Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

M Kwere Ka Jehova Na-ezi M Ụzọ

M Kwere Ka Jehova Na-ezi M Ụzọ

MGBE m dị afọ iri na isii, m kpebiri ụzọ m ga-eso, ya bụ, ịna-arụ ọrụ ego na-atọ m ezigbo ụtọ. Ma, Jehova kpọrọ m ka m soro ụzọ ọzọ. Ọ dị nnọọ ka ọ̀ na-asị m: “M ga-eme ka ị mara ihe, zikwa gị ụzọ i kwesịrị iso.” (Ọma 32:8) Otú a m kwere ka Jehova na-ezi m ụzọ mere ka m jiri ndụ m na-ejere ya ozi, nwetakwa ọtụtụ ngọzi. Otu n’ime ha bụ ozi m jere n’Afrịka ruo afọ iri ise na abụọ.

M SI N’OBODO OJII GAA N’OBODO OBIỌMA DỊ N’AFRỊKA

A mụrụ m n’afọ 1935 na Dalastịn, nke dị ná mpaghara Ịngland a na-akpọ Obodo Ojii. Ihe mere e ji akpọ ya Obodo Ojii bụ maka otú anwụrụ ọkụ ojii si ekpuchi ebe niile. Ebe ọ na-esi apụta bụ n’ụlọ ọrụ ndị na-eji ígwè akpụ ihe nakwa n’ụlọ ọrụ ndị ọzọ. Mgbe m dị ihe dị ka afọ anọ, papa m na mama m malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Mgbe m dị afọ iri na anọ, obi bịara sie m ike na ihe m mụtara bụ eziokwu, e mee m baptizim n’afọ 1952 mgbe m dị afọ iri na isii.

N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, amalitere m ịmụ ọrụ n’otu nnukwu ụlọ ọrụ na-emepụta ngwá ọrụ nakwa ihe ndị na-adị n’ụgbọala. E bidoro ịzụ m ka m rụwa ọrụ dị mkpa n’ụlọ ọrụ ahụ. Ọrụ ahụ na-atọgbu m atọgbu.

Oge ruru ka m kpebie otu ihe dị ezigbo mkpa. Ọ bụ mgbe onye nlekọta sekit gwara m ka m duziwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ a na-enwe n’etiti izu n’ọgbakọ anyị dị na Wilenhọl. Amaghị m ihe m ga-eme eme. N’oge ahụ, m na-eso ọgbakọ abụọ amụ ihe. N’etiti izu, ndị m na-eso amụ ihe bụ ọgbakọ kacha dịrị nso n’ebe m na-arụ ọrụ na Brọmsgrov. Isi n’ụlọ anyị ruo ebe ahụ dị ihe dị ka kilomita iri atọ na abụọ. M laghachi n’ụlọ anyị ná ngwụcha izu, m na-eso ọgbakọ dị na Wilenhọl amụ ihe.

Ebe ọ bụ na m chọrọ ịkwado nzukọ Jehova, m kwetara ime ihe ahụ onye nlekọta sekit gwara m mee n’agbanyeghị na ọ ga-eme ka m hapụ ọrụ m ahụ na-atọ m ụtọ. E nwebeghị mgbe m kwara ụta maka na m kpebiri ka Jehova na-ezi m ụzọ m kwesịrị iso. O meela ka ndụ m na-atọkwu m ụtọ.

N’oge ahụ m na-esobu ọgbakọ Brọmsgrov amụ ihe, e nwere onye mụ na ya matara. Ọ bụ ọmarịcha nwanna nwaanyị ji ife Jehova kpọrọ ihe. Aha ya bụ Anne. Anyị lụrụ n’afọ 1957. Mụ na ya esorokwala rụkọọ ụdị ọrụ dị iche iche magburu onwe ha n’ozi Jehova. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịsụ ụzọ oge niile, ịsụ ụzọ pụrụ iche, ilekọta sekit, na ozi Betel. Nwunye m Anne emeela ka m na-enwe ọṅụ ná ndụ.

N’afọ 1966, a kpọrọ anyị ka anyị soro na klas nke 42 n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe anyị gụchara, e zigara anyị Malawi. Ọtụtụ ndị na-asị na ọ bụ obodo obiọma dị n’Afrịka n’ihi otú ha si dị obiọma ma na-anabata ndị mmadụ. E nweghị mgbe anyị tụrụ anya na a gaghị ekwe anyị nọọ ebe ahụ ọtụtụ afọ.

IJE OZI N’OGE IHE TARA AKPỤ NA MALAWI

Ụgbọala ahụ anyị ji rụọ ọrụ ilekọta sekit na Malawi

Anyị rutere Malawi n’abalị mbụ n’ọnwa Febụwarị afọ 1967. Anyị mụsiri asụsụ ha ike ruo otu ọnwa, malitezie ọrụ ilekọta distrikti. Anyị nwere ụdị ụgbọala ụfọdụ ndị chere na a ga-ejili gbaa ebe ọ bụla, ọ bụrụgodị ịgafe osimiri. Ma, n’agbanyeghị ihe ahụ ha chere, ihe anyị ji ya gafelie bụ naanị mmiri na-emighị emi. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ebi n’ụlọ ájá na ụlọ akịrịka. N’oge udu mmiri, ị ga-achọwa tapolin a ga-eji kpuchie elu ya ka mmiri ghara ịna-abata na ya. Otú ahụ ka anyị si bido ozi ala ọzọ anyị n’agbanyeghị na ọ dịrịghị anyị mfe. Ma, ọ tọrọ anyị ụtọ.

N’ọnwa Eprel, m matara na ndị ọchịchị ga-ebido inye anyị nsogbu n’oge na-adịghị anya. M nụrụ ọkwa Hastings Banda, bụ́ onyeisi ala Malawi, mara na redio. O kwuru na Ndịàmà Jehova anaghị akwụ ụtụ isi nakwa na ha na-enye ndị ọchịchị nsogbu. O doro anya na ihe ndị ahụ o kwuru bụ ebubo ụgha. Anyị niile ma na ihe bụ́ iwe ha bụ na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, karịchaa na anyị ekweghị azụrụ kaadị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

N’ọnwa Septemba, anyị gụtara n’akwụkwọ akụkọ na onyeisi ala eboola ụmụnna ebubo na ha na-akpata nsogbu ebe niile. Ọ mara ọkwa ná nnọkọ ndị ọchịchị na ọchịchị ya ga-amachi Ndịàmà Jehova iwu ozugbo otú e kpebiri ná nnọkọ ahụ. Ọ bụ n’abalị iri abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 1967 ka a machiri anyị iwu ahụ. Mgbe obere oge gara, ndị uwe ojii na ndị na-ahụ maka isi ná mba ọzọ bata Malawi batara n’alaka ụlọ ọrụ anyị, mechie ya ma gbaara ndị ozi ala ọzọ nọ na ya ụgbọ nwa mkpi.

Mgbe a nwụchiri anyị na ndị ozi ala ọzọ ibe anyị bụ́ Jack Johansson na Linda nwunye ya ma gbaara anyị ụgbọ nwa mkpi na Malawi n’afọ 1967

Mgbe anyị nọchara abalị atọ n’ụlọ mkpọrọ, a kpọgara anyị otu obodo ndị Briten na-achị, ya bụ, Mọrishọs. Ma, ndị ọchịchị obodo ahụ ekweghị ka anyị ka bụrụ ndị ozi ala ọzọ n’ebe ahụ. N’ihi ya, e zigara anyị Rodeshia (nke bụ́zi Zimbabwe ugbu a). Mgbe anyị ruru ebe ahụ, anyị hụrụ otu nwoke iwe juru obi. Ọ bụ ya na-ahụ maka isi ná mba ọzọ bata n’obodo ahụ. O kweghị enye anyị akwụkwọ ikike ịbata n’obodo ahụ. Ọ sịrị anyị: “A chụpụrụ unu na Malawi. E kweghị unu nọrọ na Mọrishọs. Unu abịalanụ ebe a ugbu a maka na a naghị enye unu nsogbu.” Nwunye m bidoro ibe ákwá. Ọ dịzi ka e nweghị onye chọrọ anyị. N’oge ahụ, ọ dị m ka ọ̀ bụ m tụgharịa ozugbo laghachi obodo anyị bụ́ Ịngland. Ndị na-ahụ maka isi ná mba ọzọ bata n’obodo ahụ mechara kwe ka anyị rahụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụhaala na anyị ga-abịa n’isi ụlọ ọrụ ha n’echi ya. Ike gwụgburu anyị agwụgbu. Ma, anyị ka hapụụrụ Jehova okwu ahụ. N’ehihie echi ya, anyị natara ozi anyị na-atụghị anya ya. E nyere anyị akwụkwọ ikike ịnọrọwa na Zimbabwe ka ndị ọbịa. Agaghị m echefu otú obi dị m n’ụbọchị ahụ. Ọ bịara doo m anya na Jehova na-ezi anyị ụzọ.

