme ka ya.​—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 4:​6, 7.

19. Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Emela Ihe Ga-eme Ka Ndị Nọ n’Ọgbakọ Na-ama Aka.”)

19 E nwere nkà Jehova nyere onye ọ bụla n’ime anyị. Anyị nwere ike iji ya ‘na-ejere ibe anyị ozi.’ (1 Pita 4:10) Anyị nwere ike ịna-eche na ihe anyị na-emeli dị obere. Ma, anyị kwesịrị icheta na otú ahụ obere eri si adụkọta ákwà mee ka ọ maa mma, ka obere ihe anyị na-eme si eme ka ọgbakọ dịrị n’udo. Anyị niile kwesịrị ịgbalị ka anyị ghara ịna-eme ihe ga-eme ka o yie ka ànyị ka ndị ọzọ mma. Ka anyị kpebisie ike ịna-eme ike anyị niile ka ọgbakọ dịrị n’udo, dịrịkwa n’otu.​—Efe. 4:3.

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

^ par. 5 Ọ bụrụ na ite ájá enwee mgbawa na ya, ọ gaghị ara ahụ́ ya agbawaa. Otú ahụ ka ịma aka si eme ka ọgbakọ kewaa. Ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ adịghị n’otu, udo agaghị adị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere anyị kwesịrị iji zere ịna-ama aka nakwa ihe anyị ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ.

^ par. 4 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.