Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 30

Amụma E Buru n’Oge Ochie nke Gbasara Gị

Amụma E Buru n’Oge Ochie nke Gbasara Gị

“M ga-eme ka gị na nwaanyị ahụ dịrị n’iro.”—JEN. 3:15.

ABỤ NKE 15 Too Ọkpara Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị ka Jehova mere obere oge Adam na Iv mehiechara? (Jenesis 3:15)

 OBERE oge Adam na Iv mehiechara, Jehova buru otu amụma dị ezigbo mkpa iji mee ka ụmụ Adam na Iv nwee olileanya. E dere ihe ahụ o kwuru na Jenesis 3:15.—Gụọ ya.

2. Gịnị mere amụma a ji dị ezigbo mkpa?

2 E dere amụma ahụ n’akwụkwọ mbụ nke Baịbụl. Ma, e nwere ihe jikọrọ ya na akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ. Otú ahụ e si eji eriri ekekọta nkụ ka ihe ahụ e dere na Jenesis 3:15 si jikọta ihe ndị ọzọ Baịbụl na-ekwu mee ka ha bụrụ otu ihe, nke bụ́ na a ga-ezite Onye Nzọpụta nke ga-ebibi Setan na ndị ọjọọ na-eso ya. b Ihe a ga-abụrụ ndị niile hụrụ Jehova n’anya ezigbo ngọzi.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

3 N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a gbasara amụma ahụ dị na Jenesis 3:15: Olee ndị e kwuru gbasara ha n’amụma ahụ? Olee otú amụma a si mezuo? Oleekwa otú o si abara anyị uru?

OLEE NDỊ E KWURU GBASARA HA N’AMỤMA AHỤ?

4. Ònye bụ “agwọ ahụ,” oleekwa otú anyị si mara?

4 Ndị e kwuru gbasara ha n’amụma ahụ e buru na Jenesis 3:14, 15 bụ “agwọ,” “nwa” agwọ ahụ, “nwaanyị,” na “nwa” nwaanyị ahụ. Baịbụl nyeere anyị aka ịmata onye bụ́ nke ọ bụla n’ime ha. c Ka anyị buru ụzọ mata onye bụ́ “agwọ ahụ.” O doro anya na agwọ nkịtị agaghị aghọta ihe Jehova kwuru n’ogige Iden. N’ihi ya, onye Jehova mara ikpe ga-abụrịrị onye nwere ọgụgụ isi. Ònye ka ọ bụ? Mkpughe 12:9 mere ka onye ọ bụ doo anya. Ebe ahụ kwuru na “agwọ mbụ ahụ” bụ Ekwensu. Ma, olee ndị bụ́ “nwa” agwọ ahụ?

AGWỌ AHỤ

Ekwensu, bụ́ onye Mkpughe 12:9 kpọrọ “agwọ mbụ ahụ” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)

5. Olee ndị bụ́ “nwa” agwọ ahụ?

5 Mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuo nwa ma ọ bụ ụmụ, ọ na-ekwu gbasara ndị na-akpa àgwà ma na-eche echiche ka onye e nwere ike ịkpọ nna ha. N’ihi ya, “nwa” agwọ ahụ bụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Jehova isi na ụmụ mmadụ ndị na-emegide Jehova na ndị ya otú ahụ Ekwensu na-eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ọrụ ha n’eluigwe n’oge Noa, na ụmụ mmadụ ọjọọ na-eme ka nna ha bụ́ Ekwensu.—Jen. 6:1, 2; Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19; Jud 6.

NWA AGWỌ AHỤ

Ndị mmụọ ọjọọ na ndị mmadụ na-emegide Jehova na ndị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)

6. Gịnị mere na e nweghị otú “nwaanyị ahụ” ga-esi abụ Iv?

6 Ugbu a, ka anyị chọpụta onye bụ́ “nwaanyị ahụ.” O nweghị otú ọ ga-esi abụ Iv. Maka gịnị? Chegodị otu ihe kpatara ya. Amụma ahụ kwuru na nwa nwaanyị ahụ “ga-egwepịa” isi agwọ ahụ. Dị ka anyị kwuburu, agwọ ahụ bụ mmụọ, ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu. E nweghịkwa mmadụ ọ bụla na-ezughị okè Iv mụrụ nwere ike igwepịa Setan. N’ihi ya, olee otú a ga-esi ebibi Ekwensu?

7. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 12:1, 2, 5, 10, ònye bụ nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya na Jenesis 3:15?

7 Akwụkwọ ikpeazụ nke Baịbụl gwara anyị onye nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya na Jenesis 3:15 bụ. (Gụọ Mkpughe 12:1, 2, 5, 10.) Ọ bụghị nwaanyị nkịtị. Ọnwa dị n’okpuru ụkwụ ya. O kpukwa okpueze e ji kpakpando iri na abụọ mee. Ọ mụrụ nwa pụrụ ezigbo iche, ya bụ, Alaeze Chineke. Alaeze Chineke dị n’eluigwe. N’ihi ya, nwaanyị ahụ ga-anọrịrị n’eluigwe. Ọ nọchiri anya nzukọ Jehova nke dị n’eluigwe, nke ndị nọ na ya bụ ndị mmụọ ozi na-erubere ya isi.—Gal. 4:26.   

NWAANYỊ AHỤ

Nzukọ Jehova nke dị n’eluigwe, ya bụ, ndị mmụọ ozi na-erubere Jehova isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

8. Ònye bụ isi sekpụ ntị na nwa nwaanyị ahụ, oleekwa mgbe ọ ghọrọ ya? (Jenesis 22:15-18)

8 Okwu Chineke nyeere anyị aka ịmata onye bụ́ isi sekpụ ntị na nwa nwaanyị ahụ. Ọ bụ nwa Ebreham. (Gụọ Jenesis 22:15-18.) Dị ka e buru n’amụma ahụ, Jizọs bụ nwa nwoke ahụ rubeere Jehova isi. (Luk 3:23, 34) Ma, nwa ahụ ga-adị ezigbo ike karịa mmadụ n’ihi na ọ ga-egwepịa Setan, mee ka ọ gharazie ịdị. N’ihi ya, mgbe Jizọs dị ihe dị ka afọ iri atọ, e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ. Jizọs Kraịst ghọrọ isi sekpụ ntị na nwa nwaanyị ahụ mgbe e tere ya mmanụ. (Gal. 3:16) Mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlite ya n’ọnwụ, Chineke “ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma,” nyekwa ya “ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa,” ma ikike ‘ibibi ọrụ Ekwensu.’—Hib. 2:7; Mat. 28:18; 1 Jọn 3:8.   

NWA NWAANYỊ AHỤ

Jizọs Kraịst na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ya na ha ga-eso chịa (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

9-10. (a) Olee ndị ọzọ so na nwa nwaanyị ahụ, oleekwa mgbe ha na-eso na ya? (b) Gịnị ka anyị ga-atụlezi?

9 Ma e nwekwara ndị ọzọ so na nwa nwaanyị ahụ. Pọl onyeozi kwuru ndị ha bụ mgbe ọ gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu, sị: ‘Ọ bụrụ na unu bụ nke Kraịst, unu bụ ụmụ Ebreham n’eziokwu, ndị ga-eketa ihe e kwere ná nkwa.’ (Gal. 3:28, 29) Ọ bụrụ na Jehova ejiri mmụọ nsọ tee Onye Kraịst mmanụ, onye ahụ na-eso na nwa nwaanyị ahụ. N’ihi ya, ọ bụ Jizọs na ndị so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ahụ ga-eso ya chịa bụ nwa nwaanyị ahụ. (Mkpu. 14:1) Ndị a niile na-agbalị iche echiche ma na-akpa àgwà ka Nna ha bụ́ Jehova.

10 Ugbu a anyị matarala ndị e kwuru okwu ha na Jenesis 3:15, ka anyị kwuo otú Jehova si jiri nwayọọ nwayọọ mee ka amụma ahụ na-emezu, nakwa uru ọ na-abara anyị taa.

OLEE OTÚ E SIRILA MEZUO AMỤMA AHỤ?

11. Olee otú e si merụọ nwa nwaanyị ahụ ahụ́ “n’ikiri ụkwụ”?

11 Dị ka e kwuru na Jenesis 3:15, agwọ ahụ ga-emerụ nwa nwaanyị ahụ ahụ́ “n’ikiri ụkwụ.” E mezuru amụma a mgbe Setan mere ka ndị Juu na ndị Rom gbuo Ọkpara Chineke. (Luk 23:13, 20-24) Otú ahụ ahụ́ e merụrụ mmadụ n’ikiri ụkwụ nwere ike ime ka ọ ghara ịga ije ruo obere oge, ọnwụ Jizọs mere ka ọ ghara inwe ike ime ihe ọ bụla n’ili ruo abalị atọ.—Mat. 16:21.

