Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

Jiri Onyinye I Nwere Ikpe Ekpere Kpọrọ Ihe

Jiri Onyinye I Nwere Ikpe Ekpere Kpọrọ Ihe

“Ka ekpere m masị gị ka insens a kwadebere nke ọma.”—ỌMA 141:2.

ABỤ NKE 47 Na-ekpe Ekpere Kwa Ụbọchị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị maka na Jehova kwere ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere?

 ONYE kere eluigwe na ụwa nyere anyị onyinye magburu onwe ya. O kwere ka anyị na-ekpe ekpere, na-agwa ya obi anyị. Cheedị ihe a: Anyị nwere ike ịkọrọ Jehova ihe niile dị anyị n’obi mgbe ọ bụla nakwa n’asụsụ ọ bụla anyị chọrọ n’ebughi ụzọ gwa ya agwa. Anyị nwere ike idina n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ kpee ekpere, obi esie anyị ike na Nna anyị hụrụ anyị n’anya ga-anụ olu anyị. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka onyinye a.

2. Olee otú Eze Devid si gosi na o ji onyinye ikpe ekpere a Chineke nyere anyị kpọrọ ihe?

2 Eze Devid ji onyinye ikpe ekpere a kpọrọ ezigbo ihe. Ọ bụkuru Jehova abụ, sị: “Ka ekpere m masị gị ka insens a kwadebere nke ọma.” (Ọma 141:1, 2) N’oge Devid, a na-akwadebe insens ndị nchụàjà na-eji efe Chineke nke ọma. (Ọpụ. 30:34, 35) Ihe ahụ Devid kwuru gbasara insens gosiri na ọ chọrọ iche echiche nke ọma gbasara ihe ọ ga-agwa Nna ya nke eluigwe. Ọ bụkwa ihe anyị chọsiri ike ịna-eme. Anyị chọrọ ka ekpere anyị na-amasị Jehova.

3. Olee otú anyị kwesịrị isi na-agwa Jehova okwu ma anyị kpewe ekpere, n’ihi gịnịkwa?

3 Anyị kpewe ekpere, anyị ekwesịghị ịna-agwa Jehova okwu ka anyị na ya ànyị bụ ọgbọ. Kama nke ahụ, otú anyị si agwa ya okwu kwesịrị igosi na anyị na-akwanyere ya ezigbo ùgwù. Chegodị banyere ọhụụ ndị dị ebube Aịzaya, Ezikiel, Daniel, na Jọn hụrụ. Ọhụụ ndị a dị iche n’ibe ha, ma e nwere otú ha niile si yie. Ha niile na-egosi na Jehova bụ Eze dị ebube. Aịzaya hụrụ “ka Jehova nọ n’ocheeze dị elu.” (Aịza. 6:1-3) Ezikiel hụrụ Jehova ka ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya eluigwe nke “ìhè na-enwu gburugburu ya yiri eke na egwurugwu.” (Ezik. 1:26-28) Daniel hụrụ “Onye Ochie ahụ” uwe ya na-acha ọcha, ire ọkụ sikwa n’ocheeze ya na-apụta. (Dan. 7:9,10) Jọn hụkwara Jehova ka ọ nọ ọdụ n’ocheeze, nke eke na egwurugwu na-egbuke ka emerad gbara gburugburu. (Mkpu. 4:2-4) Ọ bụrụ na anyị echebara otú Jehova si dị ebube echiche, ọ ga-eme ka anyị ghọta na ekpere bụ onyinye na-enweghị atụ. Anyị kwesịkwara ịna-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù ma anyị kpewe ekpere. Ma, olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere?

“KPEENỤ EKPERE OTÚ A”

4. Gịnị ka anyị na-amụta banyere ekpere n’ihe ndị Jizọs bu ụzọ kwuo n’Ekpere Onyenwe Anyị e dere na Matiu 6:9, 10?

4 Gụọ Matiu 6:9, 10. Mgbe Jizọs na-akụzi ihe n’elu ugwu, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-ekpe ekpere ga-adị Chineke mma. Mgbe Jizọs sịchara, “kpeenụ ekpere otú a,” o bu ụzọ kwuo banyere ihe ndị kacha mkpa gbasara Jehova. Ha bụ: ka e doo aha Jehova nsọ, ka Alaeze Chineke ga-eji bibie ndị iro ya niile bịa, nakwa ihe ọma ndị ọ ga-emere ụwa na ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na anyị ana-etinye ihe ndị a n’ekpere anyị, anyị na-egosi na ọ bụ ihe gbasara nzube Chineke kacha anyị mkpa.

5. Ọ̀ dị njọ ịrịọ Jehova ihe ndị bụ́ mkpa anyị?

5 Ihe ọzọ Jizọs kwuru n’ekpere ahụ gosiri na ọ dịghị njọ ma anyị kpee ekpere gbasara ihe ndị dị anyị mkpa. Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye anyị nri ụbọchị, ka ọ gbaghara anyị mmehie anyị, ka o mee ka a ghara ịnwata anyị, nakwa ka ọ napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ. (Mat. 6:11-13) Ọ bụrụ na anyị ana-arịọ Jehova ihe ndị a, anyị na-egosi ya na anyị tụkwasịrị ya obi nakwa na anyị chọrọ ịna-eme ihe dị ya mma.

Gịnị ka di nwere ike ikpe n’ekpere ma ya na nwunye ya kpewe ekpere? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6) b

6. Ọ̀ bụ naanị ihe ndị ahụ Jizọs kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị ka anyị kwesịrị ịna-ekpe maka ha? Kọwaa.

6 Ihe Jizọs chọrọ abụghị ka ndị na-eso ụzọ ya buru ekpere ahụ n’isi ma na-ekwughachi ya ma ha kpewe ekpere. N’ekpere ndị ọzọ Jizọs kpere, o kwuru banyere ihe dị iche iche bụ́ mkpa ya n’oge ndị ahụ. (Mat. 26:39, 42; Jọn 17:1-26) Anyị nwekwara ike ikpe ekpere gbasara ihe ọ bụla na-echegbu anyị. E nwee ihe anyị chọrọ ikpebi, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye anyị amamihe na nghọta anyị ga-eji ekpebi ya. (Ọma 119:33, 34) Ọ bụrụ na e nwere ọrụ siri ike anyị chọrọ irụ, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịghọta otú anyị ga-esi arụ ya. (Ilu 2:6) Ndị nne na nna nwere ike ikpe ekpere maka ụmụ ha. Ụmụaka nwekwara ike ikpe ekpere maka nne na nna ha. Anyị niile nwere ike ikpe ekpere maka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl, anyị kwesịkwara ịna-eme otú ahụ. Ma, anyị kpewe ekpere, anyị ekwesịghị ịna-arịọ Jehova naanị arịrịọ.

Anyị kpewe ekpere, olee ihe ndị anyị nwere ike ito Jehova ma kelee ya maka ha? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 9) c

7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eto Jehova ma anyị kpewe ekpere?

7 Anyị kwesịrị icheta na-eto Jehova n’ekpere anyị. E nweghị onye e kwesịrị ito karịa Chineke anyị. Jehova “dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie.” Ọ bụkwa ‘Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere. Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ. Ịhụnanya ya dị ukwuu. Ọ bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.’ (Ọma 86:5, 15) N’eziokwu, e nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-eto Jehova n’ihi ụdị onye ọ bụ na ihe ndị ọ na-eme.

8. Olee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ikele Jehova maka ha? (Abụ Ọma 104:12-15, 24)

8 E wezụga ịna-eto Jehova n’ekpere anyị, anyị kwesịkwara ịna-ekele ya maka ihe ndị magburu onwe ha o nyere anyị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ikele ya n’ihi ọmarịcha ụcha dị iche iche anyị na-ahụ n’okooko osisi, ụdị nri dị iche iche dị ụtọ juru eju bara abara, nakwa otú ezigbo ndị enyi si eme anyị obi ụtọ. Nna anyị hụrụ anyị n’anya nyere anyị ihe ndị a na ọtụtụ ihe ndị ọzọ iji na-eme anyị obi ụtọ. (Gụọ Abụ Ọma 104:12-15, 24.) Ihe kadị mkpa mere anyị ga-eji na-ekele Jehova bụ ihe niile ọ na-akụziri anyị na-eme ka okwukwe anyị na-esi ike nakwa ezigbo olileanya o mere ka anyị nwee.

9. Gịnị ga-enyere anyị aka icheta ịna-ekele Jehova? (1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18)

9 O nwere ike ịdịrị anyị mfe ichefu ikele Jehova maka ihe ọma niile ọ na-emere anyị. Gịnị ga-enyere gị aka icheta ịna-ekele ya? I nwere ike ide ihe dị iche iche ị rịọrọ Jehova. Ị nọtụ, gị agbalịa chọpụta otú o sirila za ha. Kpezie ekpere ma kelee ya maka otú o si nyere gị aka. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:17, 18.) Chegodị echiche. Obi na-adị anyị ụtọ ma ndị ọzọ kelee anyị maka ihe anyị meere ha. Ọ na-emekwa ka anyị mata na ha hụrụ anyị n’anya. Otú ahụ ka ọ dị Jehova. Ọ bụrụ na anyị echeta kelee Jehova maka ihe ndị o meere anyị, ọ na-eme ya obi ụtọ. (Kọl. 3:15) Ma, olee ihe ọzọ dị mkpa mere anyị ji kwesị ịna-ekele Chineke anyị?

NA-EKELE JEHOVA MAKA ỌKPARA YA Ọ HỤRỤ N’ANYA

10. Dị ka e kwuru na 1 Pita 2:21, gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ekele Jehova maka izite Jizọs n’ụwa?

10 Gụọ 1 Pita 2:21. Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova maka na o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ kụziere anyị ihe. Anyị mụọ gbasara Jizọs, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere Jehova na otú anyị ga-esi na-eme ihe dị ya mma. Anyị gosi na anyị nwere okwukwe n’àjà Jizọs chụrụ, anyị na Jehova ga-abụ ezigbo enyi, na-adịkwa n’udo.—Rom 5:1.

11. Gịnị mere anyị ji ekpe ekpere n’aha Jizọs?

11 Anyị na-ekele Jehova maka na anyị nwere ike ikpe ekpere n’aha Ọkpara ya. Ọ bụ Jizọs ka Jehova si n’aka ya na-emere anyị ihe anyị rịọrọ ya. Jehova na-anụ ekpere ndị e kpere n’aha Jizọs. Ọ na-azakwa ha. Jizọs kwuru, sị: “Ihe ọ bụla unu rịọkwara n’aha m, m ga-eme ya, ka e wee si n’aka Ọkpara ahụ nye Nna m otuto.”—Jọn 14:13, 14.

12. Olee ihe ọzọ mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova maka Ọkpara ya?

12 Jehova na-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Baịbụl kwuru na Jizọs bụ ‘nnukwu onye nchụàjà, na ọ nọdụla ala n’aka nri ocheeze Onye Ukwu ahụ n’eluigwe.’ (Hib. 8:1) Jizọs bụ “onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ.” (1 Jọn 2:1) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova enyela anyị Nnukwu Onye Nchụàjà dị obi ebere, onye na-aghọta na anyị adịghị ike, “na-arịọkwara anyị arịrịọ.” (Rom 8:34; Hib. 4:15) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị agaraghị agwali Jehova okwu n’ekpere ma a sị na ọ bụghị àjà ahụ Jizọs chụrụ. O doro anya na i kwetara na anyị agaghị ekelechali Jehova maka onyinye a magburu onwe ya o nyere anyị, ya bụ, Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya.

NA-EKPE EKPERE MAKA ỤMỤNNA GỊ

13. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya?

13 N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ ya ruo ogologo oge. Jizọs rịọrọ Nna ya ka o “chebe ha n’ihi ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:15) Ihe a o mere gosiri otú ọ hụruru ha n’anya. N’agbanyeghị na ọ ma na a na-aga ịta ya nnukwu ahụhụ n’oge na-adịghị anya, ihe nọ na-echegbu ya bụ ihe gbasara ndị na-eso ụzọ ya.

Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike ikpe n’ekpere gbasara ụmụnna anyị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 16) d

14. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?

14 Ebe anyị chọrọ ịna-eme ka Jizọs, anyị agaghị na-eche naanị gbasara onwe anyị. Kama, anyị ga na-ekpe ekpere mgbe niile maka ụmụnna anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị na-erube isi n’iwu Jizọs, nke bụ́ ka anyị hụ ibe anyị n’anya, na-egosikwa Jehova na anyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. (Jọn 13:34) Ikpe ekpere maka ụmụnna anyị abụghị igbu oge. Baịbụl gwara anyị na “ekpere onye ezi omume na-ekpesi ike na-akpa ezigbo ike.”—Jems 5:16.

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ekpe ekpere maka ụmụnna anyị?

15 Ụmụnna anyị nwere ọtụtụ nsogbu ha na-edi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ha. Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka idi ọrịa, ọdachi ndị na-emere onwe ha, agha, mkpagbu, na nsogbu ndị ọzọ. Anyị nwekwara ike ikpe ekpere maka ụmụnna anyị ndị na-agbalịsi ike inyere ndị ihe na-esiri ike aka. O nwere ike ịbụ na ị ma ụfọdụ ndị ụdị nsogbu ndị a bịaara. Ọ ga-adị mma ma ị kpọọ ha aha ma i kpewe ekpere. Ịrịọ Jehova ka o nyere ha aka ịna-edi nsogbu ha ga-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya.

16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere maka ndị Jehova ji eduzi ọgbakọ ya?

16 Obi na-adị ndị Jehova ji eduzi ọgbakọ ya ezigbo ụtọ na anyị na-ekpe ekpere maka ha. Ekpere ndị ahụ na-enyekwara ha aka. Pọl onyeozi ma na ekpere ndị ọzọ ga-abara ya uru. O dere, sị: “Na-ekpekwanụ ekpere maka m, ka m nwee ike ịna-ekwu okwu, katakwa obi na-eme ka a mara ihe nzuzo dị nsọ gbasara ozi ọma m na-ezisa.” (Efe. 6:19) Taakwa, anyị nwere ụmụnna nwoke na-arụsi ọrụ ike Jehova ji eduzi anyị. Ọ bụrụ na anyị na-arịọ Jehova ka ọ na-agọzi ọrụ ha, ọ ga-egosi na anyị hụrụ ha n’anya.

MGBE ANYỊ NA-EDU NDỊ ỌZỌ N’EKPERE

17-18. Olee mgbe e nwere ike ịsị anyị duo ndị ọzọ n’ekpere, gịnịkwa ka anyị kwesịrị icheta?

17 Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ịkpọ anyị ka anyị duo ndị ọzọ n’ekpere. Dị ka ihe atụ, nwanna nwaanyị na-eduzi ọmụmụ Baịbụl nwere ike ịgwa nwanna nwaanyị ya na ya so gaa ozi ọma ka o kpee ekpere. O nwere ike ịbụ na nwanna nwaanyị ahụ ya na ya so amaghị onye ahụ a na-amụrụ ihe nke ọma. N’ihi ya, o nwere ike ịkara ya mma ikpe ekpere ma a mụchaa ihe ahụ. Mgbe ahụ, ọ matatụla ihe ụfọdụ ọ ga-ekpe n’ekpere maka onye ahụ a na-amụrụ ihe.

18 E nwere ike ịgwa nwanna nwoke ka o kpee ekpere mgbe a na-enwe nzukọ ozi ubi ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ụmụnna nwoke ndị na-ekpe ụdị ekpere a kwesịrị icheta ihe mere e ji enwe nnọkọ ahụ. E kwesịghị iji ekpere ahụ nyewe ọgbakọ ndụmọdụ ma ọ bụ jiri ya na-amara ọgbakọ ọkwa. N’ọtụtụ ọmụmụ ihe ọgbakọ, oge a na-ewepụta maka abụ na ekpere bụ nkeji ise. N’ihi ya, nwanna na-ekpe ekpere ahụ ekwesịghị ikwu “ọtụtụ okwu,” karịchaa, mgbe a na-amalite ọmụmụ ihe.—Mat. 6:7.

JIRI EKPERE KPỌRỌ IHE NÁ NDỤ GỊ

19. Gịnị ga-enyere anyị aka ijikere maka ụbọchị ikpe Jehova?

19 Anyị kwesịrị iji ekpere kpọrọkwuo ihe n’ihi na ụbọchị ikpe Jehova adịla nso. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “N’ihi ya, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile ga-eme.” (Luk 21:36) N’eziokwu, ikpe ekpere mgbe niile ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike, meekwa ka anyị jikere maka ụbọchị Jehova.

20. Olee otú ekpere anyị nwere ike isi dịrị ka insens na-esi ísì ọma?

20 Gịnị na gịnị ka anyị kwurula? Anyị ji onyinye ikpe ekpere Jehova nyere anyị kpọrọ ezigbo ihe. Ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa ma anyị kpewe ekpere bụ ihe ndị gbasara nzube Jehova. Ihe ọzọ bụ na anyị na-ekele Jehova maka Ọkpara ya nakwa Alaeze ya, na-ekpekwa ekpere maka ụmụnna anyị. Jehova chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere maka ihe ndị na-akpa anyị n’ụbọchị, na-arịọkwa ya ka o mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ bụrụ na anyị echee echiche nke ọma gbasara ihe ndị anyị chọrọ ikpe n’ekpere, anyị na-egosi na anyị ji onyinye a pụrụ iche kpọrọ ihe. Ihe anyị na-ekwu n’ekpere anyị ga-adị Jehova ka insens na-esi ísì ọma. Ọ ga “na-eme ya obi ụtọ.”—Ilu 15:8.

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

a Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova kwere ka anyị na-agwa ya okwu n’ekpere. Anyị chọrọ ka ekpere anyị na-amasị Jehova ka insens na-esi ísì ọma. N’isiokwu a, anyị ga-ekwu gbasara ihe ndị anyị nwere ike ikpe n’ekpere. Anyị ga-achọpụtakwa ihe ụfọdụ anyị kwesịrị iburu n’obi ma a gwa anyị ka anyị duo ndị ọzọ n’ekpere.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na nwunye ya na-ekpe ekpere ka Jehova chebe nwa ha nọ n’ụlọ akwụkwọ, na-ekpe ekpere maka nna ha merela agadi ahụ́ na-adịghị, na-ekpekwa ekpere ka onye ha na-amụrụ ihe na-eme nke ọma.

c NKỌWA FOTO: Ebe nwanna bụ́ nwa okorobịa na-ekele Jehova maka àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị, maka ụwa anyị a mara mma, nakwa maka nri ndị na-edozi ahụ́.

d NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nwaanyị na-ekpe ekpere ka Jehova gọzie Òtù Na-achị Isi ma nye ha mmụọ nsọ ya, nakwa ka o nyere ndị ọdachi dakwasịrị na ndị a na-akpagbu aka.