Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Kpebie Ihe Ndị Ka Mkpa Ị Ga-amụ

Anyị na-enwekarị oge a kapịrị ọnụ anyị na-eji amụ ihe. Olee otú anyị ga-esi jiri oge ahụ na-eme ihe bara ezigbo uru? Nke mbụ, wepụtara ebe ị chọrọ ịmụ ezigbo oge. Ọ ga-aka abara gị uru ma ọ bụrụ na i wepụta oge mụọ ntakịrị ebe ị chọrọ ịmụ nke ọma karịa ịgụ ọtụtụ ihe ọkụ ọkụ.

Kpebizie ihe ndị ka mkpa ị ga-amụ. (Efe. 5:15, 16) Legodị ụfọdụ n’ime ha:

  • Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Ọma 1:2) I nwere ike iji ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu nke na-agba n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ malite.

  • Kwadebe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na ọmụmụ ihe etiti izu. Mụọ ya nke ọma ka i nwee ike ịza ajụjụ.​—Ọma 22:22.

  • Biko, gbalịakwa na-agụ ma ọ bụ na-ele ihe ndị ọzọ na-eme ka okwukwe anyị na-esi ike, dị ka Teta! na Ụlọ Nche ọhaneze, vidio, nakwa ihe ndị na-agba na jw.org.

  • Mee nchọnchọ gbasara isiokwu masịrị gị. I nwere ike ime nchọnchọ ná nsogbu i nwere, ajụjụ i nwere, ma ọ bụkwanụ isiokwu Baịbụl ị ga-achọ ịghọtakwu. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata ihe ụfọdụ i nwere ike ịmụ, gaa na jw.org, n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị E Ji Amụ Baịbụl.”