ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 29
Ì Jikerela Maka Oké Mkpagbu?
“Dịrịnụ njikere.”—MAT. 24:44.
ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Gịnị mere o ji dị mma ịkwadebe maka ọdachi?
ỊKWADEBE akwadebe nwere ike ịzọ ndụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwee ọdachi, e nweghị ihe na-emekarị ndị kwadebere maka ya, ha na-enyekwara ndị ọzọ aka. Otu òtù na-enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka na Yurop kwuru, sị: “Ịkwadebe nke ọma maka ọdachi nwere ike ịzọ ndụ.”
2. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkwadebe maka oké mkpagbu? (Matiu 24:44)
2 “Oké mkpagbu” ga-amalite na mberede. (Mat. 24:21) Ma, ọ gaghị adị ka ọdachi ndị ọzọ na-emenụ maka na anyị ma na ọ na-abịa. N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwadebe maka ụbọchị ahụ. (Gụọ Matiu 24:44.) Ọ bụrụ na anyị akwadebe maka ya, ọ ga-adịrị anyị mfe ịgafe oge ahụ ga-esi ezigbo ike, anyị enweekwa ike inyere ndị ọzọ aka ime otú ahụ.—Luk 21:36.
3. Olee otú ịtachi obi, inwe obi ebere, na ịhụnanya ga-esi nyere anyị aka ijikere maka oké mkpagbu?
3 Ka anyị leba anya n’àgwà atọ nwere ike inyere anyị aka ijikere maka oké mkpagbu. Gịnị ka anyị ga-eme ma a gwa anyị kwusaa ozi amamikpe na-agba agba ná ntị, ndị mmegide ana-emegidekwa anyị? (Mkpu. 16:21) Anyị kwesịrị ịtachi obi iji rubere Jehova isi, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-echebe anyị. Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe niile ụmụnna anyị nwere emie ala? (Hab. 3:17, 18) Anyị kwesịrị inwe obi ebere ka anyị nye ha ihe dị ha mkpa. Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ebikọọ ọnụ n’otu ebe n’ihi ọgụ ọtụtụ mba gbakọrọ aka ọnụ ga-alụso anyị? (Ezik. 38:10-12) Anyị kwesịrị ịhụ ibe anyị n’anya nke ukwuu. Ọ ga-eme ka ha nyere anyị aka n’oge ahụ ga-ata ezigbo akpụ.
4. Olee otú Baịbụl si gosi na anyị kwesịrị ịna-amụta ịtachi obi, inwe obi ebere, na ịhụ ndị ọzọ n’anya?
4 Okwu Chineke gbara anyị ume ka anyị na-amụtakwu ịtachi obi, inwe obi ebere, na ịhụ ndị ọzọ n’anya. Luk 21:19 sịrị: “Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.” Ndị Kọlọsi 3:12 sịrị: ‘Yirinụ obi ebere ka uwe.’ E kwukwara ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:9, 10, sị: “Chineke na-akụziri unu ka unu na-ahụ ibe unu n’anya. . . . Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya karịa otú unu na-eme.” Ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka a gwara ihe e kwuru n’amaokwu ndị a niile. Ha na-atachi obi, na-enwere ndị ọzọ obi ebere, hụkwa ndị ọzọ n’anya. Ma, ha kwesịrị ịmụta otú ha ga-esi na-akpakwu àgwà ndị a. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ. Ihe ga-enyere anyị aka bụ ileba anya n’otú Ndị Kraịst n’oge ndịozi si kpaa nke ọ bụla n’ime àgwà ndị a. Anyị ga-ahụzi otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ka ha iji gosi na anyị dị njikere maka oké mkpagbu.
MỤTAKWUO ỊTACHI OBI
5. Gịnị nyeere Ndị Kraịst n’oge Pọl aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị bịaara ha?
5 Ndị Kraịst n’oge Pọl onyeozi kwesịrị ịna-atachi obi. (Hib. 10:36) Ha nwere ụdị nsogbu ọtụtụ ndị bi n’oge ahụ nwere. Ma, ha nwere nsogbu ndị ọzọ n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst. A kpagburu ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụghị naanị ndị isi okpukpe ndị Juu na ndị ọchịchị ndị Rom kpagburu ha, kama, ndị ezinụlọ ha sokwa kpagbuo ha. (Mat. 10:21) N’ime ọgbakọ kwa, o nwere mgbe ụfọdụ ha gbasiri mbọ ike ka ha ghara ịmụta ozizi ụgha ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi, bụ́ nke nwere ike ikewa ọgbakọ. (Ọrụ 20:29, 30) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Ndị Kraịst ndị ahụ tachiri obi. (Mkpu. 2:3) Gịnị nyeere ha aka? Ha chere echiche nke ọma gbasara ndị dị ka Job, bụ́ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl tachiri obi. (Jems 5:10, 11) Ha kpere ekpere ka Chineke nye ha ike. (Ọrụ 4:29-31) Ha nọkwa na-echeta na Jehova ga-akwụ ha ụgwọ ma ha tachie obi.—Ọrụ 5:41.
6. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Merita mere iji die mmegide e megidere ya?
6 Anyịnwa ga-atachikwa obi ma ọ bụrụ na anyị ana-amụ gbasara ndị tachiri obi a kọrọ akụkọ ha n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ anyị, na-echebakwara ha echiche. Ime otú ahụ nyeere otu nwanna nwaanyị nọ n’Albenia aha ya bụ Merita aka idi mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ ndị ezinụlọ ya megidere ya. Ọ sịrị: “Akụkọ Job a kọrọ na Baịbụl gbara m ezigbo ume. Ọ tara ezigbo ahụhụ. Ọ maghịkwa ebe nsogbu ya ndị ahụ si na-abịa. N’agbanyeghị ya, ọ sịrị: ‘Ruo mgbe m nwụrụ, m ga-ejisi Chineke aka ike.’ (Job 27:5) M chere gbasara otú nsogbu ndị bịaara Job si sie ike karịa nke m. Ọ bụ eziokwu na Job amaghị onye kpatara nsogbu ya, mụnwa ma onye na-akpata nsogbu nke m.”
7. Ọ bụrụgodị na e nweghị nnukwu nsogbu bịaara anyị ugbu a, gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta ime ugbu a?
7 Ihe ọzọ nwere ike inyere anyị aka ịna-atachikwu obi bụ ịna-ekpe ekpere mgbe niile, jirikwa obi anyị niile na-akọrọ Jehova ihe ndị na-echegbu anyị. (Fil. 4:6; 1 Tesa. 5:17) O nwere ike ịbụ na o nwebeghị nnukwu nsogbu bịaara gị ugbu a, ma ị̀ na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme mgbe ọ bụla iwe ji gị ma ọ bụ mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme eme? Ọ bụrụ na ị na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka n’obere nsogbu ndị na-abịara gị kwa ụbọchị, ọ ga-adịrị gị mfe ịgwa ya ka o nyere gị aka ma nnukwu nsogbu bịara gị n’ọdịnihu. Obi ga-esizi gị ike na ọ ma mgbe ọ ga-enyere gị aka nakwa otú ọ ga-esi enyere gị aka.—Ọma 27:1, 3.
8. Olee otú ihe Nwanna Nwaanyị Mira mere si gosi na mmadụ ịtachi obi ugbu a nwere ike inyere ya aka ịtachi obi n’ọdịnihu? (Jems 1:2-4) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
8 Ọ bụrụ na anyị ana-atachi obi ná nsogbu ndị na-abịara anyị taa, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịtachi obi n’oge oké mkpagbu. (Rom 5:3) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Ọtụtụ ụmụnna achọpụtala na ọ bụrụ na ha edie otu nsogbu bịaara ha, ọ na-enyere ha aka idi nsogbu ọzọ ga-abịa. Ịtachi obi na-eme ka ha nwekwuo okwukwe, obi esiekwa ha ike na Jehova dị njikere inyere ha aka nakwa na ọ chọrọ inyere ha aka. Okwukwe ahụ na-enyere ha aka idi nsogbu ọzọ ga-abịara ha. (Gụọ Jems 1:2-4.) E nwere otu nwanna nwaanyị n’Albenia bụ́ ọsụ ụzọ. Aha ya bụ Mira. Ọ chọpụtara na otú o si tachie obi n’oge gara aga nyeere ya aka ịna-atachi obi ugbu a. O kwuru na mgbe ụfọdụ, ọ na-eche na ọ bụ naanị ya ka ọtụtụ nsogbu na-abịara. Ma, ọ na-echeta otú Jehova si na-enyere ya aka kemgbe afọ iri abụọ. Ọ na-agwa onwe ya, sị: ‘Rubere Jehova isi. Ekwela ka afọ ndị a niile na aka niile Jehova nyeere gị imeri nsogbu ndị bịaara gị fuo ọhịa.’ I nwekwara ike iche gbasara otú Jehova sirila nyere gị aka ịtachi obi. Obi sie gị ike na mgbe ọ bụla ị tachiri obi ma nsogbu bịara gị, ọ na-ahụ ya, ọ ga-agọzikwa gị maka ya. (Mat. 5:10-12) Ọ bụrụzie na oké mkpagbu amalite, ọ ga-abụrịrị na ị mụtala otú ị ga-esi na-atachi obi. Ị ga-ekpebisikwukwa ike ịna-atachi obi.
