Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 28

Ka Obi Sie Gị Ike na Ihe I Kweere Bụ Eziokwu

Ka Obi Sie Gị Ike na Ihe I Kweere Bụ Eziokwu

“Nọgide n’ihe ndị ị mụtara, ndị e mekwara ka i kwere.” —2 TIM. 3:14.

ABỤ NKE 56 Ka Eziokwu Bamie Gị n’Obi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “eziokwu” pụtara?

Ị̀ NỤTỤLA okwu ahụ bụ́ “eziokwu” n’ọnụ ụmụnna? O nwekwara ike ịbụ na gịnwa ekwutụla ya. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “eziokwu” pụtara? Anyị na-ejikarị ya akọwa ihe ndị anyị kweere, otú anyị si efe Chineke, na otú anyị si ebi ndụ. Ndị nọ “n’eziokwu” ma ihe Baịbụl na-akụzi, na-emekwa ya eme ná ndụ ha. N’ihi ya, ha anaghịzi ekwere ozizi ụgha ndị okpukpe na-akụzi. N’agbanyeghị na ha nọ n’ụwa Ekwensu, ha na-enwe obi ụtọ otú ha nwere ike.—Jọn 8:32.

2. Dị ka e kwuru na Jọn 13:34, 35, olee ihe mbụ nwere ike ime ka mmadụ nwewe mmasị n’eziokwu?

2 Olee ihe mbụ mere i ji nwewe mmasị n’eziokwu? O nwere ike ịbụ àgwà ọma ndị na-efe Jehova. (1 Pita 2:12) O nwekwara ike ịbụ otú ha si hụ ndị ọzọ n’anya. Ọtụtụ ndị bịara ọmụmụ ihe na nke mbụ ha na-achọpụtakwa ya. Ọ bụkwa ya ka ha na-echeta karịa ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe ahụ. Ihe a ejughị anyị anya n’ihi na Jizọs kwuru na ihe a ga-eji mara ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-ahụ ibe ha n’anya. (Gụọ Jọn 13:34, 35.) Ma, e nwekwara ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị sie ike.

3. Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ihe mere anyị ji nwee okwukwe bụ naanị n’ihi na ụmụnna anyị hụrụ ibe ha n’anya?

3 Ọ bụghị naanị otú ndị Chineke si hụ ibe ha n’anya kwesịrị ime ka anyị nwee okwukwe. N’ihi gịnị? Ka e were ya na nwanna, ọ bụrụgodị okenye ma ọ bụ ọsụ ụzọ, mere mmehie dị oké njọ, ma ọ bụ na nwanna mere gị ihe na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ na e nwere nwanna dapụrụ n’ọgbakọ ma na-ekwu na ihe anyị kweere abụghị eziokwu. Ụdị ihe ndị a mee, ị̀ ga-asụ ngọngọ ma kwụsị ife Jehova? Ihe anyị na-amụta bụ: Ọ bụrụ na ihe mere i ji nwee okwukwe na Chineke bụ naanị maka otú ndị ọzọ si akpa àgwà kama ịbụ na gị na Chineke dị ná mma, okwukwe gị agaghị esi ike. Otú i si hụ Jehova na ndị ya n’anya nwere ike inyetụrụ gị aka inwe okwukwe. Ma, ọ dịkwa ezigbo mkpa ka ị mụọ Baịbụl nke ọma, ghọta ihe ị na-amụ, meekwa nchọnchọ ka o doo gị anya na ihe ị na-amụta gbasara Jehova bụ eziokwu. Obi kwesịrị isi gị ike na ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jehova bụ eziokwu.—Rom 12:2.

4. Dị ka e kwuru na Matiu 13:3-6, 20, 21, olee ihe ụfọdụ ndị na-eme ma nsogbu bịara ha?

4 Jizọs kwuru na ụfọdụ nwere ike iji “ọṅụ” nabata eziokwu ahụ. Ma ọ bụrụ na nsogbu abịara ha, okwukwe ha anyụọ ka ọkụ. (Gụọ Matiu 13:3-6, 20, 21.) O nwere ike ịbụ n’ihi na ha amaghị na nsogbu na-abịara ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Mat. 16:24) O nwekwara ike ịbụ na ha chere na ebe ha bụ Ndị Kraịst, nsogbu ọ bụla agaghị abịara ha ma ọ bụ na Chineke ga-ewepụrụ ha nsogbu ha niile. Ma ebe anyị ka bi n’ụwa Ekwensu, nsogbu ga na-abịara anyị. Ihe nwere ike ịgbanwere anyị, mee ka anyị gharazie ịna-enwe obi ụtọ.—Ọma 6:6; Ekli. 9:11.

5. Olee otú ọtụtụ ụmụnna anyị si egosi na obi siri ha ike na ihe ha kweere bụ eziokwu?

5 Ọtụtụ ụmụnna anyị na-egosi na obi siri ha ike na ihe ha kweere bụ eziokwu. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Ha anaghị amalite inwe obi abụọ ọ bụrụgodị na nwanna akpasuo ha iwe ma ọ bụ mee ihe ọjọọ. (Ọma 119:165) Nsogbu ọ bụla bịaara ha na-eme ka okwukwe ha sikwuo ike kama ime ka ọ nyụọ ka ọkụ. (Jems 1:2-4) Gịnị ga-enyere gị aka inwe ụdị okwukwe ahụ?

NWETA “EZI IHE ỌMỤMA NKE CHINEKE”

6. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ndịozi ji nwee okwukwe?

6 Ihe mere ka okwukwe ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge ndịozi sie ike bụ ihe ha mụtara n’Akwụkwọ Nsọ na ihe ndị Jizọs Kraịst kụziri, ya bụ, “eziokwu nke ozi ọma ahụ.” (Gal. 2:5) Eziokwu ahụ bụ ihe niile Ndị Kraịst kweere ma àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ma mbilite n’ọnwụ ya. Obi siri Pọl onyeozi ike na nkụzi ndị a bụ eziokwu. N’ihi gịnị? N’ihi na o ji “ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ, ka o sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” (Ọrụ 17:2, 3) Ndị Kraịst n’oge ndịozi kwetakwara n’ihe ndị ahụ. Ha kwekwara ka mmụọ nsọ nyere ha aka ịghọta Okwu Chineke. Ha mekwara nchọnchọ iji mee ka obi sie ha ike na ihe ndị a kụziiri ha si n’Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 17:11, 12; Hib. 5:14) Ihe mere ka ha nwee okwukwe abụghị naanị n’ihi otú obi dị ha. Ihe mekwara ka ha na-efe Jehova abụghị naanị n’ihi na obi na-adị ha ụtọ ma ha na ụmụnna ha nọrọ. Kama, ihe mere ha ji nwee okwukwe bụ n’ihi na ha nwere “ezi ihe ọmụma nke Chineke.”—Kọl. 1:9, 10.

7. Gịnị ka okwukwe anyị nwere n’eziokwu ndị dị na Baịbụl ga-emere anyị?

7 Eziokwu dị n’Okwu Chineke anaghị agbanwe agbanwe. (Ọma 119:160) Dị ka ihe atụ, ha anaghị agbanwe ma nwanna mee anyị ihe ọjọọ ma ọ bụ mee mmehie dị oké njọ. Ha anaghịkwa agbanwe ma nsogbu bịara anyị. N’ihi ya, eziokwu ndị Baịbụl na-akụzi kwesịrị ido anyị anya, obi esiekwa anyị ike na ha bụ eziokwu. Ọ bụrụ na okwukwe anyị nwere n’eziokwu ndị dị na Baịbụl abụrụ a kwaa a kwụrụ, ọ ga-eme ka anyị kwụsie ike ma nsogbu bịara anyị otú ahụ arịlịka si eme ka ụgbọ mmiri kwụsie ike mgbe ajọ ifufe na-efe. Gịnị ka ị ga-eme ka obi sie gị ike na ihe i kweere bụ eziokwu?

MEE KA OBI SIE GỊ IKE NA IHE NDỊ I KWEERE BỤ EZIOKWU

8. Dị ka e kwuru na 2 Timoti 3:14, 15, gịnị mere ka obi sie Timoti ike na ihe o kweere bụ eziokwu?

8 Obi siri Timoti ike na ihe ọ mụtara bụ eziokwu. Olee otú o si mata? (Gụọ 2 Timoti 3:14, 15.) Nne ya na nne nne ya bụ ndị mbụ mere ka ọ mata “ihe odide ndị ahụ dị nsọ.” Ma, o doro anya na yanwa wepụtara oge, gbaakwa mbọ mụọ ha. Ihe a mere ka o “kwere” na ihe ndị ahụ bụ eziokwu. Ka oge na-aga, Timoti, nne ya na nne nne ya, mụtara ihe Ndị Kraịst na-akụzi. O doro anya na otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si hụ ibe ha n’anya masịrị Timoti, ya achọsiekwa ike ka ya na ụmụnna ya na-emekọ ihe nakwa ịna-enyere ha aka. (Fil. 2:19, 20) Ma, ihe mere ka okwukwe ya sie ike abụghị otú o si hụ ndị mmadụ n’anya, kama, ọ bụ n’ihi na obi siri ya ike na ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl bụ eziokwu. Ihe a mere ka ya na Jehova dịrị ná mma. Gịnwa kwesịkwara ịmụ Baịbụl ka o doo gị anya na ihe ndị ọ na-akụzi banyere Jehova bụ eziokwu.

9. Olee eziokwu atọ dị mkpa i kwesịrị ime ka obi sie gị ike na ha?

9 Iji malite, e nwere eziokwu atọ dị mkpa i kwesịrị ime ka obi sie gị ike na ha. Nke mbụ, obi kwesịrị isi gị ike na ọ bụ Jehova Chineke kere ihe niile. (Ọpụ. 3:14, 15; Hib. 3:4; Mkpu. 4:11) Nke abụọ, obi kwesịrị isi gị ike na ihe dị na Baịbụl bụ ihe Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ mata. (2 Tim. 3:16, 17) Nke atọ, obi kwesịrị isi gị ike na e nwere ndị Jehova haziri na-efe ya, na ọ bụ Jizọs na-eduzi ha, nakwa na ndị ahụ bụ Ndịàmà Jehova. (Aịza. 43:10-12; Jọn 14:6; Ọrụ 15:14) Ime ka obi sie gị ike na ihe ndị a bụ eziokwu apụtaghị na ị ga-ebu ihe niile dị na Baịbụl n’isi. Mkpa gị kwesịrị ịbụ iji “ike iche echiche” gị mee ka obi sie gị ike na ihe ndị i kweere bụ eziokwu.—Rom 12:1.

DỊRỊ NJIKERE IME KA NDỊ ỌZỌ KWETA

10. Olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime, e wezụga ịmata nke bụ́ eziokwu?

10 Obi sichaa gị ike na ihe atọ ndị ahụ anyị kwuru banyere Chineke, Baịbụl na ndị Chineke bụ eziokwu, i kwesịkwara ịma otú ị ga-esi jiri Baịbụl gosi ndị mmadụ na ha bụ eziokwu. N’ihi gịnị? N’ihi na ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị nwere ọrụ ịkụziri ndị chọrọ ige anyị ntị eziokwu ndị anyị mụtara. * (1 Tim. 4:16) Ọ bụrụ na anyị ana-agbalị ime ka obi sie ndị ọzọ ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu, obi ga na-esikwukwa anyịnwa ike.

11. Olee otú Pọl si kụziere ndị mmadụ ihe, oleekwa otú anyị nwere ike isi na-eme ka ya?

11 Mgbe Pọl onyeozi na-akụziri ndị mmadụ ihe, o si “n’iwu Mozis nakwa n’Akwụkwọ Ndị Amụma” gwa ha “okwu na-eru n’obi banyere Jizọs.” (Ọrụ 28:23) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl ma anyị kụziwere ndị mmadụ eziokwu? Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ihe Baịbụl kwuru. Anyị kwesịrị inyere ha aka ịmụ ihe nke ọma na ichebara ihe ha na-amụta na Baịbụl echiche. Ihe mere anyị ji chọọ ka ha mụta eziokwu abụghị n’ihi na ha nwere mmasị n’ebe anyị nọ, kama n’ihi na ha amụọla ihe nke ọma ma ghọta na ihe ha na-amụta gbasara Chineke anyị hụrụ anyị n’anya bụ eziokwu.

Ndị nne na nna, na-akụzirinụ ụmụ unu “ihe ndị miri emi nke Chineke.” Ihe a ga-eme ka okwukwe ha sie ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13) *

12-13. Olee otú ndị nne na nna nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ịnọsi ike n’eziokwu?

12 Ndị nne na nna, o doro anya na unu chọrọ ka ụmụ unu nọsie ike n’eziokwu. I nwere ike ịna-eche na ọ bụrụ na ha enwee ezi ndị enyi n’ọgbakọ, okwukwe ha ga-esi ezigbo ike. Ma, ọ bụghị naanị inwe ezigbo ndị enyi ga-eme ka obi sie ha ike na ihe ha na-amụ bụ eziokwu. Ha kwesịrị ime ka ha na Chineke dịrị ná mma, obi esiekwa ha ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu.

13 Ọ bụrụ na ndị nne na nna chọrọ ịkụziri ụmụ ha eziokwu banyere Chineke, hanwa kwesịrị ịna-amụ Baịbụl nke ọma. Ha kwesịrị iwepụta oge na-atụgharị uche n’ihe ha na-amụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-enwe ike ịkụziri ụmụ ha ịna-eme ka ha. Ha kwesịrị ịna-akụziri ụmụ ha otú e si eji ihe ndị e ji eme nchọnchọ eme nchọnchọ otú ahụ ha si akụziri ndị ha na-amụrụ Baịbụl. Ha ga-esi otú a nyere ụmụ ha aka ịhụ Jehova n’anya, meekwa ka obi sie ha ike na ọ bụ n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ka Jehova si enyere anyị aka ịghọta Baịbụl. (Mat. 24:45-47) Ndị nne na nna, ihe unu ga na-eme abụghị naanị ịkụziri ụmụ unu ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi. Na-akụzirinụ ha “ihe ndị miri emi nke Chineke” otú ha nwere ike ịghọta dabere n’afọ ole ha dị. Ihe a ga-eme ka okwukwe ha sie ike.—1 Kọr. 2:10.

NA-AMỤ AMỤMA BAỊBỤL

14. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụ banyere amụma ndị dị na Baịbụl? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ì Nwere Ike Ịkọwa Amụma Ndị A?”)

14 Ihe ọzọ na-eme ka okwukwe anyị sie ike bụ amụma ndị dị na Baịbụl. Olee amụma ndị mere ka okwukwe gị sikwuo ike? I nwere ike ikwu na ọ bụ ndị nke kwuru ihe ndị ga-eme “n’oge ikpeazụ.” (2 Tim. 3:1-5; Mat. 24:3, 7) Ma, olee amụma ndị ọzọ mezurulanụ nwere ike ime ka okwukwe gị sikwuo ike? Dị ka ihe atụ, ì nwere ike ịkọwa otú amụma ndị e dere na Daniel isi abụọ ma ọ bụ na Daniel isi iri na otu si mezuo nakwa otú ha si na-emezu taa? * Ọ bụrụ na ihe mere i ji nwee okwukwe bụ n’ihi ihe ị mụtara na Baịbụl, okwukwe gị ga-abụ a kwaa a kwụrụ. Ka anyị kwuo gbasara ụmụnna anyị ndị tara ezigbo ahụhụ na Jamanị n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Ọ bụ eziokwu na ha aghọtachaghị amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara oge ikpeazụ, okwukwe ha siri ike n’Okwu Chineke.

Ịmụ Baịbụl na amụma ndị dị na ya ga-eme ka anyị nwee obi ike ma nsogbu bịara anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 17) *

15-17. Olee otú ịmụ Baịbụl si mee ka okwukwe ụmụnna anyị ndị Nazi kpagburu sie ike?

15 Mgbe ndị Nazi na-achị Jamanị, a tụbara ọtụtụ puku ụmụnna anyị n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Hitler na otu onye nọ n’ọkwá ukwu n’ọchịchị ya aha ya bụ Chief Heinrich Himmler kpọrọ Ndịàmà Jehova asị. Otu nwanna nwaanyị kwuru na Himmler gwara ụmụnna nwaanyị nọ n’otu ogige ịta ahụhụ, sị: “Jehova unu nwere ike ịna-achị n’eluigwe. Ma n’ụwa ebe a, ọ bụ anyịnwa na-achị. Anyị ga-ama n’ime anyị na unu ndị ga-anọte aka n’obodo a.” Gịnị nyeere ha aka ịtachi obi?

16 Ndị Mmụta Baịbụl ndị ahụ ma na Alaeze Chineke malitere ịchị n’afọ 1914. O jughị ha anya na a na-akpagbu ha. Ma, obi siri ha ike na o nweghị ọchịchị mmadụ ga-akwụsịli Chineke imezu nzube ya. Hitler ekpochapụlighị ndị na-efe Chineke ma ọ bụ mee ka e nwee ọchịchị ka Alaeze Chineke ike. Obi siri ụmụnna anyị ike na ọchịchị Hitler ga-emecha kwụsị.

17 Ihe ahụ ụmụnna anyị kwetara mechara mezuo. Ọ dịghị anya, ọchịchị ndị Nazi akụọ afọ n’ala. Heinrich Himmler, bụ́ onye sịrị, “N’ụwa ebe a, ọ bụ anyịnwa na-achị,” gbara ọsọ ndụ. Mgbe ọ na-agba ọsọ ndụ ahụ, o zutere Nwanna Lübke, bụ́ onye nọbu n’ụlọ mkpọrọ. Ọ matara nwanna a. Obi dara ya mbà, ya ajụọ Nwanna Lübke, sị: “Eem, Onye Mmụta Baịbụl, gịnị ga-emezi ugbu a?” Nwanna Lübke kọwaara ya na Ndịàmà Jehova ma na ọchịchị ndị Nazi ga-emecha daa, nakwa na ha ga-emecha nwere onwe ha. Himmler, bụ́ nwoke kwuru ọtụtụ okwu ọjọọ banyere Ndịàmà Jehova, enweghịzi ọnụ okwu. O teghị aka, ya egbuo onwe ya. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ a? Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Baịbụl na amụma ndị dị na ya, okwukwe anyị nwere na Chineke ga-esi ike, anyị ga-enwekwa obi ike ma a kpagbuwe anyị.—2 Pita 1:19-21.

18. Dị ka e kwuru na Jọn 6:67, 68, gịnị mere anyị ji kwesị inwe “ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu” Pọl kwuru okwu ya?

18 Anyị niile kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya iji gosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst. Ma anyị kwesịkwara inwe “ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.” (Fil. 1:9) Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ịbụ “ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị, site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ,” ma nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. (Efe. 4:14) Mgbe ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsịrị iso Jizọs, Pita onyeozi ji obi ike kwuo na Jizọs nwere “okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Gụọ Jọn 6:67, 68.) N’agbanyeghị na Pita aghọtachaghị ihe niile Jizọs na-ekwu mgbe ahụ, ọ kwụsịghị iso Jizọs n’ihi na ọ matala ihe bụ́ eziokwu gbasara Jizọs. I nwekwara ike ime ka obi sie gịnwa ike na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. I mee otú ahụ, okwukwe gị ga-esi ike n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Ị ga-enyekwara ndị ọzọ aka ka okwukwe ha sie ike.—2 Jọn 1, 2.

ABỤ NKE 72 Anyị Na-eme Ka A Mara Eziokwu Alaeze

^ par. 5 Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịghọta na eziokwu ndị dị na Baịbụl dị ezigbo mkpa. Ọ ga-ekwukwa otú anyị ga-esi mee ka obi sie anyị ike na ihe ndị anyị kweere bụ eziokwu.

^ par. 10 Iji nyere gị aka ịma ihe ị ga-agwa ndị mmadụ banyere ihe ndị Baịbụl na-akụzi, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Nwere Ike Ịkparịta,” nke gbara n’Ụlọ Nche malite n’afọ 2010 ruo afọ 2015. Ụfọdụ ajụjụ ndị a zara na ya bụ “Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?,” “Olee Mgbe Alaeze Chineke Malitere Ịchị?,” na “Chineke Ọ̀ Na-ata Ndị Ajọ Omume Ahụhụ n’Ọkụ Ala Mmụọ?

^ par. 14 Gụọ Ụlọ Nche Jun 15, 2012 na nke Mee 2020 ka ị hụ otú e si kọwaa amụma ndị a.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe nne na nna na ụmụ ha na-amụ amụma gbasara oké mkpagbu n’ofufe ezinụlọ ha.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: N’oge oké mkpagbu, ihe ndị ga-emenụ agaghị eju ha anya.