Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 29

Na-akwado Jizọs Bụ́ Onye Na-eduzi Anyị

Na-akwado Jizọs Bụ́ Onye Na-eduzi Anyị

“E nyela m ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”—MAT. 28:18.

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1. Gịnị ka Jehova chọrọ taa?

 TAA, Chineke chọrọ ka a na-ekwusa ozi ọma gbasara Alaeze ya n’ụwa niile. (Mak 13:10; 1 Tim. 2:3, 4) Ihe a bụ ọrụ Jehova. Otú ọrụ a si dị ezigbo mkpa mere o ji gwa Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ na-eduzi ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na ebe ọ bụ na Jizọs na-eduzi anyị, a ga-ekwusacha ozi ọma a otú Jehova chọrọ ya tupu ọgwụgwụ abịa.—Mat. 24:14.

2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

2 N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú Jizọs si jiri “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enye anyị ntụziaka si n’Okwu Chineke, na-ahazikwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma a a na-ekwusatụbeghị otú a kemgbe ụwa. (Mat. 24:45) Anyị ga-ahụkwa ihe onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ime iji na-akwado Jizọs na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.

JIZỌS NA-ELEKỌTA ỌRỤ IKWUSA OZI ỌMA

3. Olee ikike e nyere Jizọs?

3 Ọ bụ Jizọs na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma. Olee otú anyị si mara? Obere oge tupu Jizọs alaa eluigwe, ya na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ n’ugwu dị na Galili. Ọ gwara ha, sị: “E nyela m ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Legodị ihe ọzọ ọ gwara ha. Ọ sịrị: “N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:18, 19) N’ihi ya, ihe so n’ikike e nyere Jizọs bụ iduzi ọrụ ikwusa ozi ọma.

4. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na ọ bụ Jizọs ka na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma a taa?

4 Jizọs kwuru na a ga na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya ná “mba niile,” nakwa na ọ ga-anọnyere ndị na-eso ụzọ ya “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.” (Mat. 28:20) Ihe a Jizọs kwuru mere ka o doo anya na ọ bụ ya ka ga na-eduzi ọrụ ikwusa ozi ọma ruo n’oge anyị a.

5. Olee otú anyị si soro na-emezu amụma e buru n’Abụ Ọma 110:3?

5 Jizọs anọghị na-echegbu onwe ya ma à ga-enwekwa ọtụtụ ndị ga na-ekwusa ozi ọma a n’oge ọgwụgwụ a. Ọ ma na amụma ahụ e buru n’akwụkwọ Abụ Ọma ga-emezu. Ebe ahụ sịrị: “Ndị gị ga-eji obi ha wepụta onwe ha n’ụbọchị i du ndị agha gị na-eje agha.” (Ọma 110:3) Ọ bụrụ na i so na-ekwusa ozi ọma a, ị na-akwado Jizọs na ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, i sokwa na-emezu amụma a. Ọrụ a na-aga n’ihu. Mana, e nwere ihe ụfọdụ na-eme ka o sie ike.

6. Olee otu ihe na-eme ka ikwusa ozi ọma na-esi ike taa?

6 Otu ihe na-eme ka o sie ike bụ na a na-akpagbu ndị na-ekwusa ozi ọma. Ndị si n’ezi ofufe dapụ, ndị isi okpukpe, na ndị ọchịchị agwala ọtụtụ ndị ihe na-abụghị eziokwu gbasara ozi ọma anyị. Ọ bụrụ na e jiri ụgha ndị a ghọgbuo ndị ikwu anyị, ndị enyi anyị, na ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ha nwere ike ịna-agbalị ime ka anyị kwụsị ife Jehova nakwa ikwusa ozi ọma. N’obodo ụfọdụ, ndị iro anyị na-eyi ụmụnna anyị egwu, na-akụ ha ihe, na-anwụchi ụfọdụ n’ime ha, na-atụbadị ụfọdụ n’ụlọ mkpọrọ. Ihe ndị a ha na-eme ejughị anyị anya. Jizọs kwuru, sị: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Otú a ha si kpọ anyị asị na-egosi na anyị na-eme ihe dị Jehova mma. (Mat. 5:11, 12) Ọ bụ Ekwensu mere e ji na-emegide anyị. Ma, e nweghị ebe o ruru Jizọs. Ebe ọ bụ na Jizọs na-akwado anyị, a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile. Legodị ihe mere anyị ji kwuo ya.