ANYỊ NỌZI NA ZIMBABWE NA-ELEKỌTA ỤMỤNNA NỌ NA MALAWI

Mgbe mụ na nwunye m nọ na Betel dị na Zimbabwe n’afọ 1968

N’alaka ụlọ ọrụ dị na Zimbabwe, a gwara m ka m rụwa ná Ngalaba Ije Ozi, na-elekọta ụmụnna nọ na Malawi nakwa na Mozambik. Mkpagbu a nọ na-akpagbu ụmụnna anyị bi na Malawi abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ihe so n’ọrụ m bụ ịsụgharị ozi ndị nlekọta sekit nọ na Malawi na-ezite. Ná mgbede otu ụbọchị m na-emechighị ọrụ n’oge ka m nwee ike sụgharịchaa otu nke ha zitere, m bere ákwá mgbe m gụtara otú e si na-akụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị isi aba okpu. a Ma, otú ha si na-erubere Jehova isi, nwee okwukwe ma na-atachi obi gbara m ezigbo ume.—2 Kọr. 6:4, 5.

Anyị gbasiri mbọ ike iji hụ na ụmụnna anyị fọdụrụ na Malawi na ndị nke gbagara ọsọ ndụ na Mozambik na-enweta akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Asụsụ a kacha asụ na Malawi bụ Chichewa. Ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ahụ kwagara Zimbabwe. Otu nwanna rụụrụ ha ọfis nakwa ụlọ ha ga-ebi ná nnukwu ugbo ya. Ebe ahụ ka ha nọ rụwakwa ọrụ ahụ dị ezigbo mkpa, nke bụ́ ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl.

Anyị haziri ka ndị nlekọta sekit nọ na Malawi gaa mgbakọ distrikti kwa afọ na Zimbabwe n’asụsụ Chichewa. Ná mgbakọ ndị ahụ, ha na-enweta ihe ndepụta ndị e ji kwuo okwu. Ha laghachiwa Malawi, ha ejiri ihe ndepụta ndị ahụ na-agwa ụmụnna ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ndị ahụ otú ha nwere ike. N’otu afọ ha gara Zimbabwe, anyị jisiri ike hazie Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze iji gbaa ndị nlekọta sekit ndị a nwere obi ike ume.

Mgbe m na-ekwu okwu ná mgbakọ distrikti e mere na Zimbabwe n’asụsụ Chichewa na Shona

N’ọnwa Febụwarị afọ 1975, m gara leta ụmụnna anyị si Malawi, ndị nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ na Mozambik. Ụmụnna ndị ahụ ma ihe ékwé na-akụ ná nzukọ Jehova. Ha ebidola inwe ndị okenye n’ọgbakọ, nke bụ́ ntụziaka ọhụrụ e nyere. Ndị okenye ọhụrụ ndị ahụ haziri ọtụtụ ihe a na-eme n’ọgbakọ, dị ka ikwu okwu ihu ọha, ịgụ ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ịmụ Ụlọ Nche, na imedị mgbakọ sekit. Ha hazichara ogige ndị ahụ ka mgbakọ distrikti, nwechaa ngalaba na-ahụ maka ihicha ihe, ikesa nri, na iche nche. Jehova gọziri ụmụnna ndị ahụ nwere okwukwe, ha arụọ ọtụtụ ihe. Nleta ahụ gbara m ezigbo ume.

N’ihe dị ka n’afọ 1979, ọ bụzi alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Zambia na-ahazi ozi ọma a na-ekwusa na Malawi. Ma, m ka nọkwa na-eche banyere ụmụnna anyị nọ na Malawi, na-echetakwa ha n’ekpere. Otú ahụ ka ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ nọkwa na-eme. Ebe m so na Kọmitii Alaka na Zimbabwe, mụ na ndị na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị na ụmụnna ụfọdụ si Malawi, Saụt Afrika, na Zambia nwere nnọkọ ọtụtụ mgbe. Otu ajụjụ anyị na-ekwurịta ná nnọkọ nke ọ bụla bụ, “È nwere ihe ọzọ anyị ka nwere ike imere ụmụnna anyị nọ na Malawi?”

Ka oge na-aga, ndị ọchịchị kwụsịwara ịta ụmụnna anyị ahụhụ. Ụmụnna ndị gbara ọsọ ndụ jizi nwayọọ nwayọọ na-alaghachi Malawi, ndị nke nọbu anọ ejirikwa nwayọọ nwayọọ na-ekurutụ ume ndụ. Mba ndị dị ha nso nọkwa na-ewepụ iwu ha machiburu Ndịàmà Jehova. Mozambik mekwara otú ahụ n’afọ 1991. Ma, anyị nọ na-eche, sị: ‘Oleekwanụ mgbe Ndịàmà Jehova nọ na Malawi ga-enwere onwe ha?’

ANYỊ LAGHACHIRI MALAWI

Ihe mechara gbanwee n’ọchịchị Malawi. N’afọ 1993, ndị ọchịchị wepụrụ iwu ahụ ha machiri Ndịàmà Jehova. N’oge na-adịghị anya, mụ na otu onye ozi ala ọzọ nọ na-ekwu okwu, ya ajụọ m, sị: “Ị̀ ga-alaghachi Malawi?” Adị m afọ iri ise na itoolu mgbe ahụ. N’ihi ya, m sịrị ya, “Mba. Akaala m.” Ma, n’otu ụbọchị ahụ, anyị nwetara ozi Òtù Na-achị Isi ji gwa anyị na anyị nwere ike ịlaghachi Malawi.

Ozi anyị na-eje na Zimbabwe nọ na-atọ anyị ezigbo ụtọ. N’ihi ya, ikpebi ịlaghachi Malawi adịrịghị anyị mfe. Zimbabwe amarala anyị ahụ́. Anyị emetakwala ọtụtụ ezigbo ndị enyi anyị na-agaghị echefu echefu. Òtù Na-achị Isi jikwa obiọma gwa anyị na anyị nwere ike ịnọrọwa na Zimbabwe ma anyị chọọ. N’ihi ya, a sị na anyị chọrọ, anyị gaara eji aka anyị ziwe onwe anyị ụzọ, nọrọwazie na Zimbabwe. Ma m ka na-echeta otú m si chewe gbasara otú Ebreham na Sera si hapụ ụlọ ha maara ha ahụ́ mgbe ha merela agadi, n’ihi na ha chọrọ irubere Jehova isi.—Jen. 12:1-5.

Anyị kpebiri na anyị ga-eme ihe nzukọ Jehova gwara anyị. Anyị laghachiri Malawi n’abalị mbụ n’ọnwa Febụwarị afọ 1995. Ụbọchị ahụ mere ya afọ iri abụọ na asatọ anyị gaburu ebe ahụ. E hiwere Kọmitii Alaka. Ndị nọ na ya bụ mụ na ụmụnna abụọ ndị ọzọ. Anyị malitere ozugbo haziwekwa ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa na Malawi.

JEHOVA NA-EME KA O TOO

Jehova agọziela m, mee ka m hụ otú o si na-eme ka ọrụ ya na-aga n’ihu n’ike n’ike. Ndị nkwusa e nwere adịkwuola ọtụtụ. N’afọ 1993, ha dị ihe dị ka puku iri atọ (30,000). Ma n’afọ 1998, ha karịziri puku iri anọ na abụọ (42,000). b Òtù Na-achị Isi kwadoro ka a rụọ alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ka e nwee ike ịna-arụ nnukwu ọrụ e kwesịrị ịrụ. Anyị zụtara ala dị ihe dị ka hekta iri na abụọ (ma ọ bụ eka iri atọ) na Lilongwe. A họpụtara m ka m soro ná ndị ga-ahazi ịrụ alaka ụlọ ọrụ ahụ.

Ọ bụ Nwanna Guy Pierce, onye sobu n’Òtù Na-achị Isi, kwuru okwu e ji nyefee Jehova alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ ahụ n’ọnwa Mee afọ 2001. Ihe karịrị puku ụmụnna abụọ (2,000), ndị si n’ọgbakọ dị iche iche na Malawi, bịara ya. Ọtụtụ n’ime ha anọọla n’ọgbakọ ihe karịrị afọ iri anọ kemgbe e mere ha baptizim. Ezigbo ụmụnna ndị a, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, diri mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ ruo ọtụtụ afọ n’oge ahụ a machiri ozi ọma anyị iwu. Ha enweghị ego, ma okwukwe ha bụ a kwaa a kwụrụ. Obi bụzi ha sọ aṅụrị ka ha na-elegharị anya na Betel ahụ a rụrụ ọhụrụ. N’ebe ọ bụla ha gara, ha na-abụ abụ Alaeze, ụfọdụ na-abụ, ndị ọzọ ana-ekwechi ya otú e si agụ egwú n’Afrịka. Ihe a mere ka ọ bụrụ ihe kacha mee obi ụtọ m hụtụrụla. O gosiri na anyị tụkwasị Jehova obi ma tachie obi n’ọnwụnwa ndị bịaara anyị, Jehova ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji.

Mgbe a rụchara alaka ụlọ ọrụ ahụ, obi dị m ụtọ na e bidoro inye m ihe omume gbasara inyefe Jehova Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a rụrụ. Ọgbakọ ndị dị na Malawi so ná ndị nzukọ Jehova haziri ka a rụọrọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ngwa ngwa otú ahụ a na-emere mba ndị na-enwechaghị ego. Mgbe mbụ, ọgbakọ ụfọdụ na-anọ n’ụlọ ndò e ji osisi rụọ amụ ihe. Ha na-eji ahịhịa kpuchie elu ya, jirikwa ájá kpụọ oche ogologo ndị mmadụ ga-anọ. Ugbu a, ụmụnna na-eji obi ha niile na-akpụ brik n’ekwú ha ji aka ha rụọ, jirizie ya rụọ ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mana, ụdị oche ka na-akara ha mma bụ bench, kama inwe oche maka otu onye otu onye n’ihi na a na-ekwukarị na mee elu, mee ala, bench ga-abakwu otu onye.

Ọnụ na-abụkwa m ọchị ọchị ma m hụ otú Jehova si enyere ndị mmadụ aka ịbụ Ndị Kraịst ma nke a na-akọ. Ụmụnna bụ́ ụmụ okorobịa n’Afrịka kacha mee m obi ụtọ n’ihi otú ha si wepụta onwe ha ijere Jehova ozi. Ha egbughịkwa oge ịmụta ihe nzukọ Jehova na-akụziri ha. Ha na-arụ ya, ha ana-amụtakwu ya. Ọ bụ ihe nyeere ha aka ịrụ ọrụ ndị e nyekwuru ha na Betel nakwa n’ọgbakọ. Ndị nlekọta sekit a họpụtara ọhụrụ nyekwara aka mee ka ọgbakọ sikwuo ike. Ọtụtụ n’ime ha alụọla nwaanyị. Ha kpebiri iji oge ha niile na-ejere Jehova ozi, hapụtụgodị ịmụ ụmụ n’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ha na ọtụtụ ndị ọzọ na-atụ anya na di na nwunye ọ bụla kwesịrị ịmụwa ụmụ ozugbo ha lụrụ.

OBI DỊ M ỤTỌ MAKA IHE NDỊ M KPEBIRI IME

Mụ na nwunye m, na Betel dị na Briten

Ka anyị nọchara afọ iri ise na abụọ n’Afrịka, ahụ́ malitere inye m nsogbu. Òtù Na-achị Isi kwadoro aro Kọmitii Alaka tụụrụ ha ka a gwa anyị laghachi Briten. O wutere anyị na anyị ga-ahapụ ọrụ anyị na-atọgbu anyị atọgbu. Ma, ezinụlọ Betel dị na Briten na-elekọta anyị nke ọma ugbu a anyị merela agadi.

Obi siri m ike na ikwe ka Jehova na-ezi m ụzọ bụ ihe kacha mma m kpebitụrụla. A sị na m tụkwasịrị amamihe m obi, ònye makwanụ ihe ọrụ ego gaara akpatara m? Mgbe niile, Jehova ma ihe m kwesịrị ime ka ‘ihe gaziere m.’ (Ilu 3:5, 6) Mgbe m bụ nwa okorobịa, ihe bụ́ mkpa m bụ ịmụ gbasara ihe ndị a na-arụ ná nnukwu ụlọ ọrụ. Mana, nzukọ Jehova zuru ụwa ọnụ mere ka m nwee ọrụ mere ka obi na-atọ m ụtọ. Ị jụọ m, m ga-asị na ijere Jehova ozi ka bụkwa ihe kacha mma mmadụ ga-eji ndụ ya mee.

a E bipụtara akụkọ gbasara Ndịàmà Jehova nọ na Malawi n’Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 1999 (nke Bekee), peeji nke 148 ruo na nke 223.

b Ndị nkwusa e nwere na Malawi ugbu a karịrị otu narị puku (100,000).