Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 27

Echela Banyere Onwe Gị Karịa Ka I Kwesịrị

Echela Banyere Onwe Gị Karịa Ka I Kwesịrị

“Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche; kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè.”—ROM 12:3.

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 2:3, olee otú ịdị umeala n’obi si eme ka anyị na ndị ọzọ dịrị ná mma?

ANYỊ na-erubere Jehova isi n’ihi na anyị ghọtara na ọ ma ihe ga-akacha baara anyị uru mgbe niile. (Efe. 4:22-24) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-ewere ya na ime uche Jehova dị mkpa karịa ime nke anyị, nakwa na ndị ọzọ ka anyị. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị na Jehova na ụmụnna anyị na-adị ná mma.—Gụọ Ndị Filipaị 2:3.

2. Olee ihe Pọl onyeozi ma, oleekwa ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, anyị nwere ike imewe ka ndị ụwa bụ́ ndị dị mpako na ndị na-eche naanị banyere onwe ha. * O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị n’oge ndịozi mewere otú ahụ n’ihi na Pọl onyeozi degaara ndị Rom akwụkwọ ozi, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche; kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè.” (Rom 12:3) Pọl ma na anyị kwesịrị iche banyere onwe anyị. Ma ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị na-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ụzọ ebe atọ ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịghara ịna-eche banyere onwe anyị karịa ka anyị kwesịrị. Ebe ndị ahụ bụ (1) n’alụmdi na nwunye anyị, (2) n’ọrụ anyị na-arụ n’ọgbakọ, nakwa (3) n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.

GOSI NA Ị DỊ UMEALA N’OBI N’ALỤMDI NA NWUNYE GỊ

3. Olee ihe nwere ike ime ka di na nwunye nwee nghọtahie, oleekwa ihe ndị ụfọdụ na-eme ma ha nwee nghọtahie?

3 Jehova chọrọ ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ. Ebe ọ bụ na e nweghị onye n’ime ha zuru okè, ha nwere ike inwe nghọtahie n’ihe ụfọdụ. Pọl kwudịrị na ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ụfọdụ nsogbu. (1 Kọr. 7:28) Ụfọdụ nwere ike iche na ebe ọ bụ na ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enwekarị nghọtahie, na ha ekwesịghị ịlụ. Ọ bụrụ na ha na-eche echiche ka ndị ụwa, ha nwere ike iche na ha kwesịrị ịgba alụkwaghịm. Ha nwere ike ichewe na ihe ga-eme ka ha nwee obi ụtọ bụ ịgba alụkwaghịm.

4. Gịnị ka anyị kwesịrị izere?

4 Anyị ekwesịghị iche na alụmdi na nwunye anyị akụọla afọ n’ala. Anyị ma na Baịbụl kwuru na naanị ihe nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm bụ ịkwa iko. (Mat. 5:32) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na di ma ọ bụ nwunye anyị enwee nghọtahie, anyị ekwesịghị ikwe ka mpako mee ka anyị chewe sị: ‘Di m ma ọ bụ nwunye m anaghị eche banyere m. Ọ hụghị m n’anya otú m chọrọ. Enwere m ike ịna-enwe obi ụtọ karịa ma ọ bụrụ onye ọzọ ka m lụrụ.’ Ọ bụrụ na anyị ana-eche otú ahụ, anyị na-eche naanị banyere onwe anyị, ọ bụghị banyere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị. Ndị ụwa na-ekwu na mmadụ kwesịrị ime ihe ọ bụla ga-eme ya obi ụtọ, ọ bụrụgodị ịgba alụkwaghịm. Ma Chineke gwara anyị na anyị kwesịrị ‘ịna-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe anyị, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.’ (Fil. 2:4) Jehova chọrọ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị biri, ọ bụghị ka unu tisaa. (Mat. 19:6) Ọ chọrọ ka i buru ụzọ na-eche ihe ga-adị ya mma, ọ bụghị onwe gị.

5. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 5:33, olee otú di na nwunye kwesịrị isi na-emeso ibe ha?

5 Di na nwunye kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. (Gụọ Ndị Efesọs 5:33.) Baịbụl kwuru ka anyị na-eche banyere ihe anyị ga-enye di anyị ma ọ bụ nwunye anyị, ọ bụghị ihe ọ ga-enye anyị. (Ọrụ 20:35) Olee àgwà ga-enyere di na nwunye aka ịhụ ibe ha n’anya na ịkwanyere ibe ha ùgwù? Ọ bụ ịdị umeala n’obi. Di na nwunye dị umeala n’obi anaghị achọ uru nke ha, “kama nke onye nke ọzọ.”—1 Kọr. 10:24.