7. Olee ihe gosiri na ihe e kwuru ná Mkpughe 14:6, 7 na-emezu?

7 Ihe ọzọ na-eme ka o siere anyị ike ikwusa ozi ọma bụ na anyị na-ekwusara ndị na-asụ asụsụ dị iche iche ozi ọma. N’ọhụụ Jọn onyeozi hụrụ, Jizọs buru amụma na n’oge a, a ga na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị nsogbu ahụ. (Gụọ Mkpughe 14:6, 7.) Olee otú a ga-esi na-ekwusa ya? Anyị na-ezi onye ọ bụla chọrọnụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. Taa, ndị bi n’ebe niile n’ụwa na-agụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl dị na jw.org n’ihi na a na-ede ha n’ihe karịrị otu puku asụsụ. Òtù Na-achị Isi nyekwara ikike ka a sụgharịa akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’ihe karịrị narị asụsụ asaa (700). Ọ bụ ya bụ akwụkwọ bụ́ isi anyị ji eme ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. A na-etinyekwa ihe ndị e ji amụ Baịbụl na vidio maka ndị ogbi, jirikwa mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì dee ya maka ndị ìsì. Anyị na-ahụ ka amụma ndị e buru na Baịbụl na-emezu. Ndị “na-asụ asụsụ niile e nwere ná mba dị iche iche” na-amụta ịsụ “asụsụ dị ọcha,” ya bụ, eziokwu Baịbụl. (Zek. 8:23; Zef. 3:9) Ihe mere e ji na-arụ ihe ndị a niile bụ n’ihi na ọ bụ Jizọs na-eduzi ozi ọma anyị.

8. Olee uru ozi ọma anyị na-ekwusa bara?

8 Taa, ihe karịrị nde mmadụ asatọ (8,000,000), ndị si na narị mba abụọ na iri anọ (240), nọ n’ọgbakọ Jehova. Kwa afọ, a na-emekwa ọtụtụ puku mmadụ baptizim. Ihe dị mkpa karịa mmadụ ole na-aghọ Ndị Kraịst bụ na ndị ọhụrụ ndị a na-agbanwe àgwà ha, yirizie “àgwà ọhụrụ.” (Kọl. 3:8-10) Ọtụtụ n’ime ha kwụsịrị ime omume rụrụ arụ, tigbuo zọgbuo, ịkpọ asị, na iche na obodo ha ka nke ndị ọzọ mma. Amụma e dere n’Aịzaya 2:4 na-emezu. Ha anaghịzi ‘amụ otú e si alụ agha.’ Anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha bata n’ọgbakọ Jehova n’ihi na anyị na-agbalịsi ike na-eyiri àgwà ọhụrụ. Anyị na-egosikwa na anyị na-eso ụzọ onye nlekọta anyị bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 13:35; 1 Pita 2:12) Gịnị mere ihe ndị a ji eme? Ọ bụ n’ihi na Jizọs na-enyere anyị aka.

JIZỌS HỌPỤTARA OHU KWESỊRỊ NTỤKWASỊ OBI

9. Dị ka e kwuru na Matiu 24:45-47, gịnị ka Jizọs kwuru ga-eme n’oge ikpeazụ?

9 Gụọ Matiu 24:45-47. Jizọs buru amụma na n’oge ikpeazụ, ọ ga-ahọpụta ‘ohu kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche’ ga-eji Okwu Chineke na-enyeju anyị afọ. N’ihi ya, ọ gaghị eju anyị anya na ohu ahụ ga na-arụsi ọrụ ike n’oge anyị a. Ọ bụkwa otú ọ dị. Jizọs ejirila mmadụ ole na ole e tere mmanụ na-enye ndị Chineke na ndị chọrọ ịmụta eziokwu “nri ha n’oge kwesịrị ekwesị.” Ụmụ nwoke ndị a anaghị ele onwe ha anya ka ọ̀ bụ ha na-eme ka ndị ọzọ nwee okwukwe. (2 Kọr. 1:24) Kama nke ahụ, ha ma na ọ bụ Jizọs Kraịst “na-edu” ndị ya ma “na-achị ha.”—Aịza. 55:4.

10. Olee akwụkwọ e sere ebe a mere ka ị malite ife Jehova?

10 Kemgbe afọ 1919, ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ewepụtala akwụkwọ dị iche iche e ji bido inyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu Baịbụl aka. N’afọ 1921, ohu ahụ bipụtara akwụkwọ aha ya bụ The Harp of God iji nyere ndị chọrọ ịmụta eziokwu aka ka ha mata ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. Ka oge na-aga, e bipụtakwara akwụkwọ ndị ọzọ. Olee akwụkwọ ndị nyeere gị aka ịmụta gbasara Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova na ịhụ ya n’anya? Ọ̀ bụ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu,” Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?, Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, ka ọ̀ bụkwanụ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi, bụ́kwanụ nke kacha ọhụrụ? E bipụtara akwụkwọ ndị a iji nyere anyị aka ime ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha bụ nnọọ ihe dị anyị ezigbo mkpa n’oge e bipụtara ha.   

11. Gịnị mere o ji dị mkpa na anyị niile kwesịrị ịna-amụtakwu gbasara Jehova na Baịbụl?

11 Ọ bụghị naanị ndị chọrọ ịmụta eziokwu bụ ndị kwesịrị ịna-amụta ihe ndị siri ike Baịbụl na-akụzi. Anyị niile kwesịrị ịna-eme otú ahụ. Pọl onyeozi sịrị: “Nri siri ike bụ maka ndị tozuru etozu.” O kwukwara na ime ihe ndị ahụ anyị mụtara ga-enyere anyị aka ịmata “ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Hib. 5:14) O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ime ihe Jehova kwuru ugbu a n’ihi na ọtụtụ ndị na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ma, Jizọs na-ahụ na anyị na-amụta ihe ndị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Ọ bụ n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl ka anyị si amụta ihe ndị ahụ. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-ewepụta ha ma na-ekesara ha ụmụnna. Ọ bụ Jizọs na-eduzi ha.

12. Dị ka Jizọs, olee otú anyị sirila mee ka e too aha Chineke?

12 Dị ka Jizọs, anyị emeela ka e too aha Chineke otú e kwesịrị ito ya. (Jọn 17:6, 26) Dị ka ihe atụ, n’afọ 1931, anyị malitere ịza aha si na Baịbụl, nke bụ́ Ndịàmà Jehova. Anyị si otú ahụ gosi na aha Chineke dị anyị ezigbo mkpa nakwa na anyị chọrọ ka e jiri ya mara anyị. (Aịza. 43:10-12) Kemgbe afọ ahụ, a na-ede aha ahụ n’ihu Ụlọ Nche ọ bụla. Ihe ọzọ bụ na Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dere aha Chineke ebe ọ bụla o kwesịrị ịdị. Ihe a dị ezigbo iche n’ihe ndị chọọchị na-eme. Ha wepụrụ aha Jehova n’ọtụtụ Baịbụl ha sụgharịrị.

JIZỌS HAZIRI NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA

13. Gịnị mesiri gị obi ike na Jizọs ji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-arụ ọrụ taa? (John 6:68)

13 Jizọs ji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” hazie ọgbakọ ya n’ụwa ka ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Olee otú obi dị gị gbasara ọgbakọ a? O nwere ike ịbụ na ọ dị gị otú ọ dị Pita onyeozi. Ọ gwara Jizọs, sị: “Ònye ka anyị ga-alakwuru? Okwu gị na-enye ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:68) Olee ebe onye ọ bụla n’ime anyị gaara anọ taa ma a sị na ọ bataghị ná nzukọ Jehova? Jizọs ji nzukọ a na-enye anyị ihe niile ga-eme ka anyị na-erubere Chineke isi. Ọ na-azụkwa anyị ka anyị nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma nke ọma. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-enyere anyị aka ịna-eyiri “àgwà ọhụrụ” ka anyị nwee ike ịna-eme ihe dị Jehova mma.—Efe. 4:24.

14. Olee uru ịnọ n’ọgbakọ Jehova baara gị n’oge ọrịa koronavaịrọs?

14 Jizọs na-enye anyị ntụziaka na-abara anyị uru n’oge ihe siri ike. Anyị hụrụ uru ntụziaka ndị ahụ baara anyị mgbe ọrịa koronavaịrọs malitere. Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa amaghị ihe ha ga-eme eme. Ma, Jizọs mere ka anyị nweta ntụziaka doro anya ga-eme ka anyị ghara ịba ná nsogbu. A gwara anyị ka anyị na-ekpuchi imi anyị na ọnụ anyị mgbe anyị nọ n’ebe ndị mmadụ nọ nakwa ka anyị ghara ịna-anọ ndị ọzọ oké nso. A gwara ndị okenye ka ha na-akpọtụrụ ndị niile nọ n’ọgbakọ ha mara otú ha mere, na-enyekwara ha aka ka ha na Jehova na-adị ná mma. (Aịza. 32:1, 2) E sikwa n’akụkọ si n’aka Òtù Na-achị Isi ndị e wepụtara gwa anyị ihe ndị ọzọ anyị kwesịrị ime, gbakwuokwa anyị ume.

15. Olee ihe a gwara anyị gbasara ọmụmụ ihe, mgbakọ, na ikwusa ozi ọma n’oge ọrịa koronavaịrọs, oleekwa uru ọ bara?

15 N’oge ọrịa koronavaịrọs, a gwakwara anyị otú anyị ga-esi na-enwe ọmụmụ ihe anyị, na-ezikwa ozi ọma. Anyị malitere ozugbo isi n’Ịntanet na-enwe ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụzie naanị akwụkwọ ozi na ekwentị ka anyị ji na-ekwusa ozi ọma. Jehova gọziri mbọ anyị gbara. Ọtụtụ alaka ụlọ ọrụ kwuru na ndị nkwusa ha nwere ebukwuola ibu. Ọtụtụ n’ime ha kọdịrị akụkọ ndị na-agba ume mere n’oge a.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Jehova Na-agọzi Ozi Ọma Anyị.”

16. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

16 O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị nọ na-eche na ọgbakọ na-akpachara anya karịa otú o kwesịrị n’ihe gbasara ọrịa koronavaịrọs. Ihe ndị mere ọtụtụ ugboro egosila na ihe ndị ahụ ha gwara anyị mee bara ezigbo uru. (Mat. 11:19) Ka anyị na-eche gbasara otú Jizọs si na-edu ndị ya, obi na-esi anyị ike na n’agbanyeghị nsogbu nwere ike ịbịara anyị echi, Jehova na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ga-anọnyere anyị.—Gụọ Ndị Hibru 13:5, 6.

17. Olee otú obi dị gị na i so ná ndị Jizọs na-eduzi?

17 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na ọ bụ Jizọs na-eduzi anyị. Anyị nọ n’ọgbakọ Jehova a na-anaghị akpa ókè na ya n’agbanyeghị na ndị nọ na ya si ná mba dị iche iche, na-asụ asụsụ dị iche iche, nweekwa omenala dị iche iche. E ji Okwu Chineke na-enyeju anyị afọ, na-akụzikwara anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ịna-ekwusa ozi ọma. A na-akụziri onye ọ bụla n’ime anyị otú ọ ga-esi na-eyiri àgwà ọhụrụ. Anyị na-amụtakwa ịhụ ibe anyị n’anya. E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji na-anya isi na ọ bụ Jizọs na-eduzi anyị.

ABỤ NKE 16 Toonụ Jaa n’Ihi Ọkpara Ya O Tere Mmanụ

a Ọtụtụ nde ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma ugbu a. Ì so na-ekwusa ya? Ọ bụrụ na i so, ọ bụ Onyenwe anyị bụ́ Jizọs Kraịst na-eduzi gị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị na-egosi na ọ bụ Jizọs na-eduzi ozi ọma a a na-ekwusa taa. Iche echiche gbasara ihe a ga-enyere anyị aka ikpebisi ike na anyị agaghị akwụsị ime ihe Jizọs na-agwa anyị n’ozi ọma anyị na-ekwusa.