NA-ENWE OBI EBERE
9. Olee otú ụmụnna nọ n’Antiọk nke Siria si gosi na ha nweere ụmụnna ha obi ebere?
9 Ka anyị leba anya n’ihe mere mgbe oké ụnwụ kpara ụmụnna nọ na Judia aka. Mgbe ọgbakọ dị n’Antiọk nke Siria nụrụ gbasara ụnwụ ahụ, o doro anya na ha nweere ụmụnna ha nọ na Judia obi ebere. Ma ha gbakwara mbọ nyere ha aka. Ha “kpebiri izigara ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka otú aka onye nke ọ bụla n’ime ha hà.” (Ọrụ 11:27-30) Ọ bụ eziokwu na ụmụnna ndị ụnwụ ahụ kpara aka bi ebe dị anya, ụmụnna ndị nọ n’Antiọk kpebisiri ike inyere ha aka.—1 Jọn 3:17, 18.
10. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi nweere ụmụnna anyị obi ebere ma ọdachi dakwasị ha? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
10 Anyị nwekwara ike inwere ụmụnna anyị obi ebere taa ma anyị hụ na ọdachi dakwasịrị ha. Anyị na-ewepụta onwe anyị inyere ha aka ngwa ngwa. Anyị nwere ike ịjụ ndị okenye ma ànyị nwere ike iso gaa rụzie ihe ndị mebiri emebi. Anyị nwere ike inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, na-etinyekwa ndị ọdachi dakwasịrị n’ekpere. b (Ilu 17:17) Dị ka ihe atụ, n’afọ 2020, e hiwere Kọmitii Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka karịrị narị itoolu na iri ise (950) n’ụwa niile iji nyere ndị ọrịa koronavaịrọs kpara aka aka. Anyị na-ekele ụmụnna ndị so rụọ ọrụ na kọmitii ndị ahụ. Ọ bụ obi ebere ha nweere ụmụnna ha mere ha ji soro gaa kesaara ha ihe ndị dị ha mkpa, nyekwara ha aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova. E nwekwara ụlọ ụmụnna na ebe ndị anyị na-anọ efe Jehova ha rụziri ma ọ bụ rụọ nke ọhụrụ.—I nwere ike ịtụle 2 Ndị Kọrịnt 8:1-4.
11. Olee otú obi ebere anyị na-enwere ụmụnna anyị si eme ka e too Jehova?
11 Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ụmụnna anyị obi ebere ma ọdachi mee, ndị ọzọ ga-ahụ mbọ anyị gbara. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2019, oké ifufe mebiri otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị na Bahamas. Mgbe ụmụnna anyị na-arụgharị Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ha gwara otu onye ọrụ ngo na-abụghị Onyeàmà Jehova ka o kwuo ego ole ọ ga-eji rụọ ihe a chọrọ ka ọ rụọ. Ọ sịrị ha: “M ga-achọ iweta . . . ngwá ọrụ, kpọta ndị ga-enye aka n’ọrụ ahụ, wetakwa ihe ndị a ga-eji arụ ya n’anaghị ego ọ bụla. . . . M chọrọ imere nzukọ unu ihe a. Ihe na-atọgbu m atọgbu bụ otú unu si emeso ibe unu.” Ọtụtụ ndị nọ n’ụwa amaghị Jehova. Ma, ọtụtụ n’ime ha na-ahụ ihe Ndịàmà Jehova na-eme. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị chọpụta na ndị mmadụ nwere ike ịchọ ịmụtakwu gbasara Jehova, onye ‘ebere ya na-enweghị atụ,’ ma ha hụ otú anyị si enwere ụmụnna anyị obi ebere.—Efe. 2:4.
12. Olee otú imetere ụmụnna anyị ebere taa ga-esi kwadebe anyị maka oké mkpagbu? (Mkpughe 13:16, 17)
12 Gịnị mere anyị kwesịrị iji nweere ụmụnna anyị obi ebere n’oge oké mkpagbu? Baịbụl kwuru ihe gosiri na nsogbu ga-abịara ndị niile na-akwadoghị ndị ọchịchị nke ụwa a ma ugbu a ma n’oge oké mkpagbu. (Gụọ Mkpughe 13:16, 17.) O nwere ike ịdị mkpa ka e nyere ụmụnna anyị aka inweta ihe ndị dị ha mkpa. Mgbe Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst ga-abịa ikpe ndị ọjọọ ikpe, anyị chọrọ ka ọ hụ na anyị na-enwere ụmụnna anyị obi ebere, nakwa ka ọ kpọọ anyị ka anyị ‘keta Alaeze.’—Mat. 25:34-40.
NA-AHỤKWU ỤMỤNNA GỊ N’ANYA
13. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 15:7, olee otú Ndị Kraịst n’oge ndịozi si na-ahụkwu ibe ha n’anya?
13 Ọ bụ ịhụnanya ka e ji mara Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Ma, ọ̀ dịịrị ha mfe ịhụ ụmụnna ha n’anya? Legodị ụdị ndị dị iche iche e nwere n’ọgbakọ dị na Rom. E nwere ndị bụ́ ndị Juu, ndị e ji Iwu Mosis zụọ, nweekwa ndị na-abụghị ndị Juu nwere omenala dị iche iche. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime Ndị Kraịst ndị ahụ bụbu ndị ohu, ụfọdụ abụrụ ndị nweere onwe ha. O nwedịrị ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha nwere ndị ohu. Olee otú Ndị Kraịst ndị a ga-esi na-ahụkwu ibe ha n’anya n’agbanyeghị ihe ndị a? Pọl onyeozi gbara ha ume ka ha ‘na-anabata ibe ha.’ (Gụọ Ndị Rom 15:7.) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Okwu a sụgharịrị “ịnabata” pụtara inwere mmadụ obiọma ma ọ bụ ile ya ọbịa nke ọma, otú ahụ mmadụ na-emere onye bịara n’ụlọ ya ma ọ bụ ndị enyi ya. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara Faịlimọn otú ọ ga-esi nabata Onesịmọs, bụ́ ohu ya gbapụrụ agbapụ. Ọ gwara ya, sị: “Nabata ya otú ị ga-esi anabata m.” (Faị. 17) Prisila na Akwịla nabatara Apọlọs, onye ha ka mara gbasara Ndị Kraịst. Otú ha si mee ya bụ ‘ịkpọpụ ya iche’ n’ebe ndị ọzọ nọ ma kọwakwuoro ya eziokwu. (Ọrụ 18:26) Ndị Kraịst ndị ahụ ekweghị ka ebe ndị ha dị iche kpatara ha nsogbu. Kama, ha nabatara ibe ha.
14. Olee otú Nwanna Nwaanyị Anna na di ya si gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya?
14 Anyị nwekwara ike igosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-emeta ha enyi. Ọ ga-emekwa ka ha hụ anyị n’anya. (2 Kọr. 6:11-13) Legodị ihe Nwanna Nwaanyị Anna na di ya mere. Obere oge ha kwagachara n’ebe ha gara ozi ala ọzọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, ọrịa koronavaịrọs malitere. N’ihi ọrịa ahụ, ha na ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ ahụghị ihu na ihu. O mekwara ka o siere ha ike ịmata ụmụnna ndị ahụ. Olee otú di na nwunye a ga-esi gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya? Ha si n’Ịntanet na-akpọtụrụ ụmụnna ha, na-agwa ha otú ha si chọsie ike ịmata ha nke ọma. Obi dị ụmụnna ndị ahụ ụtọ n’ihi otú ndị ozi ala ọzọ ahụ si hụ ha n’anya. O mere ka ezinụlọ ndị ahụ na-akpọtụrụ ha mgbe ọ bụla, na-ezigakwara ha ozi. Gịnị mere di na nwunye a ji gbalịa ịmata ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ha? Nwanna Nwaanyị Anna sịrị: “Otú e si hụ mụ na ndị ezinụlọ anyị n’anya ma n’oge ihe dịịrị anyị mma ma n’oge anyị nọ ná nsogbu anaghị apụ m apụ n’obi. O mekwara ka m chọọ isi otú ahụ na-ahụ ụmụnna anyị n’anya.”
15. Gịnị ka i si n’ihe Nwanna Nwaanyị Vanessa mere mụta gbasara ịhụ ụmụnna anyị niile n’anya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
15 Ọtụtụ n’ime anyị nọ n’ọgbakọ e nwere ụmụnna ndị si ebe dị iche iche, nweekwa àgwà dị iche iche. Anyị ga-ahụkwu ha n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’ihe ndị ha na-emeta. E nwere otu nwanna nwaanyị na-eje ozi na Niu Ziland aha ya bụ Vanessa. Ọ na-esiburu ya ike ya na ụmụnna ụfọdụ nọ n’ọgbakọ ha ịdị ná mma. Ma, o kpebiri na kama ịna-agbara ụmụnna ndị àgwà ha na-ewe ya iwe ọsọ, na ya ga-ewepụtakwu oge ka ya na ha na-anọrị. Ihe ahụ nyeere ya aka ịhụ ihe mere Jehova ji hụ ha n’anya. Ọ sịrị: “Kemgbe di m ghọrọ onye nlekọta sekit, anyị na ọtụtụ ụmụnna nwere àgwà dị iche iche na-anọkarị. Ọ dịkwuorola m mfe mụ na ha ịdị ná mma. Obi dị m ụtọ ugbu a na Jehova kere ụdị ndị dị iche iche. O doro anya na obi dịkwa Jehova ụtọ n’ihi na o kwere ka ndị dị iche iche bata n’ọgbakọ ya.” Ọ bụrụ na anyị amụta iwere ụmụnna anyị otú Jehova si were ha, anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya.—2 Kọr. 8:24.
16. Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị n’anya n’oge oké mkpagbu? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
16 Ọ ga-adị ezigbo mkpa ka anyị hụ ụmụnna anyị niile n’anya n’oge oké mkpagbu. Oké mkpagbu malite, olee otú Jehova ga-esi echebe anyị? Legodị ihe Jehova gwara ndị ya ka ha mee mgbe a bịara ịlụso Babịlọn oge ochie ọgụ. Ọ sịrị ha: “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyechara. Zoonụ nwa mgbe nta, ruo mgbe Chineke wechara iwe.” (Aịza. 26:20) O yiri ka ànyị ga-emekwa ihe ahụ Jehova gwara ha n’oge oké mkpagbu. ‘Ọnụ ụlọ ahụ dị n’ime’ nwere ike ịbụ ọgbakọ anyị dị iche iche. N’oge oké mkpagbu, Jehova kwere nkwa na ọ ga-echebe anyị ma ọ bụrụ na anyị esoro ụmụnna anyị nọsie ike n’ofufe ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ugbu a ka anyị na ụmụnna anyị dịrị ná mma, anyị ahụkwa ha n’anya. Ọ bụ ihe nwere ike ime ka a zọpụta anyị.
KWADEBE UGBU A
17. Ọ bụrụ na anyị akwadebe ugbu a, gịnị ka anyị ga-enwe ike ime n’oge oké mkpagbu?
17 “Oké ụbọchị Jehova” ga-abụrụ mmadụ niile oge tara ezigbo akpụ. (Zef. 1:14, 15) Ihe ga-esikwara ndị Jehova ike n’oge ahụ. Ma, ọ bụrụ na anyị akwadebe ugbu a, obi ga-eru anyị ala, anyị enweekwa ike inyere ndị ọzọ aka. Anyị ga-enwe ike ịtachi obi ma nsogbu bịara anyị. Ụmụnna anyị tawa ahụhụ, anyị ga-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ma ọ bụrụ na anyị ana-enwere ha obi ebere ma na-enye ha ihe ndị dị ha mkpa. Ọ bụrụkwa na anyị amụta ịhụ ụmụnna anyị n’anya ugbu a, anyị ga-ahụ ha n’anya n’ọdịnihu. Ọ ga-eme ka Jehova gọzie anyị, mee ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa, ebe a na-agaghịzi echeta ọdachi na nsogbu niile.—Aịza. 65:17.
ABỤ NKE 144 Lekwasị Anya n’Ụgwọ Ọrụ
a Ọ gaghị adị anya oké mkpagbu amalite. Ịtachi obi, obi ebere, na ịhụnanya bụ àgwà ndị ga-enyere anyị aka ijikere maka oge ahụ ga-akacha taa akpụ a na-enwetụbeghị ụdị ya. Anyị ga-ahụ ihe nyeere Ndị Kraịst n’oge ndịozi aka ịmụta àgwà ndị ahụ, otú anyịnwa ga-esi mụta àgwà ndị ahụ taa, nakwa otú àgwà ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka ịkwadebe maka oké mkpagbu.
b Ndị chọrọ iso nye aka ma e nwee ọdachi kwesịrị ibu ụzọ dejupụta fọm a na-akpọ Local Design/Construction Volunteer Application (DC-50) ma ọ bụkwanụ Application for Volunteer Program (A-19), cherezie ka a kpọọ ha ka ha nye aka.