Di na nwunye dị umeala n’obi kwesịrị ịna-enyere ibe ha aka kama ịna-ese okwu (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Steven na Stephanie kwuru?

6 Ịdị umeala n’obi enyerela ọtụtụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst aka ịna-enwekwu obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Steven kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu dị n’otu, unu ga na-emekọ ihe ọnụ, karịchaa mgbe unu nwere nsogbu. Kama ịna-eche gbasara ihe ga-adị gịnwa mma, ị ga na-eche ihe ga-adị unu mma.” Nwunye ya aha ya bụ Stephanie kwetara ihe a o kwuru. Ọ sịrị: “O nweghị onye chọrọ ka ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya na-esekarị okwu. Ọ bụrụ na anyị enwee nghọtahie, anyị na-agbalị chọpụta ihe kpatara ya. Anyị na-ekpezi ekpere, mee nchọnchọ ma kwurịta gbasara ya. Anyị na-agbalị idozi esemokwu ahụ, ọ bụghị isesa ibe anyị okwu.” Obi na-adị di na nwunye ụtọ ma ọ bụrụ na ha adịghị eche banyere onwe ha karịa ka ha kwesịrị.

JIRI ‘ỊDỊ UMEALA N’OBI ZURU EZU’ JEERE JEHOVA OZI

7. Olee àgwà nwanna nwoke kwesịrị ịna-akpa ma e nye ya ọrụ n’ọgbakọ?

7 Obi dị anyị ụtọ na anyị na-efe Jehova otú anyị nwere ike. (Ọma 27:4; 84:10) Ọ bụrụ na nwanna nwoke achọọ ijekwuru Jehova ozi, ọ dị mma. Baịbụl kwudịrị, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-agbalị ka o ruo eru ịbụ onye nlekọta, agụụ ezi ọrụ na-agụ ya.” (1 Tim. 3:1) Ma, ọ bụrụ na e nye ya ọrụ, o kwesịghị iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị. (Luk 17:7-10) Ihe kwesịrị ịbụ mkpa ya bụ iji umeala n’obi jeere ndị ọzọ ozi.—2 Kọr. 12:15.

8. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara Dayọtrefis, Ọzaya na Absalọm?

8 Baịbụl kọrọ gbasara ụfọdụ ndị chere gbasara onwe ha karịa ka ha kwesịrị. Dayọtrefis adịghị umeala n’obi. Nke a mere ka ọ chọọ “ịnọ n’ọkwá mbụ” n’ọgbakọ. (3 Jọn 9) Mpako mere ka Ọzaya chọọ ịrụ ọrụ Jehova na-enyeghị ya. (2 Ihe 26:16-21) Absalọm chọrọ ịbụ eze. N’ihi ya, o mere ka ndị mmadụ chee na ọ hụrụ ha n’anya ka ha nwee ike ịkwado ya. (2 Sam. 15:2-6) Akụkọ Baịbụl ndị a mere ka anyị ghọta na ihe ndị na-achọrọ onwe ha otuto anaghị amasị Jehova. (Ilu 25:27) Ka oge na-aga, ndị dị mpako na ndị na-achọ ka e too ha ga-enwe nsogbu.—Ilu 16:18.

9. Olee ihe Jizọs mere anyị kwesịrị ịna-eme?

9 Jizọs adịghị ka ndị a dị mpako. Baịbụl kwuru na ọ “dịrị n’ụdị Chineke, ma o cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke.” (Fil. 2:6) N’agbanyeghị na ọ bụ naanị Jehova ka ya ike, o cheghị banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.” (Luk 9:48) Obi dị anyị ụtọ na anyị na ndị ọsụ ụzọ, ndị ohu na-eje ozi, ndị okenye na ndị nlekọta sekit dị umeala n’obi ka Jizọs so na-efe Jehova. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị ga-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. Jizọs kwukwara na ezi ndị ohu Jehova ga-ahụ ibe ha n’anya.—Jọn 13:35.

