Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 30

Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ

Na-eje Ije n’Eziokwu Ahụ

“Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 JỌN 4.

ABỤ NKE 54 “Lekwa Ụzọ”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Dị ka e kwuru na 3 Jọn 3, 4, gịnị na-eme anyị obi ụtọ?

Ì NWERE ike iche ụdị obi ụtọ Jọn onyeozi nwere mgbe ọ nụrụ na ndị o nyeere aka ịmụta eziokwu ka ji obi ha niile na-efe Jehova? Ọtụtụ nsogbu bịaara ha. Jọn gbasiri mbọ ike ime ka okwukwe ndị a ji obi ha niile na-efe Jehova, ndị o wekwaara ka ụmụ ya, sie ike. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma ụmụ anyị ma ọ bụ ndị anyị nyeere aka ịmata eziokwu nyefee Jehova onwe ha ma nọgide na-efe ya.—Gụọ 3 Jọn 3, 4.

2. Gịnị mere Jọn ji dee akwụkwọ ozi ndị ahụ?

2 N’afọ 98, o nwere ike ịbụ na Jọn bi nso n’Efesọs. O nwere ike ịbụ na ọ kwagara ebe ahụ mgbe a tọhapụrụ ya na mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs. N’oge ahụ, mmụọ nsọ Jehova mere ka o dee akwụkwọ ozi atọ. Ihe mere o ji dee ha bụ iji ha mee ka okwukwe Ndị Kraịst ji obi ha na-efe Chineke sie ike na Jizọs nakwa ka ha nọgide na-eje ije n’eziokwu.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

Jọn bụ onye nke ikpeazụ dịrị ndụ n’ime ndịozi niile. Ihe nọ na-eme ya ụra aga n’anya bụ otú ndị ozizi ụgha si na-achọ imegharị ndị nọ n’ọgbakọ anya. * (1 Jọn 2:18, 19, 26) Ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ na-azọrọ na ha maara Chineke, ma ha anaghị edebe iwu Chineke. Ka anyị tụlee ndụmọdụ Jọn si n’ike mmụọ nsọ nye ha. Ka anyị na-atụle ha, anyị ga-aza ajụjụ atọ ndị a: Gịnị ka ije ije n’eziokwu pụtara? Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ije ije n’eziokwu? Oleekwa otú anyị ga-esi nyere ibe anyị aka ịnọgide n’eziokwu?

GỊNỊ KA IJE IJE N’EZIOKWU PỤTARA?

4. Dị ka e kwuru na 1 Jọn 2:3-6 na 2 Jọn 4, 6, gịnị ka anyị ga-eme iji na-eje ije n’eziokwu?

4 Ka anyị nwee ike ije ije n’eziokwu, anyị kwesịrị ịma eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Anyị kwesịkwara ‘ịna-edebe ihe ndị Jehova nyere n’iwu,’ ya bụ, ịna-erube isi n’iwu ya. (Gụọ 1 Jọn 2:3-6; 2 Jọn 4, 6.) Jizọs gosiri anyị ihe irubere Jehova isi pụtara. N’ihi ya, otu ụzọ anyị ga-esi erubere Jehova isi bụ ịna-agbalị ike anyị niile ịna-eme ka Jizọs.—Jọn 8:29; 1 Pita 2:21.

5. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

5 Iji na-eje ije n’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova bụ Chineke nke eziokwu, nakwa na ihe ọ bụla o si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-agwa anyị bụ eziokwu. Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. Ọtụtụ ndị taa ekwetaghị na Jizọs Kraịst bụ Eze nke Alaeze Chineke. Jọn dọrọ aka ná ntị na e nwere “ọtụtụ ndị nduhie” ndị nwere ike iduhie ndị obi na-esighị ike na ihe Baịbụl kwuru gbasara Jehova na Jizọs bụ eziokwu. (2 Jọn 7-11) Jọn dere, sị: “Ònye bụ onye ụgha ma ọ bụghị onye na-asị na Jizọs abụghị Kraịst?” (1 Jọn 2:22) Naanị ihe anyị ga-eme ka a ghara iduhie anyị bụ ịmụ Okwu Chineke. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-amata Jehova na Jizọs. (Jọn 17:3) Ọ bụkwa mgbe ahụ ka obi ga-esi anyị ike na ihe anyị kweere bụ eziokwu.

OLEE IHE NDỊ NWERE IKE IME KA O SIERE ANYỊ IKE IJE IJE N’EZIOKWU?

6. Olee otu ihe nwere ike ime ka o siere Ndị Kraịst na-eto eto ike ije ije n’eziokwu?

Ndị Kraịst niile kwesịrị ịkpachara anya ka a ghara iji amamihe mmadụ duhie ha. (1 Jọn 2:26) Ndị Kraịst na-eto eto karịchaa ka ọ dị mkpa ịkpachara anya maka ya. E nwere otu nwanna nwaanyị onye Frans aha ya bụ Alexia. * Ọ dị afọ iri abụọ na ise. Ọ sịrị: “Mgbe m na-etolite, ihe a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ kpara m aka ọjọọ, dị ka ozizi evolushọn na ozizi ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị a ha na-akụzi na-amasị m. Ma, m chere na ihe m ga-eme abụghị naanị ikwere ihe niile ha na-akụziri m n’ụlọ akwụkwọ ma hapụ ihe Baịbụl kwuru.” Alexia mụrụ akwụkwọ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? N’ime izu ole na ole, ihe o kweere anaghịzi eme ya obi abụọ. Alexia sịrị: “M ji aka m chọpụta na ihe Baịbụl na-akụzi bụ eziokwu. M chọpụtakwara na ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka m nwee ọṅụ, obi eruokwa m ala.”

7. Olee ihe anyị kwesịrị ịkpachara anya gbasara ya, n’ihi gịnịkwa?

Ndị Kraịst niile, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịna-ebi ndụ ihu abụọ. Jọn kwuru na anyị agaghị na-eje ije n’eziokwu ahụ, na-ebikwa ndụ rụrụ arụ. (1 Jọn 1:6) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe anyị dị Jehova mma ma ugbu a ma n’ọdịnihu, anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ na-ahụ ihe niile anyị na-eme. Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụrụgodị na ndị mmadụ anaghị ahụ ihe anyị na-eme na nzuzo, Jehova na-ahụ ya.—Hib. 4:13.

8. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịna-eme?

8 Anyị ekwesịghị ịna-ele mmehie anya ka ndị ụwa. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị: ‘Anyị enweghị mmehie,’ anyị na-eduhie onwe anyị.” (1 Jọn 1:8) N’oge Jọn, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu na mmadụ nwere ike kpachara anya na-eme mmehie, ya na Chineke aka dịrịkwa ná mma. Taa, ndị anyị na ha bi n’ụwa na-echekwa otú ahụ. Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha kweere na Chineke, ma ha ekweghị ihe Chineke kwuru gbasara mmehie, karịchaa ma a bịa n’ihe gbasara mmekọahụ. E nwere ụdị mmekọahụ ndị Jehova sị na ha dị njọ, ma ndị mmadụ ana-ekwu na ọ bụrụhaala ihe mmadụ chọrọ ime, na ọ dịghị njọ.

Ndị na-eto eto, meenụ ka obi sie unu ike na ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ọma na ihe ọjọọ bụ eziokwu. Ọ ga-eme ka unu nwee ike ịgwa ndị mmadụ ihe unu kweere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9) *

9. Olee otú ịnọsi ike n’ihe Baịbụl kwuru si abara ndị na-eto eto uru?

9 O nwere ike isiri Ndị Kraịst na-eto eto ezigbo ike ịna-ele mmekọahụ anya otú dị mma ebe ọ bụ na ụmụ akwụkwọ ibe ha ma ọ bụ ndị ọrụ ibe ha ekweghị ihe Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ. Ọ bụ ihe mere otu nwanna aha ya bụ Aleksandar. Ọ sịrị: “Ụfọdụ ụmụ agbọghọ nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị gbalịrị ime ka mụ na ha nwee mmekọahụ. Ha sịrị na ebe ọ bụ na mụ enweghị enyi nwaanyị, na mụ na ụmụ nwoke ibe m na-edina.” Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, cheta na ị nọgide na-eme ihe Baịbụl kwuru, obi ga-adị gị ụtọ, gị ezere ọrịa na obi ọjọọ, gị na Jehova adịrịkwa ná mma. N’oge ọ bụla i meriri ọnwụnwa, ọ ga-adịkwuru gị mfe ịna-eme ihe dị mma. Chetakwa na ọ bụ Setan mere ka ụwa na-ele mmekọahụ anya n’ụzọ na-adịghị mma. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị jụ ime ihe ụwa chọrọ, ị ‘na-emeri ajọ onye ahụ.’—1 Jọn 2:14.

10. Olee otú 1 Jọn 1:9 si enyere anyị aka iji akọnuche dị ọcha na-efe Chineke?

10 Anyị ma na ọ bụ Jehova kwesịrị ikwu ihe bụ́ ihe ọjọọ. Anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị ghara ime mmehie. Ọ bụrụkwanụ na anyị emehie, anyị na-ekwupụtara ya Jehova n’ekpere. (Gụọ 1 Jọn 1:9.) Anyị meekwanụ mmehie dị oké njọ, anyị na-agakwuru ndị okenye, ndị Jehova họpụtara, ka ha nyere anyị aka. (Jems 5:14-16) Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka obi anyị ka na-ama anyị ikpe n’ihi ihe ndị anyị mere n’oge gara aga. N’ihi gịnị? N’ihi na Nna anyị hụrụ anyị n’anya ji Ọkpara ya chụọ àjà ga-eme ka a gbaghara anyị mmehie. Mgbe Jehova kwuru na ya ga-agbaghara ndị mmehie chegharịrịnụ, ihe o kwuru si ya n’obi. N’ihi ya, e nweghị ihe kwesịrị ime ka anyị ghara iji akọnuche dị ọcha na-efe Chineke.—1 Jọn 2:1, 2, 12; 3:19, 20.

11. Olee otú anyị ga-esi chebe onwe anyị ka ozizi ụgha ghara ime ka okwukwe anyị nyụọ ka ọkụ?

11 Anyị kwesịrị izere ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ. Malite n’oge ndịozi, Ekwensu na-agbalị iji ndị nduhie eme ka Ndị Kraịst na-enwe obi abụọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmata otú anyị ga-esi ama nke bụ́ eziokwu na nke bụ́ ụgha. * Ndị iro anyị nwere ike iji Ịntanet ma ọ bụ ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet na-eme ka anyị gharazie ịtụkwasị Jehova na ụmụnna anyị obi. Cheta onye na-agbasa ụgha a ma zere ya.—1 Jọn 4:1, 6; Mkpu. 12:9.

12. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mee ka okwukwe anyị sie ike n’eziokwu ndị anyị mụtara?

12 Iji zere ihe ndị Setan chọrọ iji eme ka okwukwe anyị ghara isi ike, anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike na Jizọs nakwa n’ọrụ ọ na-arụ n’imezu uche Chineke. Anyị kwesịkwara ịtụkwasị ndị Jehova si n’aka ha na-eduzi nzukọ ya taa obi. (Mat. 24:45-47) Ịmụ Okwu Chineke ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ọ ga-eme ka okwukwe anyị dịrị ka osisi gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala. Pọl kwuru ihe yiri ihe a mgbe ọ na-edegara ọgbakọ dị na Kọlọsi akwụkwọ ozi. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na unu nabatara Kraịst Jizọs bụ́ Onyenwe anyị, na-ejenụ ije dị ka ndị ha na ya dị n’otu, bụrụnụ ndị gbanyere mgbọrọgwụ n’ime ya, ndị a na-ewulikwa elu n’ime ya, ndị a na-eme ka ha gbasie ike n’okwukwe.” (Kọl. 2:6, 7) Ọ bụrụ na anyị agbalịa mee ka okwukwe anyị sie ike, Ekwensu ma ọ bụ ndị na-ejere ya ozi agaghị emeli ka anyị kwụsị ije ije n’eziokwu.—2 Jọn 8, 9.

13. Olee ihe anyị kwesịrị ịtụ anya ya, n’ihi gịnịkwa?

13 Anyị kwesịrị ịtụ anya na ụwa ga-akpọ anyị asị. (1 Jọn 3:13) Jọn chetaara anyị na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ka ụwa Ekwensu a na-agba egwú ụla ya, ka iwe Ekwensu na-akakwu njọ. (Mkpu. 12:12) Ọ bụghị naanị ụzọ aghụghọ ndị dị ka omume rụrụ arụ na ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ ka Ekwensu ji eme ka okwukwe anyị ghara isi ike, ọ na-ejikwa obi ịta mmiri na-akpagbu anyị. Setan ma na oge ọ ga-eji kwụsị ozi ọma anyị ma ọ bụ mee ka okwukwe anyị gharazie isi ike na-akụzi kwarapụ kwarapụ. Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na e nwere obodo ụfọdụ a machiri ọrụ anyị ma ọ bụ machie anyị ime ihe ụfọdụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụnna anyị nọ n’obodo ndị ahụ na-atachi obi. Ha na-egosi na ihe ọ sọkwara ajọ onye ahụ mee anyị, anyị nwere ike imeri.

NYERE ỤMỤNNA GỊ AKA ỊNỌGIDE N’EZIOKWU

14. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị aka ịnọgide n’eziokwu?

14 Iji nyere ụmụnna anyị aka ịnọgide n’eziokwu, anyị ga na-enwere ha ọmịiko. (1 Jọn 3:10, 11, 16-18) Anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya, ọ bụghị naanị mgbe ihe dị mma kama ma mgbe nsogbu bịara. Dị ka ihe atụ, è nwere onye ị ma mmadụ nwụnahụrụ e kwesịrị ịkasi obi ma ọ bụ meere ihe ndị ọzọ? Ka ị̀ nụrụ na e nwere ụmụnna ọdachi na-emere onwe ya mebiri ihe ndị ha nwere, ya adịkwa mkpa ka e nyere ha aka rụgharịa Ụlọ Nzukọ Alaeze ha ma ọ bụ ụlọ ha? Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka anyị ga-eji gosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya, kama nke kacha mkpa bụ ihe anyị na-eme.

15. Dị ka e kwuru na 1 Jọn 4:7, 8, olee ihe anyị kwesịrị ịna-eme?

15 Anyị na-eme ka Nna anyị nke eluigwe ma anyị na-ahụ ibe anyị n’anya. (Gụọ 1 Jọn 4:7, 8.) Otu ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya bụ ịgbaghara ha. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ime anyị ihe ọjọọ ma rịọ mgbaghara. Anyị ga-egosi na anyị hụrụ ya n’anya ma anyị gbaghara ya ma chefuo ihe ahụ o mere anyị. (Kọl. 3:13) Obi jọrọ otu nwanna aha ya bụ Aldo njọ mgbe ọ nụrụ ihe na-adịghị mma otu nwanna ọ na-akwanyere ùgwù kwuru gbasara ndị obodo ya. Aldo kwuru, sị: “M rịọrọ Jehova ọtụtụ ugboro ka o nyere m aka ka m ghara iburu nwanna ahụ iwe n’obi.” Ma, e nwekwara ihe ọzọ Aldo mere. O kpebiri ịgwa nwanna ahụ ka ya na ya rụọ n’ozi ọma. Mgbe ha nọ n’ozi ọma, Aldo gwara nwanna ahụ otú ihe ahụ o kwuru si wute ya. Aldo sịrị: “Mgbe nwanna ahụ chọpụtara na ihe ahụ o kwuru wutere m, ọ rịọrọ m ka m gbaghara ya. Olu okwu ya gosiri m na ihe ahụ o kwuru wutere ya nke ukwuu. Mgbe nke ahụ gachara, anyị chefuru ihe ahụ, ka bụrụkwa ezigbo enyi.”

16-17. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

16 Jọn onyeozi hụrụ ụmụnna ya n’anya nke ukwuu. Ọ chọkwara ka okwukwe ha sie ike. Ihe ọ gwara ha n’akwụkwọ ozi atọ ndị ahụ o degaara ha gosiri na ihe gbasara ha na-eme ya ụra aga n’anya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ọ bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị dị ka ya ka e tere mmanụ iso Jizọs chịa.—1 Jọn 2:27.

17 Ka anyị buru ndụmọdụ ndị a Jọn nyere n’obi. Ka anyị kpebisie ike ịna-eje ije n’eziokwu, na-erubere Jehova isi n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ. Na-amụ Okwu ya, tụkwasịkwa ya obi. Mee ka okwukwe gị sie ike na ihe Baịbụl kwuru gbasara Jizọs bụ eziokwu. Zere amamihe mmadụ na nkụzi ndị si n’ezi ofufe dapụ. Gbalịa ka ị ghara ịna-ebi ndụ ihu abụọ. Egekwala ndị na-agbalị ime ka ị na-eme ihe na-adịghị mma. Na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ka anyị gbalịa na-enyere ụmụnna anyị aka ịnọgide na-eje ije n’eziokwu. Otú anyị ga-esi na-eme ya bụ ịgbaghara ha ma ha mejọọ anyị nakwa inyere ndị nọ ná mkpa aka. Anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-anọgide na-eje ije n’eziokwu n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị.

ABỤ NKE 49 Ka Anyị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

^ par. 5 Anyị bi n’ụwa Setan bụ́ nna ụgha na-achị. N’ihi ya, anyị na-agbasi mbọ ike mgbe niile ka anyị nwee ike ịna-eje ije n’eziokwu. Ndị Kraịst n’oge ndịozi nwekwara ụdị nsogbu ahụ. Iji nyere hanwa na anyịnwa aka, Jehova si n’ike mmụọ nsọ mee ka Jọn onyeozi dee akwụkwọ ozi atọ. Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịchọpụta ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ije ije n’eziokwu nakwa otú anyị ga-esi emeri ha.

^ par. 3 Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Ihe Dị Mgbe Jọn Dere Akwụkwọ Ozi Ya.”

^ par. 6 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 11 Gụọ isiokwu a na-amụ amụ bụ́ “Ị̀ Ma Ihe Niile Merenụ?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche nke Ọgọst 2018.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Otu nwanna nwaanyị na-anụ ma na-ahụ ihe ndị na-eme ka nwoke na nwoke idina na nwaanyị na nwaanyị idina yie ihe dị mma n’ebe niile n’ụlọ akwụkwọ ha. (N’obodo ụfọdụ, ụcha eke na egwurugwu na-egosi nwoke na nwoke idina na nwaanyị na nwaanyị idina.) O mechara wepụta oge mee nchọnchọ ka okwukwe ya sie ike na ihe o kweere bụ eziokwu. O nyeere ya aka ime ezigbo mkpebi.