Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Inwe Mmasị n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ Na-aba Ezigbo Uru

Inwe Mmasị n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ Na-aba Ezigbo Uru

Foto mụ na mama m na nwanne m nwaanyị aha ya bụ Pat sere n’afọ 1948

NNE NNE m gwara mama m, sị: “Chọọchị Anglịkan anaghị akụzi eziokwu. Na-achọ ndị na-akụzi eziokwu.” Mgbe o kwuchara ihe a, mama m malitere ịchọ ndị na-akụzi eziokwu Baịbụl. Ma, o kweghị ege Ndịàmà Jehova ntị. Ọ gwakwara m ka m zoo mgbe ọ bụla ha bịara n’ụlọ anyị na Toronto dị na Kanada. Ma, mgbe nwanne mama m nke nta so Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl n’afọ 1950, mama m sooro ya. Ha nọ n’ụlọ nwanne mama m ahụ mụgide Baịbụl, mechaa mee baptizim.

Papa m bụ elda na chọọchị a na-akpọ United Church of Canada dị n’obodo anyị. N’ihi ya, n’izu ọ bụla, ọ na-eziga mụ na nwanne m nwaanyị ka anyị gaa Sọnde skul, anyị gachaa, anyị esoro ya gaa chọọchị ma ọ kụọ elekere iri na otu. O ruo n’ehihie, anyị esoro mama anyị gaa Ụlọ Nzukọ Alaeze. O sirighị anyị ike ịhụ ihe dị iche n’okpukpe abụọ ahụ.

Anyị na ezinụlọ Nwanna Hutcheson mgbe anyị gara mgbakọ mba niile isiokwu ya bụ Ime Uche Chineke n’afọ 1958

Mama m gwara ndị ha na ya bụ enyi kemgbe ọtụtụ afọ ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. Aha ha bụ Bob Hutcheson na nwunye ya Marion. Ha nabatakwara eziokwu. N’afọ 1958, Hutcheson na nwunye ya kpọọrọ mụ na ụmụ ha ndị nwoke atọ gaa mgbakọ mba niile were abalị asatọ e mere na Niu Yọk Siti. Isiokwu ya bụ Ime Uche Chineke. Ọ bụ ugbu a ka m matara na ọ dịrịghị ha mfe ịkpọ m aga. Ma, mgbakọ ahụ so n’ihe kacha pụọ iche mere ná ndụ m.

ỤMỤNNA NYEERE M AKA IJEKWURU JEHOVA OZI

Tupu mụ eruo afọ iri abụọ, anyị bi n’ebe a na-akpa ụmụ anụmanụ. Ilekọta ha na-atọgbu m atọgbu. M chọsiri ike ịmụ otú m ga-esi bụrụ dọkịta na-elekọta ụmụ anụmanụ. Mama m gwara otu okenye ọgbakọ anyị gbasara ya. Okenye ahụ weturu obi chetara m na anyị bi ‘n’oge ikpeazụ,’ jụọkwa m otú iji afọ ụfọdụ gaa mahadum nwere ike isi kpaa adịm ná mma mụ na Jehova aka. (2 Tim. 3:1) N’ihi ya, m kpebiri na agaghị m aga mahadum.

M ka nọkwa na-eche ihe m ga-eme ma m gachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ bụ eziokwu na m na-aga ozi ọma ná ngwụcha izu ọ bụla, ozi ọma anaghị atọ m ụtọ n’oge ahụ. Echeghịkwa m na m ga-abụli ọsụ ụzọ. N’oge ahụ, papa m na-abụghị Onyeàmà Jehova na nwanne ya nwoke nọ na-agba m ume ka m jiri oge m niile na-arụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ ịnshọransị na-ewu ewu na Toronto. Nwanne papa m nọ n’ọkwá ukwu n’ụlọ ọrụ ahụ. N’ihi ya, m kwetara ịrụ ọrụ n’ebe ahụ.

Na Toronto, anaghị m enwe efe. M na-arụkarị ọrụ ma a gbasaa ọrụ. M na-esokwa ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Ihe a niile mere ka m ghara inwe ohere maka ihe gbasara ofufe Jehova. Mụ na papa papa m na-abụghị Onyeàmà Jehova biri ná mmalite. Ma mgbe ọ nwụrụ, ọ bịara dị mkpa ka m gaa biri ebe ọzọ.

Nwanna Hutcheson na nwunye ya bịara dịrị ka papa m na mama m. Ọ bụ ha bụ ndị ahụ kpọ m gaa mgbakọ ahụ e mere n’afọ 1958. Ha gwara m ka m bịa biri n’ụlọ ha. Ha nyekwaara m aka ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. N’afọ 1960, mụ na nwa ha nwoke bụ́ John mere baptizim. John bidoro ịsụ ụzọ, nke mere ka mụnwa wepụtakwuo oge na-eje ozi ọma. Ụmụnna nọ n’ọgbakọ hụrụ otú m si na-eme nke ọma n’ọgbakọ. E mechara họpụta m ka m bụrụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. a

M LỤTARA EZIGBO NWAANYỊ, GHỌỌKWA ỌSỤ ỤZỌ

Ụbọchị anyị gbara akwụkwọ n’afọ 1966

N’afọ 1966, m lụrụ Nwanna Nwaanyị Randi Berge. Ọ bụ ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi nke chọsiri ike ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Onye nlekọta sekit anyị gosiri anyị na ihe anyị masịrị ya. Ọ gbakwara anyị ume ịga nyere ọgbakọ dị n’Orilia dị n’Ọnterio aka. N’ihi ya, anyị kwagara ebe ahụ n’egbughị oge.

Ozugbo anyị ruru n’Orilia, m so nwunye m Randi ghọọ ọsụ ụzọ oge niile. Otú o si anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma mere ka m mụta iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ozugbo m tinyere obi m niile n’ịsụ ụzọ, obi dị m ụtọ ịhụ otú m si eji Baịbụl na-akụziri ndị mmadụ ihe na ịhụ otú ha si na-aghọta ya. Obi dị m ezigbo ụtọ inyere otu di na nwunye bi n’Orilia aka ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ha ma ghọọ ndị na-efe Jehova.

ANYỊ MỤTARA ASỤSỤ ỌHỤRỤ, GBANWEEKWA OTÚ ANYỊ SI ECHE ECHICHE

Mgbe anyị gara Toronto, m hụrụ otu nwanna so na-eduzi ọrụ a na-arụ na Betel. Aha ya bụ Arnold MacNamara. Ọ jụrụ m ma ànyị ga-achọ ịghọ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. M zara ya ozugbo, sị: “Ee, anyị ga-achọ, mana ya abụkwala na Kwebek.” M nọbu na-ele ndị nọ ná mpaghara a na-asụ French anya otú ndị nọ ná mpaghara a na-asụ Bekee si ele ha. N’oge ahụ, ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe n’ihi ndị ọchịchị, chọọkwa ka Kwebek bụrụ mba kwụụrụ onwe ya.

Nwanna Arnold sịrị m: “Ọ bụ naanị na Kwebek ka alaka ụlọ ọrụ na-eziga ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’oge a.” M kwetara ozugbo na anyị ga-aga. Ama m na nwunye m nwere mmasị ịga ebe ahụ jewe ozi. M mechara chọpụta na ihe ahụ so ná mkpebi kacha mma anyị merela.

Anyị ji izu ise mụọ asụsụ French. Mgbe anyị mụchara, mụ na Randi nwunye m na di na nwunye ọzọ so gawa Rimuski dị ihe dị ka narị kilomita ise na iri anọ (540) ma e si ebe ugwu Mọntriọl gawa ya. Ma, anyị amụtachabeghị asụsụ French. Dị ka ihe atụ, n’otu ọmụmụ ihe anyị gara, mgbe m nọ na-ama ọkwa, m chọrọ ikwu na e nwere ọtụtụ ndị ga-esi Ọstria bịa mgbakọ ukwu anyị na-aga inwe, ma ihe m kwuru bụ na ọtụtụ enyí nnụnụ ga-abịa ya.

“White House” dị na Rimuski

Na Rimuski, ụmụnna nwaanyị anọ na-alụbeghị di na Nwanna Huberdeaus, nwunye ya, na ụmụ ha ndị nwaanyị abụọ sonyeere anyị anọ. Nwanna Huberdeaus na nwunye ya chọtara ụlọ nwere ọnụ ụlọ asaa, anyị niile bụ́ ndị ọsụ ụzọ ebiri ebe ahụ na-akwụzi ụgwọ ya. Anyị na-akpọ ebe ahụ White House n’ihi na e tere ihu ụlọ ahụ na ogidi ya ágbá ọcha. A na-enwekarị ihe dị ka mmadụ iri na abụọ ruo iri na anọ na-ebi ebe ahụ. Ebe mụ na Randi nwunye m bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, anyị na-aga ozi ọma n’ụtụtụ, n’ehihie, nakwa ná mgbede. N’ihi ya, obi na-adị anyị ụtọ na a na-enwekarị onye anyị na ya ga-eso aga ozi ọma, ma mgbe ezigbo oyi na-atụ ná mgbede.

Anyị na ndị ọsụ ụzọ oge niile ndị ahụ bịara dị n’ezigbo mma, nke na ha dị ka ndị ezinụlọ anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị na-akwanye ọkụ, gbaa ya okirikiri, ma ọ bụkwanụ anyị ewepụta otu ụbọchị anyị kpọrọ “ụbọchị oriri,” ya bụ, ụbọchị onye ọ bụla na-esi na-awụsị, a na-eri. Otu n’ime ụmụnna ndị ahụ na-akụ egwú. N’ihi ya, n’ọtụtụ mgbede Satọdee, anyị na-akụ egwú, na-agba.

Ọtụtụ ndị bi na Rimuski nwere mmasị na Baịbụl. N’ime afọ ise, obi dị anyị ụtọ na ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl mere baptizim. Ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ahụ mechara ruo ihe dị ka iri atọ na ise.

Na Kwebek, anyị mụtara otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma. Anyị hụrụ otú Jehova si enyere anyị aka n’ozi anyị, na-egbokwara anyị mkpa anyị. Ihe ọzọ bụ na anyị mụtara ịhụ ndị na-asụ French n’anya, jirikwa asụsụ ha na omenala ha kpọrọ ihe. O mekwara ka anyị jiri omenala ndị ọzọ kpọrọ ihe.​—2 Kọr. 6:13.

Na mberede, alaka ụlọ ọrụ gwara anyị ka anyị gaa na Trakedi dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Niu Brọnswik. Ihe a siiri anyị ike n’ihi na ọ dịbeghị anya anyị kwụrụ ụgwọ ụlọ ebe anyị chọrọ ibi, e nwetakwala m ebe m ga-eji ụbọchị ole na ole n’izu na-akụzi ihe n’otu ụlọ akwụkwọ. Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ka ghọrọ ndị nkwusa ọhụrụ, anyị nọkwa na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe ahụ.

Anyị kpere ekpere ná ngwụcha izu ahụ niile gbasara ịkwaga Trakedi. Anyị gakwara ebe ahụ ka anyị mara otú ọ dị. Ebe ahụ dị nnọọ ezigbo iche na Rimuski. Ma anyị kpebiri na ebe ọ bụ Jehova chọrọ ka anyị gaa ebe ahụ, anyị ga-aga. Anyị nwalere Jehova, hụkwa na o wepụụrụ anyị ihe ndị ahụ ga-eme ka ịkwaga ebe ahụ siere anyị ike. (Mal. 3:10) Nwunye m bụ́ Randi hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ naghị eche naanị banyere onwe ya. Ọ na-emekwa ihe ọchị. Ihe ndị a niile mere ka ọ dịrị anyị mfe ịkwaga ebe ahụ.

Naanị otu okenye nọ n’ọgbakọ ọhụrụ anyị ahụ. Aha ya bụ Robert Ross. Ya na nwunye ya bụbu ndị ọsụ ụzọ n’ebe ahụ. Ha kpebiri ịnọ ebe ahụ mgbe ha mụrụ nwa mbụ ha. N’agbanyeghị na ha na-elekọta nwa ha, otú ha si elekọta ndị ọbịa na otú ha si ekwusasi ozi ọma ike gbara mụ na nwunye m Randi ezigbo ume.

OBI TỌRỌ ANYỊ ỤTỌ N’IHI NA ANYỊ JERE OZI EBE Ọ BỤLA A GWARA ANYỊ GAA

Mgbe ezigbo oyi na-atụ na sekit mbụ anyị gara leta

Mgbe anyị sụchara ụzọ na Trakedi afọ abụọ, a gwara anyị ka anyị gawa ọrụ sekit. Ihe ahụ tụrụ anyị n’anya. Anyị ji afọ asaa gaa na-eleta sekit ndị na-asụ Bekee. E mechakwara ziga anyị ka anyị gaa letawa sekit na-asụ French na Kwebek. Onye nlekọta distrikti anyị na Kwebek bụ́ Nwanna Léonce Crépeault na-aja m mma ma m kwuchaa okwu. Ma, e mechaa, ọ na-ajụ m, sị, “Olee otú i chere okwu gị a gaara esi bakwuo uru?” b Otú a o si na-enyere m aka mere ka m na-akapịkwu ihe ndị m na-akụzi ọnụ, ya adịrịkwa mfe nghọta.

Otu n’ime ọrụ ndị m kacha echeta bụ nke m rụrụ n’afọ 1978 ná mgbakọ mba niile e mere na Mọntriọl isiokwu ya bụ “Okwukwe Na-enwe Mmeri.” M rụrụ ọrụ na ngalaba na-ahụ maka nri. Anyị nọ na-atụ anya na puku mmadụ iri asatọ (80,000) ga-abịa mgbakọ ahụ. Otú anyị ga-esi enye ha nri ga-adịkwa iche n’otú e si eme n’oge ndị gara aga. Ihe niile dị ọhụrụ, ma ihe ndị e ji esi nri, ma nri ndị a ga-esi, ma otú a ga-esi esi ha. Anyị nwere ihe dị ka nnukwu friji iri abụọ. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ha na-arụ ọrụ nke ọma. Tupu ụbọchị mbụ a ga-amalite mgbakọ ahụ, anyị enweghị ike ịbanye n’ebe a ga-anọ mee mgbakọ ahụ hazie ihe ruo n’ime abalị ụbọchị ahụ n’ihi egwuregwu a nọ ebe ahụ na-eme. Anyị kwesịkwara ịgbanye ihe anyị ji esi nri tupu chi efoo iji nwee ike sie nri ụtụtụ. Ezigbo ike gwụrụ anyị. Ma, amụtara m ihe n’otú ụmụnna ndị anyị na ha rụkọrọ ọrụ si rụsie ọrụ ike, mara nke a na-akọ, na-emekwa ihe ọchị. Mụ na ha bịara dịrị ná mma, bụrụkwa ezigbo enyi ruo taa. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ na anyị so rụọ ọrụ a dị mkpa ná mgbakọ e mere na Kwebek bụ́ ebe a kpagburu ụmụnna anyị mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’agbata afọ 1940 na afọ 1960.

Mgbe mụ na Randi nwunye m na-enye aka n’ịkwadebe maka mgbakọ e nwere na Mọntriọl n’afọ 1985

M mụtara ọtụtụ ihe n’aka ndị okenye ibe m mụ na ha rụkọrọ ọrụ ná mgbakọ ahụ e mere na Mọntriọl. E nwere afọ Nwanna David Splane, onye so n’Òtù Na-achị Isi ugbu a, bụ onye nlekọta mgbakọ distrikti. Ná mgbakọ ọzọ e nwere, mgbe a gwara m ka m bụrụ onye nlekọta mgbakọ distrikti, Nwanna David ji obi ya niile kwadoo m n’ọrụ ahụ.

N’afọ 2011, mgbe mụ na Randi nwunye m rụrụla ọrụ sekit afọ iri atọ na isii, a gwara m ka m bịa ghọọ onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị Okenye Ọgbakọ. Anyị hiri n’àkwà iri asaa na ise n’ime afọ abụọ. Ma, mbọ anyị gbara efughị ọhịa. Ná ngwụcha izu ọ bụla, obi na-atọgbu ndị okenye atọgbu n’ihi na ha hụrụ na mkpa Òtù Na-achị Isi bụ ka ha na Jehova dịrị n’ezigbo mma.

M mechakwara kụzie ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. Ike na-agwụcha ụmụ akwụkwọ ndị ahụ, ha ana-echegbukwa onwe ha n’ihi ọtụtụ ihe ha nwere ime. Ha na-anọ na klas ihe dị ka awa asaa n’ụbọchị ọ bụla. Ha na-eji ihe dị ka awa atọ n’abalị ọ bụla eme ihe omume e nyere ha mee n’ụlọ. Ha na-emekwa ihe omume anọ ma ọ bụ ise n’ụlọ akwụkwọ ahụ kwa izu. Mụ na nwanna nke ọzọ na-akụziri ha ihe kọwaara ha na ha agaghị emeli ya ma ọ bụrụ na Jehova enyereghị ha aka. Agaghị m echefu otú o si eju ụmụ akwụkwọ ahụ anya ma ha hụ na Jehova enyerela ha aka ha emee ihe ndị ahụ ha chere na ha agaghị emeli.

INWE MMASỊ N’EBE NDỊ ỌZỌ NỌ NA-ABA EZIGBO URU

Otú mama m si nwee mmasị n’ebe ndị ọ na-amụrụ Baịbụl nọ mere ka ha na-eme nke ọma. O mekwara ka papa m gewe ntị n’ozi ọma. Mgbe abalị atọ gachara mama m nwụrụ, papa m mere ihe juru anyị anya. Ọ bịara gee okwu ihu ọha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ nọkwa na-abịa ọmụmụ ihe ruo afọ iri abụọ na isii. Ọ bụ eziokwu na papa m emeghị baptizim, ndị okenye gwara m na ọ na-abụ onye mbụ na-abịa ọmụmụ ihe n’izu ọ bụla.

Ihe mama m mere kụzikwaara mụ na ụmụnne m ezigbo ihe. Ụmụnne m ndị nwaanyị atọ na di ha ji obi ha niile na-efe Jehova. Abụọ n’ime ha na-eje ozi na Betel. Otu na-eje ozi na Betel dị na Pọtugal, nke ọzọ ana-eje ozi na Betel dị na Heiti.

Mụ na nwunye m Randi bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ugbu a na Hamiltịn dị n’Ọnterio. Mgbe anyị nọbu n’ọrụ sekit, obi na-adị anyị ụtọ iso ndị ọzọ na-aga nletaghachi ha, sorokwa ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ma ugbu a, obi na-adị anyị ụtọ ịhụ ka ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-ahụ Jehova n’anya. Anyị na ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ ọhụrụ anyị dị n’ezigbo mma. Ọ na-agba anyị ume ma anyị hụ otú Jehova si na-akwado ha, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe siri ike.

Anyị cheta ihe ndị merela ná ndụ anyị, obi na-adị anyị ezigbo ụtọ maka otú ụmụnna si gosi na ihe gbasara anyị na-amasị ha. Anyịnwa na-agbalịkwa igosi na anyị “na-eche gbasara” ndị ọzọ, na-agba ha ume ka ha mee ihe niile ha ga-emeli n’ofufe Jehova. (2 Kọr. 7:6, 7) Dị ka ihe atụ, n’ezinụlọ otu nwanna, nwunye ya, nwa ha nwoke, na nwa ha nwaanyị nọ n’ozi oge niile. Mgbe m jụrụ nwanna ahụ ma ò chetụla echiche ịsụ ụzọ, ihe ọ zara m bụ na ọ na-akwado mmadụ atọ ndị ahụ na-asụ ụzọ. M jụziri ya, sị: “Ị̀ ga-akwado ha karịa otú Jehova ga-esi akwado ha?” M gbara ya ume ka o soro ha rụọ ọrụ ahụ na-atọ ha ụtọ. Mgbe ọnwa isii gachara, ọ ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile.

Mụ na Randi nwunye m agaghị akwụsị ịkọrọ “ọgbọ na-abịa abịa” banyere “ọrụ ndị dị ebube” Jehova na-arụ. Anyị na-ekpekwa ekpere ka ozi Jehova tọọ ha ụtọ otú ọ tọrọ anyị.​—Ọma 71:17, 18.

a Ihe a na-akpọzi ya ugbu a bụ onye nlekọta Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ.

b Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Léonce Crépeault n’Ụlọ Nche Febụwarị 2020, peeji nke 26 ruo na nke 30.