10. Gịnị ka i kwesịrị ime ma i chee na e nwere nsogbu a na-enwebeghị ihe e mere gbasara ya n’ọgbakọ?

10 Ọ bụrụkwanụ na o yie ka è nwere nsogbu n’ọgbakọ, gị echee na e nwebeghị ihe ndị okenye mere gbasara ya? Kama imewe mkpesa, na-erubere ndị na-edu ndú isi. Ọ ga-egosi na ị dị umeala n’obi. (Hib. 13:17) Ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Nsogbu a ọ̀ dị oké njọ nke na e kwesịrị ime ihe gbasara ya? Ihe a ọ̀ bụ oge e kwesịrị ime ihe gbasara ya? Ọ̀ bụ mụnwa kwesịrị ime ihe gbasara ya? Ịgwa onwe m nke bụ́ eziokwu, m̀ na-agbalị ime ka udo dịrị n’ọgbakọ, ka m̀ na-agbalị ibuli onwe m elu?’

Ihe e kwesịrị iji amara ụmụnna ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ abụghị naanị nkà ndị ha nwere, e kwesịkwara ịmara ha ka ndị dị umeala n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:2, 3, olee ihe ga-eme ma anyị jiri umeala n’obi na-ejere Jehova ozi?

11 Ihe ka Jehova mkpa abụghị nkà anyị nwere, kama ọ bụ anyị ịdị umeala n’obi. Anyị ịdị n’otu dịkwa ya mkpa karịa anyị ịrụzu ọtụtụ ihe. N’ihi ya, gbalịa jiri umeala n’obi na-ejere Jehova ozi. I mee otú ahụ, ị na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ. (Gụọ Ndị Efesọs 4:2, 3.) Jiri ozi ọma kpọrọ ihe. Na-emere ndị mmadụ ihe ọma. Na-emesapụrụ mmadụ niile aka, ma ndị na-enweghị ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ. (Mat. 6:1-4; Luk 14:12-14) Ọ bụrụ na anyị ejiri umeala n’obi soro ụmụnna anyị na-efe Jehova, ha ga-achọpụta nkà ndị anyị nwere, chọpụtakwa na anyị dị umeala n’obi.

GOSI NA Ị DỊ UMEALA N’OBI N’EBE A NA-EZIRỊTA OZI N’ỊNTANET

12. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara imeta ndị enyi?

12 Jehova chọrọ ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị na-anọrị. (Ọma 133:1) Jizọs nwere ezigbo ndị enyi. (Jọn 15:15) Baịbụl kọwara uru anyị ga-erite ma anyị nwee ezigbo ndị enyi. (Ilu 17:17; 18:24) Ọ gwara anyị na ọ dịghị mma ka anyị na-akpa iche. (Ilu 18:1) Ọtụtụ ndị chere na imeta ndị enyi n’Ịntanet ga-eme ka ha nwee ọtụtụ ndị enyi ga-eme ka owu ghara ịna-ama ha. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.

13. Gịnị mere owu ji ama ụfọdụ ndị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, obi ana-ajọkwa ha njọ?

13 Nchọpụta e mere gosiri na owu nwere ike ịna-ama ndị na-anọkarị na-ele ihe ndị mmadụ dere na foto ndị mmadụ tinyere n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, obi ana-adakwa ha mbà. N’ihi gịnị? Otu ihe nwere ike ịkpata ya bụ na foto ndị mmadụ na-etinyekarị n’Ịntanet bụ foto ndị na-egosi ihe ndị kacha mee ha obi ụtọ, foto ha na ndị enyi ha ndị kacha maa mma, na ebe ndị mara mma ha gatụrụla. Onye lee foto ndị ahụ, o nwere ike ichewe na ndụ ha ka nke ya mma ma ọ bụkwanụ na e nweghị ezigbo ihe na-eme obi ụtọ ọ na-eme ná ndụ ya. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na itoolu kwuru, sị: “Obi na-ajọ m njọ ma m hụ foto ndị ọzọ tinyere ebe ha na-ekpori ndụ ná ngwụcha izu, ebe mụnwa nọ n’ụlọ n’enweghị ihe m na-eme.”

14. Olee otú ihe e kwuru na 1 Pita 3:8 ga-esi nyere anyị aka ma anyị nọrọ n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet?

14 N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe anyị nwere ike iji ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet mee, dị ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị iji ya na-akparịta. Ma, ị̀ chọpụtala na ihe ndị mmadụ na-etinye n’ebe ahụ bụ ihe ndị ha ji eme ka ndị mmadụ na-enwe mmasị n’ebe ha nọ? O yiri ka hà ji ya eme ka ndị mmadụ mata na ha sokwa biri. Ụfọdụ na-ekwu ihe ndị na-adịghị mma gbasara foto ha ma ọ bụ nke ndị ọzọ tinyere. A gwara Ndị Kraịst ka ha dịrị umeala n’obi nakwa ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. N’ihi ya, ha ekwesịghị ime ụdị ihe ndị a n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.—Gụọ 1 Pita 3:8.

Ihe ndị ị na-etinye n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet ọ̀ na-egosi na ị na-ebuli onwe gị elu ka ọ̀ bụ na ị dị umeala n’obi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka ịghara ịna-ebuli onwe anyị elu?

15 Ọ bụrụ na ị na-aga n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m na-ede, foto ma ọ bụ vidio ndị m na-etinye n’ebe ahụ, ọ̀ na-egosi na m na-ebuli onwe m elu? Ò nwere ike ime ka ndị ọzọ mewere m anyaụfụ? Baịbụl sịrị: “Ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ, esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.” (1 Jọn 2:16) Otú otu Baịbụl si sụgharịa “oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ” bụ “mmadụ ịchọ ka ndị mmadụ were ya ka onye dị mkpa.” Ndị Kraịst ekwesịghị ịchọ ibuliwe onwe ha elu. Ha na-eme ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́: “Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.” (Gal. 5:26) Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghara ịna-ebuli onwe anyị elu ma ọ bụ na-achọ ime ka ndị mmadụ na-ewere anyị ka ndị dị mkpa.

“NA-ECHE ECHICHE IJI NWEE UCHE ZURU OKÈ”

16. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịdị mpako?

16 Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi n’ihi na ndị dị mpako enweghị “uche zuru okè.” (Rom 12:3) Ndị dị mpako na-esekarị okwu, onwe ha na-ebukwa ha isi. Ihe ndị ha na-eche na ihe ndị ha na-eme na-akpatara ha na ndị ọzọ nsogbu ọtụtụ mgbe. Ọ bụrụ na ha agbanweghị otú ha si eche echiche, Setan ga-emerụ uche ha, meekwa ka o kpuo ìsì. (2 Kọr. 4:4; 11:3) Ma, onye dị umeala n’obi na-enwe uche zuru okè. Ọ na-ele onwe ya anya otú kwesịrị ekwesị, marakwa na e nwere ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ si ka ya. (Fil. 2:3) Ọ makwa na “Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.” (1 Pita 5:5) Ndị nwere uche zuru okè achọghị ka Jehova bụrụ onye iro ha.

17. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-adị umeala n’obi?

17 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị umeala n’obi, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl gwara anyị, nke bụ́: “Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ.” Anyị ga-agba ezigbo mbọ iji mee ya. Anyị kwesịrị ịmụ banyere Jizọs ma gbalịa ime ka ya otú anyị nwere ike. (Kọl. 3:9, 10; 1 Pita 2:21) Mbọ ọ bụla anyị gbara iji mee ya agaghị efu ọhịa. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, ezinụlọ anyị ga-enwe obi ụtọ, ọgbakọ ga-adịkwu n’otu, anyị agaghịkwa eji ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet eme ka ndị mmadụ lewe anyị anya ka ndị dị mkpa ma ọ bụ nwewe mmasị n’ebe anyị nọ. Nke kachanụ bụ na Jehova ga-agọzi anyị, anyị na ya adịrịkwa ná mma.

ABỤ NKE 117 Ịdị Mma

^ par. 5 Ndị juru n’ụwa a anyị bi na ya taa bụ ndị mpako na ndị na-eche naanị gbasara onwe ha. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịna-eme ka ha. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ ebe atọ anyị kwesịrị izere iche banyere onwe anyị karịa ka anyị kwesịrị iche.

^ par. 2 NKỌWAKWU: Onye dị mpako na-echekarị banyere onwe ya karịa ka ọ na-eche banyere ndị ọzọ. Onye dị mpako na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ma, ịdị umeala n’obi na-eme ka mmadụ na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru. Onye dị umeala n’obi anaghị adị nganga ma ọ bụ mpako, ọ naghịkwa eche na ya ka ndị ọzọ.

^ par. 56 NKỌWA FOTO: Otu okenye so ná ndị na-ekwu okwu ná mgbakọ, na-eduzikwa ọrụ ndị ọzọ a na-arụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ na-eduzi nzukọ ozi ubi, sorokwa na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha.