Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

“Guzosienụ Ike, Kwụrụnụ Chịm”

“Guzosienụ Ike, Kwụrụnụ Chịm”

“Ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike, kwụrụnụ chịm.”​—1 KỌR. 15:58.

ABỤ NKE 122 Ka Anyị Guzosie Ike, Kwụrụ Chịm

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Olee otú Onye Kraịst si dịrị ka ụlọ elu dị ezigbo elu? (1 Ndị Kọrịnt 15:58)

 N’AFỌ 1978, a rụrụ ụlọ elu dị okpukpu iri isii na Tokio dị na Japan. Ndị mmadụ nọ na-eche otú ụlọ elu ahụ ga-esi kwụrụ n’enweghị ihe mere ya n’ihi na ala ọma jijiji na-emekarị n’obodo ahụ. Olee ihe mere na ụlọ elu ahụ adaghị? Ọ bụ n’ihi na ndị rụrụ ya rụrụ ya ka o sie ike. Ha rụkwara ya otú ọ ga-abụ, ala ọma jijiji mee, ụlọ ahụ arọgharịtụ ka ọ ghara ịda. Ndị Kraịst dị ka ụlọ elu ahụ. Olee otú ha si dịrị ka ya?

2 Onye Kraịst kwesịrị ịna-akwụsi ike n’ezi ihe. Mana, e nwekwara oge ọ ga-eru, ya egosi na ọ naghị esi ọnwụ. A bịa n’ihe gbasara iwu Jehova, Onye Kraịst kwesịrị ịkwụrụ chịm, kpebisie ike irubere ya isi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) Ọ “na-eji obi ya niile erube isi,” ọ naghịkwa ekwe eme ihe na-adịghị mma. Ma, Onye Kraịst kwesịrị ‘ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,’ ya bụ, ikwe ka e mee ihe otú ndị ọzọ chọrọ mgbe ọ bụla o kwesịrị ime otú ahụ ma ọ bụ mgbe o kwere omume. (Jems 3:17) Onye Kraịst na-eme otú a agaghị na-emefe ihe ókè. Ọ gaghị na-ejisi ihe aka ike mgbe niile ma ọ bụ na-ekweta ka onye ọ bụla mewe otú sọrọ ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi kwụsie ike. Anyị ga-achọpụtakwa ụzọ ise Setan si agbalị ime ka anyị ghara irubere Jehova isi nakwa ihe anyị ga-eme ka ọ ghara inweta anyị.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EGUZOSI IKE?

3. Olee iwu Onye Kachanụ na-enye anyị iwu nyere anyị n’Ọrụ Ndịozi 15:28, 29?

3 Jehova, bụ́ Onye Kachanụ na-enye anyị iwu, na-enye ndị ya iwu ndị doro anya ha ga-edebe. (Aịza. 33:22) Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi Jizọs, òtù na-achị isi kwuru ihe atọ Ndị Kraịst ga-eme iji guzosie ike: (1) ha ga-ezere ikpere arụsị, na-efekwa naanị Jehova, (2) ha ga na-erubere iwu Jehova nyere gbasara ọbara isi, na (3) ha ga na-erubere iwu Baịbụl nyere ka anyị zere ịkwa iko isi. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:28, 29.) Olee otú Ndị Kraịst ga-esi na-erubere Jehova isi n’ihe atọ ndị a taa?

4. Olee otú anyị si efe naanị Jehova? (Mkpughe 4:11)

4 Anyị na-ezere ikpere arụsị, na-efekwa naanị Jehova. Jehova nyere ndị Izrel iwu ka ha na-efe naanị ya. (Diut. 5:6-10) Mgbe Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa, Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ naanị Jehova ka anyị kwesịrị ife. (Mat. 4:8-10) N’ihi ya, anyị anaghị efe ihe a kpụrụ akpụ. Anyị anaghịkwa ewere ndị mmadụ ka hà bụ chi, ma hà bụ ndị isi okpukpe, ndị ọchịchị, ma ọ bụ ndị a ma ama n’egwuregwu. Anyị na-eji obi anyị niile akwado Jehova ma na-efe naanị onye “kere ihe niile.”​—Gụọ Mkpughe 4:11.

5. Gịnị mere anyị ji erubere iwu Jehova nyere gbasara ndụ na ọbara isi?

5 Anyị na-erubere iwu Jehova nyere gbasara ndụ na ọbara isi. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova kwuru na ọbara na-anọchi anya ndụ. Ndụ bụkwanụ onyinye dị ezigbo mkpa o nyere anyị. (Lev. 17:14) Mgbe mbụ Chineke kwere ka ụmụ mmadụ riwe anụ, o nyere ha iwu ka ha ghara iri ọbara ya. (Jen. 9:4) O kwughachikwara ihe a mgbe ọ na-enye ụmụ Izrel Iwu Mosis. (Lev. 17:10) O mekwara ka òtù na-achị isi n’oge ndịozi kwuo na Ndị Kraịst niile kwesịrị izere “iri ọbara.” (Ọrụ 15:28, 29) Anyị na-erubere iwu a isi mgbe anyị na-ekpebi otú a ga-esi gwọọ anyị. b

6. Olee mbọ anyị ga-agba ka anyị nwee ike irubere iwu Jehova nyere gbasara mmekọahụ isi?

6 Anyị na-erubere iwu Jehova nyere gbasara mmekọahụ isi. (Hib. 13:4) Pọl onyeozi nyere anyị ndụmọdụ ka anyị mee ka ahụ́ anyị “nwụọ,” ya bụ, ka anyị gbaa ezigbo mbọ wepụ ọchịchọ ọ bụla na-adịghị mma n’obi anyị. Anyị anaghị ele ma ọ bụ na-eme ihe ọ bụla ga-eme ka anyị kwaa iko. (Kọl. 3:5; Job 31:1) Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, ihe anyị na-eme ozugbo bụ ịjụ echiche ma ọ bụ omume ọ bụla nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebi ime? Maka gịnị?

7 Jehova chọrọ ka anyị jiri ‘obi anyị na-erubere ya isi.’ (Rom 6:17) Iwu ọ na-enye anyị na-abụ maka ọdịmma anyị mgbe niile. Anyị agaghịkwa agbanweli iwu ya. (Aịza. 48:17, 18; 1 Kọr. 6:9, 10) Anyị na-eme ike anyị niile ime Jehova obi ụtọ. Anyị na-emekwa ka otu ọbụ abụ sịrị: “Ekpebiela m na m ga na-eso ntụziaka gị mgbe niile, sogide ya ruo n’isi.” (Ọma 119:112) Ma, Setan ga-agba mbọ ka anyị ghara ime ihe anyị kpebiri ime. Olee ụzọ ndị ọ na-esi eme ya?

OLEE OTÚ SETAN SI AGBA MBỌ KA ANYỊ GHARA IME IHE ANYỊ KPEBIRI IME?

8. Olee otú Setan na-esi agbalị iji mkpagbu eme ka anyị ghara ime ihe anyị kpebiri ime?

8 Mkpagbu. Setan na-eme ka ndị mmadụ kụọ anyị ihe ma ọ bụ na-enye anyị nsogbu ka anyị ghara ime ihe anyị kpebiri ime. Ebumnobi ya bụ ‘iri’ anyị, ya bụ, ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. (1 Pita 5:8) E yiri Ndị Kraịst n’oge ndịozi egwu, kụọ ha ihe, gbuokwa ha n’ihi na ha kpebisiri ike ime ihe Chineke chọrọ. (Ọrụ 5:27, 28, 40; 7:54-60) Setan ka na-akpagbu anyị taa. Ihe gosiri na ọ na-akpagbu anyị taa bụ otú e si emekpọ ụmụnna anyị ọnụ na Rọshịa nakwa n’obodo ndị ọzọ, nakwa otú ndị iro anyị na-esi emegide ụmụnna anyị n’otu n’otu.

9. Mee ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịkpachara anya maka aghụghọ Ekwensu.

9 Aghụghọ. Ọ bụghị naanị mkpagbu ka Setan na-eji alụso anyị ọgụ. Ọ na-ejikwa “aghụghọ.” (Efe. 6:11) Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna aha ya bụ Bob. Ọ gara ụlọ ọgwụ n’ihi na a chọrọ ịwa ya ahụ́. Ọ gwara ndị dọkịta na e nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka o kwe ka a mịnye ya ọbara. Dọkịta ga-awa ya ahụ́ ahụ kwuru na ya ga-eme ihe o kwuru. Ma, n’abalị ga-abọta ụbọchị a ga-awa ya ahụ́, dọkịta ọzọ bịara mgbe ndị ezinụlọ Nwanna Bob lachara. Ọ gwara Nwanna Bob na ha ga-agba mbọ ka a ghara ịmịnye ya ọbara, mana na a ga-edosa ọbara a dịghị ama ama ya abụrụ na a ga-emecha chọọ ya. Ọ ga-abụ na dọkịta ahụ chere na Nwanna Bob ga-agbanwe obi ya ma ọ bụrụ na ọ hụghị ndị ezinụlọ ya. Mana, Nwanna Bob guzosiri ike. O kwuru na o nweghị ihe ọ bụla ga-eme ka o kwe ka a mịnye ya ọbara.