12. Olee otú a ga-esi gwepịa isi agwọ ahụ, oleekwa mgbe a ga-eme ya?

12 Amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15 gosiri na Jizọs agaghị anọ n’ili ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na amụma ahụ kwuru na nwa nwaanyị ahụ ga-egwepịa agwọ ahụ isi. Ihe ọ pụtara bụ na a ga-akpọlite Jizọs n’ọnwụ. A kpọlitekwaranụ ya. Mgbe ọ nwụrụ, abalị atọ agaa, a kpọlitere ya, ya aghọọ mmụọ na-enweghị ike ịnwụ anwụ. Mgbe oge Chineke ruru, Jizọs ga-egwepịa Ekwensu, mee ka ọ gharazie ịdị. (Hib. 2:14) Ndị ha na Jizọs ga-eso chịa ga-eso Jizọs bibie ndị iro Chineke niile nọ n’ụwa, ya bụ, ụmụ agwọ ahụ.—Mkpu. 17:14; 20:4, 10. d

OLEE URU AMỤMA A NA-ABARA ANYỊ?

13. Olee uru mmezu amụma a na-abara anyị?

13 Ọ bụrụ na ị na-efe Chineke, mmezu amụma a na-abara gị uru. Jizọs bịara n’ụwa bụrụ mmadụ. Ọ kpara nnọọ àgwà ka Nna ya. (Jọn 14:9) N’ihi ya, anyị si n’aka ya mata Jehova Chineke ma hụ ya n’anya. Ihe ndị Jizọs na-akụzi na otú o si na-eduzi ọgbakọ Ndị Kraịst taa na-abara anyị uru. Ọ kụzierela anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ ga-eme ka anyị na Jehova dị ná mma. Ọnwụ Jizọs, ya bụ, ahụ́ e merụrụ ya n’ụkwụ, na-abakwara anyị uru. Olee otú o si abara anyị uru? Mgbe a kpọlitere Jizọs, Jehova nabatara ndụ ya ahụ zuru okè o ji chụọ àjà, nke ‘na-asachapụ anyị mmehie niile.’—1 Jọn 1:7.

14. Ndị mmadụ hà kwesịrị ịtụ anya na amụma ahụ e buru n’ogige Iden ga-emezu ozugbo ahụ e buru ya? Kọwaa.

14 Ihe ahụ Jehova kwuru n’ogige Iden gosiri na amụma ahụ agaghị emezu ozugbo. Ọ ga-ewe oge tupu nwaanyị ahụ amụta nwa ahụ e kwere nkwa ya, tupu e nwee ndị ga na-eso Ekwensu, nakwa tupu ndị na-akwado nwaanyị ahụ na ndị na-akwado Ekwensu adịrị n’iro. Anyị ghọta amụma a, ọ ga-abara anyị uru n’ihi na ọ dọrọ anyị aka ná ntị na ụwa a Ekwensu na-achị ga-akpọ ndị na-efe Jehova asị. Jizọs mechakwara dọọ ndị na-eso ụzọ ya otu aka ná ntị ahụ. (Mak 13:13; Jọn 17:14) Anyị ahụla otú ihe ahụ e buru n’amụma ahụ si na-emezu, karịchaa, kemgbe otu narị afọ. Olee otú o si na-emezu?

15. Gịnị mere asị ụwa kpọrọ anyị ji ka njọ, ma gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ Setan ụjọ?

15 Obere oge e chichara Jizọs Eze Alaeze Chineke n’afọ 1914, a chụpụrụ Setan n’eluigwe, chụdata ya n’ụwa. O nweghịzi ike ịgaghachi n’eluigwe. Ọ na-echekwa ka e bibie ya. (Mkpu. 12:9, 12) Ma, ọ pụtaghị na Setan fanyere aka n’ụkwụ kemgbe ahụ. Ọ na-esi ọnwụ, na-ewe ezigbo iwe ma na-alụso ndị Chineke ọgụ. (Mkpu. 12:13, 17) Ọ bụ ya mere asị ụwa kpọrọ ndị Chineke ji kakwuo njọ. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ Setan na ndị òtù ya ụjọ. Kama ịtụwa ha ụjọ, obi kwesịrị isi anyị ike otú ahụ o siri Pọl onyeozi. O dere, sị: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?” (Rom 8:31) Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi anyị niile n’ihi na dị ka anyị hụrụ, ọtụtụ ihe emezuola n’amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15.

16-18. Olee otú ịghọta amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15 si baara Nwanna Curtis, Nwanna Nwaanyị Ursula, na Nwanna Nwaanyị Jessica uru?

16 Nkwa ahụ Jehova kwere na Jenesis 3:15 nwere ike inyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Otu nwanna aha ya bụ Curtis bụ́ onye ozi ala ọzọ n’obodo Gụwam kwuru, sị: “Nsogbu na ihe ndị m na-atụghị anya ha bịaara m na-eme ka o siere m ike mgbe ụfọdụ irubere Jehova isi. Ma, ịtụgharị uche n’amụma ahụ e dere na Jenesis 3:15 enyerela m aka ịtụkwasị Nna m nke eluigwe obi.” Nwanna a na-atụsi anya ike ịhụ ụbọchị Jehova ga-ewepụ nsogbu anyị niile.

17 Otu nwanna nwaanyị bi na Baveria aha ya bụ Ursula kwuru na ịghọta ihe e kwuru na Jenesis 3:15 mere ka o kwetasie ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke si n’ike mmụọ nsọ. Ọ hụrụ otú amụma a si jikọta amụma ndị ọzọ niile. Ihe a mere ya ezigbo obi ụtọ. O kwukwara, sị: “Mgbe m mụtara na Jehova mere ihe ozugbo ka ụmụ mmadụ nwee ike inwe olileanya, o mere ka m hụkwuo ya n’anya.”

18 Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Jessica bụ́ onye Maịkronishia kwuru, sị: “M ka na-echeta otú ọ dị m mgbe mbụ m ghọtara na achọtala m eziokwu. Amụma ahụ e dere na Jenesis 3:15 na-emezu. O nyerela m aka ịna-echeta na ihe a anyị dị ugbu a abụghị ndụ ahụ nke bụ́ ezigbo ndụ. Amụma a emeela ka m kwetasie ike na ijere Jehova ozi na-eme ka m na-ebi ndụ kacha mma m nwere ike ibi ugbu a. Ọ ga-emekwa ka m bie ndụ kacha mma n’ọdinihu.”

19. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ihe ndị na-emezubeghị n’amụma ahụ ga-emezu?

19 Dị ka anyị hụrụla, amụma ahụ e buru na Jenesis 3:15 na-emezu ugbu a. Ndị bụ́ nwa nwaanyị ahụ na nwa agwọ ahụ edoola anya. Jizọs, bụ́ isi sekpụ ntị na nwa nwaanyị ahụ, si n’ọnwụ bilie, bụrụzie Eze dị ebube na-enweghị ike ịnwụ anwụ. Ugbu a, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na Jehova ahọrọchaala ndị niile ga-eso Ọkpara ya chịa. Ebe ọ bụ na e mezuola ihe ndị mbụ e buru n’amụma ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na ndị nke fọrọ afọ ga-emezurịrị, ya bụ, igwepịa isi agwọ ahụ. Obi ga-adị ndị ohu Chineke ezigbo ụtọ mgbe a ga-ebibi Ekwensu. Tupu mgbe ahụ, adala mbà. Chineke anyị bụ ekwu eme. Ọ ga-esi n’aka nwa nwaanyị ahụ meere “mba niile dị n’ụwa” ọtụtụ ihe ọma.—Jen. 22:18.

ABỤ NKE 23 Jehova Amalitela Ọchịchị Ya

a Anyị agaghị aghọtacha ihe dị na Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ ghọta amụma ahụ dị na Jenesis 3:15. Ịmụ gbasara amụma a ga-eme ka okwukwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ sikwuo ike. Ọ ga-emekwa ka obi sie anyị ike na ọ ga-emezu nkwa niile o kwere anyị.

b Gụọ Ihe Ndị Ọzọ A Kọwara nke B1 isiokwu ya bụ “Ihe Baịbụl Na-ekwu,” nke dị na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

c Gụọ igbe bụ “Ndị E Kwuru Okwu Ha na Jenesis 3:14, 15.”