10. Olee ihe mere echiche mmadụ ji dị njọ? (1 Ndị Kọrịnt 3:19, 20)

10 Echiche mmadụ. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú ndị mmadụ si ele ya, anyị nwere ike ịna-eleghara Jehova na iwu ya anya. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 3:19, 20.) “Amamihe ụwa a” na-emekarị ka ndị mmadụ na-enupụrụ Jehova isi. Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Pagamọm na Tayataịra malitere iwere ikpere arụsị na omume rụrụ arụ otú ndị obodo ha si were ya. Jizọs baara ọgbakọ abụọ ahụ ezigbo mba maka otú ha si na-agbachi ndị na-eme omume rụrụ arụ nkịtị. (Mkpu. 2:14, 20) Taa, a na-enye anyị nsogbu ka anyị lewe ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịna-agwa anyị na anyị na-eme oké ezi omume ma ọ bụkwanụ na anyị kwesịrị imebi iwu Jehova. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekwu na ime omume rụrụ arụ adịghị njọ, nakwa na ihe Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ enweghịzi isi taa.

11. Gịnị ka anyị kwesịrị izere n’agbanyeghị na anyị guzosiri ike?

11 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichewe na Jehova anaghị enye anyị iwu ndị doro anya. Anyị nwere ike chọwa ịna-eme ihe karịrị “ihe e dere ede.” (1 Kọr. 4:6) Ọ bụ ihe a ka ndị isi okpukpe n’oge Jizọs mere. Ha na-eji aka ha atụkwasị iwu nke ha n’Iwu Mosis, si otú ahụ na-ebo ndị mmadụ ibu arọ. (Mat. 23:4) Jehova na-esi n’Okwu ya nakwa ná nzukọ ya enye anyị ntụziaka doro anya. O nweghị ihe ọ bụla kwesịrị ime ka anyị jiri aka anyị tinye ihe ná ntụziaka ọ na-enye anyị. (Ilu 3:5-7) N’ihi ya, anyị anaghị eji aka anyị eme iwu n’elu iwu ndị nke e nyere na Baịbụl ma ọ bụ gwawa ụmụnna anyị ihe ha ga-eme n’ihe mmadụ ga-eji aka ya ekpebiri onwe ya.

12. Olee otú Setan si eji “ihe ndị na-abụghị eziokwu” eduhie ndị mmadụ?

12 Ihe ndị na-abụghị eziokwu. Setan na-eji “ihe ndị na-abụghị eziokwu” nakwa ‘otú ụwa si ele ihe anya’ eduhie ndị mmadụ, na-emekwa ka ha ghara ịdị n’otu. (Kọl. 2:8) N’oge ndịozi, ihe ndị so n’ihe ndị a bụ ihe ndị mmadụ chere, ya bụ, ihe ndị na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ ndị Juu na-akụzi, nakwa ịkụzi na Ndị Kraịst kwesịrị ịna-edebe Iwu Mosis. Ihe ndị a abụghị eziokwu n’ihi na ha na-eme ka uche ndị mmadụ pụọ n’ebe Jehova nọ, bụ́ Onye amamihe si n’aka. Taa, Ekwensu na-eji Ịntanet nakwa ebe ndị a na-agbasa ozi agbasa ihe ndị na-abụghị eziokwu si n’aka ndị ọchịchị. Ụdị ihe a mere n’oge e nwere ọrịa koronavaịrọs. c Ndịàmà Jehova ndị gere ntị ná ntụziaka si ná nzukọ Jehova anọghị na-echegbu onwe ha otú ahụ ndị gere ntị n’ihe ndị a na-abụghị eziokwu nọ na-echegbu onwe ha.​—Mat. 24:45.

13. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji kpachara anya maka ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya?

13 Ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya. Anyị ekwesịghị ikwe ka uche anyị pụọ ‘n’ihe ndị ka mkpa.’ (Fil. 1:9, 10) Ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya nwere ike iwekọrọ oge na ike anyị ga-eji eme ihe ndị bara uru. Ihe ndị a na-eme ná ndụ, dị ka iri ihe, ịṅụ ihe, ikpori ndụ, na ịrụ ọrụ nwere ike imegharị anyị anya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ka ha ghọọ ihe ndị kacha anyị mkpa. (Luk 21:34, 35) Ihe ọzọ bụ na, kwa ụbọchị, anyị na-anụ akụkọ gbasara ngagharị iwe na esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ha megharịa anyị anya. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike bido na-akwado otu ndị n’obi anyị. Setan na-eji ihe ndị a niile anyị kwuru gbasara ha agbalị ka anyị ghara ime ihe anyị kpebisiri ike ime, ya bụ, ime ihe ziri ezi. Ka anyị lee ihe anyị ga-eme ka ọ ghara iji ihe ndị a enweta anyị, anyị eguzosiekwa ike.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-EGUZOSI IKE?

Ị chọọ ịkwụrụ chịm, na-eche gbasara nnyefe i nyefere Jehova onwe gị na baptizim e mere gị, na-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya, mee ka obi sie gị ike, tụkwasịkwa Jehova obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14 ruo na nke 18)

14. Olee otu ihe ga-enyere anyị aka ịna-akwado Jehova?

14 Na-echeta ihe mere i ji nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim. Ihe mere i ji mee ihe ndị ahụ bụ na ị chọrọ ịna-akwado Jehova. Cheta ihe nyeere gị aka ka obi sie gị ike na ị matala eziokwu. Ị mụtara gbasara Jehova, mụta ịhụ ya n’anya na ịkwanyere ya ùgwù ebe ọ bụ Nna gị nke eluigwe. Ị bịara nwee ezigbo okwukwe, ya emee ka i chegharịa. Ị hapụrụ ihe ndị na-adịghị mma ị na-eme ma na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. Obi bịara ruo gị ala mgbe ị chọpụtara na Jehova agbagharala gị. (Ọma 32:1, 2) Ị gawara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, malitekwa ịgwa ndị ọzọ ihe ndị magburu onwe ha ị na-amụta. Ị bụzi Onye Kraịst nyefere Jehova onwe ya ma mee baptizim ugbu a. Ị na-agazi ije n’ụzọ na-eduga ná ndụ, kpebisiekwa ike na ị gaghị ahapụ ya.​—Mat. 7:13, 14.

15. Olee ihe mere ịmụ ihe na ịtụgharị uche ji dị ezigbo mkpa?

15 Na-amụ Okwu Chineke, na-atụgharịkwa uche na ya. Osisi ga-esi ezigbo ike ma ọ bụrụ na ọ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala. Anyịnwa ga-eguzosikwa ike ma ọ bụrụ na okwukwe anyị agbanyesie mgbọrọgwụ ike n’Okwu Chineke. Ka osisi na-eto, mgbọrọgwụ ya ga na-abakwu n’ime ala ma na-agbasakwu. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya, okwukwe anyị ga-esikwu ike, obi ana-esikwa anyị ike na otú Jehova si eme ihe kacha mma. (Kọl. 2:6, 7) Chee gbasara otú ntụziaka Jehova nyere ndị ya n’oge gara aga, iwu ya, nakwa nchebe o chebere ha si nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, mgbe otu mmụọ ozi na-atụ ụlọ nsọ n’ọhụụ Ezikiel hụrụ, Ezikiel leruru anya nke ọma. Ọhụụ ahụ mere ka obi sikwuo Ezikiel ike. Anyị sikwa na ya mụta ọtụtụ ihe bara uru gbasara otú anyị ga-esi na-edebe iwu Jehova ma na-efe ya otú ọ chọrọ. d (Ezik. 40:1-4; 43:10-12) Anyịnwa na-eritekwa uru ma ọ bụrụ na anyị ana-ewepụta oge na-amụ gbasara ihe ndị miri emi dị n’Okwu Chineke ma na-echebara ha echiche.

16. Olee uru Nwanna Bob ritere maka na obi siri ya ike? (Abụ Ọma 112:7)

16 Mee ka obi sie gị ike. Eze Devid kwuru na ọ gaghị akwụsị ịhụ Jehova n’anya. Ọ sịrị: “Obi siri m ike, Chineke.” (Ọma 57:7) Anyị nwekwara ike ime ka obi sie anyị ike, anyị ejiri obi anyị niile tụkwasị Jehova obi. (Gụọ Abụ Ọma 112:7.) Legodị otú ihe a si nyere Nwanna Bob anyị kwuburu okwu ya aka. Mgbe a gwara ya na a ga-edosa ọbara, a dịghị ama ama ya adị mkpa mgbe a na-awa ya ahụ́, o kwuru ozugbo na e nwehaala ihe ọ bụla mere ka ha chọọ ịmịnye ya ọbara, na ya ga-ahapụ ụlọ ọgwụ ahụ ozugbo. Nwanna Bob mechara sị: “O nweghịdị mgbe ihe m ga-eme mere m obi abụọ. Anọghịkwanụ m na-echegbu onwe m gbasara ihe nwere ike ime.”

Ọ bụrụ na okwukwe anyị agbanyesie mgbọrọgwụ ike n’Okwu Chineke, anyị ga-eguzosi ike n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Nwanna Bob? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

17 Obi siri Nwanna Bob ike n’ihi na o kpebiela ịkwụsi ike n’ebe Jehova nọ tupudị ya agawa ụlọ ọgwụ. Ihe mbụ nyeere ya aka bụ na ọ chọsiri ike ime Jehova obi ụtọ. Nke abụọ bụ na o wepụtara oge mụọ ihe Baịbụl na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl kwuru gbasara otú ndụ na ọbara si dị nsọ. Nke atọ abụrụ na obi siri ya ike na ime ihe Jehova kwuru ga-abara ya ezigbo uru. Obi nwekwara ike isi anyị ike n’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara anyị.

Ebe Berak na ndị agha ya ji obi ike na-achụ Sisera na ndị agha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18)

18. Olee otú akụkọ Berak si akụziri anyị ịtụkwasị Jehova obi? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

18 Tụkwasị Jehova obi. Legodị otú ihe si gaziere Berak n’ihi na ọ tụkwasịrị nduzi Jehova obi. Ọ bụ eziokwu na n’Izrel niile, e nweghị ebe a hụrụ ọta ma ọ bụ ube, Jehova gwara ya ka ọ gaa lụso Sisera bụ́ ọchịagha ndị Kenan na ndị agha ya ji ezigbo ngwá agha ọgụ. (Ikpe 5:8) Debora bụ́ onye amụma nwaanyị gwara Berak ka ọ gaa n’ebe ala dị larịị gaa lụso Sisera na ụgbọ ịnyịnya ya dị narị itoolu (900) ọgụ. N’agbanyeghị na Berak ma na ọ ga-esiri ndị Izrel ike imeri ndị agha ahụ n’ebe ahụ dị larịị, o rubere isi. Ka ndị agha ahụ na-agbada n’Ugwu Tebọ, Jehova mere ka nnukwu mmiri malite izo. Ụgbọ ịnyịnya Sisera tọrọ n’apịtị. Jehova mekwara ka Berak merie ha. (Ikpe 4:1-7, 10, 13-16) Jehova nwekwara ike ime ka anyị merie ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, na-eme ihe ọ bụla nzukọ ya gwara anyị mee.​—Diut. 31:6.

KPEBISIE IKE ỊNA-EGUZOSI IKE N’EBE JEHOVA NỌ

19. Gịnị mere i ji chọọ iguzosi ike n’ebe Jehova nọ?

19 Anyị ga na-agbasi mbọ ike iguzosi ike n’ebe Jehova nọ ruo mgbe e bibiri ụwa Ekwensu a. (1 Tim. 6:11, 12; 2 Pita 3:17) Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị ekwe ka mkpagbu, aghụghọ Ekwensu, echiche mmadụ, ihe ndị na-abụghị eziokwu, na ihe ndị nwere ike imegharị anyị anya mee ka anyị hapụ Jehova. (Efe. 4:14) Kama, ka anyị kwụrụ chịm, na-efesi Jehova ike, ghara ịkwụsị ịhụ ya n’anya, na-erubekwara ya isi. Anyị kwesịkwara ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-ekwu otú Jehova na Jizọs si bụrụ ndị kacha ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

a Kemgbe oge Adam na Iv, ihe Setan na-eme ka ndị mmadụ kweta bụ na ha kwesịrị iji aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ chọrọ ka anyị na-eche otú ahụ gbasara iwu Jehova na ntụziaka ndị nzukọ ya na-enye anyị. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụrụ anya ka anyị ghara iji aka anyị na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ, nke bụ́kwanụ ihe ụwa Setan na-akwado. Ọ ga-enyekwara anyị aka ikpebisi ike irubere Jehova isi mgbe niile.

b Ị chọọ ịmatakwu otú Onye Kraịst ga-esi na-erubere iwu Jehova nyere gbasara ọbara isi, gụọ isi nke 39 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.

c Gaa na jw.org gụọ isiokwu bụ́ “Ekwela Ka E Jiri Akụkọ Ụgha Duhie Gị.”

d Ị chọọ ịmatakwu gbasara ọhụụ Ezikiel, gụọ isi nke 13 na nke 14 n’akwụkwọ A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe.